previous next

I. NDI KỌRINT 1

1 Pọl, onye akpọrọ ibu onye-ozi nke Jisus Kraist site n'ọchichọ nke Chineke, na Sostenis nwa-nna-ayi, 2 nēdegara nzukọ Chineke nke di na Kọrint akwukwọ, bú ndi edoworo nsọ nime Kraist Jisus, ndi akpọrọ ibu ndi nsọ, ha na ndi nile nākpọku aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist n'ebe nile, bú Onye-nwe ayi na ha:

3 Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta.
4 Anamekelere unu Chinekem mb͕e nile, n'ihi amara nke Chineke nke enyere unu nime Kraist Jisus; 5 na n'ihe nile ọ bula emere unu ndi-ọgaranya nime Ya, n'okwu nile na ọmuma nile; 6 dika emere ka àmà nke Kraist guzosie ike nime unu: 7 nke mere na ọ dighi onyinye-amara fọduru nke unu nēnweghi; unu nēche kwa nkpughe Onye-nwe-ayi Jisus Kraist; 8 Onye gēme kwa ka unu guzosie ike rue ọgwugwu ihe nile, buru ndi anāpughi ibo ebubo n'ubọchi Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.

9 Chineke kwesiri ntukwasi-obi, Onye esitere n'aka Ya kpọbata unu na nnwekọ nke Ọkpara-Ya Jisus Kraist Onye-nwe-ayi.
10 Ma, umu-nnam, esiterem n'aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist riọ unu, ka unu nile nēkwu otù ihe, ka nkewa ghara kwa idi n'etiti unu; kama ka eme unu ka unu zue okè n'otù uche ahu na n'otù ìzù ahu. 11 N'ihi na ndi èzí-na-ulo Kloi gosirim ihe bayere unu, umu-nnam, na esem-okwu di n'etiti unu. 12 Ihe m'nēkwu bu nka, na unu nile n'otù n'otù nāsi, Mu onwem bu nke Pọl; mu onwem bu kwa nke Apọlos; mu onwem bu kwa nke Kifas; mu onwem bu kwa nke Kraist. 13 Èkèwo Kraist èkè? ọ̀ gābu na akpọgidere Pọl n'obe n'ihi unu? mà-ọbu na emere unu baptism ibà n'aha Pọl? 14 Anamekele Chineke na ọ dighi onye ọ bula n'etiti unu m'mere baptism, ma-ọbughi Krispọs na Gaiọs; 15 ka onye ọ bula ghara isi na emere unu baptism ibà n'aha nkem. 16 Ma eme-kwa-ram èzí-na-ulo Stefanas baptism: ma ewepu ndia, amataghm ma emerem onye ọ bula ọzọ baptism.

17 N'ihi na Kraist eziteghm ime baptism, kama izisa ozi ọma: ọ bughi n'amam-ihe nke okwu, ka aghara ime ka obe Kraist buru ihe-efu.
18 N'ihi na okwu nke obe buru ndi nāla n'iyì ihe-nzuzu; ma ọ buru ayi, bú ndi anāzọputa, ike nke Chineke.

19 N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si,
M'gāla amam-ihe nke ndi mara ihe n'iyì,
M'gāju kwa nghọta nke ndi nwere nghọta.
20 Òle ebe onye mara ihe nọ? òle ebe ode-akwukwọ nọ? òle ebe onye oge a, onye ya na ibe-ya nājurita ajuju, nọ? Chìneke emeghi ka amam-ihe uwa buru ihe-nzuzu? 21 N'ihi na ebe uwa n'amam-ihe nke Chineke nējighi amam-ihe-ya mara Chineke, ọ di Chineke ezi nma iji ihe-nzuzu nke ihe ahu anēkwusa izọputa ndi kwere. 22 Ebe ndi-Ju nāriọ ihe-iriba-ama di iche iche, ndi-Grik nāchọ kwa amam-ihe: 23 ma ayi onwe-ayi nēkwusa Kraist, na akpọgidere Ya n'obe, Onye buru ndi-Ju ọnyà, buru kwa ndi mba ọzọ ihe-nzuzu; 24 ma Ọ buru ndi akpọrọ, ma ndi-Ju ma ndi-Grik, Kraist, bú ike nke Chineke, na amam-ihe nke Chineke.

