previous next

NDI-HIBRU 10

1 N'ihi na iwu ahu, ebe o nwere nání onyinyo nke ezi ihe ahu nile gaje ibia, ọ bughi ezi oyiyi onwe-ya nke ihe ndia, ha apughi ime ka ndi nābiaru ha nso zue okè mb͕e ọ bula, site n'otù àjà ndia nke ha nēche n'iru Chineke kwa-arọ mb͕e nile. 2 N'ihi na ma ọ dighi otú a, àgaghi-echebìwori ha n'iru Chineke, n'ihi na ndi nēkpe ekpere, ebe emeworo ka ha di ọcha otù mb͕e, ha agaghi-enwe akọ-na-uche ọ bula nke nmehie di iche iche ọzọ? 3 Ma nime àjà ndia ncheta nke nmehie di kwa-arọ.

4 N'ihi na ọbara nke oke-ehi na nke ewu apughi iwepu nmehie.

5 N'ihi nka mb͕e Ọ nābia n'uwa, Ọ si,
Àjà na ihe echere n'iru Gi, I chọghi ha,
Ma aru ka I kwadebere nyem;

6 Àjà-nsuresi-ọku na àjà achuru bayere nmehie, ha abughi ihe di Gi ezi nma:

7 Mb͕e ahu ka M'siri, Le, abiawom
(N'akwukwọ-npiakọta ka edeworo ihe bayerem)
Ime ihe I nācho, Chineke.
8 Mb͕e O buru uzọ kwu, si, Àjà na ihe echere n'iru Gi na àjà-nsuresi-ọku na àjà achuru bayere nmehie, I chọghi ha, ha abughi kwa ihe di Gi ezi nma (bú ihe anēche n'iru Chineke dika iwu si di), 9 mb͕e ahu ka Ọ siworo, Le, abiawom ime ihe I nāchọ. Ọ nēwepu nke-mbu, ka O we me ka nke-abua guzo. 10 Ọ bu kwa n'ọchichọ a ka edoworo ayi nsọ site n'iche aru Jisus Kraist n'iru Chineke dika àjà nání otù mb͕e. 11 Onye-nchu-àjà ọ bula nēguzo kwa kwa-ubọchi nēfè òfùfè nēche kwa otù àjà ndia n'iru Chineke ọtutu mb͕e, bú àjà nke nāpughi ihichapu nmehie mb͕e ọ bula: 12 ma Onye ahu, mb͕e O chereri otù àjà n'iru Chineke n'ihi nmehie, O we nọdu n'aka-nri Chineke mb͕e nile; 13 nēle anya n'oge fọduru rue mb͕e agēdo ndi-iro-Ya dika ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwu-Ya abua. 14 N'ihi na O sitewo n'iche Onwe-ya n'iru Chineke dika àjà otù mb͕e me ka ndi anēdo nsọ zue okè mb͕e nile.

15 Mọ Nsọ nāb͕a-kwa-ra ayi àmà: n'ihi na mb͕e O kwuru, si,

16 Nka bu ọb͕ub͕a-ndu nke Mu na ha gāb͕a
Mb͕e ubọchi ahu gasiri, ka Onye-nwe-ayi kwuru;
M'gētiye iwum n'obi-ha,
Ọ bu kwa n'uche-ha ka M'gēdekwasi ha dika n'akwukwọ;
mb͕e ahu Ọ si,

