previous next

II. TIMỌTI 2

1 Ya mere, gi onwe-gi, nwam, ka eme ka i di ike n'amara nke di nime Kraist Jisus. 2 Ihe nile i nukwara n'ọnum site n'etiti ọtutu ndi-àmà, nye ihe ndia n'aka madu ndi kwesiri ntukwasi-obi idebe, bú madu ndi ọ gēkwe kwa izí madu-ibe-ha ihe ndia. 3 Som hujukọ anya, dika onye-agha ọma nke Kraist Jisus. 4 Ọ dighi onye-agha ọ bula nātuhi onwe-ya n'ihe nke ibi-obi a mb͕e o nēbu agha; ka o we me ihe gātọ onye dere aha-ya n'akwukwọ dika onye-agha. 5 Ma ọ buru kwa na onye ọ bula nāb͕a nb͕a, ekpughi ya okpu-nmeri, ma ọ buru na ọ b͕aghi nb͕a otú ọ di n'iwu. 6 Onye-ọlu-ubi nke nādọb͕u onwe-ya n'ọlu aghaghi ibu uzọ kère òkè na nkpuru-ya. 7 Nātughari uche n'ihe m'nēkwu; n'ihi na Onye-nwe-ayi gēnye gi nghọta n'ihe nile. 8 Nēcheta Jisus Kraist, dika Onye emeworo ka O si na ndi nwuru anwu bilie, Onye si na nkpuru Devid puta, dika ozi ọmam si di: 9 nke m'nāhuju anya nime ya rue ab͕u, dika onye nālu ọlu ọjọ; ma ekeghi okwu Chineke ab͕u. 10 N'ihi nka ka m'nwere ntachi-obi n'ihe nile n'ihi ndi arọputara, ka ha onwe-ha we ru kwa nzọputa nke di nime Kraist Jisus, ya na ebube ebighi-ebi. 11 Okwu a kwesiri ntukwasi-obi: N'ihi na asi na ayi soro Ya nwukọ ọnwu, ayi gēso kwa Ya dikọ ndu: 12 asi na ayi nēnwe ntachi-obi, ayi gēso kwa Ya bukọ eze: asi na ayi gāgọnari Ya, Ya onwe-ya gāgọnari kwa ayi:

13 asi na ayi ekweghi ekwe, Ya onwe-ya nānọgide n'ikwesi ntukwasi-obi; n'ihi na Ọ pughi igọnari Onwe-ya.
14 Nēchetara ha ihe ndia, nāgwasi ha ike n'iru Onye-nwe-ayi, ka ha ghara ise okwu bayere okwu efu, bú ihe nābaghi n'ihe, nēkpù ndi nānu anu iru. 15 Nānu ọku n'obi iche onwe-gi n'iru madu dika onye Chineke nwaputaworo, onye-ọlu nke ihere nāpughi ime ya, onye nēkwuzi okwu nke ezi-okwu ahu. 16 Ma nēze okwu efu nile emeruru emeru: n'ihi na ha gāga kari n'iru n'asọpurughi-Chineke, 17 okwu-ha gābu kwa ọnyá nāba aba dika gangrene: ndi Haimeniọs na Filitọs di n'etiti ha; 18 bú madu ndi hiere n'ihe bayere ezi-okwu ahu, nāsi na nbilite-n'ọnwu agabigawo ub͕u a, ha nēkpù kwa okwukwe madu ufọdu iru. 19 Otú ọ di, ntọ-ala di ike nke Chineke nēguzo, ebe o nwere akàrà nka, Onye-nwe-ayi mara ndi bu nke Ya: na, Ka onye ọ bula nke nākpọ aha Onye-nwe-ayi si n'ajọ omume wezuga onwe-ya. 20 Ma nime ulo uku ọ bughi nání ihe ọla-edo na ihe ọla-ọcha di, kama ihe osisi na ihe ájá di kwa; e mekwara ufọdu ka ha buru ihe-nsọpuru, me kwa ufọdu ha na buru ihe-ihere. 21 Ya mere ọ buru na onye ọ bula asacha onwe-ya pua n'ihe ndia, ọ gābu ihe emere ka ọ buru ihe-nsọpuru, ihe edoworo nsọ, ihe bara n'ihe ka Onye-nwe-ya were ya me ihe, ihe edoziworo iji lu ezi ọlu nile ọ bula. 22 Ma nāb͕anari agu ihe ọjọ nāgu nwa-okorọbia, nāb͕aso kwa ezi omume, okwukwe, ihu-n'anya, udo, gi na ndi nākpọku Onye-nwe-ayi site n'obi di ọcha. 23 Ma nāju iju-ajuju nzuzu na nke amaghi-ihe, ebe i matara na ha nāmuputa ilu-ọ̀gù. 24 Ma orù nke Onye-nwe-ayi aghaghi ibu onye nādighi-alu ọ̀gù, kama ọ ghaghi idi nwayọ n'ebe madu nile nọ, ọ ghaghi kwa ibu onye nwere ike izí ihe, onye nānagide ihe ọjọ, 25 n'idi-nwayọ nādọ ndi nēdo onwe-ha imegide ya aka na nti; ma asi na ọ bu ezie ma eleghi anya na Chineke gēnye ha nchèghari ka ha we mazu ezi-okwu, 26 we teta n'ura manya pua n'ọnyà ekwensu, ebe orù Onye-nwe-ayi nwudeworo ha na ndu ka ha me ihe Chineke nāchọ.

