previous next

NDI EFESỌS 4

1 Ya mere mu onwem, bú onye-nkpọrọ nime Onye-nwe-ayi, nāriọ unu ka unu jegharia dika o kwesiri ọkpukpọ nke akpọrọ unu, 2 n'obi di ume-ala na idi-nwayọ nile, n'ogologo ntachi-obi, nānagiderita ibe-unu nime ihu-n'anya; 3 nānu ọku n'obi idebe idi-n'otù nke Mọ Nsọ nime ihe-ọkiké nke bu udo. 4 Otù aru di, otù Mọ di kwa, dika akpọ-kwa-ra unu nime otù olile-anya nke ọkpukpọ-unu; 5 otù Onye-nwe-ayi di, otù okwukwe di, otù baptism di, 6 otù Chineke na Nna nke ayi nile di, Onye bu isi ayi nile, Onye site-kwa-ra n'aka ayi nile nālu ọlu, Onye nānọ kwa nime ayi nile.

7 Ma ọ bu ayi nile n'otù n'otù ka enyere amara ahu dika ọtùtù nke onyinye Kraist si di.

8 N'ihi nka Ọ si,
Mb͕e Ọ rigoro n'elu, Ọ dọtara usu ndi adọtara n'agha n'agha,
Nye kwa madu onyinye di iche iche.
9 (Ma okwu nka, Ọ rigoro, gini ka ọ bu ma-ọbughi na Ọ rida-kwa-ra nime akuku uwa dikariri ala? 10 Onye ridara bu kwa Onye ahu Nke rigoro n'ebe kachasi elu-igwe nile elu nke-uku, ka O we mezu ihe nile.) 11 Ya onwe-ya nye-kwa-ra ufọdu ka ha buru ndi-ozi; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi-amuma; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi nēzisa ozi ọma; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi nāzù aturu Chineke na ndi-ozizí; 12 ime ka ndi nsọ zu okè ilu ọlu nke ije-ozi, iwuli aru nke Kraist elu dika ulo: 13 rue mb͕e ayi nile gēru idi-n'otù nke okwukwe na nke nmazu nke Ọkpara Chineke, ru ibu nwoke tozuru okè, ru ọtùtù nke ogologo nke ozuzù nke Kraist: 14 ka ayi we ghara ibu umu ọhu ọzọ, ndi ifufe nile ọ bula nke ozizí nēfeghari nēbughari kwa, nime itu-ntu nke madu, nime aghughọ, nke ha ji ezuputa nduhie; 15 kama ka ayi we nēso ezi-okwu nime ihu-n'anya, we tó etó rue nime Ya n'ihe nile, Onye bu isi-ayi, bú Kraist;

16 Onye aru nile, ebe anēwere nkwonkwo nile ọ bula nke nnyezu kwukọ ya nke-ọma jikọ kwa ya, dika ilusi-ọ1u-ike nke akuku nile ọ bula n'otù n'otù n'ọtùtù-ha si di, aru nile ahu nēsite na Ya nēme ka aru ba uba iwuli onwe-ya elu dika ulo nime ihu-n'anya.
17 Ya mere nka ka m'nēkwu, kwusi kwa ike nime Onye-nwe-ayi, ka unu ghara ijeghari ọzọ dika ndi mba ọzọ nējeghari kwa, n'ihe-efu nke uche-ha, 18 n'ihi na emewo ka ha b͕a ọchichiri n'èchìchè-uche-ha, eme kwa ka ha buru ndi ala ọzọ n'ebe ndu nke Chineke di n'ihi amaghi-ihe di nime ha, n'ihi na anēme ka obi-ha me etili; 19 madu ndi, ebe nmehie-ha nādighi-ewuta ha ọzọ, ha rara onwe-ha nye n'aka agu ikwa-iko, iluputa adighi-ọcha nile nime anya-uku. 20 Ma unu onwe-unu amutaghi Kraist-ayi otú a; 21 asi na ọ bu ezie na ọ bu Ya onwe-ya ka unu nuru, asi kwa na ọ bu nime Ya ka ezíri unu ihe, dika ezi-okwu di nime Jisus: 22 ka unu tupu madu ochie unu, nke nēmebi emebi n'uzọ agu nke aghughọ, dika ibi-obi-unu na mbu si di; 23 ka eme kwa ka unu di ọhu na mọ nke uche-unu,

24 ka unu yikwasi kwa madu ọhu unu, nke ekère dika Chineke chọrọ nime ezi omume na idi-ọcha nke ezi-okwu ahu.

