JỌN 10
1 N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye nēsiteghi n'ọnu-uzọ ba n'ogige aturu, kama o si n'ebe ọzọ nārigo ibà, onye ahu bu onye-ori na onye nāpunara madu ihe. 2 Ma onye si n'ọnu-uzọ ba bu onye nāzù aturu. 3 Onye ahu ka onye-ọnu-uzọ nēmeghere uzọ; aturu nānu kwa olu-ya: ọ nākpọ kwa aturu nke aka ya n'aha, n'edupu kwa ha. 4 Mb͕e ọ bula ọ chupuru aturu nke aka ya nile, ọ nāga n'iru ha, aturu ahu nēso kwa ya: n'ihi na ha matara olu-ya. 5 Ma ha agaghi-eso ọbìa ma-ọli, kama ha gāb͕anari ya: n'ihi na ha amataghi olu ndi-ọbìa.
6 Ilu a ka Jisus turu ha: ma ha amaghi ihe ha bu, bú okwu Ọ nāgwa ha.
7 Ya mere Jisus siri ha ọzọ, N'ezie, n'ezie, asim unu, Mu onwem bu ọnu-uzọ nke aturu. 8 Ka ha ra, bú ndi nile burum uzọ bia, ha bu ndi-ori na ndi nāpunara madu ihe: ma aturu ahu anughi olu-ha. 9 Mu onwem bu ọnu-uzọ ahu: ọ buru na onye ọ bula esi na Mu ba, agāzọputa ya, ọ ganābata kwa nāpu kwa, nāhu kwa nri ọ gāta. 10 Onye-ori adighi-abia, ma-ọbughi ka o we zue ori, b͕u kwa, la kwa ihe n'iyì: Mu onwem biara ka ha we nwe ndu, ka ha nwebiga kwa ya ókè. 11 Mu onwem bu onye-ọzùzù-aturu ọma: onye-ọzùzù-aturu ọma nātọb͕ọ ndu-ya n'ihi aturu-ya. 12 Onye-ọlu egoro ego, nke nābughi kwa onye-ọzùzù-aturu, onye aturu nābughi nke aka ya, ọ nāhu agu ka ọ nābia, o we rapu aturu, b͕alaga, agu we nwude ha, chusa kwa ha: 13 n'ihi na ọ bu onye-ọlu egoro ego, ọ kpọghi kwa aturu ahu ihe. 14 Mu onwem bu onye-ọzùzù-aturu ọma; ama-kwa-ram aturu nkem, aturu nkem ma-kwa-ram, 15 dika Nnam maram, dika Mu onwem ma-kwa-ra Nnam; anamatọb͕ọ kwa ndum n'ihi aturum. 16 Aturu ọzọ ka M'nwe-kwa-ra, ndi nēsiteghi n'ogige-aturu nka: aghaghim iduta kwa ndi ahu, ha gānu kwa olum; otù ìgwè-aturu gādi kwa, otù Onye-ọzùzù-aturu. 17 N'ihi nka ka Nnam nāhum n'anya, n'ihi na Mu onwem nātọb͕ọ ndum, ka M'we nara ya ọzọ.
18 Ọ dighi onye ọ bula nānapum ya, kama Mu onwem nātọb͕ọ ya n'Onwem. Enwerem ike itọb͕ọ ya, enwe-kwa-ram ike inara ya ọzọ. Ihe a enyere n'iwu ka M'natara n'aka Nnam.
19 Nkewa putara ọzọ n'etiti ndi-Ju n'ihi okwu ndia. 20 Ọtutu nime ha we si, O nwere mọ ọjọ, anya adighi kwa Ya nma; gini mere unu nānu olu-Ya?
21 Ndi ọzọ nāsi, Ndia abughi okwu onye mọ ọjọ ji. Mọ̀ ọjọ puru imeghe anya ndi kpuru ìsì?
22 Ma ememe icheta owuwu ulo uku Chineke ọhu ruru na Jerusalem: ọ bu mb͕e oyi; 23 Jisus we nējeghari n'ulo uku Chineke n'ìbà Solomon. 24 Ya mere ndi-Ju nọgidere Ya buruburu, we si Ya, Ì nākwuba nkpuru-obi-ayi n'elu rue ole mb͕e? Ọ buru na Gi onwe-gi bu Kraist-ayi, gwawa ayi. 25 Jisus zara ha, si, Agwaram unu, ma unu adighi-ekwe: ọlu nke Mu onwem nālu n'aha Nnam, ndia nāb͕aram àmà. 26 Ma unu onwe-unu adighi-ekwe, n'ihi na unu adighi nime aturu nkem. 27 Aturu nkem nānu olum, Mu onwem ma-kwa-ra ha, ha nēsokwam: 28 Mu onwem nēnye kwa ha ndu ebighi-ebi; ha agaghi-ala kwa n'iyì ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi, ọ dighi kwa onye ọ bula gānapu ha n'akam. 29 Nnam, Nke nyeworom ha, bu Onye uku kachasi ihe nile; ọ dighi kwa onye ọ bula puru inapu ihe n'aka Nnam. 30 Mu onwem na Nnam bu otù. 31 Ndi-Ju tuturu nkume ọzọ ka ha tua Ya. 32 Jisus zara ha, si Ọtutu ọlu ọma ka M'gosiri unu site na Nnam; n'ìhi aha ọlu gini nime ndia Ka unu nātum nkume? 33 Ndi-Ju zara Ya, si, Ọ bughi n'ihi ọlu ọma ka ayi nātu Gi nkume, kama ọ bu n'ihi nkwulu; n'ihi kwa na Gi onwe-gi, ebe I bu madu, I nēme Onwe-gi Chineke. 34 Jisus zara ha, si, Èdeghi ya n'iwu-unu, si, Mu onwem siri, Chi ka unu bu? 35 Ọ buru na Ọ kpọrọ ndi ahu chi, ndi okwu Chineke biaruru (apughi kwa imebi ihe edere n'akwukwọ nso), 36 ùnu onwe-unu nēkwu okwu bayere Onye ahu Nnam doro nsọ zite kwa n'uwa, si, I nēkwulu Chineke; n'ihi na asim, Abum Ọkpara Chineke? 37 Ọ buru na alughm ọlu Nnam, unu ekwelam. 38 Ma ọ buru na aluam ha, ọbuná ma asi na unu ekweghi Mu onwem, nēkwerenu ọlum: ka unu we mara nāmagide kwa na Nnam di nimem, na Mu onwem di kwa nime Nnam.
