JỌN 2
1 N'ubọchi nke-atọ ọlulu-nwunye di na Kena nke Galili; nne Jisus nọ kwa n'ebe ahu: 2 ewe kpọ kwa Jisus, Ya na ndi nēso uzọ-Ya, bia n'ọlulu-nwunye ahu. 3 Mb͕e manya-vine kọrọ, nne Jisus we si Ya, Ha enweghi manya-vine. 4 Jisus we si ya, Nwanyi, gini ka Mu na gi nwekọrọ? oge hour nkem akābiarughi. 5 Nne-Ya si ndi nēje ozi, Ihe ọ bula Ọ si unu me, menu ya. 6 Ma adọbara n'ebe ahu ite nkume miri isi, dika ime-ọcha nke ndi-Ju si di, nānagide firkin abua ma-ọbu atọ n'otù. 7 Jisus si ha, Were miri b͕ajue ite-miri ndia. Ha we b͕ajupu ha n'ọnu. 8 O we si ha, Kuputanu ub͕u a, bugara onye-isi oriri. Ha we būru ya. 9 Ma mb͕e onye-isi oriri ahu deturu miri ahu ọnu nke ghọrọri manya-vine, ma ọ mataghi ebe o si puta (ma ndi nēje ozi ndi kuputarari miri ahu mara), onye-isi oriri ahu we kpọ onye nālu nwunye ọhu, 10 si ya, Onye ọ bula nēbu uzọ adọba manya-vine ọma; mb͕e ọ bula madu ṅubigasiri manya ókè o we dọba nke jọkariri njọ: gi onwe-gi edebewo manya-vine ọma rue ub͕u a.
11 Jisus mere nmalite ihe-iriba-ama-Ya nile nka na Kena nke Galili, we me ka ebube-Ya puta ìhè; ndi nēso uzọ-Ya we kwere na Ya.
12 Mb͕e ihe a gasiri Ọ ridara na Kapanaum, Ya onwe-ya, na nne-Ya, na umu-nne-Ya, na ndi nēso uzọ-Ya: ha we nọgide n'ebe ahu ọ bughi ọtutu ubọchi.
13 Ememe ngabiga nke ndi-Ju we di nso, Jisus we rigoro Jerusalem. 14 Ọ we hu n'ulo uku Chineke ndi nēre ehi na aturu na nduru, na ndi nāb͕anwe ego ka ha nọduru ala: 15 O we chiri udọ̀ me utari, we chupu ha nile n'ulo uku Chineke, ma aturu ma ehi ahu; Ọ wusì ego ndi nāb͕anwe ego, kpù kwa table-ha iru; 16 Ọ si ndi nēre nduru, Chipunu ihe ndi a n'ebe a; unu emela ulo Nnam ka ọ buru ulo ahia. 17 Ndi nēso uzọ-Ya chetara na edere ya-ri n'akwukwọ nsọ, si, Ekworo ulo-Gi gēripiam. 18 Ya mere ndi-Ju zara, si Ya, Ọ̀ bu ihe-iriba-ama gini ka I nēgosi ayi, ebe I nēme ihe ndia? 19 Jisus zara, si ha, Kwatuenu ulo nsọ a, n'ubọchi atọ M'gēweli kwa ya elu. 20 Ya mere ndi-Ju siri, Ọgu arọ abua na isi ka eji wu ulo nsọ a, Gì onwe-gi gēweli kwa ya n'ubọchi atọ? 21 Ma Ya onwe-ya nēkwu okwu bayere ulo nsọ nke bu aru-Ya.
22 Ya mere mb͕e emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ndi nēso uzọ-Ya chetara na O kwuru okwu a; ha we kwere ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, ya na okwu Jisus kwuru.
23 Ma mb͕e Ọ nọ na Jerusalem n'ememe ngabiga, n'ememe ahu, ọtutu madu kwere n'aha-Ya, n'ihi na ha nāhu ihe-iriba-ama-Ya nile nke Ọ nēme. 24 Ma Jisus onwe-ya araraghi Onwe-ya nye n'aka-ha na ntukwasi-obi, n'ihi na Ọ mara madu nile, 25 ya na n'ihi na ọ dighi Ya nkpà ka onye ọ bula b͕ara madu àmà; n'ihi na Ya onwe-ya mara ihe di nime madu.
John 2
1 And the third day there was a marriage in Cana of Galilee; and the mother of Jesus was there:2 and Jesus also was bidden, and his disciples, to the marriage.3 And when the wine failed, the mother of Jesus saith unto him, They have no wine.4 And Jesus saith unto her, Woman, what have I to do with thee? mine hour is not yet come.5 His mother saith unto the servants, Whatsoever he saith unto you, do it.6 Now there were six waterpots of stone set there after the Jews’ manner of purifying, containing two or three firkins apiece.7 Jesus saith unto them, Fill the waterpots with water. And they filled them up to the brim.8 And he saith unto them, Draw out now, and bear unto the ruler of the feast. And they bare it.9 And when the ruler of the feast tasted the water now become wine, and knew not whence it was (but the servants that had drawn the water knew), the ruler of the feast calleth the bridegroom,10 and saith unto him, Every man setteth on first the good wine; and when men have drunk freely, then that which is worse: thou hast kept the good wine until now.11 This beginning of his signs did Jesus in Cana of Galilee, and manifested his glory; and his disciples believed on him.12 After this he went down to Capernaum, he, and his mother, and his brethren, and his disciples; and there they abode not many days.13 And the passover of the Jews was at hand, and Jesus went up to Jerusalem.14 And he found in the temple those that sold oxen and sheep and doves, and the changers of money sitting:15 and he made a scourge of cords, and cast all out of the temple, both the sheep and the oxen; and he poured out the changers’ money, and overthrew their tables;16 and to them that sold the doves he said, Take these things hence; make not my Father’s house a house of merchandise.17 His disciples remembered that it was written, Zeal for thy house shall eat me up.18 The Jews therefore answered and said unto him, What sign showest thou unto us, seeing that thou doest these things?19 Jesus answered and said unto them, Destroy this temple, and in three days I will raise it up.20 The Jews therefore said, Forty and six years was this temple in building, and wilt thou raise it up in three days?21 But he spake of the temple of his body.22 When therefore he was raised from the dead, his disciples remembered that he spake this; and they believed the scripture, and the word which Jesus had said.23 Now when he was in Jerusalem at the passover, during the feast, many believed on his name, beholding his signs which he did.24 But Jesus did not trust himself unto them, for that he knew all men,25 and because he needed not that any one should bear witness concerning man; for he himself knew what was in man.