17 M'gaghi-echeta kwa nmehie nile ha na nmebi-iwu nile ha ọzọ ma-ọli.

18 Ma ebe nb͕aghara ihe ndia di, iche àjà n'iru Chineke bayere nmehie adighi ọzọ.
19 Ya mere, umu-nnam, ebe ayi nwere nkwuwa-okwu ibà n'ebe nsọ ahu site n'ọbara Jisus, 20 bú uzọ O mere ọhu nye ayi, nke di ọhu di kwa ndu, site n'ákwà-nb͕ochi, nke ahu bu, anu-aru-Ya; 21 ebe ayi nwe-kwa-ra Onye-nchu-àjà uku edoro onye-isi èzí-na-ulo Chineke; 22 ka ayi were obi ezi-okwu biarue nso nime nkwezu nke okwukwe, buru kwa ndi efesaworo ọbara n'obi-ayi pua n'ajọ akọ-na-uche, ndi asachawo-kwa-ra aru-ayi na miri di ọcha: 23 ka ayi jidesie nkwuputa nke olile-anya-ayi ike ka ọ ghara iruda n'ala; n'ihi na Onye ahu Nke kwere nkwa kwesiri ntukwasi-obi: 24 ka ayi nātugharita kwa uche n'aru ibe-ayi ikpasu ihu-n'anya na ọlu ọma di iche iche;

25 ka ayi ghara kwa irapu nzukọ nke onwe-ayi, dika ufọdu nēme, kama ka ayi nādusi ndi ọzọ ọdu ike; ka ayi me kari kwa otú a, n'uzọ ra otú unu nēle ubọchi ahu anya ka ọ nābiaru nso.
26 N'ihi na asi na ayi were ọchichọ-obi nānọ na nmehie mb͕e ayi nataworo nmazu nke ezi-okwu, àjà agāchu bayere nmehie di iche iche afọdughi ọzọ, 27 kama nke fọduru bu oké olile-anya di egwu nke ikpé, ya na ọku nēre ike ike nke gaje iripia ndi nēguzogide Chineke. 28 Onye ọ bula nke juworo iwu Moses gānwu anwu nēmereghi ya ebere n'okwu ndi-àmà abua ma-ọbu atọ: 29 ma àhuhu ahu jọkariri njọ ra aṅa, bú nke agāgu na onye ahu kwesiri ka enye ya, ka unu chère, bú onye nke zọworo Ọkpara Chineke ukwu, onye guwo-kwa-ra ọbara nke ọb͕ub͕a-ndu ahu, bú nke eji do ya nsọ, n'ihe emeruru emeru, onye mewo-kwa-ra Mọ nke amara ihe-ihere? 30 N'ihi na ayi matara Onye ahu Nke siri, Mu nwe ọ́bọ̀, Mu onwem gēnyeghachi. Ọzọ kwa, Onye-nwe-ayi gēkpe ndi-Ya ikpé.

31 Ọ bu ihe di egwu idabà n'aka Chineke di ndu.
32 Ma nēchetanu ubọchi mbu ahu, nke ọ bu nime ha, mb͕e enyesiri unu ìhè, ka unu tachiri obi n'oké ib͕a-nb͕a nke ahuhu di iche iche; 33 n'otù akuku, ebe ewere ita-uta na nkpab͕u di iche iche me unu ka unu buru ihe-nkiri; n'akuku ọzọ, ebe unu ghọrọ ndi nēso ndi nēbi obi otú a nwekọ ahuhu. 34 N'ihi na unu ji obi so ndi nọ n'ab͕u hukọ ahuhu, unu were kwa ọṅù nara npunara ahu nke-ọma, bú nke apunara unu ihe nile unu nwere, ebe unu mara na unu nwere onwe-unu dika ihe unu nwere, bú ihe ka nma nke nādigide kwa. 35 Ya mere unu etufula nkwuwa-okwu-unu, bú ihe nke nwere oké nnyeghachi nke ugwọ-ọlu.

36 N'ihi na ntachi-obi di unu nkpà, ka ọ gābu, mb͕e unu meworo ihe Chineke nāchọ, ka unu we nata nkwa ahu.

37 N'ihi na le ka nwa oge ntà fọduru ra,
Onye ahu Nke nābia gābia, Ọ gaghi-anọ kwa ọdù.

38 Ma onye ezi omume nkem gēsite n'okwukwe di ndu:
Ọ buru kwa na ọ gēwezuga onwe-ya, ihe-ya adighi nkpuru-obim ezi nma.
39 Ma ayi onwe-ayi adighi n'etiti ndi wezugara onwe-ha ila n'iyì; kama ayi di n'etiti ndi kwere ekwe inweta nkpuru-obi-ha.

