I. NDI KỌRINT 14
1 Nāb͕asonu ihu-n'anya; otú ọ di, werenu obi nānu ọku chọ onyinye-amara nile nke Mọ Nsọ, ma nāchọkarinu ka unu bū amuma. 2 N'ihi na onye ji asusu di iche nēkwu okwu, ọ dighi-agwa madu okwu, kama ọ nāgwa Chineke; n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nānu ihe ọ nēkwu; ma o ji mọ-ya nēkwu ihe-omimi. 3 Ma onye nēbu amuma nāgwa madu okwu nke iwuli-elu dika ulo, na nke nkasi-obi, na nke ngugu-obi. 4 Onye ji asusu di iche nēkwu okwu nēwuli onwe-ya elu dika ulo; ma onye nēbu amuma nēwuli nzukọ Kraist elu dika ulo. 5 Otú ọ di, anamachọ ka unu nile ji asusu di iche iche nēkwu okwu, ma achọkaririm ka unu nēbu amuma: onye nēbu amuma ka kwa onye ji asusu di iche iche nēkwu okwu, ma-ọbughi na ọ nāsughari ya, ka ewe wuli nzukọ Kraist elu dika ulo. 6 Ma otú ọ di, umu-nnam, asi na agamabiakute unu were asusu di iche iche nēkwu okwu, ùrù gini ka m'gābara unu, asi na agwaghi m unu okwu n'uzọ nkpughe, ma-ọbu n'uzọ ihe-ọmuma, ma-ọbu n'uzọ ibu-amuma, ma-ọbu n'uzọ ozizí? 7 Ọbuná ihe nējighi ndu, mb͕e olu-ha nāda udà, ma ọ bu ọ̀jà ma-ọbu ubọ-akwara, ọ buru na ọ dighi ihe di iche n'olu-ha, àgēsi aṅa mara ihe anāfù ma-ọbu nke anākpọ? 8 N'ihi na asi kwa na opì nāda nke anāmaghi isi-ya, ònye gākwadebe onwe-ya ije agha? 9 Otú a unu onwe-unu kwa, ma ọ buru na unu ejighi ire kwu okwu di nfe ighota, àgēsi aṅa mara ihe anēkwu? n'ihi na unu ganēkwu okwu nye ifufe. 10 Agāsi na ọtutu aha olu di iche iche di n'uwa, ọ dighi kwa ihe ọ bula nke nēnweghi olu. 11 Ya mere asi na amataghm isi olu ahu, m'gābu onye nāsu asusu ọzọ n'anya onye ahu nēkwu okwu, onye ahu nēkwu okwu gābu kwa onye nāsu asusu ọzọ n'anyam. 12 Otú a unu onwe-unu kwa, ebe unu bu ndi nēwere obi nānu ọku chọ onyinye nile nke Mọ Nsọ, nāchọnu ka unu we babiga ókè nime ha, ka ewe wuli nzukọ Kraist elu dika ulo. 13 N'ihi nka onye ji asusu di iche nēkwu okwu, ya kpere Chineke ka o we sugharia. 14 N'ihi na asi na ejim asusu di iche nēkpe ekpere, mọm nēkpe ekpere, ma uchem amighi nkpuru. 15 Ọ̀ bu gini kwa? m'gēji mọm kpe ekpere, ma m'gēji kwa uchem kpe ekpere: m'gēji mọm bù abù ọma, ma m'gēji kwa uchem bù abù ọma. 16 Ma emeghi otú a, onye nọ n'ọnọdu onye nāmutaghi akwukwọ gēsi aṅa si Amen ahu mb͕e i nēkele ekele, ma ọ buru na i ji mọ-gi nāgọzi, ebe ọ nāmataghi ihe ọ bula i nēkwu? 17 N'ihi na ọ bu ezie na gi onwe-gi nēkele nke-ọma, ma ewulighi ibe-gi elu dika ulo. 18 Ekelem Chineke, na ejim asusu di iche iche nēkwu okwu kari unu nile:
19 otú ọ di, nime nzukọ Kraist anamachọ ka m'ji uchem kwu nkpuru okwu ise, ka m'were okwu-ọnum zí kwa ndi ọzọ ihe, kari ikwu orú nnù okwu na nnù ise n'asusu di iche.
