previous next

NDI GALETIA 6

1 Umu-nnam, asi na ọ bu ezie na anwude madu mb͕e ọ nọ na ndahie ọ bula, unu onwe-unu, bú ndi Mọ Nsọ nāchi, menu ka madu di otú a guzozie nime mọ nke idi-nwayọ; nēlezi onwe-gi anya, ka aghara inwa kwa gi onwe-gi. 2 Nēburitanu ibu nānyi ibe-unu, nēdebezu-kwa-nu iwu Kraist n'uzọ di otú a. 3 N'ihi na asi na madu nēchè na ya bu ihe, mb͕e ọ nābughi ihe ọ bula, ọ nāghọ onwe-ya aghughọ n'obi. 4 Ma ka onye ọ bula nwaputa ọlu nke aka ya, mb͕e ahu ka ọ gēnwe kwa ihe ọ gānyara isi n'ebe nání ya onwe-ya nọ, ọ bughi kwa n'ebe ibe-ya nọ.

5 N'ihi na madu nile n'otù nọtù gēbu ibu nke aka ha.
6 Ma onye ewere okwu ọnu nēzi okwu Chineke, ya me ka onye nēwere okwu ọnu nēzi ya so ya nēnwekọ ezi ihe nile. 7 Una ekwela ka eduhie unu; Chineke abughi onye anēlelì: n'ihi na nkpuru ọ bula madu nāgha, nke ahu ka ọ gēweta kwa n'ubi. 8 N'ihi na onye nāgha nkpuru nye anu-aru onwe-ya gēsite n'anu-aru ahu weta nmebi dika ihe-ubi; ma onye nāgha nkpuru nye Mọ Nsọ gēsite na Mọ Nsọ weta ndu ebighi-ebi dika ihe-ubi 9 Ma ike agwula ayi n'obi n'ime ihe ọma: n'ihi na ayi gēweta ihe-ubi mb͕e oge-ya ruru, ma ayi adaghi #mbà.

10 Ya mere otú a, otú ayi nwere oge, ka ayi nālu ezi ihe n'ebe madu nile nọ, ma ka ayi nālu ezi ihe karisia n'ebe ndi èzí-na-ulo nke okwukwe-ayi nọ.
11 Lenu otú nkpuru-akwukwọ m'ji aka nkem degara unu di okpotokpo. 12 Ka ha ra, bú ndi nāchọ ka ha ma nma n'anu-aru n'iru madu, ndi ahu nērugide unu ka ebì unu úgwù; ihe ha ji me ya bu nání ka ewe ghara isob͕u ha n'ihi obe Kraist. 13 N'ihi na ndi kwere ka ebì ha úgwù, ọbuná ha onwe-ha adighi-edebe iwu; kama ha nācho ka ebì unu úgwù, ka ha we nya isi n'anu-aru unu onwe-unu. 14 Ma Chineke ekwela ka m'nya isi, ma-ọbughi n'obe Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, nke esiteworo na ya kpọgide uwa n'ebe m'nọ, kpọgide kwa mu onwem n'ebe uwa di. 15 N'ihi na obibì-úgwù abughi ihe, ebìghi-úgwù abughi kwa ihe, kama ọ bu òkìkè ọhu.

16 Ka ha ra kwa, bú ndi gāgazi dika ihe-ọtùtù a si di, udo dikwasi ha, ya na ebere, dikwasi kwa Israel nke Chineke.
17 Site n'ub͕u a ka onye ọ bula ghara isob͕um: n'ihi na mu onwem nēbu n'arum apa di iche iche nēgosi na abum onye Jisus. 18 Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere mọ-unu, umu-nnam. Amen.

Galatians 6

1 Brethren, even if a man be overtaken in any trespass, ye who are spiritual, restore such a one in a spirit of gentleness; looking to thyself, lest thou also be tempted.2 Bear ye one another’s burdens, and so fulfil the law of Christ.3 For if a man thinketh himself to be something when he is nothing, he deceiveth himself.4 But let each man prove his own work, and then shall he have his glorying in regard of himself alone, and not of his neighbor.5 For each man shall bear his own burden.6 But let him that is taught in the word communicate unto him that teacheth in all good things.7 Be not deceived; God is not mocked: for whatsoever a man soweth, that shall he also reap.8 For he that soweth unto his own flesh shall of the flesh reap corruption; but he that soweth unto the Spirit shall of the Spirit reap eternal life.9 And let us not be weary in well-doing: for in due season we shall reap, if we faint not.10 So then, as we have opportunity, let us work that which is good toward all men, and especially toward them that are of the household of the faith.11 See with how large letters I write unto you with mine own hand.12 As many as desire to make a fair show in the flesh, they compel you to be circumcised; only that they may not be persecuted for the cross of Christ.13 For not even they who receive circumcision do themselves keep the law; but they desire to have you circumcised, that they may glory in your flesh.14 But far be it from me to glory, save in the cross of our Lord Jesus Christ, through which the world hath been crucified unto me, and I unto the world.15 For neither is circumcision anything, nor uncircumcision, but a new creature.16 And as many as shall walk by this rule, peace be upon them, and mercy, and upon the Israel of God.17 Henceforth, let no man trouble me; for I bear branded on my body the marks of Jesus.18 The grace of our Lord Jesus Christ be with your spirit, brethren. Amen.