ỌLU NDI-OZI 1
1 Ederem akwukwọ mbu, Teofilọs, banyere ihe nile Jisus malitere ime na izí, 2 rue ubọchi anara Ya n'elu, mb͕e O sitere na Mọ Nsọ nyesia ndi-ozi-Ya ndi Ọ rọputarari iwu: 3 ndi O ji kwa ọtutu uzọ nādighi igọ agọ che Onwe-ya n'iru ha na ndu mb͕e Ọ husiri ahuhu, ebe O mere ka ha nāhu Ya anya n'ogologo ọgu ubọchi abua, O nēkwu kwa ihe nile bayere ala-eze Chineke: 4 mb͕e Ya na ha zukọrọ O we nye ha iwu ka ha ghara isi na Jerusalem pua, kama ka ha chere nkwa nke Nna-Ya, nke unu nuru n'ọnum, ka O kwuru:
5 n'ihi na Jọn jiri miri me baptism n'ezie; ma agēji Mọ Nsọ me unu baptism mb͕e ọtutu ubọchi nāgaghi-agabiga site n'ub͕u a.
6 Ya mere mb͕e ha b͕akọrọ, ha jua Ya, si, Onye-nwe-ayi, ọ̀ bu n'oge a ka I nēnyeghachi Israel ala-eze? 7 O we si ha, Ọ bughi ihe diri unu ima oge ma-ọbu ubọchi, nke Nnam debere n'ike nke aka Ya. 8 Ma unu gānata ike, mb͕e Mọ Nsọ gābiakwasiwori unu: unu gābu kwa ndi-àmàmnime Jerusalem, na nime Judia na Sameria nile, ru kwa ebe uwa sọturu. 9 Mb͕e O kwusiri okwu ndia, mb͕e ha nēle anya, ewe welie Ya elu; igwe-oji we nara Ya, Ọ pua n'anya-ha. 10 Mb͕e ha nēlegide anya n'elu-igwe ka Ọ nāga n'elu, le, ndikom abua we guzo ha nso yiri uwe ọcha;
11 ndi si-kwa-ara, Ndikom nke Galili, gini mere unu nēguzo nēle anya n'elu-igwe? Jisus nka, Onye anapuru n'ebe unu nọ rigo n'elu-igwe, gābia n'otù aka ahu dika unu kiriri Ya ka Ọ nāga n'elu-igwe.
12 Mb͕e ahu ha siri n'ugwu anākpọ Olivet, nke di Jerusalem nso, ije nke otù ubọchi-izu-ike, laghachi na Jerusalem. 13 Mb͕e ha batara n'obodo, ha we rigo n'ime-ulo di n'elu ulo, ebe ha nānọ; Pita na Jọn na Jemes na Andru, Filip na Tomas, Batọlọmiu na Matiu, Jemes nwa Alfiọs, na Saimon Zilotis, na Judas nwa Jemes.
14 Ndia nile ji otù obi nọgidesi ike n'ekpere, ha na ndinyom ufọdu, na Meri nne Jisus, na umu-nne-Ya.
15 Na mb͕e ahu Pita we bilie n'etiti umu-nna nime Kraist, si, (ìgwè madu ndi nọkọrọ n'otù di kwa, ihe ra ka ọgu madu isi), 16 Umu-nnam, ihe edeworo n'akwukwọ nsọ aghaghi imezu, nke Mọ Nsọ kwuru n'oge gara aga site n'ọnu Devid banyere Judas, onye mesiri buru onye-ndù ndi jidere Jisus. 17 N'ihi na aguru ya-ri n'etiti ayi, o we keta òkè-ya n'ije-ozi a. 18 (Ya mere onye a sitere n'ugwọ-ọlu nke ajọ omume-ya nata otù iberibe ala; o we da su isi n'ala, tipue afọ-ya, ngiri-afọ-ya nile we nuputa. 19 Ọ we buru ihe ndi nile bi na Jerusalem mara; ya mere eji akpọ iberibe ala ahu Akeldama n'asusu-ha, nke ahu bu, Iberibe ala ọbara.)
20 N'ihi na edewo ya n'akwukwọ Abù ọma, si,
Ka ebe-ulo-ikwū-ya ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu,
Ka onye ọ bula ghara kwa ibi na ya: na,
Ka onye di iche nara ya ọlu-nlekọta-ya.
