previous next

NDI KỌLỌSI 3

1 Ya mere, ọ buru na unu soro Kraist-ayi bilikọ, nāchọnu ihe di n'elu, ebe Kraist-ayi nọ, nānọdu n'aka-nri Chineke. 2 Tukwasinu uche n'ihe di n'elu, ọ bughi n'ihe di n'elu uwa. 3 N'ihi na unu nwuru anwu, ezowo kwa ndu-unu n'ebe Kraist-ayi nọ nime Chineke.

4 Mb͕e ọ bula agēme ka Kraist-ayi puta ìhè, Onye bu ndu-ayi, mb͕e ahu ka agēme kwa ka unu onwe-unu so Ya puta ìhè n'ebube.
5 Ya mere, menu ka ihe nile di unu n'aru nke di n'elu uwa nwua; ikwa-iko, adighi-ọcha, ọchichọ ọjọ, agu ihe ọjọ, na anya-uku ahu, n'ihi na nka bu ikpere arusi; 6 ọ bu kwa n'ihi ihe ndia ka iwe Chineke nābiakwasi umu nke ekweyeghi-ekweye; 7 nke unu onwe-unu jeghariri nime ha n'oge gara aga, mb͕e unu nādi ndu nime ihe ndia. 8 Ma ub͕u a unu onwe-unu, tupu-kwa-nu ihe ndia nile; bú iwe, ọnuma, obi ọjọ, nkwulu, ikwu okwu ihere nēsi n'ọnu-unu puta 9 unu ekwula okwu-ugha gwarita ibe-unu; ebe unu yipuchasiworo madu ochie ahu, ya na omume-ya nile, 10 yikwasi kwa madu ọhu ahu, nke anēme ya ka ọ di ọhu rue na nmazu dika onyinyo nke Onye kère ya si di:

11 ebe onye-Grik na onye-Ju, obibì-úgwù na ebìghi-úgwù, onye nāsu asusu ọzọ, onye Sitia, orù, onye nwere onwe-ya, nāpughi idi: ma Kraist bu ihe nile, di kwa nime madu nile.
12 Ya mere dika ndi Chineke rọputara, ndi di nsọ ndi ahuwo-kwa-ra n'anya, yikwasinu obi ebere, obi-ọma, obi di ume-ala, idi-nwayọ, ogologo-ntachi-obi; 13 nānagideritanu ibe-unu, were-kwa-nu amara b͕aghara onwe-unu, asi na onye ọ bula nwere ihe ita onye ọ bula uta; ọbuná dika Onye-nwe-ayi were amara b͕aghara unu, unu onwe-unu me kwa otú a: 14 ma n'elu ihe ndia nile yikwasinu ihu-n'anya, nke bu ihe-nkekọ nke izu-okè. 15 Ka udo nke Kraist nēkpezi kwa okwu n'obi-unu, nke akpọbata-kwa-ra unu nime ya n'otù aru; buru-kwa-nu ndi nēkele ekele. 16 Kwenu ka okwu Kraist were àkù-ya nile biri nime unu n'amam-ihe nile; werenu abù ọma na ukwe na abù nke Mọ Nsọ nēzírita onwe-unu ihe, nādurita kwa onwe-unu ọdu, nime amara enyere unu nābùnu abù nime obi-unu nye Chineke.

17 Ihe nile ọ bula unu nēme kwa, n'okwu ma-ọbu n'ọlu, nēmenu ha nile n'aha Onye-nwe-ayi Jisus, nēkele Chineke, bú Nna-ayi, site n'aka-Ya.
18 Ndi bu nwunye, nēdonu onwe-unu n'okpuru di-unu, dika ọ nēkwesi unu nime Onye-nwe-ayi. 19 Ndi bu di, hunu nwunye-unu n'anya, unu enwe-kwa-la obi ilu n'ebe ha nọ. 20 Umu, nāṅanu nti okwu ndi muru unu n'ihe nile, n'ihi na nka bu ihe nātọ ezi utọ nime Onye-nwe-ayi. 21 Ndi bu nna, akpasula umu-unu iwe, ka obi ghara ifù ha. 22 Ndi-orù, nāṅanu nti okwu ndi bu ndi-nwe-unu n'uzọ anu-aru n'ihe nile; ghara iwere ibu-orù-n'anya nāṅa, dika ndi nēme otú ọ gātọ madu utọ, kama n'afọ-ofufo, nātu egwu Onye-nwe-ayi: 23 ihe ọ bula unu nēme, nālunu ọlu site na nkpuru-obi-unu, dika unu nāluru Onye-nwe-ayi ọlu, ọ bughi kwa madu; 24 ebe unu matara na ọ bu n'aka Onye-nwe-ayi ka unu gānata ihe-nnyeghachi-unu, bú ihe-nketa ahu: unu bu orù nke Onye-nwe-ayi Kraist. 25 N'ihi na onye nēme ajọ omume gānaghachi ajọ omume ahu o mere: ile-madu-anya-n'iru adighi kwa.

Colossians 3

1 If then ye were raised together with Christ, seek the things that are above, where Christ is, seated on the right hand of God.2 Set your mind on the things that are above, not on the things that are upon the earth.3 For ye died, and your life is hid with Christ in God.4 When Christ, who is our life, shall be manifested, then shall ye also with him be manifested in glory.5 Put to death therefore your members which are upon the earth: fornication, uncleanness, passion, evil desire, and covetousness, which is idolatry;6 for which things’ sake cometh the wrath of God upon the sons of disobedience:7 wherein ye also once walked, when ye lived in these things;8 but now do ye also put them all away: anger, wrath, malice, railing, shameful speaking out of your mouth:9 lie not one to another; seeing that ye have put off the old man with his doings,10 and have put on the new man, that is being renewed unto knowledge after the image of him that created him:11 where there cannot be Greek and Jew, circumcision and uncircumcision, barbarian, Scythian, bondman, freeman; but Christ is all, and in all.12 Put on therefore, as God’s elect, holy and beloved, a heart of compassion, kindness, lowliness, meekness, longsuffering;13 forbearing one another, and forgiving each other, if any man have a complaint against any; even as the Lord forgave you, so also do ye:14 and above all these things put on love, which is the bond of perfectness.15 And let the peace of Christ rule in your hearts, to the which also ye were called in one body; and be ye thankful.16 Let the word of Christ dwell in you richly; in all wisdom teaching and admonishing one another with psalms and hymns and spiritual songs, singing with grace in your hearts unto God.17 And whatsoever ye do, in word or in deed, do all in the name of the Lord Jesus, giving thanks to God the Father through him.18 Wives, be in subjection to your husbands, as is fitting in the Lord.19 Husbands, love your wives, and be not bitter against them.20 Children, obey your parents in all things, for this is well-pleasing in the Lord.21 Fathers, provoke not your children, that they be not discouraged.22 Servants, obey in all things them that are your masters according to the flesh; not with eye-service, as men-pleasers, but in singleness of heart, fearing the Lord:23 whatsoever ye do, work heartily, as unto the Lord, and not unto men;24 knowing that from the Lord ye shall receive the recompense of the inheritance: ye serve the Lord Christ.25 For he that doeth wrong shall receive again for the wrong that he hath done: and there is no respect of persons.