JỌN 4
1 Ya mere mb͕e Onye-nwe-ayi mara na ndi-Farisi nururi na Jisus nēme madu ka ha buru ndi nēso uzọ-Ya, na Ọ nēme kwa ha baptism, kari Jọn, 2 (ọ bu ezie na Jisus onwe-ya emeghi baptism, kama ọ bu ndi nēso uzọ-Ya), 3 Ọ rapuru Judia, we je Galili ọzọ. 4 Ma Ọ ghaghi igabiga n'etiti Sameria. 5 Ya mere Ọ bia rue otù obodo nke Sameria, anākpọ Saika, na nso iberibe ala ahu nke Jekob nyere nwa-ya Josef: 6 ma isi-iyi Jekob di n'ebe ahu. Ya mere Jisus, ebe ike gwuru Ya n'ije-Ya, Ọ nọduru ala otú a n'usọ isi-iyi ahu. Ọ ra ka oge hour nke-isi. 7 Otù nwanyi, bú onye Sameria, bia isere miri: Jisus si ya, Nyem miri ka M'ṅua. 8 N'ihi na ndi nēso uzọ-Ya jeriri n'obodo izu nri. 9 Ya mere nwanyi Sameria ahu si Ya, Gì onwe-gi si aṅa ariọ miri n'akam ka I ṅua, ebe I bu Onye-Ju, ma mu bu nwanyi Sameria? (N'ihi na ndi-Ju na ndi Sameria adighi-emekọ ihe.) 10 Jisus zara, si ya, Ọ buru na i matara onyinye Chineke, na Onye Ọ bu Nke nāsi gi, Nyem miri ka M'ṅua; gi onwe-gi gāriọ Ya-ri, Ọ gēnye kwa gi miri di ndu. 11 Nwanyi ahu si Ya, Onye-nwe-ayi, I nweghi ihe isere miri, ma olùlù-miri a di omimi: òle ebe kwa ka I nwere miri ahu di ndu? 12 Ọ̀ gābu na Gi onwe-gi ka nna-ayi Jekob uku, onye nyere ayi olùlù-miri a; ya onwe-ya, na umu-ya, na anu-ulo-ya, ṅu-kwa-ra nime ya? 13 Jisus zara, si ya, Onye ọ bula nke nāṅu miri a, akpiri gākpọ ya nku ọzọ: 14 ma onye ọ bula nke gāṅu miri ahu nke Mu onwem gēnye ya, akpiri agaghi-akpọ ya nku ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi; kama miri ahu nke Mu onwem gēnye ya gāghọ nime ya isi-iyi miri nāsuputa ri nne rue ndu ebighi-ebi. 15 Nwanyi ahu si Ya, Onye-nwe-ayi, nyem miri a, ka akpiri we ghara ikpọm nku, ka m'ghara kwa isi n'ogologo uzọ a nile bia ebe a isere miri. 16 Jisus si ya, Laba, kpọ di-gi, bia kwa n'ebe a. 17 Nwanyi ahu zara, si Ya, Enweghm di. Jisus si ya, I kwuru nke-ọma, si, Enweghi m di: 18 n'ihi na i nwewo di ise; ma onye i nwere ub͕u a abughi di-gi: nka ka i kwuworo n'ezie. 19 Nwanyi ahu si Ya, Onye-nwe-ayi, ahurum na Gi onwe-gi bu onye-amuma. 20 Nna-ayi-hà nile kpọrọ isi ala nye Chineke n'ugwu a; ma unu onwe-unu si, na ebe madu aghaghi ikpọ isi ala nye Chineke di nime Jerusalem. 21 Jisus si ya, Nwanyi, kwerem, oge hour nābia, mb͕e unu nāgaghi-akpọ isi ala nye Nnam, ma ọ bu n'ugwu a, ma-ọbu na Jerusalem. 22 Unu onwe-unu nākpọ isi ala nye ihe unu nāmatagh: ayi onwe-ayi nākpọ isi ala nye ihe ayi matara: n'ihi na nzọputa si n'etiti ndi-Ju puta. 23 Ma oge hour nābia, ub͕u a ka ọ di kwa, mb͕e ndi nākpọ isi ala n'ezie gākpọ isi ala nye Nnam nime mọ na ezi-okwu: n'ihi na ndi di otú ahu ka Nnam nāchọ kwa ka ha buru ndi nākpọ isi ala nye Ya. 24 Chineke bu Mọ: ndi nākpọ kwa isi ala nye Ya aghaghi ikpọ isi ala nime mọ na ezi-okwu. 25 Nwanyi ahu si Ya, Amataram na Mesaia nābia (Onye anākpọ Kraist): mb͕e ọ bula Onye ahu gābia, Ọ gākọrọ ayi ihe nile.
