previous next

ỌLU NDI-OZI 19

1 O we rue mb͕e Apọlos nọ na Kọrint, na Pọl, mb͕e ọ gabigasiri nime elu ala, ọ biaruru Efesọs, hu madu ufọdu ndi nēso uzọ Jisus: 2 o we si ha, Ùnu natara Mọ Nsọ mb͕e unu kwere? Ha si ya, É-è, kama ayi anughi ọbuná ma enyere Mọ Nsọ. 3 O we si, Ọ̀ bu ibà nime gini kwa ka emere unu baptism? Ha we si, Ibà nime baptism nke Jọn. 4 Pọl we si, Jọn ji baptism nke nchèghari eme baptism, nāsi ndi-Ju ka ha kwere n'Onye ahu Nke gaje ibia n'azu ya, nke ahu bu, na Jisus. 5 Mb͕e ha nuru nka, ewe me ha baptism ibà n'aha Onye-nwe-ayi Jisus. 6 Mb͕e Pọl bikwasisiri ha aka-ya abua n'isi, Mọ Nsọ we biakwasi ha; ha we kwue okwu n'asusu di iche iche ọzọ, bu kwa amuma.

7 Ha nile ra ka ndikom iri na abua.
8 O we ba n'ulo-nzukọ-ha, we nēkwuwa okwu ogologo ọnwa atọ, nāgwa ha okwu n'ihe nile bayere ala-eze Chineke, nēme kwa ka ha kweye ha. 9 Ma mb͕e obi madu ufọdu mere etili, mb͕e ha ghara kwa ikweye, nēkwu ihe ọjọ bayere Uzọ Jisus n'iru ọra madu, o we si n'ebe ha nọ pua, kewapu ndi nēso ụzọ Jisus, nēkwu okwu kwa-ubọchi n'ulo-akwukwọ Tiranọs. 10 Ewe nēme nka ogologo arọ abua; ya mere ndi nile ndi bi n'Esia nuru okwu Onye-nwe-ayi, ma ndi-Ju ma ndi-Grik. 11 Chineke nālu kwa ọlu di ike site n'aka Pọl dika anāhughi mb͕e ọ bula: 12 ya mere anēsi n'aru-ya wetara ndi aru-ha nādighi ike ichafọ ma-ọbu ákwà apron, ọria-ha we la n'aru-ha, ajọ mọ nile aputa kwa. 13 Ma ufọdu nime ndi-Ju ndi nējeghari, bú ndi si na ha nāchupu ndi ajọ mọ, tiye-kwa-ra-aka-ha ikpọkwasi aha Onye-nwe-ayi Jisus n'isi ndi nwere ajọ mọ ahu, nāsi, Ewerem Jisus Onye Pọl nēkwusa b͕a unu iyi. 14 Umu-ndikom asa nke otù onye-Ju, anākpọ Skiva, bú onye-isi-nchu-àjà, di, ndi mere nka. 15 Ajọ mọ ahu we za, si ha, Jisus ka m'matara, ama-kwa-ram Pọl; ma ùnu onwe-unu bu ole ndi? 16 Nwoke ahu onye ajọ mọ di nime ya we wukwasi ha, karia ha abua, o nwe-kwa-ra ike n'aru-ha, ya mere ha si n'ulo ahu b͕apu, b͕ara ọtọ, emeru kwa ha aru. 17 Ewe me ka ndi nile ndi bi n'Efesọs, ma ndi-Ju ma ndi-Grik, mara nka; ha nile we tua egwu, eme-kwa-ra aha Onye-nwe-ayi Jisus ka ọ di uku. 18 Ọtutu madu n'etiti ndi kwereri na Jisus bia-kwa-ra, nēkwuputa, nākọ kwa ihe nile ha nēme. 19 Ọ dighi kwa madu ole-na-ole n'etiti ndi nēme mb͕asi kpokọtara akwukwọ-ha, rechapu ha ọku n'iru ọra madu: ha we gua ọnu-ahia-ha, we hu na ọ bu ọgu nnù ego ọla-ọcha isi na nnù ise.

20 Otú a ka okwu Onye-nwe-ayi were ike nāga n'iru n'iru nādi kwa irè.
21 Ma mb͕e ihe ndia mezuru, Pọl zubere na mọ-ya iga Jerusalem, mb͕e ọ gāgabigasi nime Masedọnia na Akaia, si, Mb͕e m'rusiri ebe ahu, aghaghm ihu kwa Rom.

