previous next

ỌLU NDI-OZI 2

1 Mb͕e ubọchi Pentikọst nēzu okè, ha nile we nọkọ n'otù ebe. 2 Na mberede ùzù, dika nke oké ifufe nke nēfesi ike, we site n'elu-igwe, o we juputa ulo ahu dum ebe ha nānọdu ala. 3 Ewe me ka ha hu ire, dika nke ọku, nēkesa onwe-ha; o we nọkwasi ha nile n'otù n'otù.

4 Ha nile we juputa na Mọ Nsọ, ha we malite ikwu okwu n'asusu di iche, dika Mọ ahu nēnye ha ike ikwuwa okwu.
5 Ma ndi-Ju ufọdu bi na Jerusalem, ndi nātu egwu Chineke, ndi si na mba nile di n'okpuru elu-igwe bia. 6 Ma mb͕e ùzù ahu putura, ọra madu b͕akọrọ, o we b͕a ha ghari, n'ihi na onye ọ bula n'etiti ha nānu ka ha nēkwu okwu n'asusu nke aka ya. 7 Ibobo we nwua ha nile n'aru, o ju-kwa-ra ha anya, ha si, Le, ndia nile ndi nēkwu okwu, hà abughi ndi Galili? 8 Àyi onwe-ayi si kwa aṅa nu n'otù n'asusu nke aka ayi, nke amuru ayi nime ya? 9 Ndi Patia na ndi Midia na ndi Ilam, na ndi bi na Mesọ-pọtemia, ndi bi kwa nime Judia na Kapa-dọsia, nime Pọntọs na Esia, 10 nime Frijia na Pamafilia, nime Ijipt na akuku Libia di Sairini nso, na ndi-ọbìa si na Rom bia, ma ndi-Ju ma ndi nēso uzọ ndi-Ju, 11 ndi Krit na ndi Arebia, ayi nānu ka ha nēkwu okwu n'asusu-ayi bayere oké ọlu nile nke Chineke. 12 Ibobo we nwua ha nile n'aru, ha nwe-kwa-ra obi abua, nāsirita ibe-ha, Isi ihe a bu gini?

13 Ma ndi ọzọ nēme ha ihe-ọchì, si, Ha ṅujuworo manya-vine ọchu afọ.
14 Ma Pita guzoro, ya na ndi-ozi iri na otù ahu, we welie olu-ya elu, gwawa ha okwu, si, Ndikom nke Judia, na unu nile ndi bi na Jerusalem, maranu nka, ge-kwa-nu nti n'okwum. 15 N'ihi na manya abàghi ndia n'anya, dika unu onwe-unu nēchè; ebe ọ bu oge hour nke-atọ n'ututu;

16 kama nka bu nke ekwuworo site n'ọnu Joel onye-amuma, si,

17 Ọ gēru kwa na mb͕e ikpe-azu, ka Chineke kwuru,
M'gāwusa ufọdu nime Mọm n'aru anu-aru nile, bú madu:
Umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom gēbu kwa amuma,
Umu-okorọbia-unu gāhu kwa ọhù,
Ndi-okenye-unu gārọ kwa nrọ:

18 E, n'aru ndi-orùm ndikom na n'aru ndi-orùm ndinyom
Ka M'gāwusa ufọdu nime Mọ nkem na mb͕e ahu; ha gēbu kwa amuma.

19 M'gēnye kwa ọlu-ebube n'elu-igwe di n'elu,
Na ihe-iriba-ama n'elu ala di n'okpuru ya;
Ọbara, na ọku, na alulu anwuru-ọku:

20 Anyanwu gāb͕anwe ghọ ọchichiri,
Ọnwa gāb͕anwe kwa ghọ ọbara,
Tutu ubọchi Onye-nwe-ayi abia,
Bú oké ubọchi ahu nke nāputa ìhè:

21 O gēru kwa, na onye ọ bula nke gākpọku aha Onye-nwe-ayi, agāzọputa ya.
22 Ndikom nke Israel, nurunu okwu ndia: Jisus Onye Nazaret, bú Nwoke Nke Chineke gosiworo unu site n'ọlu di ike na ọlu-ebube na ihe-iriba-ama, nke Chineke mere site n'aka-Ya n'etiti unu, dika unu onwe-unu matara: 23 Onye a, ebe ewere Ya nye site n'ìzù akara àkà nke Chineke na ọmuma-ihe Chineke buru uzọ mara, Onye a ka unu kpọgidere n'obe b͕u kwa site n'aka ndi nāmaghi iwu-ayi: 24 Onye Chineke mere ka O si n'ọnwu bilie, mb͕e Ọ tọpusiri ihe-nb͕u nke ọnwu: n'ihi na ọnwu apughi ijide Ya.