26 Jisus si ya, Mu onwem Nke nāgwa gi okwu bu Ya.
27 Mb͕e Ọ nēkwu nka ndi nēso uzọ-Ya biara; o we ju ha anya na Ya na nwanyi nēkwurita okwu: otú ọ di, o nweghi onye ọ bula siri, Gini ka I nāchọ? ma-ọbu, Gini mere Gi na ya nēkwurita okwu? 28 Ya mere nwanyi ahu rapuru ite-miri-ya, we je ba nime obodo, si ndi ahu, 29 Bianu, le otù Nwoke, Onye gwaram ihe nile m'mere: Ònye a gābu Kraist ahu? 30 Ha siri n'obodo-ha puta, nābiakute kwa Ya. 31 Mb͕e ihe ndia nēme ndi nēso uzọ-Ya nāriọ Ya, si, Rabai, rie ihe. 32 Ma Ọ siri ha, Mu onwem nwere ihe-oriri iri nke unu onwe-unu nāmataghi. 33 Ya mere ndi nēso uzọ-Ya sirita onwe-ha, Ọ̀ di onye wetara Ya ihe Ọ gēri? 34 Jisus si ha, Ihe-oririm bu ka M'nēme ihe Onye ziterem nāchọ, ka M'luzu kwa ọlu-Ya. 35 Ùnu onwe-unu asighi, Ọnwa anọ fọduru, owuwe-ihe-ubi ewe bia? le, asim unu, Welienu anya-unu elu, kiri ubi, na ha chara acha ub͕u a ka ewere ihe di nime ha. 36 Onye nēwere ihe ubi nānara ugwọ-ọlu-ya, nāchikọta kwa nkpuru nye na ndu ebighi-ebi; ka onye nāgha nkpuru na onye nēwere ihe ubi we ṅuria ọṅu n'otù. 37 N'ihi na nime nka ka okwu a bu ezie, Otù onye nāgha nkpuru, ma onye ọzọ nēwere ihe ubi.
38 Mu onwem zigara unu iwere ihe ubi nke ọ dighi mb͕e unu onwe-unu dọb͕uworo onwe-unu n'ilu ya: ndi ọzọ adọb͕uwo onwe-ha n'ọlu, unu onwe-unu abàwo kwa na ndọb͕u-ha.
39 Ma ọtutu ndi Sameria si n'obodo ahu kwere na Ya n'ihi okwu nwanyi ahu, onye b͕ara àmà, si, Ọ gwaram ihe nile m'mere. 40 Ya mere mb͕e ndi Sameria biakutere Ya, ha riọ Ya ka Ọ nọyere ha: O we nọgide n'ebe ahu ubọchi abua. 41 Ma ndi kwere n'ihi okwu-Ya kariri ri nne;
42 ha we si nwanyi ahu, Ọ bughi n'ihi ihe i kwuru ka ayi nēkwe ub͕u a: n'ihi na ayi onwe-ayi anuwo, mata kwa na Onye a bu Onye-nzọputa nke uwa n'ezie.
43 Ma mb͕e ubọchi abua ahu gasiri, O si n'ebe ahu pua ba na Galili. 44 N'ihi na Jisus onwe-ya b͕ara àmà, na adighi-asọpuru onye-amuma n'ala nke aka ya.
45 Ya mere mb͕e Ọ biara na Galili, ndi Galili nara Ya nke-ọma, ebe ha hururi ka ihe O mere na Jerusalem ra n'ememe: n'ihi na ha onwe-ha je-kwa-ra ememe ahu.
46 Ya mere Ọ biaruru Kena nke Galili ozọ, ebe O mere miri ka ọ ghọ manya-vine, Ma otù nwoke nke nējere eze ozi di, nke aru nādighi nwa-ya nwoke ike na Kapanaum. 47 Mb͕e onye ahu nuru na Jisus esiwo na Judia puta ba na Galili, o jekuru Ya, riọ Ya ka Ọ ridata, me ka aru di nwa-ya ike; n'ihi na ọ nọ n'ọnu ọnwu. 48 Ya mere Jisus siri ya, Ọ buru na unu ahughi ihe-iriba-ama na ọlu-ebube, unu agaghi-ekwe ma-ọli. 49 Nwoke ahu nke nējere eze ozi si Ya, Onye-nwe-ayi, ridata mb͕e nwatakirim akānwughi. 50 Jisus si ya, Ga nke gi; nwa-gi nwoke di ndu. Nwoke ahu kwere okwu Jisus gwara ya, o we ga nke ya. 51 Ma mb͕e ọ nọ nārida ub͕u a, ndi-orù-ya zutere ya, si, na nwa-ya di ndu. 52 Ya mere ọ juru ha oge hour nke aru-ya malitere idi ya nma. Ya mere ha siri ya, Nnyahuru n'oge hour nke-asa ka aru-ọku rapuru ya. 53 Ya mere nna-ya mara na ọ bu n'oge hour ahu mb͕e Jisus siri ya, Nwa-gi nwoke di ndu: ya onwe-ya we kwere na èzí-na-ulo-ya dum. 54 Nka bu ihe-iriba-ama ọzọ nke mere ha abua nke Jisus mere, mb͕e O siri na Judia puta ba na Galili.
