II. TIMỌTI 1
1 Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus site n'ọchichọ nke Chineke, dika nkwa nke ndu ahu nke di nime Kraist Jisus si di,
2 nēdegara Timọti akwukwọ, bú nwam nke m'huru n'anya: Amara na ebere na udo diri gi, nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Kraist Jisus Onye-nwe-ayi puta.
3 Anameleke Chineke, Onye m'nēkpere site na nnam ochie-hà n'akọ-na-uche di ọcha, otú nchetam bayere gi n'aririọm nile di n'ewepughi aka, 4 n'ihi na agu ihu gi nāgusim ike abali na ehihie, ebe m'nēcheta anya-miri-gi nile, ka m'we juputa n'ọṅù; 5 ebe emerem ka m'cheta okwukwe iru-abua nādighi ya nke di nime gi; bú okwukwe nke buru uzọ biri nime nne-gi ochie Lois na nne-gi Yunaisi; ma emerem ka m'kweye na o bi kwa nime gi. 6 Ọ bu kwa n'ihi ihe a ka m'nēchetara gi ka i me ka onyinye-amara nke Chineke nwuru ọku, bú nke di nime gi site n'ibikwasi aka abua nkem n'isi-gi. 7 N'ihi na Chineke enyeghi ayi mọ nke ujọ; kama ọ bu nke ike na ihunanya na ime ka uche zuo okè. 8 Ya mere ka ihere àmà nke Onye-nwe-ayi, ma-ọbu ihere nke mu onye-nkpọrọ-Ya, ghara ime gi: kama so ozi ọma Ya hujukọ anya dika ike nke Chineke si di; 9 Onye zọputara ayi, were kwa ọkpukpọ di nsọ kpọ ayi, ọ bughi dika ọlu-ayi si di, kama dika ihe Ya onwe-ya zubere, na amara-Ya, si di, nke enyere ayi nime Kraist Jisus mb͕e oge ebighi-ebi akērughi, 10 ma emere ka ọ puta ìhè ub͕u a site na ngosi nke Onye-nzọputa-ayi Kraist Jisus, Onye mere ka ọnwu ghara idi ìrè, site kwa n'ozi ọma Ya weputa ndu na emebighi-emebi n'ìhè, 11 bú ozi ọma nke edoro mu onwem ka m'buru onye-nkwusa, na onye-ozi, na onye-ozizí, izisa ya. 12 Ọ bu kwa n'ihi ihe a ka m'nāhu kwa ahuhu ndia: ma ihere adighi-emem; n'ihi na amataram Onye m'kweworo okwu-Ya, eme-kwa-ra ka m'kweye na Ọ puru iche ihe m'nyere n'aka-Ya idebe nche rue ubọchi ahu. 13 Jide ihe ilere anya nke okwu nēnye ezi ndu nke i nuru n'ọnum, nime okwukwe na ihunanya nke di nime Kraist Jisus.
14 Ihe ọma ahu nke enyere n'aka-gi idebe, were Mọ Nsọ Nke bi nime ayi nēche ya.
15 I matara nka, na ndi nile di n'Esia b͕akutaram azu; ndi Faigelọs na Hamọgenis di n'etiti ha. 16 Ka Onye-nwe-ayi mere èzí-na-ulo Ọnisifọrọs ebere: n'ihi na o mere ka m'nwe ume ndu ọtutu mb͕e, ihere nkpọrọm emeghi kwa ya; 17 kama, mb͕e ọ biaruru Rom, o were inu-ọku-n'obi chọbam, we chọtam 18 (ka Onye-nwe-ayi nye ya ka ọ chọta ebere n'aka Onye-nwe-ayi n'ubọchi ahu); ka ha ra kwa, bú ihe o ji jere m ozi n'Efesọs, gi onwe-gi jere karia.
2 Timothy 1
1 Paul, an apostle of Christ Jesus through the will of God, according to the promise of the life which is in Christ Jesus,2 to Timothy, my beloved child: Grace, mercy, peace, from God the Father and Christ Jesus our Lord.3 I thank God, whom I serve from my forefathers in a pure conscience, how unceasing is my remembrance of thee in my supplications, night and day4 longing to see thee, remembering thy tears, that I may be filled with joy;5 having been reminded of the unfeigned faith that is in thee; which dwelt first in thy grandmother Lois, and thy mother Eunice; and, I am persuaded, in thee also.6 For which cause I put thee in remembrance that thou stir up the gift of God, which is in thee through the laying on of my hands.7 For God gave us not a spirit of fearfulness; but of power and love and discipline.8 Be not ashamed therefore of the testimony of our Lord, nor of me his prisoner: but suffer hardship with the gospel according to the power of God;9 who saved us, and called us with a holy calling, not according to our works, but according to his own purpose and grace, which was given us in Christ Jesus before times eternal,10 but hath now been manifested by the appearing of our Saviour Christ Jesus, who abolished death, and brought life and immortality to light through the gospel,11 whereunto I was appointed a preacher, and an apostle, and a teacher.12 For which cause I suffer also these things: yet I am not ashamed; for I know him whom I have believed, and I am persuaded that he is able to guard that which I have committed unto him against that day.13 Hold the pattern of sound words which thou hast heard from me, in faith and love which is in Christ Jesus.14 That good thing which was committed unto thee guard through the Holy Spirit which dwelleth in us.15 This thou knowest, that all that are in Asia turned away from me; of whom are Phygelus and Hermogenes.16 The Lord grant mercy unto the house of Onesiphorus: for he oft refreshed me, and was not ashamed of my chain;17 but, when he was in Rome, he sought me diligently, and found me18 (the Lord grant unto him to find mercy of the Lord in that day); and in how many things he ministered at Ephesus, thou knowest very well.