39 Ha we chọ kwa uzọ ijide Ya: O we pua n'aka-ha.
40 O we je ọzọ gabiga n'ofè Jọdan rue ebe Jọn nēme baptism na mbu; O we n-ogide n'ebe ahu. 41 Ọtutu madu we biakute Ya; ha nāsi kwa, N'ezie ọ dighi ihe-iriba-ama Jọn mere: ma ka ha ra, bú ihe Jọn kwuru bayere Onye a, bu ezi-okwu 42 Ọtutu madu we kwere na Ya n'ebe ahu.
John 10
1 Verily, verily, I say unto you, He that entereth not by the door into the fold of the sheep, but climbeth up some other way, the same is a thief and a robber.2 But he that entereth in by the door is the shepherd of the sheep.3 To him the porter openeth; and the sheep hear his voice: and he calleth his own sheep by name, and leadeth them out.4 When he hath put forth all his own, he goeth before them, and the sheep follow him: for they know his voice.5 And a stranger will they not follow, but will flee from him: for they know not the voice of strangers.6 This parable spake Jesus unto them: but they understood not what things they were which he spake unto them.7 Jesus therefore said unto them again, Verily, verily, I say unto you, I am the door of the sheep.8 All that came before me are thieves and robbers: but the sheep did not hear them.9 I am the door; by me if any man enter in, he shall be saved, and shall go in and go out, and shall find pasture.10 The thief cometh not, but that he may steal, and kill, and destroy: I came that they may have life, and may have it abundantly.11 I am the good shepherd: the good shepherd layeth down his life for the sheep.12 He that is a hireling, and not a shepherd, whose own the sheep are not, beholdeth the wolf coming, and leaveth the sheep, and fleeth, and the wolf snatcheth them, and scattereth them:13 he fleeth because he is a hireling, and careth not for the sheep.14 I am the good shepherd; and I know mine own, and mine own know me,15 even as the Father knoweth me, and I know the Father; and I lay down my life for the sheep.16 And other sheep I have, which are not of this fold: them also I must bring, and they shall hear my voice: and they shall become one flock, one shepherd.17 Therefore doth the Father love me, because I lay down my life, that I may take it again.18 No one taketh it away from me, but I lay it down of myself. I have power to lay it down, and I have power to take it again. This commandment received I from my Father.19 There arose a division again among the Jews because of these words.20 And many of them said, He hath a demon, and is mad; why hear ye him?21 Others said, These are not the sayings of one possessed with a demon. Can a demon open the eyes of the blind?22 And it was the feast of the dedication at Jerusalem:23 it was winter; and Jesus was walking in the temple in Solomon’s porch.24 The Jews therefore came round about him, and said unto him, How long dost thou hold us in suspense? If thou art the Christ, tell us plainly.25 Jesus answered them, I told you, and ye believe not: the works that I do in my Father’s name, these bear witness of me.26 But ye believe not, because ye are not of my sheep.27 My sheep hear my voice, and I know them, and they follow me:28 and I give unto them eternal life; and they shall never perish, and no one shall snatch them out of my hand.29 My Father, who hath given them unto me, is greater than all; and no one is able to snatch them out of the Father’s hand.30 I and the Father are one.31 The Jews took up stones again to stone him.32 Jesus answered them, Many good works have I showed you from the Father; for which of those works do ye stone me?33 The Jews answered him, For a good work we stone thee not, but for blasphemy; and because that thou, being a man, makest thyself God.34 Jesus answered them, Is it not written in your law, I said, ye are gods?35 If he called them gods, unto whom the word of God came (and the scripture cannot be broken),36 say ye of him, whom the Father sanctified and sent into the world, Thou blasphemest; because I said, I am the Son of God?37 If I do not the works of my Father, believe me not.38 But if I do them, though ye believe not me, believe the works: that ye may know and understand that the Father is in me, and I in the Father.39 They sought again to take him: and he went forth out of their hand.40 And he went away again beyond the Jordan into the place where John was at the first baptizing; and there be abode.41 And many came unto him; and they said, John indeed did no sign: but all things whatsoever John spake of this man were true.42 And many believed on him there.