previous next

I. NDI KỌRINT 10

1 N'ihi na achọghm, umu-nnam, ka unu ghara imara, na nna-ayi-hà nile nọri n'okpuru igwe-oji ahu, ha nile gabiga-kwa-ra oké osimiri ahu; 2 eme-kwa-ra ha nile baptism ibà nime Moses nime igwe-oji ahu na nime oké osimiri ahu; 3 ha nile ri-kwa-ra otù ihe-oriri ahu nke mọ; 4 ha nile ṅu-kwa-ra otù ihe-ọṅuṅu ahu nke mọ: n'ihi na ha nāṅu miri nke si na nkume nke mọ nke soro ha: nkume ahu bu kwa Kraist. 5 Ma ihe ndi kari n'etiti ha adighi Chineke ezi nma: n'ihi ya akwaturu ha n'ọhia. 6 Ma ihe ndia ghọrọ ihe-atù nye ayi, ka ayi we ghara ibu ndi agu ihe ọjọ nāgu, dika agu ihe ọjọ gu-kwa-ra ndi ahu. 7 Unu aghọ-kwa-la ndi nēkpere arusi, dika ufọdu n'etiti ha ghọrọ; dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ndi Israel nọduru ala iri ihe na iṅu ihe, ha we bilie igwu egwú. 8 Ka ayi ghara kwa ikwa iko, dika ufọdu n'etiti ha kwara, we da nwua n'otù ubọchi, ọgu nnù madu abua na nnù iri na asa na ọgu iri. 9 Ka ayi ghara kwa inwa Onye-nwe-ayi, dika ufọdu n'etiti ha nwara, agwọ we la ha n'iyì. 10 Unu atamu-kwa-la, dika ufọdu n'etiti ha tamuru, onye-nbibi ahu we la ha n'iyì. 11 Ma ihe ndia nēmeri ndi ahu n'uzọ ihe-atù; ewe de ha n'akwukwọ nsọ ka ha we buru ihe idu ayi ọdú, ndi ọgwugwu oge ndia ruteworo. 12 Ya mere, onye nēchè na o nēguzo, ya lezi anya ka ọ ghara ida.

13 Ọ dighi ọnwunwa ọ bula nwaworo unu ma-ọbughi nke madu nānagide: ma Chineke kwesiri ntukwasi-obi, Onye nāgaghi-ekwe ka anwa unu kari nke unu puru inagide; kama n'oge ọnwunwa ahu Ọ gēme kwa uzọ nb͕apu, ka unu we nwe ike inagide ya.
14 N'ihi nka, ndi m'huru n'anya, b͕anarinu ikpere-arusi. 15 Anamekwu dika anamagwa ndi nwere uche; unu onwe-unu tule ihe m'nēkwu. 16 Iko nke ngọzi ahu nke ayi nāgọzi, ọ̀ bughi nnwekọ ọbara Kraist? Achicha ahu nke ayi nānyawa, ọ̀ bughi nnwekọ aru Kraist? 17 n'ihi na otù achicha di, ayi, ọ bu ezie na ayi di ọtutu, ma ayi bu otù aru: n'ihi na ayi nile nēketa òkè n'otù achicha ahu. 18 Lenu Israel dika anu-aru si di: ndi nēri àjà, hà na ebe-ichu-aja adighi-enwekọ? 19 Gini kwa ka m'nēkwu? nà ihe achuru n'aja nye arusi bu ihe ọ bula, ma-ọbu na arusi bu ihe ọ bula? 20 Kama okwu m'nēkwu bu, na ihe ndi mba ọzọ nāchu n'àjà, ha nāchuru ndi-mọ ọjọ, ọ bughi kwa Chineke ka ha nāchuru: ma achọghi m ka unu ghọ ndi unu na ndi-mọ ọjọ nēnwekọ. 21 Unu apughi iṅu iko Onye-nwe-ayi na iko ndi-mọ ọjọ: unu apughi iketa table Onye-nwe-ayi na table ndi-mọ ọjọ.