25 N'ihi na ihe-nzuzu nke Chineke kariri madu nile n'amam-ihe; adighi-ike nke Chineke kariri kwa madu nile n'ike.
26 N'ihi na lenu ọkpukpọ-unu, umu-nnam, na ọ dighi ọtutu ndi mara ihe dika anu-aru si mara ihe, ọ dighi ọtutu ndi-ike, ọ dighi ọtutu ndi amazuru aha-ha, ka akpọrọ: 27 Kama ọ bu ihe-nzuzu nke uwa ka Chineke rọputara, ka O we me ka ihere me ndi mara ihe; ọ bu kwa ihe nādighi ike nke uwa ka Chineke rọputara, ka O we me ka ihere me ihe di ike; 28 ọ bu kwa ihe di ala nke uwa, na ihe akpọrọ ihe-efu, ka Chineke rọputara, bú ihe nke nādighi, ka O we me ka ihe nke nādi ghara idi irè: 29 ka anu-aru nile, bú madu, we ghara inya isi n'iru Chineke. 30 Ma unu onwe-unu sitere na Ya di nime Kraist Jisus, Onye ghọrọ amam-ihe nye ayi site na Chineke, bú ezi omume, na ido-nsọ kwa, na nb͕aputa: 31 ka, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, Onye nānya isi, ya nya n'Onye-nwe-ayi.

1 Corinthians 1

1 Paul, called to be an apostle of Jesus Christ through the will of God, and Sosthenes our brother,2 unto the church of God which is at Corinth, even them that are sanctified in Christ Jesus, called to be saints, with all that call upon the name of our Lord Jesus Christ in every place, their Lord and ours:3 Grace to you and peace from God our Father and the Lord Jesus Christ.4 I thank my God always concerning you, for the grace of God which was given you in Christ Jesus;5 that in everything ye were enriched in him, in all utterance and all knowledge;6 even as the testimony of Christ was confirmed in you:7 so that ye come behind in no gift; waiting for the revelation of our Lord Jesus Christ;8 who shall also confirm you unto the end, that ye be unreproveable in the day of our Lord Jesus Christ.9 God is faithful, through whom ye were called into the fellowship of his Son Jesus Christ our Lord.10 Now I beseech you, brethren, through the name of our Lord Jesus Christ, that ye all speak the same thing and that there be no divisions among you; but that ye be perfected together in the same mind and in the same judgment.11 For it hath been signified unto me concerning you, my brethren, by them that are of the household of Chloe, that there are contentions among you.12 Now this I mean, that each one of you saith, I am of Paul; and I of Apollos: and I of Cephas; and I of Christ.13 Is Christ divided? was Paul crucified for you? or were ye baptized into the name of Paul?14 I thank God that I baptized none of you, save Crispus and Gaius;15 lest any man should say that ye were baptized into my name.16 And I baptized also the household of Stephanas: besides, I know not whether I baptized any other.17 For Christ sent me not to baptize, but to preach the gospel: not in wisdom of words, lest the cross of Christ should be made void.18 For the word of the cross is to them that perish foolishness; but unto us who are saved it is the power of God.19 For it is written, I will destroy the wisdom of the wise, And the discernment of the discerning will I bring to nought.

20 Where is the wise? where is the scribe? where is the disputer of this world? hath not God made foolish the wisdom of the world?21 For seeing that in the wisdom of God the world through its wisdom knew not God, it was God’s good pleasure through the foolishness of the preaching to save them that believe.22 Seeing that Jews ask for signs, and Greeks seek after wisdom:23 but we preach Christ crucified, unto Jews a stumblingblock, and unto Gentiles foolishness;24 but unto them that are called, both Jews and Greeks, Christ the power of God, and the wisdom of God.25 Because the foolishness of God is wiser than men; and the weakness of God is stronger than men.26 For behold your calling, brethren, that not many wise after the flesh, not many mighty, not many noble, are called:27 but God chose the foolish things of the world, that he might put to shame them that are wise; and God chose the weak things of the world, that he might put to shame the things that are strong;28 and the base things of the world, and the things that are despised, did God choose, yea and the things that are not, that he might bring to nought the things that are:29 that no flesh should glory before God.30 But of him are ye in Christ Jesus, who was made unto us wisdom from God, and righteousness and sanctification, and redemption:31 that, according as it is written, He that glorieth, let him glory in the Lord.