20 Umu-nnam, unu abula umu-ntakiri n'uche-unu: kama burunu umu ọhu n'obi ọjọ, ma n'uche-unu burunu ndi tozuru okè. 21 Nime iwu Chineke ka edeworo ya, si, M'gēji madu ndi nāsu asusu di iche, ji kwa eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi di iche, gwa ndi nka okwu; ma ọbuná otú a ha agaghi-anu olum, ka Onye-nwe-ayi kwuru. 22 Ya mere asusu di iche iche ndia, emere ka ha buru ihe-iriba-ama, ọ bughi nye ndi kwere ekwe, kama nye ndi nēkweghi ekwe: ma emere ibu-amuma ka ọ buru ihe-iriba-ama, ọ bughi nye ndi nēkweghi ekwe, kama nye ndi kwere ekwe. 23 Ya mere asi na nzukọ Kraist dum biakọrọ n'otù ebe, asi kwa na ha nile ji asusu di iche iche nēkwu okwu, ma ọ buru na ndi nāmutaghi akwukwọ ma-ọbu ndi nēkweghi ekwe gābata, hà agaghi-asi na anya adighi unu nma? 24 Ma asi na ha nile ebu amuma, ma ọ buru na onye nēkweghi ekwe ma-ọbu onye nāmutaghi akwukwọ gābata, ha nile nātu ya nmehie-ya n'anya, ha nile nēkpe kwa ya ikpé;
25 ihe-nzuzo nile nke obi-ya aputa ìhè; ọ gēsi otú a da kpuchie iru-ya n'ala kpọ kwa isi ala nye Chineke, nēkwuputa na ọ bu ezie na Chineke nọ n'etiti unu.
26 Ọ̀ bu gini kwa, umu-nnam? mb͕e ọ bula unu biakọrọ n'otù ebe, unu nile n'otù n'otù ji abù ọma, ji ihe-ozizí, ji ihe-nkpughe, ji asusu di iche, ji isughari-asusu. Ka eme ihe nile ka ewe wuli madu nile elu dika ulo. 27 Ọ buru na onye ọ bula eji asusu di iche nēkwu okwu, ka ọ buru ihe ra ka madu abua gēkwu, ma ka ha ghara ika madu atọ, ka ha kwu kwa n'usoro; ka otù onye sughari kwa: 28 ma asi na ọ dighi onye nāsughari asusu nọ n'etiti unu, ya kpuchie ọnu-ya nime nzukọ Kraist; ya gwa onwe-ya na Chineke okwu. 29 Ka ndi-amuma kwu kwa okwu, madu abua ma-ọbu madu atọ, ka ndi ọzọ tule kwa. 30 Ma asi na ekpughere onye ọzọ nke nọdu n'akuku ya ihe, ka onye mbu kpuchie ọnu-ya. 31 N'ihi na unu nile puru ibu amuma n'otù n'otù, ka madu nile we muta ihe, ka ewe kasi kwa madu nile obi; 32 anēdo kwa mọ nile nke ndi-amuma n'okpuru ndi-amuma;
33 n'ihi na Chineke abughi Chineke nke aghara, kama Ọ bu Chineke nke udo; otú ọ di nime nzukọ nile nke ndi nsọ.
34 Ka ndinyom-unu kpuchie ọnu-ha nime nzukọ-unu: n'ihi na ekweghi ha ka ha kwue okwu; kama ka ha do onwe-ha n'okpuru ike, dika iwu Chineke nēkwu kwa. 35 Ọ buru kwa na ha nāchọ imuta ihe ọ bula, ka ha jua di nke aka ha n'ulo: n'ihi na ọ bu ihe-ihere ka nwanyi kwue okwu nime nzukọ Kraist.
36 Ọ̀ gābu na okwu Chineke si n'ebe unu nọ puta? ma-ọbu ò ruru nání unu?
37 Ọ buru na onye ọ bula nēchè na ya bu onye-amuma, ma-ọbu onye nwere onyinye Mọ Nsọ, ya mazu ihe m'nēdegara unu n'akwukwọ, na ha bu ihe Onye-nwe-ayi nyere n'iwu.
