NDI-HIBRU 13
1 Ka ihu-n'anya-unu n'ebe umu-nna-unu nọ nādigide. 2 Unu echezọla ile ndi-ọbìa nke-ọma: n'ihi na ufọdu esitewo na nka le ndi-mọ-ozi ọbìa nāmaghi ama. 3 Nēchetanu ndi nọ n'ab͕u, dika ndi ekekọworo unu na ha n'ab͕u; nēchetanu ndi anēmejọ, dika ndi unu onwe-unu nọ kwa n'aru. 4 Ka ilu-di-na-nwunye buru ihe anāsọpuru n'etiti unu nile, ka ihe-ndina-unu buru kwa ihe adighi-emeru emeru: n'ihi na Chineke gēkpe ndi nākwa iko ikpé, ha na ndi nākwa iko, bú ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di. 5 Ka ọchichọ-obi-unu ghara idi n'ihu-n'anya ego; ka afọ ju unu n'ihe unu nwere ub͕u a: n'ihi na Ya onwe-ya ekwuwo, si, M'gaghi-ara gi aka ma-ọli, M'gaghi-arapu kwa gi ma-ọli.
6 Ya mere ayi were obi-ike si,
Onye-nwe-ayi bu onye nēyerem aka;
Gini ka madu gēmem?
7 Nēchetanu ndi-isi-unu, bú madu ndi gwara unu okwu Chineke; nēkiri-kwa-nu ọpupu nke ibi-obi-ha, nēṅomi-kwa-nu okwukwe-ha. 8 Jisus Kraist di otù aka ahu nnyahu na ta, ma rukwa mb͕e nile ebighi-ebi. 9 Unu ekwela ka ewere ozizí di iche iche nke si kwa n'ebe ọzọ puta duhie unu: n'ihi na ọ di nma ka ewere amara me ka obi-unu guzosie ike; ka aghara iwere ihe-oriri, nke ọ dighi mb͕e ha bara ndi jeghariri nime ha urù. 10 Ayi nwere ebe-ichu-àjà, nke ndi nēkpe ekpere n'ulo-ikwū Chineke nēnweghi ike iri ihe si nime ya puta. 11 N'ihi na ozu anu nile nke anēwebata ọbara-ha n'ebe nsọ site n'aka onye-isi-nchu-àjà dika àjà achuru bayere nmehie, anērechapu ozu ahu ọku n'azu ọmuma-ulo-ikwū. 12 N'ihi nka Jisus, ka O we site n'ọbara nke Ya onwe-ya do ndi nke Ya nsọ, Ọ hu-kwa-ra ahuhu n'azu ọnu-uzọ-ama nke obodo. 13 Ya mere, ka ayi pukuru Ya n'azu ọmuma-ulo-ikwū, nēbu ita-uta-Ya. 14 N'ihi na ayi enweghi obodo n'ebe a nke nādigide, kama ayi nāchọ obodo ahu nke gaje ibia. 15 Ya mere, ka ayi site n'aka-Ya nāchu àjà, bú otuto, nye Chineke mb͕e nile, nke ahu bu, nkpuru eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwuputa nye aha-Ya. 16 Ma unu echezọla ime ihe di nma na ime ka unu na ndi ọzọ nwekọ ihe-unu: n'ihi na àjà di otú a nātọ Chineke ezi utọ.
17 Nēkweyenu ndi-isi-unu, nēdo-kwa-nu onwe-unu n'okpuru ha: n'ihi na ndi ahu nāmu anya n'ihi nkpuru-obi-unu, dika ndi gāza ajuju bayere unu: ka ha we were ọṅù me nka, ghara isu udè: n'ihi na nka gābu ihe nābaghi unu urù.
18 Nēkpenu ekpere bayere ayi: n'ihi na emere ka ayi kweye na ayi nwere akọ-na-uche ọma, ebe ayi nāchọ ibi obi nke-ọma n'ihe nile.
19 Ma anamariọbiga unu ókè kari ime nka, ka ewe werem nyeghachi unu ọsọsọ kari.
20 Ma Chineke nke udo, Onye were ọbara nke ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ahu si na ndi nwuru anwu kughachi oké Onye-ọzùzù-aturu nke aturu-Ya, bú Onye- nwe-ayi Jisus,
21 Ya me ka unu zue okè n'ezi ihe nile ọ bula ime ihe Ọ nāchọ, nēme nime ayi ihe nātọ ezi utọ n'iru Ya, site n'aka Jisus Kraist; Onye otuto nile diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.
22 Ma ariọm unu, umu-nnam, nānagidenu okwu aririọ a: n'ihi na anamewere okwu ole-na-ole degara unu akwukwọ-ozi.
23 Maranu na arapuwo nwa-nna-ayi Timọti ka ọ la; ọ buru kwa na ọ gābia na mb͕e ntà, mu na Ya gāhu unu anya.
24 Kelenu ndi-isi-unu nile na ndi nsọ nile. Ndi Itali nēkele unu.
25 Ka amara diyere unu nile. Amen.
Hebrews 13
1 Let love of the brethren continue.2 Forget not to show love unto strangers: for thereby some have entertained angels unawares.3 Remember them that are in bonds, as bound with them; them that are illtreated, as being yourselves also in the body.4 Let marriage be had in honor among all, and let the bed be undefiled: for fornicators and adulterers God will judge.5 Be ye free from the love of money; content with such things as ye have: for himself hath said, I will in no wise fail thee, neither will I in any wise forsake thee.6 So that with good courage we say, The Lord is my helper; I will not fear: What shall man do unto me?
7 Remember them that had the rule over you, men that spake unto you the word of God; and considering the issue of their life, imitate their faith.8 Jesus Christ is the same yesterday and to-day, yea and for ever.9 Be not carried away by divers and strange teachings: for it is good that the heart be established by grace; not by meats, wherein they that occupied themselves were not profited.10 We have an altar, whereof they have no right to eat that serve the tabernacle.11 For the bodies of those beasts whose blood is brought into the holy place by the high priest as an offering for sin, are burned without the camp.12 Wherefore Jesus also, that he might sanctify the people through his own blood, suffered without the gate.13 Let us therefore go forth unto him without the camp, bearing his reproach.14 For we have not here an abiding city, but we seek after the city which is to come.15 Through him then let us offer up a sacrifice of praise to God continually, that is, the fruit of lips which make confession to his name.16 But to do good and to communicate forget not: for with such sacrifices God is well pleased.17 Obey them that have the rule over you, and submit to them: for they watch in behalf of your souls, as they that shall give account; that they may do this with joy, and not with grief: for this were unprofitable for you.18 Pray for us: for we are persuaded that we have a good conscience, desiring to live honorably in all things.19 And I exhort you the more exceedingly to do this, that I may be restored to you the sooner.20 Now the God of peace, who brought again from the dead the great shepherd of the sheep with the blood of an eternal covenant, even our Lord Jesus,21 make you perfect in every good thing to do his will, working in us that which is well-pleasing in his sight, through Jesus Christ; to whom be the glory for ever and ever. Amen.22 But I exhort you, brethren, bear with the word of exhortation, for I have written unto you in few words.23 Know ye that our brother Timothy hath been set at liberty; with whom, if he come shortly, I will see you.24 Salute all them that have the rule over you, and all the saints. They of Italy salute you.25 Grace be with you all. Amen.