previous next

JỌN 11

1 Ma aru otù nwoke adighi ike, bú Lazarọs onye Betani, onye sitere n'obodo ntà Meri na Mata nwa-nne-ya nwanyi. 2 Ma ọ bu Meri ahu nke were manu-otite te Onye-nwe-ayi, were kwa agiri-isi-ya hicha ukwu-Ya abua, onye aru nwa-nne-ya nwoke, bú Lazarọs, nādighi ike. 3 Ya mere umu-nne-ya nwanyi zigara Ya, si, Onye-nwe-ayi, le, aru nke onye ahu I huru n'anya adighi ike. 4 Ma mb͕e Jisus nuru ya, Ọ si, Nriaria nka abughi nke ọnwu, kama ọ bu n'ihi otuto Chineke, ka ewe nye Ọkpara Chineke otuto site na ya. 5 Ma Jisus huru Mata, na nwa-nne-ya nwanyi, na Lazarọs, n'anya. 6 Ya mere mb͕e Ọ nuru na aru-ya adighi ike, mb͕e ahu Ọ nọgidere ubọchi abua n'ebe Ọ nọ. 7 Mb͕e ahu mb͕e nka gasiri Ọ si ndi nēso uzọ-Ya, Ka ayi je Judia ọzọ. 8 Ndi nēso uzọ-Ya si Ya, Rabai, ub͕u a ka ndi-Ju nāchọ uzọ itu Gi nkume; Ì nēje kwa ebe ahu ọzọ? 9 Jisus zara, si, Ọ̀ bughi oge hour iri na abua di n'ehihie? Ọ buru na onye ọ bula ejeghari n'ehihie, ọ dighi-asu ngọngọ, n'ihi na ọ nāhu ìhè nke uwa nka. 10 Ma ọ buru na onye ọ bula ejeghari n'abali, ọ nāsu ngọngọ, n'ihi na ìhè adighi nime ya. 11 Ihe ndia ka O kwuru: mb͕e nka gasiri Ọ si ha, Enyi-ayi Lazarọs adawo n'ura; ma anamaga, ka M'we kpọte ya n'ura. 12 Ya mere ndi nēso uzọ-Ya siri Ya, Onye-nwe-ayi, ọ buru na ọ dawo n'ura, agāzọputa ya. 13 Ma Jisus kwururi okwu bayere ọnwu-ya: ma ndi ahu chère na Ọ nēkwu okwu bayere ida n'ura efu. 14 Ya mere Jisus gwawara ha okwu mb͕e ahu, si, Lazarọs nwuru anwu. 15 Anamaṅuri kwa ọṅu n'ihi unu na adighi m n'ebe ahu, ka unu we kwere; otú ọ di, ka ayi jekuru ya.

