previous next

II. NDI KỌRINT 12

1 Aghaghi m inya isi, ọ bu ezie na ọ baghi urù; ma m'gēche iru n'ọhù na ihe-nkpughe nke Onye-nwe-ayi. 2 Amataram otù madu nime Kraist, arọ iri na anọ gara aga (ma ọ bu nime aru, amataghi m; ma-ọbu na ọ bughi nime aru, amataghm; Chineke matara), na eweliri madu di otú a na mberede rue elu-igwe nke-atọ. 3 Amata-kwa-ram madu di otú a (ma ọ bu nime aru, ma-ọbu na aru anọghi ya, amataghi m; Chineke matara), 4 na eweliri ya rigo na Paradais na mberede, o we nu okwu nke anāpughi ikwu, nke o nēzighi ezi n'iwu ka madu kwue ha. 5 M'ganānya isi bayere onye di otú a: ma m'gaghi-anya isi bayere mu onwem, ma-ọbughi n'adighi-ikem nile. 6 N'ihi na asi na agamachọ inya isi, m'gaghi-abu onye nēnweghi uche; n'ihi na m'gēkwu ezi-okwu: ma esepurum aka, ka onye ọ bula we ghara igu ihe bayerem kari ihe ọ huru na abum, ma-ọbu nke ọ nuru n'ọnum. 7 N'ihi ọkika nke nkpughe ndia-n'ihi ya, ka ewe ghara iwelibigam ókè, enyerem ogwu n'anu-arum, bú mọ-ozi nke Setan, ka o we tiem aka, ka ewe ghara iwelibigam ókè. 8 Ub͕ò atọ ka m'riọrọ Onye-nwe-ayi aririọ bayere ihe a, ka ọ pua n'arum. 9 Ọ siwokwam, Amaram ezuworo gi: n'ihi na emewo ka ikem zu oké n'adighi-ike. Ya mere kama ihe ọzọ m'gēwere obi-utọ nile nya isi n'adighi-ikem nile, ka ike nke Kraist we ridakwasim, biri kwa nimem.

10 N'ihi nka adighi-ike nile na imem ihe-ihere nile na nkpà nile na nsob͕u nile na oké nkpà nile n'ihi Kraist dim ezi nma: n'ihi na mb͕e ọ bula m'nādighi ike, mb͕e ahu ka m'nādi ike.
11 Aghọwom onye nēnweghi uche: unu onwe-unu rugiderem; n'ihi na ugwọ unu ji mu onwem bu ime ka amaram: n'ihi na ọ dighi uzọ ọ bula m'nērughi ndi kachasi elu n'etiti ndi-ozi, asi na ọ bu ezie na abughi m ihe ọ bula. 12 Ewere ihe-iriba-ama di iche iche na ọlu-ebube na ọlu di ike di iche iche luputa ihe-iriba-ama nile nke onye-ozi n'etiti unu ezie na ntachi-obi nile.

13 N'ìhi na gini bu ihe ahu nke emere ka unu la ala nime ya kari nzukọ Kraist fọduru, ma-ọbughi na mu onwem abughi unu ibu arọ́? b͕agharanum ajọ omume a.
14 Le, nka bu ub͕ò nke-atọ m'nọ dika onye edoziworo ibiakute unu; m'gaghi-abu kwa ibu arọ́: n'ihi na achọghi m ihe-unu, kama ọ bu unu onwe-unu: n'ihi na ọ bughi ọlu umu ikpadoro ndi muru ha ihe, kama ọ bu ọlu ndi muru umu ikpadoro umu-ha. 15 Ma mu onwem gēwere obi-utọ nile mefu ihe m'nwere kwe kwa ka emefusia mu onwem n'ihi nkpuru-obi-unu. Ọ buru na anamahubiga unu n'anya ókè kari, ànāhum n'anya nke-ntà kari? 16 Ma ka ọ di otú a, mu onwem eboghi unu ibu arọ́; kama, ebe m'bu onye-aghughọ, ejim itu-ntu nwude unu. 17 Ọ̀ gābu na esim n'aka onye ọ bula n'etiti ndi m'ziteworo unu rib͕u unu?