38 Ma ọ buru na onye ọ bula amaghi ihe ndia, ọ bu onye anāmaghi ama.
39 Ya mere, umu-nnam, werenu obi nānu ọku chọ ka unu bu amuma, unu eb͕ochi-kwa-la iji asusu di iche iche nēkwu okwu. 40 Ma ka eme ihe nile n'uzọ di nma n'anya, na n'usoro.
1 Corinthians 14
1 Follow after love; yet desire earnestly spiritual gifts, but rather that ye may prophesy.2 For he that speaketh in a tongue speaketh not unto men, but unto God; for no man understandeth; but in the spirit he speaketh mysteries.3 But he that prophesieth speaketh unto men edification, and exhortation, and consolation.4 He that speaketh in a tongue edifieth himself; but he that prophesieth edifieth the church.5 Now I would have you all speak with tongues, but rather that ye should prophesy: and greater is he that prophesieth than he that speaketh with tongues, except he interpret, that the church may receive edifying.6 But now, brethren, if I come unto you speaking with tongues, what shall I profit you, unless I speak to you either by way of revelation, or of knowledge, or of prophesying, or of teaching?7 Even things without life, giving a voice, whether pipe or harp, if they give not a distinction in the sounds, how shall it be known what is piped or harped?8 For if the trumpet give an uncertain voice, who shall prepare himself for war?9 So also ye, unless ye utter by the tongue speech easy to be understood, how shall it be known what is spoken? for ye will be speaking into the air.10 There are, it may be, so many kinds of voices in the world, and no kind is without signification.11 If then I know not the meaning of the voice, I shall be to him that speaketh a barbarian, and he that speaketh will be a barbarian unto me.12 So also ye, since ye are zealous of spiritual gifts, seek that ye may abound unto the edifying of the church.13 Wherefore let him that speaketh in a tongue pray that he may interpret.14 For if I pray in a tongue, my spirit prayeth, but my understanding is unfruitful.15 What is it then? I will pray with the spirit, and I will pray with the understanding also: I will sing with the spirit, and I will sing with the understanding also.16 Else if thou bless with the spirit, how shall he that filleth the place of the unlearned say the Amen at thy giving of thanks, seeing he knoweth not what thou sayest?17 For thou verily givest thanks well, but the other is not edified.18 I thank God, I speak with tongues more than you all:19 howbeit in the church I had rather speak five words with my understanding, that I might instruct others also, than ten thousand words in a tongue.20 Brethren, be not children in mind: yet in malice be ye babes, but in mind be men.21 In the law it is written, By men of strange tongues and by the lips of strangers will I speak unto this people; and not even thus will they hear me, saith the Lord.22 Wherefore tongues are for a sign, not to them that believe, but to the unbelieving: but prophesying is for a sign, not to the unbelieving, but to them that believe.23 If therefore the whole church be assembled together and all speak with tongues, and there come in men unlearned or unbelieving, will they not say that ye are mad?24 But if all prophesy, and there come in one unbelieving or unlearned, he is reproved by all, he is judged by all;25 the secrets of his heart are made manifest; and so he will fall down on his face and worship God, declaring that God is among you indeed.26 What is it then, brethren? When ye come together, each one hath a psalm, hath a teaching, hath a revelation, hath a tongue, hath an interpretation. Let all things be done unto edifying.27 If any man speaketh in a tongue, let it be by two, or at the most three, and that in turn; and let one interpret:28 but if there be no interpreter, let him keep silence in the church; and let him speak to himself, and to God.29 And let the prophets speak by two or three, and let the others discern.30 But if a revelation be made to another sitting by, let the first keep silence.31 For ye all can prophesy one by one, that all may learn, and all may be exhorted;32 and the spirits of the prophets are subject to the prophets;33 for God is not a God of confusion, but of peace. As in all the churches of the saints,34 let the women keep silence in the churches: for it is not permitted unto them to speak; but let them be in subjection, as also saith the law.35 And if they would learn anything, let them ask their own husbands at home: for it is shameful for a woman to speak in the church.36 What? was it from you that the word of God went forth? or came it unto you alone?37 If any man thinketh himself to be a prophet, or spiritual, let him take knowledge of the things which I write unto you, that they are the commandment of the Lord.38 But if any man is ignorant, let him be ignorant.39 Wherefore, my brethren, desire earnestly to prophesy, and forbid not to speak with tongues.40 But let all things be done decently and in order.