ỌLU NDI-OZI 5
1 Ma otù nwoke nke anākpọ aha-ya Ananaias, ya na Safaira nwunye-ya, rere otù ihe o nwere, 2 we debere onwe-ya ufọdu nime ọnu-ahia-ya, nwunye-ya ma-kwa-ra, o we weta otù òkè, tọb͕ọ ya n'ukwu ndi-ozi. 3 Ma Pita siri, Ananaias, n'ìhi gini ka Setan mejuru obi-gi igwa Mọ Nsọ okwu-ugha, na idebere onwe-gi ufọdu nime ọnu-aha nke iberibe ala gi? 4 Mb͕e ọ nānọ, ọ̀ nọgideghi n'aka-gi? mb͕e eresiri ya, ọ̀ dighi kwa n'ike-gi? Gini mere i ji tiye ihe a n'obi-gi? Ọ bughi madu ka i gwara okwu-ugha, kama ọ bu Chineke. 5 Ma mb͕e Ananaias nuru okwu ndia ọ da n'ala, kubìe ume: ndi nile nke nuru ya we tua oké egwu.
6 Ndi bu umu-okorọbia nime ha we bilie, ke ya ákwà, ha we bupu ya lìe ya.
7 Ma ihe ra ka oge hour atọ gasiri, mb͕e nwunye-ya batara nime, nāmataghi ihe emereri. 8 Pita we za ya, si, Gwam, ọ̀ bu ihe ra otú a ka unu rere iberibe ala unu? Ọ si, E, ihe ra otú a. 9 Ma Pita siri ya, Gini mere unu nwere otù olu inwa Mọ nke Onye-nwe-ayi? le, ukwu nke ndi lìri di-gi di n'ọnu-uzọ, ha gēbupu kwa gi. 10 O we da n'ala ngwa ngwa n'ukwu-ya, kubìe ume: umu-okorọbia ahu we bata, hu ya ka ọ nwuru, ha we bupu ya, lìe ya n'akuku di-ya.
11 Nzukọ Kraist dum we tua oké egwu, ha na ndi nile ndi nuru ihe ndia.
12 Ma emere ọtutu ihe-iriba-ama na ọlu-ebube n'etiti ndi-Ju site n'aka ndi-ozi; ha nile were kwa otù obi nọ n'ìbà Solomon. 13 Ma nime ndi fọduru ọ dighi onye ọ bula nwere anya-ike iwere onwe-ya rapara ha n'aru: otú ọ di, ndi-Ju nēme ka ha di uku; 14 ewe tukwasi kari nye Onwe-nye-ayi ndi kwere na Ya, ìgwè madu ma ndkom ma ndinyom; 15 nke mere ka ha nēkupu ọbuná ndi aru nādighi ike, nēdebe ha n'amá, tọb͕ọ ha n'ihe-ndina na ute, ka, mb͕e Pita nāga, ka ọbuná nání onyinyo-ya we kpuchie otù onye nime ha.
16 Ọra madu nke obodo nile di Jerusalem buruburu we nāb͕akọ kwa, nēkuta ndi aru nādighi ike, na ndi ndi-mọ nādighi ọcha nēsob͕u: ewe me ka aru-ha nile n'otù n'otù di ike.