18 Ariọrọm Taitọs, ziga kwa nwa-nna-ayi ahu ka o so ya. Ọ̀ gābu na Taitọs rib͕uru unu n'uzọ ọ bula? àyi eweghi otù Mọ ahu jeghari? àyi esoghi n'otù ije-ukwu ahu?
19 Unu nēchè oge nile a na ayi nāgọpu onwe-ayi nye unu. Ọ bu n'iru Chineke nime Kraist ka ayi nēkwu. Ma ihe nile bu n'ihi iwuli unu elu dika ulo, ndi m'huru n'anya. 20 N'ihi na anamatu egwu, ma o nwere uzọ ọ bula, mb͕e m'gābia, m'gāhu unu ka unu nābughi aha madu ahu m'nāchọ, unu ahú kwa mu onwem ka m'nābu aha madu unu ṅachọghi; ma o nwere uzọ ọ bula esem-okwu, ekworo, ọnuma, ikpa-iche-iche, nkwutọ, ntakwu, nfuli-elu, aghara, gādi; 21 ma o nwere uzọ ọ bula, mb͕e m'gābia ọzọ, Chinekem gēwedam n'ala n'iru unu, m'ru-kwa-ra ọtutu madu újú n'etiti ndi mehieworo n'oge gara aga, ha echègharighi kwa n'adighi-ọcha na ikwa-iko na agu ikwa-iko nke ha mere.

2 Corinthians 12

1 I must needs glory, though it is not expedient; but I will come to visions and revelations of the Lord.2 I know a man in Christ, fourteen years ago (whether in the body, I know not; or whether out of the body, I know not; God knoweth), such a one caught up even to the third heaven.3 And I know such a man (whether in the body, or apart from the body, I know not; God knoweth),4 how that he was caught up into Paradise, and heard unspeakable words, which it is not lawful for a man to utter.5 On behalf of such a one will I glory: but on mine own behalf I will not glory, save in my weaknesses.6 For if I should desire to glory, I shall not be foolish; for I shall speak the truth: but I forbear, lest any man should account of me above that which he seeth me to be, or heareth from me.7 And by reason of the exceeding greatness of the revelations, that I should not be exalted overmuch, there was given to me a thorn in the flesh, a messenger of Satan to buffet me, that I should not be exalted overmuch.8 Concerning this thing I besought the Lord thrice, that it might depart from me.9 And he hath said unto me, My grace is sufficient for thee: for my power is made perfect in weakness. Most gladly therefore will I rather glory in my weaknesses, that the power of Christ may rest upon me.10 Wherefore I take pleasure in weaknesses, in injuries, in necessities, in persecutions, in distresses, for Christ’s sake: for when I am weak, then am I strong.11 I am become foolish: ye compelled me; for I ought to have been commended of you: for in nothing was I behind the very chiefest apostles, though I am nothing.12 Truly the signs of an apostle were wrought among you in all patience, by signs and wonders and mighty works.13 For what is there wherein ye were made inferior to the rest of the churches, except it be that I myself was not a burden to you? forgive me this wrong.14 Behold, this is the third time I am ready to come to you; and I will not be a burden to you: for I seek not yours, but you: for the children ought not to lay up for the parents, but the parents for the children.15 And I will most gladly spend and be spent for your souls. If I love you more abundantly, am I loved the less?16 But be it so, I did not myself burden you; but, being crafty, I caught you with guile.17 Did I take advantage of you by any one of them whom I have sent unto you?18 I exhorted Titus, and I sent the brother with him. Did Titus take any advantage of you? walked we not in the same spirit? walked we not in the same steps?19 Ye think all this time that we are excusing ourselves unto you. In the sight of God speak we in Christ. But all things, beloved, are for your edifying.20 For I fear, lest by any means, when I come, I should find you not such as I would, and should myself be found of you such as ye would not; lest by any means there should be strife, jealousy, wraths, factions, backbitings, whisperings, swellings, tumults;21 lest again when I come my God should humble me before you, and I should mourn for many of them that have sinned heretofore, and repented not of the uncleanness and fornication and lasciviousness which they committed.