previous next

NDI-HIBRU 5

1 N'ihi na onye-isi-nchu-àjà ọ bula, esi n'etiti madu weputa ya, ọ bu n'ihi madu ka anēdo ya onye-isi-nchu-àjà n'ihe diri Chineke, ka o we nēche onyinye na àjà di iche iche n'ihi nmehie n'iru Chineke: 2 ọ bu kwa onye puru iwere nwayọ nēmeso ndi nāmaghi ihe ndi nējehie kwa ejehie, n'ihi na adighi-ike di kwa ya onwe-ya gburugburu; 3 n'ihi nka o ji kwa ugwọ iche àjà n'iru Chineke n'ihi nmehie, dika ọ nēchere ndi Israel, otú ahu ọ nēche-kwa-ra onwe-ya. 4 Ọ dighi kwa onye ọ bula nānara nsọpuru a n'onwe-ya, kama mb͕e Chineke nākpọ ya, ọbuná dika Ọ kpọ-kwa-ra Eron.

5 Otú a Kraist enyeghi kwa Onwe-ya otuto ka ewe me Ya onye-isi-nchu-àjà, kama ọ bu Onye siri Ya,
Ọkparam ka Gi onwe-gi bu,
Mu onwem amuwo Gi ta:

6 dika O si kwu kwa n'ebe di iche, si,
Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi
Dika usoro Melkizedek si di.
7 Onye n'ubọchi nke anu-aru-Ya, mb͕e Ọ weresiri ikwa-ákwá siri ike na anya-miri che ekpere na aririọ n'iru Onye ahu puru izọputa Ya n'ọnwu, mb͕e anusi-kwa-ra olu-Ya n'ihi na Ọ turu egwu Chineke, 8 ọ bu ezie na Ọ bu Ọkpara, ma Ọ mutara iṅa-nti-Ya site n'ahuhu nile Ọ huru; 9 ebe emesiri Ya ka O zue okè, O we ghọrọ ndi nile nāṅa Ya nti Onye nēwetara ha nzọputa ebighi-ebi;

10 Onye Chineke nyere aha onye-isi-nchu-àjà dika usoro Melkizedek si di.
11 Onye okwu ayi nwere ikwu bayere ya di uku, di kwa ike isughari asusu, ebe unu ghọworo ndi nwere nti ike. 12 N'ihi na mb͕e unu kwesiri ibu ndi-ozizí n'ihi oge, ọ di unu nkpà ọzọ ka madu zí unu ihe bu ihe-ozizí mbu nke nmalite okwu si n'ọnu Chineke puta; unu aghọwo kwa ndi miri-ara di nkpà, ọ bughi nri siri ike. 13 N'ihi na onye ọ bula nke nēketa miri-ara bu onye akānwaghi ya n'okwu ezi omume; n'ihi na ọ bu nwa ọhu. 14 Ma nri siri ike bu nke ndi tozuru okè, ndi anwaworo nghọta-ha n'ihi omume ha nēme mb͕e dum itule ihe ọma na ihe ọjọ.

Hebrews 5

1 For every high priest, being taken from among men, is appointed for men in things pertaining to God, that he may offer both gifts and sacrifices for sins:2 who can bear gently with the ignorant and erring, for that he himself also is compassed with infirmity;3 and by reason thereof is bound, as for the people, so also for himself, to offer for sins.4 And no man taketh the honor unto himself, but when he is called of God, even as was Aaron.5 So Christ also glorified not himself to be made a high priest, but he that spake unto him, Thou art my Son, This day have I begotten thee:

6 as he saith also in another place, Thou art a priest for ever After the order of Melchizedek.

7 Who in the days of his flesh, having offered up prayers and supplications with strong crying and tears unto him that was able to save him from death, and having been heard for his godly fear,8 though he was a Son, yet learned obedience by the things which he suffered;9 and having been made perfect, he became unto all them that obey him the author of eternal salvation;10 named of God a high priest after the order of Melchizedek.11 Of whom we have many things to say, and hard of interpretation, seeing ye are become dull of hearing.12 For when by reason of the time ye ought to be teachers, ye have need again that some one teach you the rudiments of the first principles of the oracles of God; and are become such as have need of milk, and not of solid food.13 For every one that partaketh of milk is without experience of the word of righteousness; for he is a babe.14 But solid food is for fullgrown men, even those who by reason of use have their senses exercised to discern good and evil.