2 Timothy 2

1 Thou therefore, my child, be strengthened in the grace that is in Christ Jesus.2 And the things which thou hast heard from me among many witnesses, the same commit thou to faithful men, who shall be able to teach others also.3 Suffer hardship with me, as a good soldier of Christ Jesus.4 No soldier on service entangleth himself in the affairs of this life; that he may please him who enrolled him as a soldier.5 And if also a man contend in the games, he is not crowned, except he have contended lawfully.6 The husbandmen that laboreth must be the first to partake of the fruits.7 Consider what I say; for the Lord shall give thee understanding in all things.8 Remember Jesus Christ, risen from the dead, of the seed of David, according to my gospel:9 wherein I suffer hardship unto bonds, as a malefactor; but the word of God is not bound.10 Therefore I endure all things for the elect’s sake, that they also may obtain the salvation which is in Christ Jesus with eternal glory.11 Faithful is the saying: For if we died with him, we shall also live with him:12 if we endure, we shall also reign with him: if we shall deny him, he also will deny us:13 if we are faithless, he abideth faithful; for he cannot deny himself.14 Of these things put them in remembrance, charging them in the sight of the Lord, that they strive not about words, to no profit, to the subverting of them that hear.15 Give diligence to present thyself approved unto God, a workman that needeth not to be ashamed, handling aright the word of truth.16 But shun profane babblings: for they will proceed further in ungodliness,17 and their word will eat as doth a gangrene: of whom is Hymenaeus an Philetus;18 men who concerning the truth have erred, saying that the resurrection is past already, and overthrow the faith of some.19 Howbeit the firm foundation of God standeth, having this seal, The Lord knoweth them that are his: and, Let every one that nameth the name of the Lord depart from unrighteousness.20 Now in a great house there are not only vessels of gold and of silver, but also of wood and of earth; and some unto honor, and some unto dishonor.21 If a man therefore purge himself from these, he shall be a vessel unto honor, sanctified, meet for the master’s use, prepared unto every good work.22 after righteousness, faith, love, peace, with them that call on the Lord out of a pure heart.23 But foolish and ignorant questionings refuse, knowing that they gender strifes.24 And the Lord’s servant must not strive, but be gentle towards all, apt to teach, forbearing,25 in meekness correcting them that oppose themselves; if peradventure God may give them repentance unto the knowledge of the truth,26 and they may recover themselves out of the snare of the devil, having been taken captive by him unto his will.