previous next

NDI EFESỌS 3

1 N'ihi nka mu onwem Pọl, onye-nkpọrọ nke Kraist Jisus n'ihi unu ndi mba ọzọ, 2 asi na ọ bu ezie na unu nuru okwu bayere ọchichi-èzí-na-ulo nke amara Chineke ahu nke enyerem n'ebe unu nọ; 3 na emere ka m'mara ihe-omimi ahu n'uzọ nkpughe, dika m'deworo n'akwukwọ a na mbu n'okwu ole-na-ole, 4 nke unu gēji pu ihuta nghọtam n'ihe-omimi nke Kraist, mb͕e unu guru ya; 5 nke anēmeghi ka umu madu mara ya n'ọb͕ọ ọzọ, dika ekpughere ya ub͕u a nye ndi-ozi-Ya na ndi-amuma-Ya di nsọ nime Mọ Nsọ; 6 bú, na ndi mba ọzọ bu ndi soro ayi ketakọ ihe, na idikọ n'otù aru, na ikèkọ nkwa ahu nime Kraist Jisus site n'ozi ọma, 7 nke emerem ka m m'buru onye nēje ozi ya, dika onyinye nke amara ahu nke Chineke si di nke enyerem dika ilusi-ọlu-ike nke ike-Ya si di. 8 Ọ bu mu onwem, bú onye di ntà kari onye dikarisiri ntà n'etiti ndi nsọ nile, ka enyere amara nka, izisara ndi mba ọzọ ozi ọma nke àkù nke Kraist nke anēnweghi ike ituputa ya; 9 na inye ha nile ìhè ihu ihe bu ọchichi-èzí-na-ulo nke ihe-omimi ahu nke ezoworo nime Chineke site n'oge nile, Onye kère ihe nile; 10 ka ewe me ub͕u a ka ibu-isi nile na ike nile nke di n'ebe di n'elu-igwe mara ọtutu okpukpu amam-ihe Chineke di iche iche site n'aka nzukọ-Ya, 11 dika ìzù nke mb͕e nile ebighi-ebi si di nke O zubere nime Kraist-ayi, bú Jisus Onye-nwe-ayi: 12 ọ bu kwa nime Ya ka ayi sitere n'okwukwe nke ayi kwere na Ya nwe nkwuwa-okwu na nkpọbata nime ntukwasi-obi.

13 N'ihi nka ariọm aririọ ka ike ghara igwu unu n'obi nime nkpab͕um nile n'ihi unu, nke bu otuto-unu.
14 Ọ bu n'ihi nka ka m'ji b͕ue ikperèm abua n'ala nye Nna-ayi, 15 Onye esitere na Ya gu eriri-nna nile ọ bula n'elu-igwe na n'elu uwa aha, 16 ka O we nye unu, dika àkù nke ebube-Ya si di, ka ewere ike me ka unu di ike site n'aka Mọ-Ya nābata nime madu ime unu; 17 ka Kraist we site n'okwukwe-unu bigide nime obi-unu; ka unu, ebe unu b͕agideworo nkpọrọgwu nime ihu-n'anya buru kwa ndi atọworo ntọ-ala nime ya, 18 ka unu we nara ike ighọta, unu na ndi nsọ nile, ihe bu obodobo na ogologo na idi-elu na omimi,

19 na imara ihu-n'anya Kraist nke kariri ọmuma nke-uku ri nne, ka ewe me ka unu zue ezù rue ozuzù nile nke Chineke.
20 Ma otuto diri Onye ahu Onye puru imebiga ókè nke-uku ri nne kari ihe nile nke ayi nāriọ ma-ọbu nke ayi nātughari uche, dika ike nke nālusi ike nime ayi si di, 21 otuto diri Ya nime nzukọ-Ya na nime Kraist Jisus rue ọb͕ọ nile nke mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

Ephesians 3

1 For this cause I Paul, the prisoner of Christ Jesus in behalf of you Gentiles,--2 if so be that ye have heard of the dispensation of that grace of God which was given me to you-ward;3 how that by revelation was made known unto me the mystery, as I wrote before in few words,4 whereby, when ye read, ye can perceive my understanding in the mystery of Christ;5 which in other generations was not made known unto the sons of men, as it hath now been revealed unto his holy apostles and prophets in the Spirit;6 to wit, that the Gentiles are fellow-heirs, and fellow-members of the body, and fellow-partakers of the promise in Christ Jesus through the gospel,7 whereof I was made a minister, according to the gift of that grace of God which was given me according to the working of his power.8 Unto me, who am less than the least of all saints, was this grace given, to preach unto the Gentiles the unsearchable riches of Christ;9 and to make all men see what is the dispensation of the mystery which for ages hath been hid in God who created all things;10 to the intent that now unto the principalities and the powers in the heavenly places might be made known through the church the manifold wisdom of God,11 according to the eternal purpose which he purposed in Christ Jesus our Lord:12 in whom we have boldness and access in confidence through our faith in him.13 Wherefore I ask that ye may not faint at my tribulations for you, which are your glory.14 For this cause I bow my knees unto the Father,15 from whom every family in heaven and on earth is named,16 that he would grant you, according to the riches of his glory, that ye may be strengthened with power through his Spirit in the inward man;17 that Christ may dwell in your hearts through faith; to the end that ye, being rooted and grounded in love,18 may be strong to apprehend with all the saints what is the breadth and length and height and depth,19 and to know the love of Christ which passeth knowledge, that ye may be filled unto all the fulness of God.20 Now unto him that is able to do exceeding abundantly above all that we ask or think, according to the power that worketh in us,21 unto him be the glory in the church and in Christ Jesus unto all generations for ever and ever. Amen.