22 Ma-ọbu àyi nākpasu Onye-nwe-ayi ekworo? àyi ka Ya ike?
23 Ihe nile ziri ezi n'iwu; ma ọ bughi ihe nile bara urù. Ihe nile ziri ezi n'iwu; ma ọ bughi ihe nile nēwuli madu elu dika ulo. 24 Ka onye ọ bula ghara ichọ ọdi-nma nke aka ya, kama ọdi-nma nke madu-ibe-ya. 25 Ihe nile ọ bula anēre n'ahia anu, rienu ya, ghara iju ajuju n'ihi akọ-na-uche; 26 n'ihi na uwa bu nke Onye-nwe-ayi, na ùjú-ya. 27 Ọ buru na onye ọ bula n'etiti ndi nēkweghi akpọ unu n'oriri, ọ buru kwa na unu achọ ije; ihe ọ bula anēdebe n'iru unu, rienu ya, ghara iju ajuju n'ihi akọ-na-uche. 28 Ma ọ buru na onye ọ bula asi unu, Achuru ihe a n'àjà, unu erila, n'ihi onye ahu nke gosiri ya, na n'ihi akọ-na-uche: 29 akọ-na-uche, ka m'kwuru, ọ bughi nke aka gi, kama akọ-na-uche nke madu-ibe-gi; n'ihi na gini mere akọ-na-uche ọzọ nēkpe inwe-onwem ikpé? 30 Ọ buru na mu onwem ji ekele keta, gini mere anēkwulum n'ihi ihe ahu nke mu onwem nēkelere ekele? 31 Ya mere ma unu nēri ihe, ma unu nāṅu ihe, ma unu nēme ihe ọ bula, nēmenu ihe nile ka ewe nye Chineke otuto. 32 Unu aghọla ndi nēme ndi-Ju, ma-ọbu ndi-Grik, ma-ọbu nzukọ Chineke, ka ha su ngọngọ: 33 dika mu onwem nēme kwa ihe nātọ madu nile n'ihe nile, nāchọghi urù nke akam, kama urù nke madu nile, ka ewe zọputa ha.

1 Corinthians 10

1 For I would not, brethren, have you ignorant, that our fathers were all under the cloud, and all passed through the sea;2 and were all baptized unto Moses in the cloud and in the sea;3 and did all eat the same spiritual food;4 and did all drink the same spiritual drink: for they drank of a spiritual rock that followed them: and the rock was Christ.5 Howbeit with most of them God was not well pleased: for they were overthrown in the wilderness.6 Now these things were our examples, to the intent we should not lust after evil things, as they also lusted.7 Neither be ye idolaters, as were some of them; as it is written, The people sat down to eat and drink, and rose up to play.8 Neither let us commit fornication, as some of them committed, and fell in one day three and twenty thousand.9 Neither let us make trial of the Lord, as some of them made trial, and perished by the serpents.10 Neither murmur ye, as some of them murmured, and perished by the destroyer.11 Now these things happened unto them by way of example; and they were written for our admonition, upon whom the ends of the ages are come.12 Wherefore let him that thinketh he standeth take heed lest he fall.13 There hath no temptation taken you but such as man can bear: but God is faithful, who will not suffer you to be tempted above that ye are able; but will with the temptation make also the way of escape, that ye may be able to endure it.14 Wherefore, my beloved, flee from idolatry.15 I speak as to wise men; judge ye what I say.16 The cup of blessing which we bless, is it not a communion of the blood of Christ? The bread which we break, is it not a communion of the body of Christ?17 seeing that we, who are many, are one bread, one body: for we are all partake of the one bread.18 Behold Israel after the flesh: have not they that eat the sacrifices communion with the altar?19 What say I then? that a thing sacrificed to idols is anything, or that an idol is anything?20 But I say, that the things which the Gentiles sacrifice, they sacrifice to demons, and not to God: and I would not that ye should have communion with demons.21 Ye cannot drink the cup of the Lord, and the cup of demons: ye cannot partake of the table of the Lord, and of the table of demons.22 Or do we provoke the Lord to jealousy? are we stronger than he?23 All things are lawful; but not all things are expedient. All things are lawful; but not all things edify.24 Let no man seek his own, but each his neighbor’s good.25 Whatsoever is sold in the shambles, eat, asking no question for conscience’ sake,26 for the earth is the Lord’s, and the fulness thereof.27 If one of them that believe not biddeth you to a feast, and ye are disposed to go; whatsoever is set before you, eat, asking no question for conscience’ sake.28 But if any man say unto you, This hath been offered in sacrifice, eat not, for his sake that showed it, and for conscience sake:29 conscience, I say, not thine own, but the other’s; for why is my liberty judged by another conscience?30 If I partake with thankfulness, why am I evil spoken of for that for which I give thanks?31 Whether therefore ye eat, or drink, or whatsoever ye do, do all to the glory of God.32 Give no occasions of stumbling, either to Jews, or to Greeks, or to the church of God:33 even as I also please all men in all things, not seeking mine own profit, but the profit of the many, that they may be saved.