previous next

I. PITA 3

1 Otú ahu, ndi bu nwunye, nēdonu onwe-unu n'okpuru di nke aka unu; ka, ọbuná asi na ufọdu ekweyeghi okwu Chineke, ka ewe site n'ibi-obi nwunye-ha rita ha n'urù n'ebe anēkwughi okwu; 2 mb͕e ha nēle ibi-obi-unu di ọcha, ya na egwu. 3 Ndi ichọ-nma-ha ka ọ ghara ibu ichọ-nma ahu nke aru nke bu ikpa isi, na iyikwasi ihe ọla-edo, ma-ọbu iyikwasi ọtutu uwe; 4 kama ka ọ buru madu zoro ezo nke nkpuru-obi, n'uwe anāpughi imebi nke bu mọ di nwayọ di kwa udo, nke di oké ọnu-ahia n'anya Chineke. 5 N'ihi na otú a ka ndinyom ahu ndi di nsọ, ndi nēle anya Chineke, nāchọ kwa onwe-ha nma n'oge gara aga, nēdo onwe-ha n'okpuru di nke aka ha:

6 dika Sera ṅara Abraham nti, nākpọ ya onye-nwe-ya: onye emere unu ka unu buru umu-ya, ma ọ buru na unu eme ezi ihe, ghara kwa itu egwu site n'ujọ ọ bula.

7 Ndi bu di, otú ahu, sonu nwunye-unu bikọ n'uzọ ihe-omuma, nēkeye ihe bu nwanyi nsọpuru, dika onye nādighi ike kari, dika unu na ha bu kwa ndi nēketakọ amara nke bu ndu; ka ewe ghara ib͕ochi ekpere-unu.
8 Ma n'ikpe-azu, nwekọnu otù uche, unu nile, werenu obi sorita onwe-unu hukọ ahuhu, burunu ndi nāhu umu-nna-unu n'anya, ndi nwere obi ọmiko, ndi nwere uche di ume-ala: 9 ndi nādighi-ewere ihe ọjọ nyeghachi n'ọnọdu ihe ọjọ, ma-ọbu nkwutọ n'ọnọdu nkwutọ; ma kama nke ahu burunu ndi nāgọzi; n'ihi na ihe eji kpọ unu bu nka, ka unu we keta ngọzi.

10 N'ihi na,
Onye ahu nke nāchọ ihu ndu n'anya,
Na ihu ezi ubọchi,
Ya me ka ire-ya ghara ikwu ihe ọjọ,
Me kwa ka eb͕ub͕ere-ọnu-ya ghara ikwu okwu aghughọ:

