previous next

JỌN 17

1 Okwu ndia ka Jisus kwuru: O we welie anya-Ya le elu-igwe, si, Nnam oge hour abiawo; nye Ọkpara-Gi otuto, ka Ọkpara-Gi we nye Gi Otuto: 2 dika I nyere Ya ike n'ebe madu nile nọ, ka ihe ọ bula I nyeworo Ya, ka O we nye ha ndu ebighi-ebi. 3 Ma nka bu ndu ebighi-ebi ahu, ka ha mara Gi, Nke nání Gi bu ezi Chineke, mara kwa Onye I zitere, bú Jisus Kraist. 4 Mu onwem nyere Gi otuto n'elu uwa, ebe M'luzuru ọlu I nyeworom ka M'lua. 5 Nna, Gi onwe-gi were kwa otuto nke M'nwere n'ebe I nọ mb͕e uwa akādighi nyem otuto ub͕u a nebe Gi onwe-Gi nọ. 6 Emerem ka aha-Gi puta ìhè nye ndi I nyerem site 'uwa: Gi onwe-gi nwere ha, I were kwa ha nyem; ha edebewo kwa okwu-Gi. 7 Ha mara ub͕u a na ihe nile, ka ha ra, bú nke I nyeworom, si n'ebe I nọ puta: 8 n'ihi na okwu I nyerem ka M'nyeworo ha; ha onwe-ha we nara ha, mara kwa n'ezie na esim n'ebe I nọ puta, ha kwere kwa na Gi onwe-gi ziterem. 9 Mu onwem nēkpe ekpere bayere ha: ọ bughi uwa ka M'nēkpe ekpere bayere ya, kama anamekpe ekpere bayere ndi I nyeworom; n'ihi na ha bu nke Gi: 10 ihe nile nke bu nkem bu kwa nke Gi, nke Gi bu kwa nkem: enyewokwam otuto nime ha. 11 Anọkwaghm n'uwa ọzọ, ma ndia nọ n'uwa, Mu onwem nābiakute kwa Gi. Nna di nsọ, nēdebe ha n'aha-Gi nke I nyeworom, ka ha we buru otù, dika Ayi onwe-ayi bu. 12 Mb͕e Mu na ha nọri, Mu onwem nēdebe ha n'aha-Gi nke I nyeworom: eche-kwa-ram ha, ọ dighi kwa onye ọ bula nime ha lara n'iyì, ma-ọbughi nwa nke ila-n'iyì ahu; ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ we mezu. 13 Ma anamabiakute Gi ub͕u a; okwu ndia ka M'nēkwu kwa nuwa, ka ha we nwe ọṅùm ka o zuworo nime onwe-ha. 14 Mu onwem enyewo ha okwu-Gi; uwa kpọ-kwa-ra ha asì, n'ihi na ha esiteghi n'uwa, dika Mu onwem nēsiteghi n'uwa. 15 Ekpeghm ekpere ka I wepu ha n'uwa, kama ka I debe ha ka ha pua n'aka ajọ onye ahu. 16 Ha esiteghi n'uwa, dika Mu onwem nēsiteghi n'uwa. 17 Were ezi-okwu do ha nsọ: okwu-Gi bu ezi-okwu. 18 Dika I zigaram nime uwa, Mu onwem ziga-kwa-ra ha nime uwa. 19 N'ihi ha ka Mu onwem nēdo kwa Onwem nsọ, ka ewe do kwa ha onwe-ha nsọ n'ezi-okwu. 20 Ọ bughi kwa nání ndia ka M'nēkpe ekpere bayere ha, kama anamekpe kwa ekpere bayere ndi kwere na Mu site n'okwu-ha; 21 ka ha nile we buru otù; dika Gi onwe-gi di nimem, dika Mu onwem di kwa nime Gi, Nna, ka ha onwe-ha we di kwa nime Ayi: ka uwa we kwere na Gi onwe-gi ziterem. 22 Otuto nke I nyeworom ka Mu onwem nyewo-kwa-ra ha; ka ha we buru otù, dika Ayi onwe-ayi bu otù; 23 Mu onwem nime ha, Gi onwe-gi kwa nimem, ka ewe me ka ha buru ndi zuworo okè ibu otù; ka uwa we mara na Gi onwe-gi ziterem, na I hu-kwa-ra ha n'anya, dika I hurum n'anya. 24 Nna, ihe I nyeworom, anamachọ ka, ebe Mu onwem nọ, ka Mu na ndi ahu nọ kwa; ka ha we hu otutom, nke I nyeworom: n'ihi na I hurum n'anya mb͕e akātọghi ntọ-ala uwa. 25 Nna Nke bu Onye ezi omume, uwa amaghi Gi, ma Mu onwem mara Gi; ndia ndia ma-kwara na Gi onwe-gi ziterem; 26 eme-kwa-ram ka ha mara aha-Gi, M'gēme kwa ka ha mara ya; ka ihu-n'anya I ji hum we di nime ha, Mu onwem kwa nime ha.

John 17

1 These things spake Jesus; and lifting up his eyes to heaven, he said, Father, the hour is come; glorify thy Son, that the son may glorify thee:2 even as thou gavest him authority over all flesh, that to all whom thou hast given him, he should give eternal life.3 And this is life eternal, that they should know thee the only true God, and him whom thou didst send, even Jesus Christ.4 I glorified thee on the earth, having accomplished the work which thou hast given me to do.5 And now, Father, glorify thou me with thine own self with the glory which I had with thee before the world was.6 I manifested thy name unto the men whom thou gavest me out of the world: thine they were, and thou gavest them to me; and they have kept thy word.7 Now they know that all things whatsoever thou hast given me are from thee:8 for the words which thou gavest me I have given unto them; and they received them, and knew of a truth that I came forth from thee, and they believed that thou didst send me.9 I pray for them: I pray not for the world, but for those whom thou hast given me; for they are thine:10 and all things that are mine are thine, and thine are mine: and I am glorified in them.11 And I am no more in the world, and these are in the world, and I come to thee. Holy Father, keep them in thy name which thou hast given me, that they may be one, even as we are.12 While I was with them, I kept them in thy name which thou hast given me: and I guarded them, and not one of them perished, but the son of perdition; that the scripture might be fulfilled.13 But now I come to thee; and these things I speak in the world, that they may have my joy made full in themselves.14 I have given them thy word; and the world hated them, because they are not of the world, even as I am not of the world.15 I pray not that thou shouldest take them from the world, but that thou shouldest keep them from the evil one.16 They are not of the world even as I am not of the world.17 Sanctify them in the truth: thy word is truth.18 As thou didst send me into the world, even so sent I them into the world.19 And for their sakes I sanctify myself, that they themselves also may be sanctified in truth.20 Neither for these only do I pray, but for them also that believe on me through their word;21 that they may all be one; even as thou, Father, art in me, and I in thee, that they also may be in us: that the world may believe that thou didst send me.22 And the glory which thou hast given me I have given unto them; that they may be one, even as we are one;23 I in them, and thou in me, that they may be perfected into one; that the world may know that thou didst send me, and lovedst them, even as thou lovedst me.24 Father, I desire that they also whom thou hast given me be with me where I am, that they may behold my glory, which thou hast given me: for thou lovedst me before the foundation of the world.25 O righteous Father, the world knew thee not, but I knew thee; and these knew that thou didst send me;26 and I made known unto them thy name, and will make it known; that the love wherewith thou lovedst me may be in them, and I in them.