25 N'ihi na Devid nēkwu okwu bayere Ya, si,
Anamahuri Onye-nwe-ayi n'irum mb͕e nile;
N'ihi na Ọ nọ n'aka-nrim, ka aghara ime ka M'me nkpatu:

26 N'ihi nka ọ tọrọ obim utọ, obi nātọ kwa irem utọ nke-uku;
Ọzọ kwa, anu-arum gēbi kwa n'olile-anya:

27 N'ihi na I gaghi-arapu nkpuru-obim nime Hedis,
I gaghi-enye kwa Onye nke Gi di ọcha n'obi ka Ọ hu ire-uré.

28 I mere ka M'mara uzọ ndu;
I gēji iru-Gi me ka M'juputa n'ọṅù.
29 Umu-nnam, o ziri ezi iwere nkwuwa-okwu gwa unu okwu bayere nna uku ayi Devid, na ọ nwuru, eli kwa ya, ílì-ya di kwa n'etiti ayi rue ubọchi ta. 30 Ya mere ebe ọ bu onye-amuma, mata kwa na Chineke ṅuru ya-ri iyi, na Ọ gēwere otù Onye nime ndi bu nkpuru si ya n'afọ puta me ka Ọ nọkwasi oche-eze-ya; 31 ebe o buru uzọ hu nka a o kwuru okwu bayere nbilite-n'ọnwu nke Kraist ahu, na arapughi Ya nime Hedis, anu-aru-Ya ahughi kwa ire-uré. 32 Jisus nka ka Chineke mere ka O si n'ọnwu bilie, nke ayi onwe-ayi nile bu ndi-àmà-ya. 33 Ya mere, ebe eweliri Ya elu site n'aka-nri Chineke, ebe Ọ nata-kwa-ra n'aka Nna-Ya nkwà ahu, bú Mọ Nsọ, Ọ wusara nka unu onwe-unu nāhu nānu kwa.

34 N'ihi na Devid arigoghi n'elu-igwe: ma ya onwe-ya si,
Onye-nwe-ayi siri Onye-nwem, Nọdu ala n'aka-nrim,

35 Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi nke ukwu-Gi abua.

36 Ya mere ka ulo Israel nile mazue, na Chineke mere Ya ka Ọ buru Onye-nwe-ayi na Kraist-ayi, bú Jisus ahu Onye unu onwe-unu kpọgidere n'obe.
37 Ma mb͕e ha nuru nke a, ewe dua ha nime obi-ha, ha we si Pita na ndi-ozi fọduru, Umu-nna-ayi, gini ka ayi gēme? 38 Pita we si ha, Chègharianu, ka eme kwa unu nile baptism n'otù n'otù n'aha Jisus Kraist, ka ewe b͕aghara nmehie nile unu; unu gānata kwa onyinye a, bú Mọ Nsọ. 39 N'ihi na unu ka nkwa nka diri, na umu-unu, na ndi nile nọ n'ebe di anya, ka ha ra, bú ndi Onye-nwe-ayi Chinike-ayi gākpọtara Onwe-ya. 40 O ji kwa ọtutu okwu ọzọ kwusie okwu ike, nāriọ kwa ha, si, Zọputanu onwe-unu n'ọb͕ọ a di nb͕agọ. 41 Ya mere ndi nāra okwu-ya nke-ọma, emere ha baptism: n'ubọchi ahu ewe tukwasiri ha ihe ra ka nnù madu asa na ọgu iri.

42 Ha we nānọgidesi ike n'ozizí ndi-ozi na nnwekọ, n'inyawa-achicha-ha na ekpere-ha.
43 Madu nile we tua egwu n'otù n'otù: eme-kwa-ra ọtutu ọlu-ebube na ihe-iriba-ama site n'aka ndi-ozi. 44 Ndi nile ndi kwere na Kraist nọkọ-kwa-ra, ha nwekọ-kwa-ra ihe nile; 45 ha we re ihe nile ha natara na ihe nile ha nwere, we kesa ha nye madu nile, dika nkpà diri onye ọ bula. 46 Ha ji kwa otù obi nānọgidesi ike n'ulo uku Chineke kwa-ubọchi, ha nānyawa kwa achicha n'ulo-ha, we nara ihe-oriri-ha n'obi utọ na obi nke aghughọ nādighi ya, 47 ha nēto Chineke, ihe-ha nātọ kwa ndi-Ju dum utọ. Onye-nwe-ayi nātukwasi-kwa-ra ha kwa-ubọchi ndi anāzọputa.