22 Mb͕e o zigasiri na Masedọnia madu abua nime ndi nējere ya ozi, bú Timọti na Erastọs, ya onwe-ya we nọdu n'Esia nwa oge.
23 Ma ihe di ka oge ahu ọ bughi nkpasu ntà putara bayere Uzọ Jisus. 24 N'ihi na otù nwoke, aha-ya bu Dimitriọs, bú uzú ọla-ọcha, onye nākpu ulo nsọ ntà nke ọla-ọcha nke Daiana, ọ bughi ọlu ntà ka onye ahu nēwetara ndi-ọ̀kà; 25 ndi ọ kpọkọrọ, ha na ndi nālu ọlu di otú ahu, we si, Ndikom, unu mara na ayi nwere àkù-ayi site n'ọlu a. 26 Ma unu nāhu nānu kwa, na ọ bughi nání n'Efesọs kama ọ fọduru ihe ntà ka ọ buru n'Esia nile, ka Pọl nka rafuru oké ìgwè madu wepu kwa ha n'ezi uzọ, ebe ọ nāsi na ihe eji aka me abughi chi: 27 ọ bughi kwa nání na ihe-ize-ndu di na agēlelì ọlu-ayi nka; kama na agāgu kwa ulo nke oké chi-nwanyi ahu, bú Daiana, n'ihe-efu, na agaje kwa isi n'idi-uku-ya weda ya n'ala, onye Esia dum na elu-uwa dum madu bi nāsọpuru. 28 Mb͕e ha nuru nka, ha we juputa n'ọnuma, ti kwa nkpu, si, Daiana nke ndi Efesọs di uku. 29 Obodo ahu we juputa n'aghara ahu: ha we were otù obi nubà nime ebe anēkiri ihe, mb͕e ha jidesiri Gaiọs na Aristakọs, ndi Masedọnia, ndi nēso Pọl n'ije. 30 Ma mb͕e Pọl zubere ibakuru ọra madu ahu, ndi nēso uzọ Jisus ekweghi ya. 31 Ufọdu kwa n'etiti ndi-isi Esia, ebe ha bu ndi-eyì-ya, ha zigara ya ozi, we riọ ya ka ọ ghara inuye onwe-ya nime ebe ahu anēkiri ihe. 32 Ya mere ufọdu nēti nkpu otù ihe, ufọdu nēti kwa ihe ọzọ: n'ihi na nzukọ ahu nāb͕a aghara; ndi kariri n'ọnu-ọgugu n'etiti ha amataghi kwa ihe ha jiri zukọ. 33 Ha we si n'etiti ìgwè madu ahu nupu Aleksanda, ebe ndi-Ju nēnu ya ka o buru uzọ. Aleksanda we kpukpue ha aka, nāchọ ka ọ gọpuru ọra madu onwe-ya. 34 Ma mb͕e ha mazuru na ọ bu onye-Ju, ha nile were otù olu nēti nkpu ihe ra ka oge hour abua, si, Daiana nke ndi Efesọs di uku. 35 Ma mb͕e ode-akwukwọ-ha mesiri ka ìgwè madu ahu jurú, ọ si, Ndikom Efesọs, Ònye di n'etiti madu nke nāmaghi na obodo ndi Efesọs bu odozi-ulo-nsọ, oké Daiana ahu, na nke arusi nke si n'elu-igwe da? 36 Ya mere ebe anāpughi irughari ihe ndia uka, unu aghaghi ijurú, na ighara ime ihe nēchèghi echè. 37 N'ihi na unu kutara ndikom ndia n'ebe a, ndi nābughi ndi nēzu ihe ulo chi n'ori ma-ọbu ndi nēkwulu chi-nwanyi nke ayi. 38 Ya mere ọ buru na Dimitriọs, na ndi-ọ̀kà ndi soro ya, nwere okwu megide onye ọ bula, anēdebe ubọchi ikpé, ndi-isi nọ kwa: ka ha borita onwe-ha ebubo. 39 Ma ọ buru na unu nāchọ ihe ọ bula bayere okwu di iche, agēdozi ya na nzukọ ahu nke ziri ezi n'iwu. 40 N'ihi na ayi nọ n'ihe-ize-ndu na agēji ihe mere ta bo ayi ebubo na ayi biliri megide ndi-isi, ebe ọ nādighi ihe wetara ya: n'ihi ya ayi agaghi-apu kwa iza ajuju bayere nb͕akọ a. 41 Mb͕e o kwusiri okwu ndia, o we zilaga nzukọ ahu.

