previous next

I. NDI KỌRINT 6

1 Ọ̀ di onye ọ bula n'etiti unu, ma asi na o nwere okwu megide ibe-ya, nwere anya-ike ije ikpé n'iru ndi ajọ omume, ma ọ bughi n'iru ndi nsọ? 2 Ma-ọbu ùnu amataghi na ndi nsọ gēkpe uwa ikpé? ọ buru kwa na agaje ikpe uwa n'iru unu, ùnu ekwesighi inọ dika ndi-ikpé n'ulo-ikpé dikarisiri ntà? 3 Ùnu amataghi na ayi gēkpe ndi-mọ-ozi ikpé? àyi gēsi aṅa ghara inwe ike ikpe ihe nke ndu a? 4 Ya mere asi na unu nwere ulo-ikpé diri ndu a n'ezie, menu ka ndi ahu nọdu dika ndi-ikpé, bú ndi anākpọ ihe-efu n'etiti nzukọ Kraist. 5 Anamekwu nka ka m'me unu ihe-ihere n'iru. Ọ̀ di otú a, na ọ dighi otù onye mara ihe nọ n'etiti unu, onye gāpu ikpe ikpé n'etiti nwa-nna-ya na ibe-ya, 6 kama nwa-nna nēwere nwa-nna-ya je ikpé, nka bu kwa n'iru ndi nēkweghi ekwe? 7 Ezie ọ bu nọ̄ ila-ala n'ebe unu nọ ọbuná ub͕u a, na unu nwere okwu ikpé n'etiti onwe-unu. Kari nke ahu, n'ìhi gini unu adighi-ekwe ka emegide unu ajọ omume? kari nke ahu, n'ìhi gini unu adighi-ekwe ka emeb͕ue unu? 8 É-è, kama unu onwe-unu nēme ajọ omume, nēmeb͕u kwa, nka ka unu nēme kwa umu-nna-unu. 9 Ma-ọbu ùnu amataghi na ndi ajọ omume agaghi-eketa ala-eze Chineke? Unu ekwela ka eduhie unu: ndi nākwa iko, ma-ọbu ndi nēkpere arusi, ma-ọbu ndikom nākwa iko, bú ndi nwere nwunye, ma-ọbu ndikom nēme dika ndinyom, ma-ọbu ndikom nēmeru onwe-ha n'aru ndikom, 10 ma-ọbu ndi-ori, ma-ọbu ndi-anya-uku, ma-ọbu ndi nāṅubiga manya ókè, ma-ọbu ndi-nkwutọ, ma-ọbu ndi nāpunara madu ihe, ha agaghi-eketa ala-eze Chineke.

11 Otú a ka ufọdu n'etiti unu di-kwa-ri: ma unu sachara onwe-unu, ma edoro unu nsọ, ma aguru unu na ndi ezi omume n'aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ya na nime Mọ nke Chineke-ayi.
12 Ihe nile zirim ezi n'iwu; ma ọ bughi ihe nile nābaram urù. Ihe nile zirim ezi n'iwu; ma ọ dighi ihe ọ bula gāchi mu onwem. 13 Ihe-oriri nile diri afọ, afọ di-kwa-ra ihe-oriri nile: ma Chineke gēme ka ya na ha ghara idi irè. Ma aru-ayi adirighi ikwa-iko, kama ọ diri Onye-nwe-ayi; Onye-nwe-ayi di-kwa-ra aru-ayi: 14 ma Chineke mere ka Onye-nwe-ayi si n'ọnwu bilie, Ọ gēsite kwa n'ike-Ya me ka ayi onwe-ayi si n'ọnwu bilie. 15 Ùnu amataghi na aru-unu bu ihe di n'aru Kraist? #m'gēwepu kwa ihe di n'aru Kraist, me ha ka ha buru ihe di n'aru nwanyi nākwa iko? Chineke ekwela. 16 Ma-ọbu ùnu amataghi na onye nārapara n'aru nwanyi nke nākwa iko, ya na ya bu otù aru? n'ihi na, Ha abua ka O kwuru, gāghọ otù anu-aru. 17 Ma onye nārapara n'aru Onye-nwe-ayi, ya na Ya bu otù mọ. 18 B͕anarinu ikwa-iko. Nmehie nile ọ bula nke madu nēme di n'elu aru; ma onye nākwa iko nēmehie megide aru nke onwe-ya. 19 Ma-ọbu ùnu amataghi na aru-unu bu ulo nsọ nke Mọ Nsọ, Onye bi nime unu, Onye unu nwere site na Chineke? ọ bughi kwa unu onwe-unu nwe onwe-unu; 20 n'ihi na ewere ọnu-ahia b͕ara unu: ya mere nyenu Chineke otuto n'aru-unu.

1 Corinthians 6

1 Dare any of you, having a matter against his neighbor, go to law before the unrighteous, and not before the saints?2 Or know ye not that the saints shall judge the world? and if the world is judged by you, are ye unworthy to judge the smallest matters?3 Know ye not that we shall judge angels? how much more, things that pertain to this life?4 If then ye have to judge things pertaining to this life, do ye set them to judge who are of no account in the church?5 I say this to move you to shame. What, cannot there be found among you one wise man who shall be able to decide between his brethren,6 but brother goeth to law with brother, and that before unbelievers?7 Nay, already it is altogether a defect in you, that ye have lawsuits one with another. Why not rather take wrong? why not rather be defrauded?8 Nay, but ye yourselves do wrong, and defraud, and that your brethren.9 Or know ye not that the unrighteous shall not inherit the kingdom of God? Be not deceived: neither fornicators, nor idolaters, nor adulterers, nor effeminate, nor abusers of themselves with men,10 nor thieves, nor covetous, nor drunkards, nor revilers, nor extortioners, shall inherit the kingdom of God.11 And such were some of you: but ye were washed, but ye were sanctified, but ye were justified in the name of the Lord Jesus Christ, and in the Spirit of our God.12 All things are lawful for me; but not all things are expedient. All things are lawful for me; but I will not be brought under the power of any.13 Meats for the belly, and the belly for meats: but God shall bring to nought both it and them. But the body is not for fornication, but for the Lord; and the Lord for the body:14 and God both raised the Lord, and will raise up as through his power.15 Know ye not that your bodies are members of Christ? shall I then take away the members of Christ, and make them members of a harlot? God forbid.16 Or know ye not that he that is joined to a harlot is one body? for, The twain, saith he, shall become one flesh.17 But he that is joined unto the Lord is one spirit.18 Flee fornication. Every sin that a man doeth is without the body; but he that committeth fornication sinneth against his own body.19 Or know ye not that your body is a temple of the Holy Spirit which is in you, which ye have from God? and ye are not your own;20 for ye were bought with a price: glorify God therefore in your body.