previous next

I. TIMỌTI 1

1 Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus dika ihe ahu si di, nke Chineke, bú Onye-nzọputa-ayi, na Kraist Jisus, bú Onye ayi nēle anya Ya, nyere n'iwu;

2 anamedegara Timọti akwukwọ, bú ezi nwam n'okwukwe: Amara na ebere na udo diri gi nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Kraist Jisus Onye-nwe-ayi puta.
3 Dika m'riọrọ gi ka i nọgide n'Efesọs, mb͕e m'gaje iga nime Masedọnia, ka i we nye madu ufọdu iwu ka ha ghara izí ihe di iche, 4 ka ha ghara kwa iṅa nti akukọ-ifò di iche iche na akukọ osuso-ọmumu di iche iche nādighi-agwu agwu, nke bu ihe nākpata ajuju, kari ikpata ọchichi-èzí-na-ulo nke Chineke nke di nime okwukwe: otú a ka m'nēme ub͕u a. 5 Ma ihe ezubere iweta n'iwu ahu bu ihu-n'anya sitere n'obi ọcha na ezi akọ-na-uche na okwukwe nke iru-abua nādighi ya: 6 nke madu ufọdu, ebe ha hiere ha, ha siri nime ha jehie we kwue okwu efu; 7 chọ kwa ibu ndi-ozizí nke iwu, ọ bu ezie na ha aghọtaghi ihe ha nēkwu, ha aghọtaghi kwa ihe ahu ha nēkwusi ike bayere ha. 8 Ma ayi matara na iwu ahu di nma, ma ọ buru na onye ọ bula ewere ya me ihe n'uzọ kwesiri iwu, 9 ebe ọ matara nka, na adighi-enye onye ezi omume iwu, kama anēnye ndi nēmebi iwu, ndi nēkweghi kwa idi n'okpuru iwu, nye ndi nāsọpurughi Chineke, ndi bu kwa ndi-nmehie, nye ndi nādighi ọcha n'obi, ndi emeru-kwa-ra emeru, nye ndi nēb͕u nna-ha na ndi nēb͕u nne-ha, nye ndi nēb͕u madu, 10 nye ndi nākwa iko, nye ndikom nēmeru onwe-ha n'aru ndikom, nye ndi nēzu madu n'ori, nye ndi-ugha, nye ndi nāṅu iyi ugha, ma ọ buru kwa na ihe ọ bula ọzọ di iche di nēmegide ozizí ahu nke nēnye ezi ndu;

11 dika ozi ọma nke ebube nke Chineke di ngọzi si di, nke enyere mu onwem n'aka na ntukwasi-obi idebe.
12 Anamekele Onye ahu Nke merem ka m'di ike, bú Kraist Jisus Onye-nwe-ayi, n'ihi na Ọ gurum n'onye kwesiri ntukwasi-obi, ebe O deberem ijere Ya ozi; 13 ọ bu ezie na abum onye nēkwulu Chineke na mbu, buru kwa onye-nsob͕u, na onye nēme madu ihe-ihere: otú ọ di, O merem ebere, n'ihi na emerem ya nāmaghi ama nime ekweghi-ekwe; 14 ma amara nke Onye-nwe-ayi, ya na okwukwe na ihu-n'anya nke di nime Kraist Jisus, riri nne nke-uku. 15 Okwu a kwesiri ntukwasi-obi, kwesi kwa ka anara ya nke-ọma n'uzọ nile ọ bula, na Kraist Jisus biara n'uwa izọputa ndi-nmehie; ndi mu onwem bu onye-isi-ha: 16 otú ọ di, ọ bu n'ihi nka ka emerem ebere, ka o we buru nime mu onwem, bú onye-isi, ka Jisus Kraist gēgosi ogologo-ntachi-obi-Ya nile, ka m'buru ihe ilere anya n'etiti ndi gaje ikwere na Ya ka ha nata ndu ebighi-ebi.

17 Ma Eze nke mb͕e nile, Nke anāpughi imebi emebi, Nke anāpughi ihu anya, Onye nání Ya bu Chineke, nsọpuru na otuto diri Ya rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.
18 Iwu a ka m'nēnye n'aka-gi idebe, nwam Timọti, dika amuma nile si di nke eburu uzọ bu bayere gi, ka i we were ha bu agha ọma nka; 19 nēnwe okwukwe na ezi akọ-na-uche; nke ufọdu nupuru n'ebe ha nọ, ub͕ọ-ha we kpùe n'ebe okwukwe-ayi di: 20 ndi Haimeniọs na Aleksanda nọ n'etiti ha; ndi m'rara nye n'aka Setan, ka ewe site n'ahuhu zí ha ka ha ghara ikwulu Chineke.

1 Timothy 1

1 Paul, an apostle of Christ Jesus according to the commandment of God our Saviour, and Christ Jesus our hope;2 unto Timothy, my true child in faith: Grace, mercy, peace, from God the Father and Christ Jesus our Lord.3 As I exhorted thee to tarry at Ephesus, when I was going into Macedonia, that thou mightest charge certain men not to teach a different doctrine,4 neither to give heed to fables and endless genealogies, which minister questionings, rather than a dispensation of God which is in faith; so do I now.5 But the end of the charge is love out of a pure heart and a good conscience and faith unfeigned:6 from which things some having swerved have turned aside unto vain talking;7 desiring to be teachers of the law, though they understand neither what they say, nor whereof they confidently affirm.8 But we know that the law is good, if a man use it lawfully,9 as knowing this, that law is not made for a righteous man, but for the lawless and unruly, for the ungodly and sinners, for the unholy and profane, for murderers of fathers and murderers of mothers, for manslayers,10 for fornicators, for abusers of themselves with men, for menstealers, for liars, for false swearers, and if there be any other thing contrary to the sound doctrine;11 according to the gospel of the glory of the blessed God, which was committed to my trust.12 I thank him that enabled me, even Christ Jesus our Lord, for that he counted me faithful, appointing me to his service;13 though I was before a blasphemer, and a persecutor, and injurious: howbeit I obtained mercy, because I did it ignorantly in unbelief;14 and the grace of our Lord abounded exceedingly with faith and love which is in Christ Jesus.15 Faithful is the saying, and worthy of all acceptation, that Christ Jesus came into the world to save sinners; of whom I am chief:16 howbeit for this cause I obtained mercy, that in me as chief might Jesus Christ show forth all his longsuffering, for an ensample of them that should thereafter believe on him unto eternal life.17 Now unto the King eternal, immortal, invisible, the only God, be honor and glory forever and ever. Amen.18 This charge I commit unto thee, my child Timothy, according to the prophecies which led the way to thee, that by them thou mayest war the good warfare;19 holding faith and a good conscience; which some having thrust from them made shipwreck concerning the faith:20 of whom is Hymenaeus and Alexander; whom I delivered unto Satan, that they might be taught not to blaspheme.