16 Ya mere Tomas, onye anākpọ Didimọs, siri ibe-ya ndi nēso Jisus, Ka ayi onwe-ayi je kwa, ka ayi we so Ya nwua.
17 Ya mere mb͕e Jisus biara, Ọ huru na ọ diwori n'ílì ubọchi anọ a. 18 Ma Betani di Jerusalem nso, ihe dika furlong iri na ise n'idi-anya; 19 ma ọtutu n'etiti ndi-Ju biakutereri Mata na Meri, ka ha we kasie ha obi n'ihi nwa-nne-ha. 20 Ya mere mb͕e Mata nuru na Jisus nābia, o je zute Ya: ma Meri nānọdu n'ulo. 21 Ya mere Mata siri Jisus, Onye-nwe-ayi, ọ buru na I nọri n'ebe a, nwa-nnem nwoke agaghi-anwuwori. 22 Ma ọbuná ub͕u a amataram na, ka ihe I gāriọ n'aka Chineke ra, Chineke gēnye Gi. 23 Jisus si ya, Nwa-nne-gi nwoke gēsi n'ọnwu bilie. 24 Mata si Ya, Amataram na o gēsi n'ọnwu bilie na nbilite-n'ọnwu n'ubọchi ikpe-azu. 25 Jisus siri ya, Mu onwem bu nbilite-n'ọnwu na ndu: onye nēkwere na Mu, ọbuná ma asi na ọ nwuru anwu, ọ gādi ndu ọzọ: 26 ọzọ, onye ọ bula nke nādi ndu, nke nēkwere kwa na Mu, ọ gaghi-anwu ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi. I kwere nka? 27 Ọ si Ya, E, Onye-nwe-ayi: Mu onwem ekwerewo na Gi onwe-gi bu Kraist-ayi, Ọkpara Chineke, Onye nābia n'uwa. 28 Mb͕e o kwusiri nka, o we je kpọ Meri nwa-nne-ya nwanyi na nzuzo, si, Onye-ozizí nọ n'ebe a, Ọ nāekpọ kwa gi. 29 Ma nwanyi ahu, mbe ọ nuru ya, o bilie ọsọsọ, we biakute Ya. 30 (Ma Jisus akābiarughi nime obodo ntà ahu, kama Ọ nānọ n'ebe Mata zutere Ya.) 31 Ya mere ndi-Ju ndi ha na ya di n'ulo, ndi nākasi kwa ya obi, mb͕e ha huru Meri, na o biliri ọsọsọ we pua, ha soro ya, nēchè na ọ nējeru ílì ka o we kwa ákwá n'ebe ahu. 32 Ya mere Meri, mb͕e ọ biara n'ebe Jisus nọ, mb͕e ọ huru Ya, ọ da n'ala n'ukwu-Ya, nāsi Ya, Onye-nwe-ayi, ọ buru na I nọri n'ebe a, nwa-nnem nwoke agaghi-anwuwori. 33 Ya mere mb͕e Jisus huru ya ka ọ nākwa ákwá, na ndi-Ju ndi soro ya bia ka ha nākwa kwa ákwá, Ọ su udè nime mọ-Ya, me kwa ka obi lọ Ya miri, 34 O we si, Òle ebe unu tọb͕ọworo ya? Ha si Ya, Onye-nwe-ayi, Bia, le kwa. 35 Anya-miri puru n'anya Jisus. 36 Ya mere ndi-Ju nāsi, Le otú Ọ huru ya n'anya! 37 Ma ufọdu nime ha siri, Onye a, Nke meghere anya onye ahu kpuru ìsì, Ọ̀ pughi ime kwa ka nwoke a ghara inwu anwu? 38 Ya mere Jisus nābiaru ílì ahu nāsu udè ọzọ nime Onwe-ya. Ma ọ bu ọb͕à, otù nkume nātọb͕ọ kwa n'ọnu-ya. 39 Jisus si, Wepunu nkume ahu. Mata, nwa-nne-nwanyi nke onye ahu nwuruwori, si Ya, Onye-nwe-ayi, ọ nēsì ísì ub͕u a: n'ihi na nka mere ya ubọchi anọ ọ nwuru. 40 Jisus si ya, Àsighi m i na, ọ buru na i kwere, i gāhu ebube Chineke? 41 Ya mere ha wepuru nkume ahu. Ma Jisus weliri anya-Ya elu, si, Nna, ekelem I na I nuru olum. 42 Ma Mu onwem matara na I nānu olum mb͕e nile: ma n'ihi ìgwè madu a nke guzoro gburugburu ka M'kwuru ya, ka ha we kwere na ọ bu Gi onwe-gi ziterem. 43 Ma mb͕e O kwusiri ihe ndia, O were oké olu tie nkpu, si, Lazarọs, puta n'èzí.

44 Onye nwururi anwu putara, ewerewori ákwà-ozu ke ya ukwu na aka; were kwa ichafọ kechie ya iru. Jisus si ha, Tọpunu ya, ghara kwa ya ka ọ la.
45 Ya mere ọtutu n'etiti ndi-Ju, ndi biakutere Meri, ndi le-kwa-ra ihe O mere, ha kwere na Ya.