21 Ya mere otù onye nime ndikom ndi soro ayi n'oge nile Onye-nwe-ayi Jisus bàra nime pu kwa n'èzí n'etiti ayi, 22 nāmalite na baptism nke Jọn, rue ubọchi anapuru Ya n'ebe ayi nọ rigo n'elu-igwe, otù onye nime ndia aghaghi iso ayi buru onye-àmà nke nbilite- n'ọnwu-Ya. 23 Ha we guzo madu abua, Josef anākpọ Basabas, onye akpọ-kwa-ra Justọs, na Mataias. 24 Ha we kpe ekpere, si, Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, Onye mara obi madu nile, gosi ayi onye ahu I rọputara nime madu abua ndia, 25 inara ọnọdu n'ije-ozi na ọlu onye-ozi a, nke Judas jehiere nime ya, ka o we ga n'ebe nke aka ya. 26 Ha we fere ha nzà; nzà ahu we ma Mataias; ewe gua ya nime ndi-ozi iri na otù ahu.
Acts 1
1 The former treatise I made, O Theophilus, concerning all that Jesus began both to do and to teach,2 until the day in which he was received up, after that he had given commandment through the Holy Spirit unto the apostles whom he had chosen:3 To whom he also showed himself alive after his passion by many proofs, appearing unto them by the space of forty days, and speaking the things concerning the kingdom of God:4 and, being assembled together with them, he charged them not to depart from Jerusalem, but to wait for the promise of the Father, which, said he, ye heard from me:5 For John indeed baptized with water; but ye shall be baptized in the Holy Spirit not many days hence.6 They therefore, when they were come together, asked him, saying, Lord, dost thou at this time restore the kingdom to Israel?7 And he said unto them, It is not for you to know times or seasons, which the Father hath set within His own authority.8 But ye shall receive power, when the Holy Spirit is come upon you: and ye shall be my witnesses both in Jerusalem, and in all Judaea and Samaria, and unto the uttermost part of the earth.9 And when he had said these things, as they were looking, he was taken up; and a cloud received him out of their sight.10 And while they were looking stedfastly into heaven as he went, behold, two men stood by them in white apparel;11 who also said, Ye men of Galilee, why stand ye looking into heaven? this Jesus, who was received up from you into heaven shall so come in like manner as ye beheld him going into heaven.12 Then returned they unto Jerusalem from the mount called Olivet, which is nigh unto Jerusalem, a Sabbath day’s journey off.13 And when they were come in, they went up into the upper chamber, where they were abiding; both Peter and John and James and Andrew, Philip and Thomas, Bartholomew and Matthew, James the son of Alphaeus, and Simon the Zealot, and Judas the son of James.14 These all with one accord continued stedfastly in prayer, with the women, and Mary the mother of Jesus, and with his brethren.15 And in these days Peter stood up in the midst of the brethren, and said (and there was a multitude of persons gathered together, about a hundred and twenty),16 Brethren, it was needful that the Scripture should be fulfilled, which the Holy Spirit spake before by the mouth of David concerning Judas, who was guide to them that took Jesus.17 For he was numbered among us, and received his portion in this ministry.18 (Now this man obtained a field with the reward of his iniquity; and falling headlong, he burst asunder in the midst, and all his bowels gushed out.19 And it became known to all the dwellers at Jerusalem; insomuch that in their language that field was called Akeldama, that is, The field of blood.)20 For it is written in the book of Psalms, Let his habitation be made desolate, And let no man dwell therein: and, His office let another take.
21 Of the men therefore that have companied with us all the time that the Lord Jesus went in and went out among us,22 beginning from the baptism of John, unto the day that he was received up from us, of these must one become a witness with us of his resurrection.23 And they put forward two, Joseph called Barsabbas, who was surnamed Justus, and Matthias.24 And they prayed, and said, Thou, Lord, who knowest the hearts of all men, show of these two the one whom thou hast chosen,25 to take the place in this ministry and apostleship from which Judas fell away, that he might go to his own place.26 And they gave lots for them; and the lot fell upon Matthias; and he was numbered with the eleven apostles.