I. PITA 4
1 Ya mere, ebe Kraist huru ahuhu n'anu-aru, unu onwe-unu were kwa otù izù ahu ke dika ekike-agha; n'ihi na onye huworo ahuhu n'anu-aru agharawo nmehie; 2 ka unu we ghara ibi ọzọ n'oge fọduru unu n'anu-aru-unu ime ihe ọjọ di iche iche nāgu madu, kama ime ihe Chineke nāchọ. 3 N'ihi na oge nke gasiworo ezuwo iluputa ihe ndi mba ọzọ nēzube, na ijeghari nime agu ikwa-iko, agu ihe ọjọ nile, manya-ob͕ub͕u nile, ite-egwú nile, iṅubiga-manya-ókè nile, na ikpere-arusi nile jọb͕uru onwe-ha: 4 nke ha nēchè na ọ bu ihe madu nāhughi mb͕e ọ bula na unu adighi-eso ha n'omume ahu b͕abà n'otù njubiga-ókè ahu nke ndu ila-n'iyì, ha nēkwulu unu: 5 ndi gāza ajuju bayere onwe-ha nye Onye ahu Nke doziworo Onwe-ya ikpe ndi di ndu na ndi nwuru anwu ikpé.
6 N'ihi na ihe eji zìsara ọbuná ndi nwuru anwu ozi ọma bu nka, ka ewe kpe ha ikpé dika esi ekpe madu n'anu-aru, ma ka ha we di ndu dika Chineke si di na mọ.
7 Ma ọgwugwu ihe nile di nsọ: ya mere nwenu uche zuru okè, nwe-kwa-nu anya-udo ka unu we kpe ekpere: 8 nke bu isi ihe nile menu ka ihu-n'anya ahu unu nāhurita onwe-unu di ike; n'ihi na ihu-n'anya nēkpuchi ọtutu nmehie: 9 nelērita onwe-unu ọbìa nke-ọma nātamughi ntamu: 10 dika unu nile n'otù n'otù natara onyinye-amara, werenu ihe ahu nējerita onwe-unu ozi, dika ndi nāchi èzi-na-ulo nke-ọma n'amara Chineke nke di n'uzọ di iche iche;
11 ọ buru na onye ọ bula nēkwu okwu, ya kwue dika okwu nke si Chineke n'ọnu puta; ọ buru na onye ọ bula nēje ozi, ya je dika o sitere n'ike ahu Chineke nēnyezu: ka ewe nye Chineke otuto n'ihe nile site n'aka Jisus Kraist, Onye nwe ebube nile na ike nile rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.
12 Ndi m'huru n'anya, unu echèla èchichè bayere ọnwunwa ọku ahu nke di n'etiti unu, nke nābiakwasi unu inwa unu, na ọ bu ihe anāhughi mb͕e ọ bula, dika agāsi na ọ bu ihe anāhughi mb͕e ọ bula nādakwasi unu: 13 kama ebe unu nwekọrọ ahuhu nke Kraist, nāṅurinu ọṅu; ka unu we were kwa obi nātọ utọ nke-uku ṅuria nime nkpughe nke ebube-Ya. 14 Ọ buru na anāta unu uta n'aha Kraist, ngọzi nādiri unu; n'ihi na Mọ nke ebube na Mọ nke Chineke nānọgide n'aru unu. 15 N'ihi na, ka onye ọ bula n'etiti unu ghara ihu ahuhu dika ob͕u-madu, ma-ọbu onye-ori, ma-ọbu onye nēme ihe ọjọ, ma-ọbu dika onye nēle ihe nābughi nke aka ya anya: 16 ma ọ buru na onye ọ bula nāhu ahuhu dika Kristian, ka ihere ghara ime ya; ma ka o nye Chineke otuto n'aha nka. 17 N'ihi na oge ahu eruwo ka esite n'ulo Chineke malite ikpe ikpé: ma ọ buru na o buru uzọ site n'aru ayi malite, gini gābu ọgwugwu nke ndi nēkweyeghi ozi ọma nke Chineke? 18 Ọ buru kwa na ọ di ike izọputa onye ezi omume, òle ebe agēgosi onye nādighi-asọpuru Chineke na onye-nmhie? 19 Ya mere ka ndi nāhu ahuhu dika ọchichọ Chineke si di were kwa nkpuru-obi-ha n'ime ezi ihe nye n'aka Onye-òkìkè kwesiri ntukwasi-obi idebe.
1 Peter 4
1 Forasmuch then as Christ suffered in the flesh, arm ye yourselves also with the same mind; for he that hath suffered in the flesh hath ceased from sin;2 that ye no longer should live the rest of your time in flesh to the lusts of men, but to the will of God.3 For the time past may suffice to have wrought the desire of the Gentiles, and to have walked in lasciviousness, lusts, winebibbings, revellings, carousings, and abominable idolatries:4 wherein they think it strange that ye run not with them into the same excess of riot, speaking evil of you:5 who shall give account to him that is ready to judge the living and the dead.6 For unto this end was the gospel preached even to the dead, that they might be judged indeed according to men in the flesh, but live according to God in the spirit.7 But the end of all things is at hand: be ye therefore of sound mind, and be sober unto prayer:8 above all things being fervent in your love among yourselves; for love covereth a multitude of sins:9 using hospitality one to another without murmuring:10 according as each hath received a gift, ministering it among yourselves, as good stewards of the manifold grace of God;11 if any man speaketh, speaking as it were oracles of God; is any man ministereth, ministering as of the strength which God supplieth: that in all things God may be glorified through Jesus Christ, whose is the glory and the dominion for ever and ever. Amen.12 Beloved, think it not strange concerning the fiery trial among you, which cometh upon you to prove you, as though a strange thing happened unto you:13 but insomuch as ye are partakers of Christ’s sufferings, rejoice; that at the revelation of his glory also ye may rejoice with exceeding joy.14 If ye are reproached for the name of Christ, blessed are ye; because the Spirit of glory and the Spirit of God resteth upon you.15 For let none of you suffer as a murderer, or a thief, or an evil-doer, or as a meddler in other men’s matters:16 but if a man suffer as a Christian, let him not be ashamed; but let him glorify God in this name.17 For the time is come for judgment to begin at the house of God: and if it begin first at us, what shall be the end of them that obey not the gospel of God?18 And if the righteous is scarcely saved, where shall the ungodly and sinner appear?19 Wherefore let them also that suffer according to the will of God commit their souls in well-doing unto a faithful Creator.