17 Ma onye-isi-nchu-àjà biliri, ya na ndi nile soro ya (nke bu irọ-òtù ndi-Sadusi), ha juputa-kwa-ra n'ekworo, 18 ha we tukwasi aka-ha n'aru ndi-ozi, tubà ha n'ulo-nkpọrọ ọra madu. 19 Ma mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi meghere ọnu-uzọ nile nke ulo-nkpọrọ ahu n'abali, we duputa ha, si, 20 Ganu, guzo, gwa kwa ndi-Ju n'ulo uku Chineke okwu nile nke Ndu a. 21 Ma mb͕e ha nuru nka, ha ba n'ulo uku Chineke mb͕e chi nābọ, we nēzí ihe. Ma onye-isi-nchu-àjà biara, ya na ndi soro ya, we kpọkọ nnọkọ-ikpé-ha, na nzukọ ndi-okenye umu Israel nile, we ziga n'ulo-nkpọrọ, ka ekuta ha. 22 Ma ndi nēje ozi ndi biara ahughi ha n'ulo-nkpọrọ; ha we laghachi, kọrọ ha, 23 si, Ayi huru ulo-nkpọrọ ka emechisiri ya ike nke-ọma, ayi hu-kwa-ra ndi-nche ka ha nēguzo n'ọnu-uzọ: ma mb͕e ayi meghere, ọ dighi onye ọ bula ayi huru nime ya. 24 Ma mb͕e ọchi-agha nke ulo Chineke na ndi-isi-nchu-àjà nuru okwu ndia, ha nwere obi abua nke-uku bayere ha ebe nka gērusi. 25 Ma otù onye biara kọrọ ha, si, Le, ndikom ahu unu tubàra n'ulo-nkpọrọ nọ n'ulo uku Chineke nēguzo nēzí kwa ndi-Ju ihe. 26 Mb͕e ahu ọchi-agha ahu na ndi nēje ozi jere, kuta ha, ma ha ejighi ihe-ike; n'ihi na ha nātu egwu ndi-Ju, ka aghara itu ha nkume. 27 Ma mb͕e ha kutasiri ha, ha guzoro ha n'etiti nnọkọ-ikpé. 28 si, Ayi nyesiri unu iwu ike ka unu ghara izí ihe n'aha nka: ma le, unu ewerewo ozizí-unu meju Jerusalem, unu nēzube kwa iweta ọbara Nwoke a tukwasi ayi n'isi. 29 Ma Pita na ndi-ozi zara, si, Ayi aghaghi ikweyere Chineke kari madu. 30 Chineke nke nna-ayi-hà mere ka Jisus si n'ọnwu bilie, Onye unu onwe-unu b͕uru, nākwuba Ya n'elu osisi. 31 Onye ahu ka Chineke were aka-nri-Ya welie elu ibu Onye-ndú na Onye-nzọputa, inye Israel nchèghari na nb͕aghara nmehie.
32 Ayi onwe-ayi bu kwa ndi-àmà nke ihe ndia; Mọ Nsọ bu kwa onye-àmà, Onye Chineke nyere ndi nēkweyere Ya.
33 Ma mb͕e ha nuru nka, amapue ha n'obi-ha, ha we zube ib͕u ha. 34 Ma otù onye biliri na nnọkọ-ikpé ahu, bú onye-Farisi, aha-ya bu Gameliel, onye nēzí iwu Moses, onye ndi-Ju nile nāsọpuru, o we kwue ka akpọpu madu ahu n'èzí nwa oge. 35 O we si ha, Ndikom nke Israel, nēzenu onwe-unu n'ihe banyere madu ndi a, ihe unu gaje ime. 36 N'ihi na mb͕e ubọchi nda akērughi Teudas biliri, nākpọ onwe-ya ihe; onye ọnu-ọgugu ndikom, ra ka nnù madu, dayere ya: onye eb͕uru; ndi nile, ka ha ra, bú ndi kweyere ya, we b͕asa, ha we ghọ ihe-efu. 37 Mb͕e onye ahu gasiri Judas onye Galili biliri n'ubọchi odide-aha, me kwa ka ufọdu n'etiti ndi-Ju so ya n'azu: onye ahu la-kwa-ra n'iyì; ewe chusa ndi nile, ka ha ra, bú ndi kweyere ya. 38 M'si kwa unu ub͕u a, Wepunu aka n'aru madu ndia, rapu-kwa-nu ha: n'ihi na ọ buru na ìzù a ma-ọbu ọlu a sitere n'aka madu agākwatu ya n'ala: 39 ma ọ buru na o sitere n'aka Chineke, unu agaghi-apu ikwatu ha n'ala; ka aghara ihu unu dika ndi nālu kwa ọ̀gù megide Chineke ma eleghi anya. 40 Ha we kweyere ya: mb͕e ha kpọsiri ndi-ozi biakute ha, ha pia ha ihe, nye ha iwu ka ha ghara ikwu okwu n'aha Jisus, ha we rapu ha ka ha la. 41 Ya mere ha siri n'iru nnọkọ-ikpé ahu la, nāṅuri na aguru ha na ndi kwesiri ka eme ha ihe-ihere n'ihi Aha ahu. 42 Ma kwa-ubọchi, n'ulo uku Chineke na n'ulo nke aka ha, ha adighi-arapu izí ihe na izisa ozi ọma Jisus, na Ọ bu Kraist.
