previous next

NDI EFESỌS 1

1 Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus site n'ọchichọ nke Chineke, nēdegara ndi nsọ ndi nọ n'Efesọs, na ndi kwere na Kraist Jisus, akwukwọ:

2 Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke, bu Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta.
3 Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Onye were ngọzi nile ọ bula nke Mọ Nsọ gọzie ayi n'ebe di n'elu-igwe nime Kraist: 4 dika Ọ roputara ayi nime Ya mb͕e akātọghi ntọ-ala uwa, ka ayi we di nsọ buru kwa ndi anāpughi ita uta n'iru Ya n'ihu-n'anya: 5 ebe O buru uzọ ka ayi àkà ka ewe site n'aka Jisus Kraist do ayi ka umu-Ya ndikom, dika ọ di Ya ezi nma n'ọchichọ-Ya, 6 ka ewe to ebube nke amara-Ya, bú nke O were amara me ka ayi nara n'aka-Ya nime Onye ahu Ọ huru n'anya: 7 Onye ayi sitere n'ọbara-Ya nwe nb͕aputa-ayi nime Ya, bú nb͕aghara nke ndahie nile ayi, dika àkù nke amara-Ya si di, 8 nke O mere ka ọ babigara ayi ókè n'amam-ihe na uche nile, 9 mb͕e O mesiri ka ayi mara ihe-omimi nke ihe Ọ chọrọ, dika ọ di Ya ezi nma, bú ihe O zubere nime Ya, 10 rue ọchichi-èzi-na-ulo nke ozuzù oge akara àkà, ichikọta ihe nile nime Kraist-ayi dika Isi, bú ihe nile di n'elu-igwe, na ihe nile di n'elu uwa; nime Ya, ka m'kwuru, 11 Nke eme-kwa-ra ayi ka ayi buru ihe-nketa nime Ya, ebe eburu uzọ ka ayi àkà dika Onye ahu zubere, Onye nālusi ihe nile ike dika ìzù nke ọchichọ-Ya si di; 12 ka ayi we buru ihe agēji to ebube-Ya, ayi ndi leworo anya Kraist na mbu: 13 Onye unu onwe-unu nọ kwa nime Ya, mb͕e unu nuru okwu nke ezi-okwu ahu, bú ozi ọma nke nzọputa-unu, ọ bu kwa nime Ya, mb͕e unu kwekwa-ra na Ya, ka eji Mọ Nsọ nke nkwa ahu ka unu akàrà,

14 bú Mọ Nsọ, Onye bu ihe ayi ji mara na ayi gēketazu ihe-nketa-ayi, rue nb͕aputa nke ihe Chineke nwetara, ka ewe to ebube-Ya.
15 N'ihi nka mu onwem kwa, ebe m'nuru okwu bayere okwukwe di nime unu nke unu kwere n'Onye-nwe-ayi Jisus, na ihu-n'anya unu ji hu ndi nsọ nile, 16 ewepughi m aka n'ikele ekele bayere unu, nēhotakwa unu n'ekperem; 17 ka Chineke nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, bú Nna nke ebube, we nye unu Mọ nke amam-ihe na nkpughe nime nmazu-Ya; 18 ebe emeworo ka anya obi-unu nara ìhè, ka unu we mata ihe bu olile-anya nke ọkpukpọ-Ya, mata kwa ihe bu àkù nke ebube nke ihe-nketa-Ya n'etiti ndi nsọ Ya, 19 mata kwa otú ike-Ya di uku ri nne n'ebe ayi nọ, bú ndi kwere, dika ilusi-ọ1u-ike nke idi-ike nke ike-Ya si di, 20 nke Ọ lusiri ike nime Kraist, mb͕e O mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, me kwa ka Ọ nọdu n'aka-nri-Ya n'ebe di n'elu-igwe, 21 kachasi ha nile elu, bú ibu-onye-isi, na ichi-isi, na ike, na ibu-onye-nwe-madu, na aha ọ bula anākpọ ya aha, ọ bughi nání n'oge a, kama ọ bu kwa n'oge nke gaje ibia: 22 O do-kwa-ra ihe nile n'okpuru ukwu-Ya abua, ọ bu kwa Ya onwe-ya ka O mere ka Ọ buru isi n'elu ihe nile n'ebe nzukọ-Ya nọ, 23 nke bu aru-Ya, ozuzù nke Onye ahu Nke nāluzu ihe nile nime madu nile.

Ephesians 1

1 Paul, an apostle of Christ Jesus through the will of God, to the saints that are at Ephesus, and the faithful in Christ Jesus:2 Grace to you and peace from God our Father and the Lord Jesus Christ.3 Blessed be the God and Father of our Lord Jesus Christ, who hath blessed us with every spiritual blessing in the heavenly places in Christ:4 even as he chose us in him before the foundation of the world, that we should be holy and without blemish before him in love:5 having foreordained us unto adoption as sons through Jesus Christ unto himself, according to the good pleasure of his will,6 to the praise of the glory of his grace, which he freely bestowed on us in the Beloved:7 in whom we have our redemption through his blood, the forgiveness of our trespasses, according to the riches of his grace,8 which he made to abound toward us in all wisdom and prudence,9 making known unto us the mystery of his will, according to his good pleasure which he purposed in him10 unto a dispensation of the fulness of the times, to sum up all things in Christ, the things in the heavens, and the things upon the earth; in him, I say,11 in whom also we were made a heritage, having been foreordained according to the purpose of him who worketh all things after the counsel of his will;12 to the end that we should be unto the praise of his glory, we who had before hoped in Christ:13 in whom ye also, having heard the word of the truth, the gospel of your salvation,-- in whom, having also believed, ye were sealed with the Holy Spirit of promise,14 which is an earnest of our inheritance, unto the redemption of God’s own possession, unto the praise of his glory.15 For this cause I also, having heard of the faith in the Lord Jesus which is among you, and the love which ye show toward all the saints,16 cease not to give thanks for you, making mention of you in my prayers;17 that the God of our Lord Jesus Christ, the Father of glory, may give unto you a spirit of wisdom and revelation in the knowledge of him;18 having the eyes of your heart enlightened, that ye may know what is the hope of his calling, what the riches of the glory of his inheritance in the saints,19 and what the exceeding greatness of his power to us-ward who believe, according to that working of the strength of his might20 which he wrought in Christ, when he raised him from the dead, and made him to sit at his right hand in the heavenly places,21 far above all rule, and authority, and power, and dominion, and every name that is named, not only in this world, but also in that which is to come:22 and he put all things in subjection under his feet, and gave him to be head over all things to the church,23 which is his body, the fulness of him that filleth all in all.