NDI GALETIA 5
1 Kraist mere ka ayi pua n'orù ka ayi we nwere onwe-ayi: ya mere nēguzosinu ike, unu ekwela ka ewere yoke nke bu ibu-orù jide unu ọzọ.
2 Le, mu onwem Pọl si unu, na, asi na unu ekwe ka ebì unu úgwù, Kraist agaghi-abara unu urù ọ bula. 3 Ma agwasim onye ọ bula ike, bú onye kwere ka ebì ya úgwù, na ọ bu onye ji ugwọ idebe iwu ahu dum. 4 Atọpuru unu n'aru Kraist, unu ndi nāchọ ka ewere iwu gua unu na ndi ezi omume; unu siri n'amara dapu. 5 N'ihi na ayi onwe-ayi ji Mọ Nsọ nēchesi ihe anēle anya ike, bú ezi omume, site n'okwukwe. 6 N'ihi na nime Kraist Jisus ọ dighi ike ọ bula obibì-úgwù ma-ọbu ebìghi-úgwù nwere; kama nke nwere ike bu okwukwe nke sitere n'aka ihu-n'anya alusi ọlu ike. 7 Unu nāb͕arì ọsọ nke-ọma; ònye b͕ochiri unu, ka unu ghara ikweyere ezi-okwu ahu? 8 Nkweye ahu emere ka unu kweye esiteghi n'Onye ahu Nke nākpọ unu. 9 Ihe-iko-achicha di ntà nēko ob͕e utu ọka agwọrọ agwọ dum. 10 Mu onwem atukwasiwo obim n'ebe unu nọ nime Onye-nwe-ayi, na unu agaghi-atukwasi uche n'ihe ọ bula ọzọ: ma onye nēme ka obi lọ unu miri gēbu ikpé-ya, onye ọ bula. 11 Ma mu onwem, umu-nnam, ọ buru na anọm nēkwusa ibì-úgwù, gini mere anọ nēsob͕um? m'kwusa otú a, emewo ka ọnyà nka, bú obe, ghara idi irè.
12 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ndi nēkpù unu iru gēme onwe-ha onozi.
13 N'ihi na unu onwe unu, umu-nnam, ka akpọrọ ka unu nwere onwe-unu; nání unu ewerela inwe-onwe-unu ahu nye ka ọ buru ihe anu-aru-unu gēji me ihe kama werenu ihunanya burita orù ibe-unu. 14 N'ihi na edebezuwo iwu nile n'otù okwu, bú nka; Hu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi.
15 Ma ọ buru na unu atarita ibe-unu aru, ripia kwa ibe-unu, lezienu anya ka unu ghara ikpochapurita onwe-unu.
16 Ma asim, Nējegharinu site na Mọ Nsọ, unu agaghi-emezu kwa agu nke anu-aru maọli. 17 N'ihi na agu nāgu anu-aru megide Mọ Nsọ, agu nāgu kwa Mọ Nsọ megide anu-aru; n'ihi na ndia nēmegide onwe-ha; ka unu we ghara ime ihe ndia ọ bula unu nāchọ ime. 18 Ma ọ buru na Mọ Nsọ nēdu unu, unu anọghi n'okpuru iwu. 19 Ma ọlu nile nke anu-aru putara ìhè, nke di ka ndia, ikwa-iko, adighi-ọcha, agu ikwa-iko, 20 ikpere-arusi, igwọ-ńsí, ibu-iro, esem-okwu, ekworo, ọnuma, ikpa-iche-iche, nkewa, irọ-òtù, 21 ikpọ-asì, iṅubiga-manya-ókè, ite-egwú, na ihe yiri ihe ndia: nke m'buru uzọ gwa unu, dika m'buru uzọ gwa unu n'oge gara aga, na ndi nēme ihe di otú a agaghi-eketa ala-eze Chineke. 22 Ma nkpuru nke Mọ Nsọ bu ihu-n'anya, ọṅù, udo, ogologo-ntachi-obi; obi-ọma, idi-nma, ikwesi-ntukwasi-obi, 23 idi-nwayọ, imerū-ihe-n'ókè: ọ dighi iwu nēmegide ihe nile di otú a.
24 Ma ndi nke Kraist-ayi Jisus kpọgidere anu-aru-ha n'obe, ya na ọchichọ ọjọ nile na agu ihe ọjọ nile di ya.
25 Ọ buru na ayi di ndu site na Mọ Nsọ, ka ayi nāgazi kwa site na Mọ Nsọ. 26 Ka ayi ghara ighọ ndi nāchọ otuto efu, nāchọrita ibe-ayi okwu, nākpọrita ibe-ayi asì.
Galatians 5
1 For freedom did Christ set us free: stand fast therefore, and be not entangled again in a yoke of bondage.2 Behold, I Paul say unto you, that, if ye receive circumcision, Christ will profit you nothing.3 Yea, I testify again to every man that receiveth circumcision, that he is a debtor to do the whole law.4 Ye are severed from Christ, ye would be justified by the law; ye are fallen away from grace.5 For we through the Spirit by faith wait for the hope of righteousness.6 For in Christ Jesus neither circumcision availeth anything, nor uncircumcision; but faith working through love.7 Ye were running well; who hindered you that ye should not obey the truth?8 This persuasion came not of him that calleth you.9 A little leaven leaveneth the whole lump.10 I have confidence to you-ward in the Lord, that ye will be none otherwise minded: but he that troubleth you shall bear his judgment, whosoever he be.11 But I, brethren, if I still preach circumcision, why am I still persecuted? then hath the stumbling-block of the cross been done away.12 I would that they that unsettle you would even go beyond circumcision.13 For ye, brethren, were called for freedom; only use not your freedom for an occasion to the flesh, but through love be servants one to another.14 For the whole law is fulfilled in one word, even in this: Thou shalt love thy neighbor as thyself.15 But if ye bite and devour one another, take heed that ye be not consumed one of another.16 But I say, walk by the Spirit, and ye shall not fulfil the lust of the flesh.17 For the flesh lusteth against the Spirit, and the Spirit against the flesh; for these are contrary the one to the other; that ye may not do the things that ye would.18 But if ye are led by the Spirit, ye are not under the law.19 Now the works of the flesh are manifest, which are these: fornication, uncleanness, lasciviousness,20 idolatry, sorcery, enmities, strife, jealousies, wraths, factions, divisions, parties,21 envyings, drunkenness, revellings, and such like; of which I forewarn you, even as I did forewarn you, that they who practise such things shall not inherit the kingdom of God.22 But the fruit of the Spirit is love, joy, peace, longsuffering, kindness, goodness, faithfulness,23 meekness, self-control; against such there is no law.24 And they that are of Christ Jesus have crucified the flesh with the passions and the lusts thereof.25 If we live by the Spirit, by the Spirit let us also walk.26 Let us not become vainglorious, provoking one another, envying one another.