Acts 5
1 But a certain man named Ananias, with Sapphira his wife, sold a possession,2 and kept back part of the price, his wife also being privy to it, and brought a certain part, and laid it at the apostles’ feet.3 But Peter said, Ananias, why hath Satan filled thy heart to lie to the Holy Spirit, and to keep back part of the price of the land?4 While it remained, did it not remain thine own? and after it was sold, was it not in thy power? How is it that thou hast conceived this thing in thy heart? thou has not lied unto men, but unto God.5 And Ananias hearing these words fell down and gave up the ghost: and great fear came upon all that heard it.6 And the young men arose and wrapped him round, and they carried him out and buried him.7 And it was about the space of three hours after, when his wife, not knowing what was done, came in.8 And Peter answered unto her, Tell me whether ye sold the land for so much. And she said, Yea, for so much.9 But Peter said unto her, How is it that ye have agreed together to try the Spirit of the Lord? behold, the feet of them that have buried thy husband are at the door, and they shall carry thee out.10 And she fell down immediately at his feet, and gave up the ghost: and the young men came in and found her dead, and they carried her out and buried her by her husband.11 And great fear came upon the whole church, and upon all that heard these things.12 And by the hands of the apostles were many signs and wonders wrought among the people; and they were all with one accord in Solomon’s porch.13 But of the rest durst no man join himself to them: howbeit the people magnified them;14 and believers were the more added to the Lord, multitudes both of men and women;15 insomuch that they even carried out the sick into the streets, and laid them on beds and couches, that, as Peter came by, at the least his shadow might overshadow some one of them.16 And there also came together the multitudes from the cities round about Jerusalem, bring sick folk, and them that were vexed with unclean spirits: and they were healed every one.17 But the high priest rose up, and all they that were with him (which is the sect of the Sadducees), and they were filled with jealousy,18 and laid hands on the apostles, and put them in public ward.19 But an angel of the Lord by night opened the prison doors, and brought them out, and said,20 Go ye, and stand and speak in the temple to the people all the words of this Life.21 And when they heard this, they entered into the temple about daybreak, and taught. But the high priest came, and they that were with him, and called the council together, and all the senate of the children of Israel, and sent to the prison-house to have them brought.22 But the officers that came found them not in the prison; and they returned, and told,23 saying, The prison-house we found shut in all safety, and the keepers standing at the doors: but when we had opened, we found no man within.24 Now when the captain of the temple and the chief priests heard these words, they were much perplexed concerning them whereunto this would grow.25 And there came one and told them, Behold, the men whom ye put in the prison are in the temple standing and teaching the people.26 Then went the captain with the officers, and brought them, but without violence; for they feared the people, lest they should be stoned.27 And when they had brought them, they set them before the council. And the high priest asked them,28 saying, We strictly charged you not to teach in this name: and behold, ye have filled Jerusalem with your teaching, and intend to bring this man’s blood upon us.29 But Peter and the apostles answered and said, We must obey God rather than men.30 The God of our fathers raised up Jesus, whom ye slew, hanging him on a tree.31 Him did God exalt with his right hand to be a Prince and a Saviour, to give repentance to Israel, and remission of sins.32 And we are witnesses of these things; and so is the Holy Spirit, whom God hath given to them that obey him.33 But they, when they heard this, were cut to the heart, and minded to slay them.34 But there stood up one in the council, a Pharisee, named Gamaliel, a doctor of the law, had in honor of all the people, and commanded to put the men forth a little while.35 And he said unto them, Ye men of Israel, take heed to yourselves as touching these men, what ye are about to do.36 For before these days rose up Theudas, giving himself out to be somebody; to whom a number of men, about four hundred, joined themselves: who was slain; and all, as many as obeyed him, were dispersed, and came to nought.37 After this man rose up Judas of Galilee in the days of the enrolment, and drew away some of the people after him: he also perished; and all, as many as obeyed him, were scattered abroad.38 And now I say unto you, Refrain from these men, and let them alone: for if this counsel or this work be of men, it will be overthrown:39 but if it is of God, ye will not be able to overthrow them; lest haply ye be found even to be fighting against God.40 And to him they agreed: and when they had called the apostles unto them, they beat them and charged them not to speak in the name of Jesus, and let them go.41 They therefore departed from the presence of the council, rejoicing that they were counted worthy to suffer dishonor for the Name.42 And every day, in the temple and at home, they ceased not to teach and to preach Jesus as the Christ.