NDI-HIBRU 1
1 Chineke, mb͕e Ọ gwarari nna-ayi-hà okwu n'oge ochie nime ndi-amuma n'iberibe-akwukwọ di iche iche na uzọ di iche iche, 2 Ọ gwara ayi okwu n'ọgwugwu ubọchi ndia nime Ọkpara, Onye O doro onye-nketa nke ihe nile, Onye O site-kwa-ra n'aka-Ya me uwa nile; 3 Onye, ebe Ọ bu nnwupu nke ebube-Ya na onyinyo nke udi-Ya, ebe O nēbu kwa ihe nile site n'okwu nke ike-Ya, mb͕e Ọ sachasiri nmehie nile ayi, O we nọdu n'aka-nri nke Idi-uku ahu di n'elu; 4 ebe emere Ya-ri ka Ọ ka ndi-mọ-ozi nma n'uzọ ra otú O ketawa aha nke ka nma.
5 N'ihi na ọ̀ bu onye n'etiti ndi-mọ-ozi ka Ọ siri mb͕e ọ bula,
Ọkparam ka Gi onwe-gi bu,
Mu onwem amuwo Gi ta?
ọzọ kwa,
Mu onwem gāburu Ya Nna,
Ya onwe-ya gābu-kwa-ram Ọkpara?
6 Ma ọzọ kwa, mb͕e ọ bula Ọ gākpọbatawori Ọkpara ahu n'elu-uwa ebe madu bi, Ọ si, Ka ndi-mọ-ozi nile nke Chineke kpọ kwa isi ala nye Ya.
7 Ọ nēkwu kwa ihe bayere ndi-mọ-ozi, si,
Onye nēme ndi-mọ-ozi-Ya ka ha buru ifufe,
Nēme kwa ndi nējere Ya ozi ka ha buru ọku nēnwu enwu:
8 ma Ọ nēkwu ihe bayere Ọkpara ahu, si,
Oche-eze-gi, Chineke, nādiru mb͕e nile ebighi-ebi;
Nkpa-n'aka-eze nke izi-ezi ka nkpa-n'aka nke ala-eze-Gi bu kwa.
9 I huru ezi omume n'anya, we kpọ nmebi-iwu asì;
N'ihi nka Chineke, bú Chineke-Gi, tere Gi
Manu obi-utọ n'isi kari ndi-nketa-ibe-Gi.
10 Ọzọ kwa,
Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, na mbu ka I tọrọ ntọ-ala nke uwa;
Ọlu aka-Gi ka elu-igwe bu kwa:
11 Ha onwe-ha gāla n'iyì; ma Gi onwe-gi nānọgide:
Ha nile gāka kwa nká dika uwe;
12 Dika ákwà-nb͕okwasi ka I gāpiakọta kwa ha,
Dika uwe, agāb͕anwe kwa ha:
Ma Gi onwe-gi bu Onye ahu Nke nādi mb͕e nile,
Arọ-Gi nile agaghi-agwu kwa agwu.
13 Ma ọ̀ bu onye n'etiti ndi-mọ-ozi ka O kwuworo okwu bayere ya mb͕e ọ bula, si,
Nọdu ala n'aka-nrim,
Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi ukwu-Gi abua?
14 Hà nile abughi ndi-mọ nēfè òfùfè, ndi eziputara ije ozi n'ihi ndi gaje iketa nzọputa?
Hebrews 1
1 God, having of old time spoken unto the fathers in the prophets by divers portions and in divers manners,2 hath at the end of these days spoken unto us in his Son, whom he appointed heir of all things, through whom also he made the worlds;3 who being the effulgence of his glory, and the very image of his substance, and upholding all things by the word of his power, when he had made purification of sins, sat down on the right hand of the Majesty on high;4 having become by so much better than the angels, as he hath inherited a more excellent name than they.5 For unto which of the angels said he at any time, Thou art my Son, This day have I begotten thee? and again, I will be to him a Father, And he shall be to me a Son?
6 And when he again bringeth in the firstborn into the world he saith, And let all the angels of God worship him.7 And of the angels he saith, Who maketh his angels winds, And his ministers a flame a fire:
8 but of the Son he saith, Thy throne, O God, is for ever and ever; And the sceptre of uprightness is the sceptre of thy kingdom.
9 Thou hast loved righteousness, and hated iniquity; Therefore God, thy God, hath anointed thee With the oil of gladness above thy fellows.
10 And, Thou, Lord, in the beginning didst lay the foundation of the earth, And the heavens are the works of thy hands:
11 They shall perish; but thou continuest: And they all shall wax old as doth a garment;
12 And as a mantle shalt thou roll them up, As a garment, and they shall be changed: But thou art the same, And thy years shall not fail.
13 But of which of the angels hath he said at any time, Sit thou on my right hand, Till I make thine enemies the footstool of thy feet?
14 Are they not all ministering spirits, sent forth to do service for the sake of them that shall inherit salvation?