III. JỌN 1
1 Okenye nēdegara Gaiọs akwukwọ, bú onye ahuru n'anya, onye mu onwem nāhu n'anya n'ezi-okwu.
2 Onye m'huru n'anya, anamekpere Chineke ka ihe nile nāgara gi nke-ọma, ka i nwe kwa ezi ndu, dika ọ nāgara nkpuru-obi-gi nke-ọma. 3 N'ihi na aṅuririm ọṅu nke-uku, mb͕e umu-nna-ayi ufọdu biara we b͕a àmà ezi-okwu-gi, dika gi onwe-gi nējeghari n'ezi-okwu.
4 Enweghm ọṅù nke ka ihe ndia uku, bú inu ka umu nke akam nējeghari n'ezi-okwu ahu.
5 Onye m'huru n'anya, i nēme ihe kwesiri ntukwasi-obi n'ọlu ọ bula i luru n'ebe ndi bu umu-nna-ayi, ndi bu kwa ndi-ọbìa, nọ; 6 ndi b͕ara àmà ihu-n'anya-gi n'iru nzukọ Kraist: ndi i gēme nke-ọma idupu ha n'ije-ha dika o kwesiri imere Chineke: 7 n'ihi na ọ bu n'ihi Aha ahu ka ha puru, nānaraghi ihe ọ bula n'aka ndi mba ọzọ. 8 Ya mere ayi onwe-ayi ji ugwọ ikpọbata madu di otú a, ka ayi we buru kwa ndi soro ezi-okwu ahu nālukọ ọlu. 9 Edegaram nzukọ-unu ihe n'akwukwọ: ma Diọtrefis, onye ọ nātọ utọ ibu onye-isi n'etiti ha, anaraghi ayi nke-ọma. 10 N'ihi nka, ọ buru na abiam, m'gēme ka echeta ọlu-ya nile nke ọ nālu, n'iwere ajọ okwu nēkwugide ayi ihe-nzuzu: afọ ejughi kwa ya n'ihe ahu, ma ya onwe-ya adighi-anara umu-nna-ayi nke-ọma, ọ nēb͕ochi kwa ndi nēzube inara ha, ọ nāchupu kwa ha na nzukọ Kraist. 11 Onye m'huru n'anya, eṅomila ihe ọjọ, kama nēṅomi ezi ihe. Onye nēme ezi ihe bu onye siri na Chineke puta: onye nēme ihe ọjọ ahughi Chineke mb͕e ọ bula.
12 Madu nile, ha na ezi-okwu onwe-ya, ab͕aworo Dimitriọs àmà: e, ayi onwe-ya nāb͕a kwa àmà; i mata-kwa-ra na àmà-ayi bu ezie.
13 Enwerem ọtutu ihe idegara gi n'akwukwọ, ma achọghm iwere ink na pen degara gi: 14 ma anamele anya ihu gi ngwa ngwa, ayi gēwere kwa ọnu kwurita okwu. 15 Ka udo diri gi. Ndi-eyì-ayi nēkele gi. Nēkele ndi-eyì-ayi n'aha n'aha.
3 John 1
1 The elder unto Gaius the beloved, whom I love in truth.2 Beloved, I pray that in all things thou mayest prosper and be in health, even as thy soul prospereth.3 For I rejoiced greatly, when brethren came and bare witness unto thy truth, even as thou walkest in truth.4 Greater joy have I none than this, to hear of my children walking in the truth.5 Beloved, thou doest a faithful work in whatsoever thou doest toward them that are brethren and strangers withal;6 who bare witness to thy love before the church: whom thou wilt do well to set forward on their journey worthily of God:7 because that for the sake of the Name they went forth, taking nothing of the Gentiles.8 We therefore ought to welcome such, that we may be fellow-workers for the truth.9 I wrote somewhat unto the church: but Diotrephes, who loveth to have the preeminence among them, receiveth us not.10 Therefore, if I come, I will bring to remembrance his works which he doeth, prating against us with wicked words: and not content therewith, neither doth he himself receive the brethren, and them that would he forbiddeth and casteth them out of the church.11 Beloved, imitate not that which is evil, but that which is good. He that doeth good is of God: he that doeth evil hath not seen God.12 Demetrius hath the witness of all men, and of the truth itself: yea, we also bear witness: and thou knowest that our witness is true.13 I had many things to write unto thee, but I am unwilling to write them to thee with ink and pen:14 but I hope shortly to see thee, and we shall speak face to face. Peace be unto thee. The friends salute thee. Salute the friends by name.