previous next

II. NDI KỌRINT 10

1 Ma mu onwem Pọl ji idi-nwayọ na obi-ọma nke Kraist nāriọ unu, mu onye nādi ala n'iru unu mb͕e m'nọ n'etiti unu, ma mb͕e m'nānọghi enwem obi-ike n'ebe unu nọ: 2 ma ariọm unu, ka m'ghara inwe obi-ike mb͕e m'nọ n'etiti unu na ntukwasi-obi ahu nke m'nāgu na m'gēji nwe anya-ike imegide ufọdu, ndi nāgu ayi dika ndi nējeghari dika anu-aru-ayi si chọ. 3 N'ihi na ọ bu ezie na ayi nējeghari n'anu-aru, ma ayi adighi-ebu agha dika anu-aru si ebu: 4 (n'ihi na ihe-agha nke ibu-agha-ayi abughi nke anu-aru, kama ha sitere na Chineke bu ihe puru ikwada ebe ewusiri ike); 5 ebe ayi nēweda ihe anātule n'obi, na ihe nile ọ bula di elu nke eweliri elu imegide ọmuma Chineke, ayi nādọta kwa ihe nile ọ bula anēchèputa n'agha iṅa nti Kraist; 6 ayi nānọ kwa dika ndi edoziworo ikpeputa aṅaghi-nti nile n'ìhè, mb͕e ọ bula agēmezu iṅa-nti-unu. 7 Unu nēle ihe di n'iru unu anya. Ọ buru na onye ọ bula atukwasiwo obi n'onwe-ya na ya bu onye Kraist, ya gua nka ọzọ n'onwe-ya, na, dika ya onwe-ya bu onye Kraist, otú a ka ayi onwe-ayi bu kwa. 8 N'ihi na asi na ọ bu ezie na m'gānyabiga isi ókè kari bayere ike-ayi (nke Onye-nwe-ayi nyere iwuli unu elu dika ulo, ọ bughi kwa iweda unu), agaghi-eme ka ihere mem: 9 ka m'we ghara idi unu ka agāsi na ejim akwukwọ-ozim nile me ka unu tua oké egwu. 10 N'ihi na ha nāsi, Akwukwọ-ozi-ya di arọ́ di kwa ike; ma ọnunọ nke aru-ya n'etiti ayi adighi ike, okwu-ya bu kwa ihe akpọrọ ihe-efu. 11 Ka madu di otú a gua nka, na aha madu ayi ji akwukwọ-ozi buru n'okwu mb͕e ayi nānọghi n'etiti unu, madu di otú a ka ayi bu kwa n'ọlu mb͕e ayi nọ n'etiti unu. 12 N'ihi na ayi enweghi anya-ike igu onwe-ayi n'etiti ufọdu, ma-ọbu iwere onwe-ayi tule ha, bú ufọdu ndi ahu ndi ha onwe-ha nēme ka amara ha: ma ebe ha nēwere onwe-ha tù onwe-ha, were kwa onwe-ha tule onwe-ha, ha onwe-ha aghọtaghi ihe. 13 Ma ayi onwe-ayi agaghi-anya isi rue ihe anāpughi itù atù, kama dika ọtùtù nke ihe-ọtùtù ahu si di, bú nke Chineke keputara ayi, dika ọtùtù, ibiaru ọbuná n'ebe unu nọ. 14 N'ihi na ayi esetibigaghi onwe-ayi ókè, dika agāsi na ayi adighi-eru unu: n'ihi na ayi bu ndi buru uzọ biakute unu nime ozi ọma Kraist: 15 ayi adighi-anya isi rue ihe anāpughi itù atù, nke ahu bu, na ndọb͕u ndi ọzọ dọb͕uru onwe-ha n'ọlu; ma ayi nēle anya na, mb͕e okwukwe-unu nāba uba kari, agēme ka ayi di uku n'etiti unu dika ihe-ọtùtù-ayi si di rue ibabiga-ókè, 16 ka ayi we zisa ozi ọma rue ebe nile di n'ofè unu, ghara kwa inya isi bayere ihe edoziri ayi n'ihe-ọtùtù onye ọzọ. 17 Ma onye nānya isi, ya nya n'Onye-nwe-ayi. 18 N'ihi na onye ya onwe-ya nēme ka amara ya, ọ bughi onye ahu ka anwaputaworo, kama ọ bu onye Onye-nwe-ayi nēme ka amara ya.

2 Corinthians 10

1 Now I Paul myself entreat you by the meekness and gentleness of Christ, I who in your presence am lowly among you, but being absent am of good courage toward you:2 yea, I beseech you, that I may not when present show courage with the confidence wherewith I count to be bold against some, who count of us as if we walked according to the flesh.3 For though we walk in the flesh, we do not war according to the flesh4 (for the weapons of our warfare are not of the flesh, but mighty before God to the casting down of strongholds),5 casting down imaginations, and every high thing that is exalted against the knowledge of God, and bringing every thought into captivity to the obedience of Christ;6 and being in readiness to avenge all disobedience, when your obedience shall be made full.7 Ye look at the things that are before your face. If any man trusteth in himself that he is Christ’s, let him consider this again with himself, that, even as he is Christ’s, so also are we.8 For though I should glory somewhat abundantly concerning our authority (which the Lord gave for building you up, and not for casting you down), I shall not be put to shame:9 that I may not seem as if I would terrify you by my letters.10 For, His letters, they say, are weighty and strong; but his bodily presence is weak, and his speech of no account.11 Let such a one reckon this, that, what we are in word by letters when we are absent, such are we also in deed when we are present.12 For we are not bold to number or compare ourselves with certain of them that commend themselves: but they themselves, measuring themselves by themselves, and comparing themselves with themselves, are without understanding.13 But we will not glory beyond our measure, but according to the measure of the province which God apportioned to us as a measure, to reach even unto you.14 For we stretch not ourselves overmuch, as though we reached not unto you: for we came even as far as unto you in the gospel of Christ:15 not glorying beyond our measure, that is, in other men’s labors; but having hope that, as your faith groweth, we shall be magnified in you according to our province unto further abundance,16 so as to preach the gospel even unto the parts beyond you, and not to glory in another’s province in regard of things ready to our hand.17 But he that glorieth, let him glory in the Lord.18 For not he that commendeth himself is approved, but whom the Lord commendeth.