John 4
1 When therefore the Lord knew that the Pharisees had heard that Jesus was making and baptizing more disciples than John2 (although Jesus himself baptized not, but his disciples),3 he left Judea, and departed again into Galilee.4 And he must needs pass through Samaria.5 So he cometh to a city of Samaria, called Sychar, near to the parcel of ground that Jacob gave to his son Joseph:6 and Jacob’s well was there. Jesus therefore, being wearied with his journey, sat thus by the well. It was about the sixth hour.7 There cometh a woman of Samaria to draw water: Jesus saith unto her, Give me to drink.8 For his disciples were gone away into the city to buy food.9 The Samaritan woman therefore saith unto him, How is it that thou, being a Jew, askest drink of me, who am a Samaritan woman? (For Jews have no dealings with Samaritans.)10 Jesus answered and said unto unto her, If thou knewest the gift of God, and who it is that saith to thee, Give me to drink; thou wouldest have asked of him, and he would have given thee living water.11 The woman saith unto him, Sir, thou hast nothing to draw with, and the well is deep: whence then hast thou that living water?12 Art thou greater than our father Jacob, who gave us the well, and drank thereof himself, and his sons, and his cattle?13 Jesus answered and said unto her, Every one that drinketh of this water shall thirst again:14 but whosoever drinketh of the water that I shall give him shall never thirst; but the water that I shall give him shall become in him a well of water springing up unto eternal life.15 The woman saith unto him, Sir, give me this water, that I thirst not, neither come all the way hither to draw.16 Jesus saith unto her, Go, call thy husband, and come hither.17 The woman answered and said unto him, I have no husband. Jesus saith unto her, Thou saidst well, I have no husband:18 for thou hast had five husbands; and he whom thou now hast is not thy husband: this hast thou said truly.19 The woman saith unto him, Sir, I perceive that thou art a prophet.20 Our fathers worshipped in this mountain; and ye say, that in Jerusalem is the place where men ought to worship.21 Jesus saith unto her, Woman, believe me, the hour cometh, when neither in this mountain, nor in Jerusalem, shall ye worship the Father.22 Ye worship that which ye know not: we worship that which we know; for salvation is from the Jews.23 But the hour cometh, and now is, when the true worshippers shall worship the Father in spirit and truth: for such doth the Father seek to be his worshippers.24 God is a Spirit: and they that worship him must worship in spirit and truth.25 The woman saith unto him, I know that Messiah cometh (he that is called Christ): when he is come, he will declare unto us all things.26 Jesus saith unto her, I that speak unto thee am he.27 And upon this came his disciples; and they marvelled that he was speaking with a woman; yet no man said, What seekest thou? or, Why speakest thou with her?28 So the woman left her waterpot, and went away into the city, and saith to the people,29 Come, see a man, who told me all things that ever I did: can this be the Christ?30 They went out of the city, and were coming to him.31 In the mean while the disciples prayed him, saying, Rabbi, eat.32 But he said unto them, I have meat to eat that ye know not.33 The disciples therefore said one to another, Hath any man brought him aught to eat?34 Jesus saith unto them, My meat is to do the will of him that sent me, and to accomplish his work.35 Say not ye, There are yet four months, and then cometh the harvest? behold, I say unto you, Lift up your eyes, and look on the fields, that they are white already unto harvest.36 He that reapeth receiveth wages, and gathereth fruit unto life eternal; that he that soweth and he that reapeth may rejoice together.37 For herein is the saying true, One soweth, and another reapeth.38 I sent you to reap that whereon ye have not labored: others have labored, and ye are entered into their labor.39 And from that city many of the Samaritans believed on him because of the word of the woman, who testified, He told me all things that ever I did.40 So when the Samaritans came unto him, they besought him to abide with them: and he abode there two days.41 And many more believed because of his word;42 and they said to the woman, Now we believe, not because of thy speaking: for we have heard for ourselves, and know that this is indeed the Saviour of the world.43 And after the two days he went forth from thence into Galilee.44 For Jesus himself testified, that a prophet hath no honor in his own country.45 So when he came into Galilee, the Galilaeans received him, having seen all the things that he did in Jerusalem at the feast: for they also went unto the feast.46 He came therefore again unto Cana of Galilee, where he made the water wine. And there was a certain nobleman, whose son was sick at Capernaum.47 When he heard that Jesus was come out of Judaea into Galilee, he went unto him, and besought him that he would come down, and heal his son; for he was at the point of death.48 Jesus therefore said unto him, Except ye see signs and wonders, ye will in no wise believe.49 The nobleman saith unto him, Sir, come down ere my child die.50 Jesus saith unto him, Go thy way; thy son liveth. The man believed the word that Jesus spake unto him, and he went his way.51 And as he was now going down, his servants met him, saying, that his son lived.52 So he inquired of them the hour when he began to amend. They said therefore unto him, Yesterday at the seventh hour the fever left him.53 So the father knew that it was at that hour in which Jesus said unto him, Thy son liveth: and himself believed, and his whole house.54 This is again the second sign that Jesus did, having come out of Judaea into Galilee.