25 N'ihi nka, ebe unu tupuru okwu-ugha, nēkwunu ezi-okwu onye ọ bula n'ebe onye-ab͕ata-obi-ya nọ: n'ihi na ayi nāburita ihe di n'aru ibe-ayi.
26 Unu emehiela mb͕e unu nēwe iwe: ekwela anyanwu da na nkpasu-iwe-unu: 27 enye-kwa-la ekwensu uzọ. 28 Ka onye nēzu ori ghara izu kwa ori ọzọ: kama ka ọ dọb͕u onwe-ya n'ọlu, nēji aka ya abua lu ezi ihe, ka o we nwe ihe ya na onye nọ na nkpà gēketa. 29 Ka okwu ọ bula nke ruru aru ghara isi n'ọnu-unu puta, kama ihe bu ezi ihe, iwuli madu elu dika ulo, dika nkpà si di, ka o we nye ndi nānu ya amara. 30 Unu eme-kwa-la ihe gēwuta Mọ Nsọ nke Chineke, Onye akara unu akàrà nime Ya rue ubọchi nb͕aputa. 31 Ka ewepu ihe-ilu na ọnuma na iwe na iti-nkpu na nkwulu nile, ha na obi ọjọ nile, n'etiti unu: 32 nweritanu obiọma n'aru ibe-unu, nwenu obi ọmiko, were-kwa-nu amara b͕aghara onwe-unu, dika Chineke were-kwa-ra amara b͕aghara unu nime Kraist.

Ephesians 4

1 I therefore, the prisoner in the Lord, beseech you to walk worthily of the calling wherewith ye were called,2 with all lowliness and meekness, with longsuffering, forbearing one another in love;3 giving diligence to keep the unity of the Spirit in the bond of peace.4 There is one body, and one Spirit, even as also ye were called in one hope of your calling;5 one Lord, one faith, one baptism,6 one God and Father of all, who is over all, and through all, and in all.7 But unto each one of us was the grace given according to the measure of the gift of Christ.8 Wherefore he saith, When he ascended on high, he led captivity captive, And gave gifts unto men.9 (Now this, He ascended, what is it but that he also descended into the lower parts of the earth?10 He that descended is the same also that ascended far above all the heavens, that he might fill all things.)11 And he gave some to be apostles; and some, prophets; and some, evangelists; and some, pastors and teachers;12 for the perfecting of the saints, unto the work of ministering, unto the building up of the body of Christ:13 till we all attain unto the unity of the faith, and of the knowledge of the Son of God, unto a fullgrown man, unto the measure of the stature of the fulness of Christ:14 that we may be no longer children, tossed to and fro and carried about with every wind of doctrine, by the sleight of men, in craftiness, after the wiles of error;15 but speaking truth in love, we may grow up in all things into him, who is the head, even Christ;16 from whom all the body fitly framed and knit together through that which every joint supplieth, according to the working in due measure of each several part, maketh the increase of the body unto the building up of itself in love.17 This I say therefore, and testify in the Lord, that ye no longer walk as the Gentiles also walk, in the vanity of their mind,18 being darkened in their understanding, alienated from the life of God, because of the ignorance that is in them, because of the hardening of their heart;19 who being past feeling gave themselves up to lasciviousness, to work all uncleanness with greediness.20 But ye did not so learn Christ;21 if so be that ye heard him, and were taught in him, even as truth is in Jesus:22 that ye put away, as concerning your former manner of life, the old man, that waxeth corrupt after the lusts of deceit;23 and that ye be renewed in the spirit of your mind,24 and put on the new man, that after God hath been created in righteousness and holiness of truth.25 Wherefore, putting away falsehood, speak ye truth each one with his neighbor: for we are members one of another.26 Be ye angry, and sin not: let not the sun go down upon your wrath:27 neither give place to the devil.28 Let him that stole steal no more: but rather let him labor, working with his hands the thing that is good, that he may have whereof to give to him that hath need.29 Let no corrupt speech proceed out of your mouth, but such as is good for edifying as the need may be, that it may give grace to them that hear.30 And grieve not the Holy Spirit of God, in whom ye were sealed unto the day of redemption.31 Let all bitterness, and wrath, and anger, and clamor, and railing, be put away from you, with all malice:32 and be ye kind one to another, tenderhearted, forgiving each other, even as God also in Christ forgave you.