I. NDI KỌRINT 4
1 Ka madu nāgu ayi otú a, dika ndi nējere Kraist ozi, ndi bu kwa ndi nāchi èzí-na-ulo n'ihe-omimi nke Chineke. 2 N'ebe a ihe anāchọ kwa n'aka ndi nāchi èzí-na-ulo bu, ka ahu onye ọ bula na o kwesiri ntukwasi-obi. 3 Ma ọ burum ihe dikarisiri ntà ka unu, ma-ọbu ubọchi ikpé nke madu, kpem ikpé: é-è, ekpeghi m ọbuná onwem ikpé. 4 N'ihi na ọ dighi ihe ọ bula m'mara megide onwem; ma ọ bughi na nka ka aguworom n'onye ezi omume: kama Onye nēkpem ikpé bu Onye-nwe-ayi.
5 Ya mere, unu ekpela ihe ọ bula ikpé mb͕e oge ahu akērughi, rue mb͕e ọ bula Onye-nwe-ayi gābia, Onye gēweputa kwa ihe nile ezoro ezo nke ọchichiri n'ìhè, me kwa ka ìzù nile nke obi nile puta ìhè; mb͕e ahu ka madu nile n'otù n'otù gēnwe kwa otuto-ha site n'aka Chineke.
6 Ma ihe ndia, umu-nnam, ka m'mere ka ha ghọ mu onwem na Apọlos n'oyiyi n'ihi unu; ka unu we muta nime ayi ozizì a, Unu agabigala ihe edeworo n'akwukwọ, ka unu we ghara ifuli onwe-unu elu, otù onye n'ihi otù onye megide madu-ibe-ya. 7 N'ihi na Ònye nākpa ókè n'etiti gi na madu-ibe-gi? ọ̀ bu gini kwa ka i nwere nke i nānataghi? ma ọ buru na i natara ya, gini mere i nānya isi, dika agāsi na i nataghi ya? 8 Ọbuná ub͕u a unu erijuwo afọ, ọbuná ub͕u a unu ghọrọ ọgaranya, unu buru eze mb͕e ayi onwe-ayi nānọghi ya: e, ọ gādim nọ̄ mma, ma asi na unu buru eze n'ezie, ka ayi onwe-ayi we so kwa unu buru eze. 9 N'ihi na anamechè na Chineke were ayi, bú ndi-ozi, gosi, dika ndi-ikpe-azu, dika ndi amara ikpé ọnwu: n'ihi na emere ayi ihe-nkiri nye uwa na ndi-mọ-ozi na madu. 10 Ayi onwe-ayi bu ndi-nzuzu n'ihi Kraist, ma unu onwe-unu bu ndi nwere uche nime Kraist; ayi onwe-ayi adighi ike, ma unu onwe-unu di ike; anēnye unu onwe-unu otuto, ma anēme ayi onwe-ayi ihe-ihere. 11 We rue oge hour di ub͕u a agu nāgu ayi, akpiri nākpọ kwa ayi nku, ayi nāb͕a kwa ọtọ, anēti kwa ayi aka, ayi enweghi kwa ebe-obibi; 12 ayi nādọb͕u kwa onwe-ayi n'ọlu, were aka-ayi nālu ọlu: mb͕e anēkwutọ ayi, ayi nāgọzi: mb͕e anēsob͕u ayi, ayi nānagide:
13 mb͕e anēkwulu ayi, ayi nāriọ aririọ; emere ka ayi buru dika ihe asachapuru n'uwa, ihe ehichapuru n'ihe nile, rue ub͕u a.
14 Edeghi m ihe ndia n'akwukwọ dika anameme unu ihe-ihere n'iru, kama dika anamadu unu ọdú, dika umum m'huru n'anya. 15 N'ihi na asi na unu nwere orú nnù ndi-ozizí na nnù ndi-ozizí ise nime Kraist, ma unu enweghi ọtutu nna: n'ihi na mu onwem nime Kraist Jisus were ozi ọma mu unu. 16 Ya mere ariọm unu, burunu ndi nēṅomim. 17 N'ihi nka ka m'zitere unu Timọti, onye bu nwam nime Onye-nwe-ayi, buru kwa onye m'huru n'anya, onye kwesiri ntukwasi-obi, ọ gēchetara unu uzọm nile nke di nime Kraist, dika m'nēzí n'ebe nile na nzukọ Kraist nile ọ bula. 18 Ma ufọdu fuliri onwe-ha elu, dika agāsi na m'gaghi-abiakute unu. 19 Ma m'gābiakute unu ọsọsọ, ma ọ buru na Onye-nwe-ayi chọrọ; m'gāmara kwa, ọ bughi okwu nke ndi fuliworo onwe-ha, kama ike-ha. 20 N'ihi na ala-eze Chineke adighi n'okwu-ọnu, kama n'ike. 21 Gini ka unu nāchọ? ọ̀ bu utari ka m'gēwere biakute unu, ma-ọbu ihu-n'anya na mọ nke idi-nwayọ?
1 Corinthians 4
1 Let a man so account of us, as of ministers of Christ, and stewards of the mysteries of God.2 Here, moreover, it is required in stewards, that a man be found faithful.3 But with me it is a very small thing that I should be judged of you, or of man’s judgment: yea, I judge not mine own self.4 For I know nothing against myself; yet am I not hereby justified: but he that judgeth me is the Lord.5 Wherefore judge nothing before the time, until the Lord come, who will both bring to light the hidden things of darkness, and make manifest the counsels of the hearts; and then shall each man have his praise from God.6 Now these things, brethren, I have in a figure transferred to myself and Apollos for your sakes; that in us ye might learn not to go beyond the things which are written; that no one of you be puffed up for the one against the other.7 For who maketh thee to differ? and what hast thou that thou didst not receive? but if thou didst receive it, why dost thou glory as if thou hadst not received it?8 Already are ye filled, already ye are become rich, ye have come to reign without us: yea and I would that ye did reign, that we also might reign with you.9 For, I think, God hath set forth us the apostles last of all, as men doomed to death: for we are made a spectacle unto the world, both to angels and men.10 We are fools for Christ’s sake, but ye are wise in Christ; we are weak, but ye are strong; ye have glory, but we have dishonor.11 Even unto this present hour we both hunger, and thirst, and are naked, and are buffeted, and have no certain dwelling-place;12 and we toil, working with our own hands: being reviled, we bless; being persecuted, we endure;13 being defamed, we entreat: we are made as the filth of the world, the offscouring of all things, even until now.14 I write not these things to shame you, but to admonish you as my beloved children.15 For though ye have ten thousand tutors in Christ, yet have ye not many fathers; for in Christ Jesus I begat you through the gospel.16 I beseech you therefore, be ye imitators of me.17 For this cause have I sent unto you Timothy, who is my beloved and faithful child in the Lord, who shall put you in remembrance of my ways which are in Christ, even as I teach everywhere in every church.18 Now some are puffed up, as though I were not coming to you.19 But I will come to you shortly, if the Lord will; and I will know, not the word of them that are puffed up, but the power.20 For the kingdom of God is not in word, but in power.21 What will ye? shall I come unto you with a rod, or in love and a spirit of gentleness?