previous next

I. NDI KỌRINT 3

1 Mu onwem kwa, umu-nnam, apughi m igwa unu okwu dika ndi Mọ Nsọ nāchi, kama dika ndi bu nání anu-aru, dika umu ọhu nime Kraist. 2 Ejirim ara zù unu, ọ bughi ihe-oriri; n'ihi na unu akāpughi inagide ya; é-è, ọbuná ub͕u a unu apughi; 3 n'ihi na unu bu ndi anu-aru nāchi rue ub͕u a: n'ihi na ebe ekworo na esem-okwu di n'etiti unu, ùnu abughi ndi anu-aru nāchi, ndi nējeghari kwa dika madu? 4 N'ihi na mb͕e ọ bula otù onye nāsi, Mu onwem bu nke Pọl; mb͕e ibe-ya nāsi kwa, Mu onwem bu nke Apọlos; ùnu abughi madu efu? 5 Gini kwa bu Apọlos? gini bu kwa Pọl? Ndi nēje ozi, ndi unu si n'aka-ha kwere; dika Onye-nwe-ayi nye-kwa-ra ha abua n'otù n'otù. 6 Mu onwem kuru osisi, Apọlos kwọsara ya miri; ma ọ bu Chineke nēme ka ọ nāba uba. 7 Ya mere onye nāku abughi ihe ọ bula, onye nākwọsa miri abughi kwa ihe ọ bula; kama Chineke, Onye nēme ka ọ nāba uba, bu ihe nile. 8 Ma onye nāku na onye nākwọsa miri bu otù: ma ha abua n'otù n'otù gānata ugwọ-ọlu nke aka ha, onye ọ bula dika ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu si di.

9 N'ihi na ayi bu ndi ha na Chineke nālukọ ọlu: unu bu ubi Chineke, buru kwa ulo Chineke nēwu.
10 Dika amara Chineke nke enyerem si di, dika onye-isi-ọ̀kà nke mara ihe, atọrọm ntọ-ala; onye ọzọ nēwu kwa ulo n'elu ya. Ma ka onye ọ bula lezi anya otú ọ nēwu ulo n'elu ya. 11 N'ihi na ọ dighi onye ọ bula puru itọ ntọ-ala ọzọ ma-ọbughi Nke atọworo, Nke bu Jisus Kraist. 12 Ma ọ buru na onye ọ bula ewukwasi ọla-edo, ọla-ọcha, nkume di oké ọnu, osisi, ahihia, okporo-ọka, n'elu ntọ-ala ahu; 13 agēme ka ọlu nke madu nile n'otù n'otù puta ìhè: n'ihi na ubọchi ahu gēgosi ya, n'ihi na agaje ikpughe ya n'ọku; ọku onwe-ya gānwa kwa ọlu madu nile n'otù n'otù, aha ọlu ọ bu. 14 Ọ buru na ọlu onye ọ bula gādigide nke o wukwasiri ya, ọ gānata ugwọ-ọlu.

15 Ọ buru na agērechapu ọlu onye ọ bula n'ọku, ọ gēyi iyì: ma agāzọputa ya onwe-ya; ma ọ bu dika onye azọputara n'ọku.
16 Ùnu amataghi na unu bu ulo nsọ Chineke, Mọ nke Chineke bi kwa nime unu?

17 Ọ buru na onye ọ bula emebi ulo nsọ Chineke, onye ahu ka Chineke gēmebi; n'ihi na ulo nsọ Chineke di nsọ, otú a ka unu di kwa.
18 Ka onye ọ bula ghara ighọb͕u onwe-ya. Ọ buru na onye ọ bula nēchè na ya bu onye mara ihe n'etiti unu n'oge a, ya ghọ onye-nzuzu, ka o we ghọ onye mara ihe. 19 N'ihi na amam-ihe nke uwa nka bu ihe-nzuzu n'ebe Chineke nọ. N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye nējide ndi mara ihe n'aghughọ-ha: 20 ọzọ kwa, Onye-nwe-ayi mara ihe ndi mara ihe nātule n'obi-ha, na ha bu ihe-efu. 21 Ya mere onye ọ bula anyala isi na madu. N'ihi na ihe nile bu nke unu; 22 ma ọ bu Pọl, ma-ọbu Apọlos, ma-ọbu Kifas, ma-ọbu uwa, ma-ọbu ndu ma-ọbu ọnwu, ma-ọbu ihe di ub͕u a, ma-ọbu ihe gaje idi; ihe nile bu nke unu; 23 ma unu onwe-unu bu ndi nke Kraist; ma Kraist bu nke Chineke.

1 Corinthians 3

1 And I, brethren, could not speak unto you as unto spiritual, but as unto carnal, as unto babes in Christ.2 I fed you with milk, not with meat; for ye were not yet able to bear it: nay, not even now are ye able;3 for ye are yet carnal: for whereas there is among you jealousy and strife, are ye not carnal, and do ye not walk after the manner of men?4 For when one saith, I am of Paul; and another, I am of Apollos; are ye not men?5 What then is Apollos? and what is Paul? Ministers through whom ye believed; and each as the Lord gave to him.6 I planted, Apollos watered; but God gave the increase.7 So then neither is he that planteth anything, neither he that watereth; but God that giveth the increase.8 Now he that planteth and he that watereth are one: but each shall receive his own reward according to his own labor.9 For we are God’s fellow-workers: ye are God’s husbandry, God’s building.10 According to the grace of God which was given unto me, as a wise masterbuilder I laid a foundation; and another buildeth thereon. But let each man take heed how he buildeth thereon.11 For other foundation can no man lay than that which is laid, which is Jesus Christ.12 But if any man buildeth on the foundation gold, silver, costly stones, wood, hay, stubble;13 each man’s work shall be made manifest: for the day shall declare it, because it is revealed in fire; and the fire itself shall prove each man’s work of what sort it is.14 If any man’s work shall abide which he built thereon, he shall receive a reward.15 If any man’s work shall be burned, he shall suffer loss: but he himself shall be saved; yet so as through fire.16 Know ye not that ye are a temple of God, and that the Spirit of God dwelleth in you?17 If any man destroyeth the temple of God, him shall God destroy; for the temple of God is holy, and such are ye.18 Let no man deceive himself. If any man thinketh that he is wise among you in this world, let him become a fool, that he may become wise.19 For the wisdom of this world is foolishness with God. For it is written, He that taketh the wise in their craftiness:20 and again, The Lord knoweth the reasonings of the wise that they are vain.21 Wherefore let no one glory in men. For all things are yours;22 whether Paul, or Apollos, or Cephas, or the world, or life, or death, or things present, or things to come; all are yours;23 and ye are Christ’s; and Christ is God’s.