46 Ma ufọdu n'etiti ha jekuru ndi-Farisi, kọrọ ha ihe Jisus mere.
47 Ya mere ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi kpọrọ nnọkọ-ikpé ka ha zukọ, si, Gini ka ayi nēme? n'ihi na Nwoke a nēme ọtutu ihe-iriba-ama. 48 Ọ buru na ayi arapu Ya otú a, madu nile gēkwere na Ya: ndi Rom gābia kwa napu ebe nke ayi na mba nke ayi. 49 Ma otù onye n'etiti ha, bú Kaiafas, ebe ọ bu onye-isi-nchu-àjà n'arọ ahu, si ha, Unu onwe-unu amataghi ihe ọ bula, 50 unu atuleghi kwa uche na ọ bara unu urù ka otù onye nwua n'ọnọdu ndi-Ju, ka mba-ayi dum ghara ila kwa n'iyì. 51 Ma o kwughi nka site n'onwe-ya: kama ebe ọ bu onye-isi-nchu-àjà n'arọ ahu, o buru amuma na Jisus gaje inwu anwu n'ọnọdu mba ahu; 52 ọ bughi kwa nání n'ọnọdu mba ahu, kama ka O we me kwa ka umu Chineke ndi b͕asaworo zukọ n'otù.

53 Ya mere site n'ubọchi ahu ha b͕ara ìzù ka ha we b͕ue Ya.
54 Ya mere Jisus adighi-ejeghari n'iru ọra madu n'etiti ndi-Ju ọzọ, kama O si n'ebe ahu je ba n'ala nke di ọhia nso, ba n'obodo anākpọ Ifraim; O we nọgide n'ebe ahu, Ya na ndi nēso uzọ-Ya. 55 Ma ememe ngabiga nke ndi-Ju di nso: ọtutu madu we si n'ala ndi-Ju rigoro Jerusalem mb͕e ememe ngabiga ahu akērughi, ime onwe-ha ka ha di ọcha. 56 Ya mere ha nāchọ Jisus, we nēkwurita n'etiti onwe-ha, mb͕e ha guzoro n'ulo uku Chineke, si, Gini ka unu nēchè? Nà Ọ gaghi-abia n'ememe a ma-ọli? 57 Ma ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi nyereri iwu ka, ọ buru na onye ọ bula mara ebe Ọ nọ, ka o gosi ya, ha we jide Ya.