Acts 19

1 And it came to pass, that, while Apollos was at Corinth, Paul having passed through the upper country came to Ephesus, and found certain disciples:2 and he said unto them, Did ye receive the Holy Spirit when ye believed? And they said unto him, Nay, we did not so much as hear whether the Holy Spirit was given.3 And he said, Into what then were ye baptized? And they said, Into John’s baptism.4 And Paul said, John baptized with the baptism of repentance, saying unto the people that they should believe on him that should come after him, that is, on Jesus.5 And when they heard this, they were baptized into the name of the Lord Jesus.6 And when Paul had laid his hands upon them, the Holy Spirit came on them; and they spake with tongues, and prophesied.7 And they were in all about twelve men.8 And he entered into the synagogue, and spake boldly for the space of three months, reasoning and persuading as to the things concerning the kingdom of God.9 But when some were hardened and disobedient, speaking evil of the Way before the multitude, he departed from them, and separated the disciples, reasoning daily in the school of Tyrannus.10 And this continued for the space of two years; so that all they that dwelt in Asia heard the word of the Lord, both Jews and Greeks.11 And God wrought special miracles by the hands of Paul:12 insomuch that unto the sick were carried away from his body handkerchiefs or aprons, and the evil spirits went out.13 But certain also of the strolling Jews, exorcists, took upon them to name over them that had the evil spirits the name of the Lord Jesus, saying, I adjure you by Jesus whom Paul preacheth.14 And there were seven sons of one Sceva, a Jew, a chief priest, who did this.15 And the evil spirit answered and said unto them, Jesus I know, and Paul I know, but who are ye?16 And the man in whom the evil spirit was leaped on them, and mastered both of them, and prevailed against them, so that they fled out of that house naked and wounded.17 And this became known to all, both Jews and Greeks, that dwelt at Ephesus; and fear fell upon them all, and the name of the Lord Jesus was magnified.18 Many also of them that had believed came, confessing, and declaring their deeds.19 And not a few of them that practised magical arts brought their books together and burned them in the sight of all; and they counted the price of them, and found it fifty thousand pieces of silver.20 So mightily grew the word of the Lord and prevailed.21 Now after these things were ended, Paul purposed in the spirit, when he had passed through Macedonia and Achaia, to go to Jerusalem, saying, After I have been there, I must also see Rome.22 And having sent into Macedonia two of them that ministered unto him, Timothy and Erastus, he himself stayed in Asia for a while.23 And about that time there arose no small stir concerning the Way.24 For a certain man named Demetrius, a silversmith, who made silver shrines of Diana, brought no little business unto the craftsmen;25 whom he gathered together, with the workmen of like occupation, and said, Sirs, ye know that by this business we have our wealth.26 And ye see and hear, that not alone at Ephesus, but almost throughout all Asia, this Paul hath persuaded and turned away much people, saying that they are no gods, that are made with hands:27 and not only is there danger that this our trade come into disrepute; but also that the temple of the great goddess Diana be made of no account, and that she should even be deposed from her magnificence whom all Asia and the world worshippeth.28 And when they heard this they were filled with wrath, and cried out, saying, Great is Diana of the Ephesus.29 And the city was filled with the confusion: and they rushed with one accord into the theatre, having seized Gaius and Aristarchus, men of Macedonia, Paul’s companions in travel.30 And when Paul was minded to enter in unto the people, the disciples suffered him not.31 And certain also of the Asiarchs, being his friends, sent unto him and besought him not to adventure himself into the theatre.32 Some therefore cried one thing, and some another: for the assembly was in confusion; and the more part knew not wherefore they were come together.33 And they brought Alexander out of the multitude, the Jews putting him forward. And Alexander beckoned with the hand, and would have made a defense unto the people.34 But when they perceived that he was a Jew, all with one voice about the space of two hours cried out, Great is Diana of the Ephesians.35 And when the townclerk had quieted the multitude, he saith, Ye men of Ephesus, what man is there who knoweth not that the city of the Ephesians is temple-keeper of the great Diana, and of the image which fell down from Jupiter?36 Seeing then that these things cannot be gainsaid, ye ought to be quiet, and to do nothing rash.37 For ye have brought hither these men, who are neither robbers of temples nor blasphemers of our goddess.38 If therefore Demetrius, and the craftsmen that are with him, have a matter against any man, the courts are open, and there are proconsuls: let them accuse one another.39 But if ye seek anything about other matters, it shall be settled in the regular assembly.40 For indeed we are in danger to be accused concerning this day’s riot, there being no cause for it: and as touching it we shall not be able to give account of this concourse.41 And when he had thus spoken, he dismissed the assembly.