NDI KỌLỌSI 4
1 Ndi-nwe madu, nēnye-kwa-nu ndi-orù-unu ihe ziri ezi na nke ra nrata; ebe unu matara na unu onwe-unu nwe-kwa-ra otù Onye Nke bu Onye-nwe-unu n'elu-igwe.
2 Nānọgidesinu ike n'ekpere-unu, nāmu-kwa-nu anya nime ya n'ikele-ekele; 3 nēkpe-kwa-nu ekpere n'ihi ayi n'otù oge ahu, ka Chineke we meghere ayi ọnu-uzọ ikwusa okwu-Ya, ka ayi kwue ihe-omimi nke Kraist, nke m'nọ kwa n'ab͕u n'ihi ya; 4 ka m'we me ka ọ puta ìhè, dika m'nāghaghi ikwu ya. 5 Nējegharinu n'amam-ihe n'ebe ndi nọ n'èzí nọ, nāzuchapuru onwe-unu oge a nile.
6 Ka okwu-unu di n'amara mb͕e nile, ihe eji nnú me ka ọ di utọ, ka unu we mata otú unu nāghaghi iza madu nile ọ bula.
7 Madu nke gēme ka unu mara ihe nile bayere mu onwem bu Tikikọs, onye bu nwa-nna-ayi ahu ahuru n'anya, buru kwa onye kwesiri ntukwasi-obi n'ije-ozi, buru kwa orù-ibem nime Onye-nwe-ayi: 8 onye m'nēzitere unu ime ihe a, ka unu we mara otú ihe nāgara ayi, ka o we kasi kwa obi-unu.
9 Anamezite kwa Ọnisimọs, bú nwa-nna-ayi ahu kwesiri ntukwasi-obi, onye ahu-kwa-ra n'anya, onye bu otù onye n'etiti unu. Ha gēme ka unu mara ihe nile nke anēme n'ebe a.
10 Aristakọs onye adọkọrọ mu na ya n'agha nēkele unu, ya na Mak nwa-nne Banabas (onye unu natara ihe ufọdu enyere n'iwu bayere ya; asi na ọ biakute unu, naranu ya nke-ọma), 11 Jisus kwa, onye anākpọ Justọs, madu atọ ndia sitere n'obibì-úgwù: nání ndia bu ndi sorom nālukọ ọlu n'ikwusa ala-eze Chineke, madu ndi emere ka ha burum ndi-ngugù-obi. 12 Epafras, onye bu otù onye n'etiti unu, orù nke Kraist Jisus, nēkele unu, nāb͕asi nb͕a ike n'ihi unu n'ekpere-ya nile mb͕e nile, ka unu we guzo dika ndi zuru okè ndi kwezuwo-kwa-ra ihe nile Chineke nāchọ. 13 N'ihi na anamab͕ara ya àmà, na ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu nke-uku nye unu na ndi nọ na Leọdisia na ndi nọ na Hierapọlis. 14 Luk, bú dibia nke ahuru n'anya, nēkele unu, ya na Dimas. 15 Kelenu umu-nna-ayi ndi nọ na Leọdisia, na Nimfas, na nzukọ Kraist nke di n'ulo-ha. 16 Ma mb͕e ọ bula agāgusi akwukwọ-ozi a n'etiti unu, menu ka agu kwa ya na nzukọ Kraist nke ndi Leọdisia; lezi-kwa-nu anya ka unu onwe-unu gu kwa akwukwọ ozi ahu si na Leọdisia bia.
17 Ọzọ, sinu Akipọs, Lezie ije-ozi nke i natara nime Onye-nwe-ayi anya, ka i jezu ya.
18 Ekele nke mu Pọl, nke m'ji aka nkem de. Chetanu ab͕um. Ka amara diyere unu.
Colossians 4
1 Masters, render unto your servants that which is just and equal; knowing that ye also have a Master in heaven.2 Continue stedfastly in prayer, watching therein with thanksgiving;3 withal praying for us also, that God may open unto us a door for the word, to speak the mystery of Christ, for which I am also in bonds;4 that I may make it manifest, as I ought to speak.5 Walk in wisdom toward them that are without, redeeming the time.6 Let your speech be always with grace, seasoned with salt, that ye may know how ye ought to answer each one.7 All my affairs shall Tychicus make known unto you, the beloved brother and faithful minister and fellow-servant in the Lord:8 whom I have sent you for this very purpose, that ye may know our state, and that he may comfort your hearts;9 together with Onesimus, the faithful and beloved brother, who is one of you. They shall make known unto you all things that are done here.10 Aristarchus my fellow-prisoner saluteth you, and Mark, the cousin of Barnabas (touching whom ye received commandments; if he come unto you, receive him),11 and Jesus that is called Justus, who are of the circumcision: these only are my fellow-workers unto the kingdom of God, men that have been a comfort unto me.12 Epaphras, who is one of you, a servant of Christ Jesus, saluteth you, always striving for you in his prayers, that ye may stand perfect and fully assured in all the will of God.13 For I bear him witness, that he hath much labor for you, and for them in Laodicea, and for them in Hierapolis.14 Luke, the beloved physician, and Demas salute you.15 Salute the brethren that are in Laodicea, and Nymphas, and the church that is in their house.16 And when this epistle hath been read among you, cause that it be read also in the church of the Laodiceans; and that ye also read the epistle from Laodicea.17 And say to Archippus, Take heed to the ministry which thou hast received in the Lord, that thou fulfil it.18 The salutation of me Paul with mine own hand. Remember my bonds. Grace be with you.