previous next

I. NDI KỌRINT 2

1 Mu onwem kwa, umu-nnam, mb͕e m'biakutere unu, abiaghm n'ọ̀kà okwu ma-ọbu n'ọ̀kà amam-ihe, nēkwusara unu àmà nke Chineke. 2 N'ihi na ezuberem ka m'ghara imata ihe ọ bula n'etiti unu, ma-ọbughi Jisus Kraist, ka m'mata kwa Onye ahu ka onye akpọgideworo n'obe. 3 Mu onwem nọ kwa n'etiti unu n'adighi-ike, na n'egwu, na n'oké ima-jijiji. 4 Okwum na ihe m'kwusara abughi kwa n'okwu amam-ihe, ime ka madu kweye, kama ha bu na ngosi nke Mọ Nsọ na nke ike:

5 ka okwukwe-unu we ghara idi n'amam-ihe madu, kama n'ike nke Chineke.
6 Otú ọ di, amam-ihe bu ihe ayi nēkwu n'etiti ndi tozuru okè: ma ọ bu amam-ihe nke nābughi nke oge a, ọ bughi kwa nke ndi-isi oge a, ndi anēme ka ha ghara idi irè: 7 kama ihe ayi nēkwu bu amam-ihe Chineke n'ihe-omimi, bú amam-ihe nke ezobeworo, nke Chineke buru uzọ ka àkà mb͕e oge ndia akērughi, iwetara ayi otuto: 8 nke ọ dighi onye ọ bula n'etiti ndi-isi oge a mara: n'ihi na asi na ha mara ya-ri, ha agaghi-akpọgidewori Onye-nwe ebube n'obe:

9 kama dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si,
Ihe anya nāhughi, nke nti nānughi kwa,
Nke nābàghi kwa n'obi madu,
Ka ha ra, bú ihe Chineke doziri ndi huru Ya n'anya.
10 Ma ọ bu ayi onwe-ayi ka Chineke kpughere ha site n'aka Mọ Nsọ: n'ihi na Mọ Nsọ nēnyocha ihe nile, ọbuná ihe nile di omimi nke Chineke. 11 N'ihi na ònye n'etiti madu matara ihe nile nke madu, ma-ọbughi mọ nke madu ahu, nke di nime ya? ọbuná otú a ọ dighi onye mara ihe nke Chineke, ma-ọbughi Mọ nke Chineke. 12 Ma ayi onwe-ayi anataghi mọ nke uwa, kama ọ bu Mọ Nke sitere na Chineke; ka ayi we mata ihe nile Chineke were amara nye ayi. 13 Ọ bu kwa ihe ndia ka ayi nēkwu, ọ bughi n'okwu nke amam-ihe madu nēzí, kama n'okwu nke Mọ Nsọ nēzí; ayi nēwere kwa ihe nke Mọ Nsọ tule ihe nke Mọ Nsọ. 14 Ma madu nke nkpuru-obi onwe-ya nāchi adighi-anata ihe nke Mọ nke Chineke: n'ihi na ha bu ihe-nzuzu n'anya-ya; ọ pughi kwa imara ha, n'ihi na ewere Mọ Nsọ sikwuputa ha. 15 Ma onye Mọ Nsọ nāchi nēsikwuputa ihe nile, ma ọ dighi onye ọ bula nēsikwuputa ya onwe-ya. 16 N'ihi na ònye mara uche Onye-nwe-ayi, ka o zí Ya ihe? Ma ayi onwe-ayi nwere uche nke Kraist.

1 Corinthians 2

1 And I, brethren, when I came unto you, came not with excellency of speech or of wisdom, proclaiming to you the testimony of God.2 For I determined not to know anything among you, save Jesus Christ, and him crucified.3 And I was with you in weakness, and in fear, and in much trembling.4 And my speech and my preaching were not in persuasive words of wisdom, but in demonstration of the Spirit and of power:5 that your faith should not stand in the wisdom of men, but in the power of God.6 We speak wisdom, however, among them that are fullgrown: yet a wisdom not of this world, nor of the rulers of this world, who are coming to nought:7 but we speak God’s wisdom in a mystery, even the wisdom that hath been hidden, which God foreordained before the worlds unto our glory:8 which none of the rulers of this world hath known: for had they known it, they would not have crucified the Lord of glory:9 but as it is written, Things which eye saw not, and ear heard not, And which entered not into the heart of man, Whatsoever things God prepared for them that love him.

10 But unto us God revealed them through the Spirit: for the Spirit searcheth all things, yea, the deep things of God.11 For who among men knoweth the things of a man, save the spirit of the man, which is in him? even so the things of God none knoweth, save the Spirit of God.12 But we received, not the spirit of the world, but the spirit which is from God; that we might know the things that were freely given to us of God.13 Which things also we speak, not in words which man’s wisdom teacheth, but which the Spirit teacheth; combining spiritual things with spiritual words.14 Now the natural man receiveth not the things of the Spirit of God: for they are foolishness unto him; and he cannot know them, because they are spiritually judged.15 But he that is spiritual judgeth all things, and he himself is judged of no man.16 For who hath known the mind of the Lord, that he should instruct him? But we have the mind of Christ.