11 Ya si kwa n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya, me ezi ihe;
Ya chọ udo, b͕aso kwa ya.

12 N'ihi na anya abua nke Onye-nwe-ayi di n'aru ndi ezi omume,
Nti-Ya abua di kwa n'ebe aririọ-ha di:
Ma iru nke Onye-nwe-ayi digidere ndi nēme ihe ọjọ.
13 Ọ̀nye bu kwa onye ahu nke gēmejọ unu, ma o buru na unu ghọro ndi nānu ọku n'obi n'iso ezi ihe? 14 Ma ọ buru kwa na unu ahu ahuhu n'ihi ezi omume, ngọzi nādiri unu: ma unu atula egwu ahu ha nākpata, obi alọ-kwa-la unu miri; 15 kama donu Kraist-ayi nsọ nime obi-unu dika Onye-nwe-unu: buru-kwa-nu ndi edoziworo mb͕e dum igọpuru onye ọ bula nke nāju unu ajuju bayere olile-anya ahu nke di nime unu, ma ka unu were nwayọ na egwu gọpu: 16 ebe unu nwere ezi akọ-na-uche; ka ewe me ka ihere me ha, bú ndi nākpali ibi-obi ọma unu nime Kraist, nime ihe ahu nke anēkwutọ unu nime ya. 17 N'ihi na ọ ka nma, ma ọ buru na ọchichọ Chineke chọrọ ya, ka unu hu ahuhu n'ihi na unu nēme ezi ihe kama n'ihi na unu nēme ihe ọjọ. 18 N'ihi na Kraist hu-kwa-ra ahuhu bayere nmehie, nání otù mb͕e, Onye ezi omume n'ihi ndi ajọ omume, ka O we kuru ayi biakute Chineke; n'ihi na emere ka Ọ nwua anwu n'anu-aru-Ya, ma emere ka Ọ di ndu na mọ-Ya; 19 nke ọ bu kwa nime ya ka Ọ gara we kwusara ndi-mọ nọ n'ulọ-nkpọrọ okwu, 20 ndi nēkweyeghi n'oge gara aga, mb͕e ogologo-ntachi-obi Chineke nēchesi ike n'ubọchi Noa, mb͕e anēdozi ub͕o, nke ewere miri zọputa madu ole-na-ole, ya bu madu asatọ, nime ya: 21 bú miri nke nāzọputa kwa unu ub͕u a n'uzọ yiri ihe-atù a, ya bu baptism, ọ bughi itupu inyi nke aru, kama ọ bu ajuju nke ezi akọ-na-uche n'ebe Chineke nọ, site na nbilite-n'ọnwu nke Jisus Kraist; 22 Onye nọ n'aka-nri nke Chineke, ebe Ọ gara ba n'elu-igwe; edowo kwa ndi-mọ-ozi na ndi nāchi isi na ndi di ike n'okpuru Ya.

1 Peter 3

1 In like manner, ye wives, be in subjection to your own husbands; that, even if any obey not the word, they may without the word be gained by the behavior of their wives;2 beholding your chaste behavior coupled with fear.3 Whose adorning let it not be the outward adorning of braiding the hair, and of wearing jewels of gold, or of putting on apparel;4 but let it be the hidden man of the heart, in the incorruptible apparel of a meek and quiet spirit, which is in the sight of God of great price.5 For after this manner aforetime the holy women also, who hoped in God, adorned themselves, being in subjection to their own husbands:6 as Sarah obeyed Abraham, calling him lord: whose children ye now are, if ye do well, and are not put in fear by any terror.7 Ye husbands, in like manner, dwell with your wives according to knowledge, giving honor unto the woman, as unto the weaker vessel, as being also joint-heirs of the grace of life; to the end that your prayers be not hindered.8 Finally, be ye all likeminded, compassionate, loving as brethren, tenderhearted, humbleminded:9 not rendering evil for evil, or reviling for reviling; but contrariwise blessing; for hereunto were ye called, that ye should inherit a blessing.10 For, He that would love life, And see good days, Let him refrain his tongue from evil, And his lips that they speak no guile:

11 And let him turn away from evil, and do good; Let him seek peace, and pursue it.

12 For the eyes of the Lord are upon the righteous, And his ears unto their supplication: But the face of the Lord is upon them that do evil.

13 And who is he that will harm you, if ye be zealous of that which is good?14 But even if ye should suffer for righteousness’ sake, blessed are ye: and fear not their fear, neither be troubled;15 but sanctify in your hearts Christ as Lord: being ready always to give answer to every man that asketh you a reason concerning the hope that is in you, yet with meekness and fear:16 having a good conscience; that, wherein ye are spoken against, they may be put to shame who revile your good manner of life in Christ.17 For it is better, if the will of God should so will, that ye suffer for well-doing than for evil-doing.18 Because Christ also suffered for sins once, the righteous for the unrighteous, that he might bring us to God; being put to death in the flesh, but made alive in the spirit;19 in which also he went and preached unto the spirits in prison,20 that aforetime were disobedient, when the longsuffering of God waited in the days of Noah, while the ark was a preparing, wherein few, that is, eight souls, were saved through water:21 which also after a true likeness doth now save you, even baptism, not the putting away of the filth of the flesh, but the interrogation of a good conscience toward God, through the resurrection of Jesus Christ;22 who is on the right hand of God, having gone into heaven; angels and authorities and powers being made subject unto him.