JEMES 3
1 Unu aghọla ọtutu ndi-ozizí, umu-nnam, ebe unu matara na ayi gānata ikpé ka uku. 2 N'ihi na ayi nile nāsu ngọngọ n'ọtutu ihe. Ọ buru na onye ọ bula asughi ngọngọ n'okwu, onye ahu bu nwoke tozuru okè, buru kwa onye puru ikwa aru-ya dum nga. 3 Ma ọ buru na ayi etiye bridle inyinya-ayi n'ọnu-ha, ka ha we kweyere ayi, ayi nēchighari kwa aru-ha dum. 4 Le, ub͕ọ kwa, ọ bu ezie na ha di uku otú a, oké ifufe nēfeghari kwa ha, ma umara isi-ub͕ọ dikarisiri ntà nēchighari ha, ebe ọ bula uche onye-isi ub͕ọ nāchọ. 5 Otú a ire bu kwa ihe ntà di n'aru, ọ nānya kwa isi oké ihe. Le, otú oké ọhia ra uku, bú nke ọku dikarisiri ntà nēme ka o nwuru ọku! 6 Ire bu kwa ọku, bú uwa ahu nke ajọ omume: ire nēguzo n'etiti ihe nile di ayi n'aru dika ihe nēnye aru dum ntupọ, nke nāfunwu kwa ihe nāga dika amuru ya ọku, ọku ala-mọ bu kwa ihe nāfunwu ire ahu ọku. 7 N'ihi na aha nile ọ bula nke anu na anu-ufe, nke ihe nākpu akpu na ihe di n'oké osimiri, ha nile ka ihe akpọrọ madu nēmeju anya, o mejuwo kwa ha anya: 8 ma ọ dighi onye ọ bula n'etiti madu puru imeju ire anya; ọ bu ihe ọjọ nke nādighi-eguzo n'otù ebe, ọ bu ihe juputara na irè-agwọ nēweta ọnwu. 9 Ọ bu nka ka ayi ji nāgọzi Onye-nwe-ayi, bú Nna-ayi; nka ka ayi ji kwa nābu madu ọnu, ndi ekèworo dika oyiyi Chineke si di: 10 n'otù ọnu ahu ka ngọzi na ọbubu-ọnu si puta. Umu-nnam, o kwesighi ka ihe ndia di otú a. 11 Ìsi-iyi nēsi n'otù ọnu ahu suputa miri nātọ utọ na miri nēlu ilu?
12 Umu-nnam, ọ̀ gābu na osisi fig puru imi olive, ma-ọbu na osisi vine puru imi fig? miri nnú apughi kwa isuputa miri nātọ utọ.
13 Ònye bu onye-amam-ihe nke nāghọta kwa ihe n'etiti unu? ya site n'ibi-obi ọma ya gosi ọlu-ya nile nime idi-nwayọ nke amam-ihe. 14 Ma ọ buru na unu nwere ekworo di ilu na ikpa-iche-iche n'obi-unu, unu anyala isi, unu ekwu-kwa-la okwu-ugha megide ezi-okwu. 15 Amam-ihe a abughi amam-ihe nke nēsi n'elu ridata, kama ọ bu nke uwa, buru kwa nke nkpuru-obi madu nāchi, buru kwa ihe ndi-mọ ọjọ nēzí. 16 N'ihi na ebe ekworo na ikpa-iche-iche di, n'ebe ahu ka ib͕a-aghara na omume nile ọ bula nke nādighi nma di. 17 Ma amam-ihe ahu nke si n'elu bia buru uzọ di ọcha, emesia ọ di udo, nwe obi-ọma, nēkweye okwu nke-ọma, juputa n'ebere na ezi nkpuru, nēnweghi obi-abua, nēnweghi iru-abua. 18 Ma ọ bu nkpuru nke ezi omume ka ndi nēme udo nāgha n'udo.
James 3
1 Be not many of you teachers, my brethren, knowing that we shall receive heavier judgment.2 For in many things we all stumble. If any stumbleth not in word, the same is a perfect man, able to bridle the whole body also.3 Now if we put the horses’ bridles into their mouths that they may obey us, we turn about their whole body also.4 Behold, the ships also, though they are so great and are driven by rough winds, are yet turned about by a very small rudder, whither the impulse of the steersman willeth.5 So the tongue also is a little member, and boasteth great things. Behold, how much wood is kindled by how small a fire!6 And the tongue is a fire: the world of iniquity among our members is the tongue, which defileth the whole body, and setteth on fire the wheel of nature, and is set on fire by hell.7 For every kind of beasts and birds, of creeping things and things in the sea, is tamed, and hath been tamed by mankind.8 But the tongue can no man tame; it is a restless evil, it is full of deadly poison.9 Therewith bless we the Lord and Father; and therewith curse we men, who are made after the likeness of God:10 out of the same mouth cometh forth blessing and cursing. My brethren, these things ought not so to be.11 Doth the fountain send forth from the same opening sweet water and bitter?12 Can a fig tree, my brethren, yield olives, or a vine figs? Neither can salt water yield sweet.13 Who is wise and understanding among you? let him show by his good life his works in meekness of wisdom.14 But if ye have bitter jealousy and faction in your heart, glory not and lie not against the truth.15 This wisdom is not a wisdom that cometh down from above, but is earthly, sensual, devilish.16 For where jealousy and faction are, there is confusion and every vile deed.17 But the wisdom that is from above is first pure, then peaceable, gentle, easy to be entreated, full of mercy and good fruits, without variance, without hypocrisy.18 And the fruit of righteousness is sown in peace for them that make peace.