John 11

1 Now a certain man was sick, Lazarus of Bethany, of the village of Mary and her sister Martha.2 And it was that Mary who anointed the Lord with ointment, and wiped his feet with her hair, whose brother Lazarus was sick.3 The sisters therefore sent unto him, saying, Lord, behold, he whom thou lovest is sick.4 But when Jesus heard it, he said, This sickness is not unto death, but for the glory of God, that the Son of God may be glorified thereby.5 Now Jesus loved Martha, and her sister, and Lazarus.6 When therefore he heard that he was sick, he abode at that time two days in the place where he was.7 Then after this he saith to the disciples, Let us go into Judaea again.8 The disciples say unto him, Rabbi, the Jews were but now seeking to stone thee; and goest thou thither again?9 Jesus answered, Are there not twelve hours in the day? If a man walk in the day, he stumbleth not, because he seeth the light of this world.10 But if a man walk in the night, he stumbleth, because the light is not in him.11 These things spake he: and after this he saith unto them, Our friend Lazarus is fallen asleep; but I go, that I may awake him out of sleep.12 The disciples therefore said unto him, Lord, if he is fallen asleep, he will recover.13 Now Jesus had spoken of his death: but they thought that he spake of taking rest in sleep.14 Then Jesus therefore said unto them plainly, Lazarus is dead.15 And I am glad for your sakes that I was not there, to the intent ye may believe; nevertheless let us go unto him.16 Thomas therefore, who is called Didymus, said unto his fellow-disciples, Let us also go, that we may die with him.17 So when Jesus came, he found that he had been in the tomb four days already.18 Now Bethany was nigh unto Jerusalem, about fifteen furlongs off;19 and many of the Jews had come to Martha and Mary, to console them concerning their brother.20 Martha therefore, when she heard that Jesus was coming, went and met him: but Mary still sat in the house.21 Martha therefore said unto Jesus, Lord, if thou hadst been here, my brother had not died.22 And even now I know that, whatsoever thou shalt ask of God, God will give thee.23 Jesus saith unto her, Thy brother shall rise again.24 Martha saith unto him, I know that he shall rise again in the resurrection at the last day.25 Jesus said unto her, I am the resurrection, and the life: he that believeth on me, though he die, yet shall he live;26 and whosoever liveth and believeth on me shall never die. Believest thou this?27 She saith unto him, Yea, Lord: I have believed that thou art the Christ, the Son of God, even he that cometh into the world.28 And when she had said this, she went away, and called Mary her sister secretly, saying, The Teacher is here, and calleth thee.29 And she, when she heard it, arose quickly, and went unto him.30 (Now Jesus was not yet come into the village, but was still in the place where Martha met him.)31 The Jews then who were with her in the house, and were consoling her, when they saw Mary, that she rose up quickly and went out, followed her, supposing that she was going unto the tomb to weep there.32 Mary therefore, when she came where Jesus was, and saw him, fell down at his feet, saying unto him, Lord, if thou hadst been here, my brother had not died.33 When Jesus therefore saw her weeping, and the Jews also weeping who came with her, he groaned in the spirit, and was troubled,34 and said, Where have ye laid him? They say unto him, Lord, come and see.35 Jesus wept.36 The Jews therefore said, Behold how he loved him!37 But some of them said, Could not this man, who opened the eyes of him that was blind, have caused that this man also should not die?38 Jesus therefore again groaning in himself cometh to the tomb. Now it was a cave, and a stone lay against it.39 Jesus saith, Take ye away the stone. Martha, the sister of him that was dead, saith unto him, Lord, by this time the body decayeth; for he hath been dead four days.40 Jesus saith unto her, Said I not unto thee, that, if thou believedst, thou shouldest see the glory of God?41 So they took away the stone. And Jesus lifted up his eyes, and said, Father, I thank thee that thou heardest me.42 And I knew that thou hearest me always: but because of the multitude that standeth around I said it, that they may believe that thou didst send me.43 And when he had thus spoken, he cried with a loud voice, Lazarus, come forth.44 He that was dead came forth, bound hand and foot with grave-clothes; and his face was bound about with a napkin. Jesus saith unto them, Loose him, and let him go.45 Many therefore of the Jews, who came to Mary and beheld that which he did, believed on him.46 But some of them went away to the Pharisees, and told them the things which Jesus had done.47 The chief priests therefore and the Pharisees gathered a council, and said, What do we? for this man doeth many signs.48 If we let him thus alone, all men will believe on him: and the Romans will come and take away both our place and our nation.49 But a certain one of them, Caiaphas, being high priest that year, said unto them, Ye know nothing at all,50 nor do ye take account that it is expedient for you that one man should die for the people, and that the whole nation perish not.51 Now this he said not of himself: but, being high priest that year, he prophesied that Jesus should die for the nation;52 and not for the nation only, but that he might also gather together into one the children of God that are scattered abroad.53 So from that day forth they took counsel that they might put him to death.54 Jesus therefore walked no more openly among the Jews, but departed thence into the country near to the wilderness, into a city called Ephraim; and there he tarried with the disciples.55 Now the passover of the Jews was at hand: and many went up to Jerusalem out of the country before the passover, to purify themselves.56 They sought therefore for Jesus, and spake one with another, as they stood in the temple, What think ye? That he will not come to the feast?57 Now the chief priests and the Pharisees had given commandment, that, if any man knew where he was, he should show it, that they might take him.