Hebrews 10

1 For the law having a shadow of the good things to come, not the very image of the things, can never with the same sacrifices year by year, which they offer continually, make perfect them that draw nigh.2 Else would they not have ceased to be offered? because the worshippers, having been once cleansed, would have had no more consciousness of sins.3 But in those sacrifices there is a remembrance made of sins year by year.4 For it is impossible that the blood of bulls and goats should take away sins.5 Wherefore when he cometh into the world, he saith, Sacrifice and offering thou wouldest not, But a body didst thou prepare for me;

6 In whole burnt offerings and sacrifices for sin thou hadst no pleasure:

7 Then said I, Lo, I am come (In the roll of the book it is written of me) To do thy will, O God.

8 Saying above, Sacrifices and offerings and whole burnt offerings and sacrifices for sin thou wouldest not, neither hadst pleasure therein (the which are offered according to the law),9 then hath he said, Lo, I am come to do thy will. He taketh away the first, that he may establish the second.10 By which will we have been sanctified through the offering of the body of Jesus Christ once for all.11 And every priest indeed standeth day by day ministering and offering oftentimes the same sacrifices, the which can never take away sins:12 but he, when he had offered one sacrifice for sins for ever, sat down on the right hand of God;13 henceforth expecting till his enemies be made the footstool of his feet.14 For by one offering he hath perfected for ever them that are sanctified.15 And the Holy Spirit also beareth witness to us; for after he hath said,

16 This is the covenant that I will make with them After those days, saith the Lord: I will put my laws on their heart, And upon their mind also will I write them; then saith he,

17 And their sins and their iniquities will I remember no more.

18 Now where remission of these is, there is no more offering for sin.19 Having therefore, brethren, boldness to enter into the holy place by the blood of Jesus,20 by the way which he dedicated for us, a new and living way, through the veil, that is to say, his flesh;21 and having a great priest over the house of God;22 let us draw near with a true heart in fulness of faith, having our hearts sprinkled from an evil conscience: and having our body washed with pure water,23 let us hold fast the confession of our hope that it waver not; for he is faithful that promised:24 and let us consider one another to provoke unto love and good works;25 not forsaking our own assembling together, as the custom of some is, but exhorting one another; and so much the more, as ye see the day drawing nigh.26 For if we sin wilfully after that we have received the knowledge of the truth, there remaineth no more a sacrifice for sins,27 but a certain fearful expectation of judgment, and a fierceness of fire which shall devour the adversaries.28 A man that hath set at nought Moses law dieth without compassion on the word of two or three witnesses:29 of how much sorer punishment, think ye, shall he be judged worthy, who hath trodden under foot the Son of God, and hath counted the blood of the covenant wherewith he was sanctified an unholy thing, and hath done despite unto the Spirit of grace?30 For we know him that said, Vengeance belongeth unto me, I will recompense. And again, The Lord shall judge his people.31 It is a fearful thing to fall into the hands of the living God.32 But call to remembrance the former days, in which, after ye were enlightened, ye endured a great conflict of sufferings;33 partly, being made a gazingstock both by reproaches and afflictions; and partly, becoming partakers with them that were so used.34 For ye both had compassion on them that were in bonds, and took joyfully the spoiling of you possessions, knowing that ye have for yourselves a better possession and an abiding one.35 Cast not away therefore your boldness, which hath great recompense of reward.36 For ye have need of patience, that, having done the will of God, ye may receive the promise.

37 For yet a very little while, He that cometh shall come, and shall not tarry.

38 But my righteous one shall live by faith: And if he shrink back, my soul hath no pleasure in him.

39 But we are not of them that shrink back unto perdition; but of them that have faith unto the saving of the soul.