Acts 2

1 And when the day of Pentecost was now come, they were all together in one place.2 And suddenly there came from heaven a sound as of the rushing of a mighty wind, and it filled all the house where they were sitting.3 And there appeared unto them tongues parting asunder, like as of fire; and it sat upon each one of them.4 And they were all filled with the Holy Spirit, and began to speak with other tongues, as the Spirit gave them utterance.5 Now there were dwelling at Jerusalem Jews, devout men, from every nation under heaven.6 And when this sound was heard, the multitude came together, and were confounded, because that every man heard them speaking in his own language.7 And they were all amazed and marvelled, saying, Behold, are not all these that speak Galilaeans?8 And how hear we, every man in our own language wherein we were born?9 Parthians and Medes and Elamites, and the dwellers in Mesopotamia, in Judaea and Cappadocia, in Pontus and Asia,10 in Phrygia and Pamphylia, in Egypt and the parts of Libya about Cyrene, and sojourners from Rome, both Jews and proselytes,11 Cretans and Arabians, we hear them speaking in our tongues the mighty works of God.12 And they were all amazed, and were perplexed, saying one to another, What meaneth this?13 But others mocking said, They are filled with new wine.14 But Peter, standing up with the eleven, lifted up his voice, and spake forth unto them, saying, Ye men of Judaea, and all ye that dwell at Jerusalem, be this known unto you, and give ear unto my words.15 For these are not drunken, as ye suppose; seeing it is but the third hour of the day.16 but this is that which hath been spoken through the prophet Joel:

17 And it shall be in the last days, saith God, I will pour forth of my Spirit upon all flesh: And your sons and your daughters shall prophesy, And your young men shall see visions, And your old men shall dream dreams:

18 Yea and on my servants and on my handmaidens in those days Will I pour forth of my Spirit; and they shall prophesy.

19 And I will show wonders in the heaven above, And signs on the earth beneath; Blood, and fire, and vapor of smoke:

20 The sun shall be turned into darkness, And the moon into blood, Before the day of the Lord come, That great and notable day.

21 And it shall be, that whosoever shall call on the name of the Lord shall be saved.

22 Ye men of Israel, hear these words: Jesus of Nazareth, a man approved of God unto you by mighty works and wonders and signs which God did by him in the midst of you, even as ye yourselves know;23 him, being delivered up by the determinate counsel and foreknowledge of God, ye by the hand of lawless men did crucify and slay:24 whom God raised up, having loosed the pangs of death: because it was not possible that he should be holden of it.25 For David saith concerning him, I beheld the Lord always before my face; For he is on my right hand, that I should not be moved:

26 Therefore my heart was glad, and my tongue rejoiced; Moreover my flesh also shall dwell in hope:

27 Because thou wilt not leave my soul unto Hades, Neither wilt thou give thy Holy One to see corruption.

28 Thou madest known unto me the ways of life; Thou shalt make me full of gladness with thy countenance.

29 Brethren, I may say unto you freely of the patriarch David, that he both died and was buried, and his tomb is with us unto this day.30 Being therefore a prophet, and knowing that God had sworn with an oath to him, that of the fruit of his loins he would set one upon his throne;31 he foreseeing this spake of the resurrection of the Christ, that neither was he left unto Hades, nor did his flesh see corruption.32 This Jesus did God raise up, whereof we all are witnesses.33 Being therefore by the right hand of God exalted, and having received of the Father the promise of the Holy Spirit, he hath poured forth this, which ye see and hear.34 For David ascended not into the heavens: but he saith himself, The Lord said unto my Lord, Sit thou on my right hand,

35 Till I make thine enemies the footstool of thy feet.

36 Let all the house of Israel therefore know assuredly, that God hath made him both Lord and Christ, this Jesus whom ye crucified.37 Now when they heard this, they were pricked in their heart, and said unto Peter and the rest of the apostles, Brethren, what shall we do?38 And Peter said unto them, Repent ye, and be baptized every one of you in the name of Jesus Christ unto the remission of your sins; and ye shall receive the gift of the Holy Spirit.39 For to you is the promise, and to your children, and to all that are afar off, even as many as the Lord our God shall call unto him.40 And with many other words he testified, and exhorted them, saying, Save yourselves from this crooked generation.41 They then that received his word were baptized: and there were added unto them in that day about three thousand souls.42 And they continued stedfastly in the apostles’ teaching and fellowship, in the breaking of bread and the prayers.43 And fear came upon every soul: and many wonders and signs were done through the apostles.44 And all that believed were together, and had all things common;45 and they sold their possessions and goods, and parted them to all, according as any man had need.46 And day by day, continuing stedfastly with one accord in the temple, and breaking bread at home, they took their food with gladness and singleness of heart,47 praising God, and having favor with all the people. And the Lord added to them day by day those that were saved.