previous next

JỌN 6

1 Mb͕e ihe ndia gasiri Jisus jere n'ofè ọzọ nke oké osimiri Galili, nke bu osimiri Taibirias. 2 Oké ìgwè madu we so Ya, n'ihi na ha huru ihe-iriba-ama di iche iche nke Ọ nēme n'aru ndi aru-ha nādighi ike. 3 Jisus we rigo n'ugwu ahu, n'ebe ahu ka Ya na ndi nēso uzọ-Ya nọdu-kwa-ra ala. 4 Ma ngabiga, bú ememe ndi-Ju, di nso. 5 Ya mere Jisus, mb͕e O weliri anya-Ya elu, hu na oké ìgwè madu nābiakute Ya, Ọ si Filip, Òle ebe ayi gāzuta ob͕e achicha, ka ndia we rie ihe? 6 Ma nka ka O kwuru inwa ya: n'ihi na Ya onwe-ya matara ihe Ọ gāje ime. 7 Filip zara Ya, Ob͕e achicha ọgu shilling iri agaghi-ezu ha, ka madu nile n'otù we were nke-ntà nke-ntà. 8 Otù nime ndi nēso uzọ-Ya, bú Andru nwa-nne Saimon Pita, si Ya, 9 Otù nwa-okoro ntà nọ n'ebe a, onye ji ob͕e achicha barley ise, na azù abua: ma ǹdia bu gini n'etiti ọtutu madu di otú a? 10 Jisus siri, Menu ka madu ndia nọdu ala. Ma ahihia riri nne n'ebe ahu. Ya mere ndikom ahu we nọdu ala, n'ọnu-ọgugu ra ka nnù iri na nnù abua na ọgu iri. 11 Ya mere Jisus nara ob͕e achicha ise ahu, we kele, we kèsa ha nye ndi nānọdu ala; otú ahu O were azù ahu kèsa nye ha ka azù ha chọrọ ra. 12 Ma mb͕e afọ juru ha, Ọ si ndi nēso uzọ-Ya, Chikọtanu iberibe fọduru, ka ihe ọ bula ghara ila n'iyì. 13 Ya mere ha chikọtara ha, we kpoju nkata iri na abua n'iberibe sitere n'ob͕e achicha barley ise ahu, nke fọduru ndi riworori.

14 Ya mere mb͕e ndi ahu huru ihe-iriba-ama O mere, ha siri, N'ezie Onye a bu onye-amuma ahu nke nābia n'uwa.

15 Ya mere mb͕e Jisus huru na ha gaje ibia idọkpuru Ya n'ike, ka ha we me Ya eze, O wezugara Onwe-ya ọzọ n'ugwu nání Ya onwe-ya.
16 Ma mb͕e o ruru anyasi, ndi nēso uzọ-Ya ridara n'oké osimiri; 17 ha we ba n'ub͕ọ, we nāgabiga ofè oké osimiri ọzọ iga ru Kapanaum. Ọchichiri ab͕awo-kwa-ri ub͕u a, Jisus akābiakuteghi kwa ha. 18 Oké osimiri nēbili kwa, n'ihi na oké ifufe nēfe. 19 Ya mere mb͕e ha nyasiri ihe dika orú furlong na ise ma-ọbu orú na iri, ha hu Jisus ka Ọ nēje ije n'elu oké osimiri, nābiaru kwa ub͕ọ-ha nso: ha we tua egwu. 20 Ma Ọ siri ha, Ọ bu Mu onwem; unu atula egwu.

21 Ya mere ha chọrọ iwebata Ya nime ub͕ọ-ha: ngwa ngwa ub͕ọ-ha we rue ala ebe ha nāga.
22 N'echi-ya, ìgwè madu ndi guzoro n'ofè ọzọ nke oké osimiri ahu huru na ub͕ọ ntà ọzọ adighi n'ebe ahu, ma-ọbughi otù, hu kwa na Jisus esoghi ndi nēso uzọ-Ya ba n'ub͕ọ-ha, kama na nání ndi nēso uzọ-Ya jere; 23 (otú ọ di, ub͕ọ ntà di iche iche sitere na Taibirias bia rue ebe ahu nso ebe ha riri achicha ahu mb͕e Onye-nwe-ayi kelesiri ekele): 24 ya mere mb͕e ìgwè madu ahu huru na Jisus anọghi n'ebe ahu, na ndi nēso uzọ-Ya anọghi kwa, ha onwe-ha bàra n'ub͕ọ ntà, we bia Kapanaum, nāchọ Jisus. 25 Mb͕e ha chọputara Ya n'ofè oké osimiri ọzọ, ha si Ya, Rabai, òle mb͕e I biara n'ebe a? 26 Jisus zara ha, si, N'ezie, n'ezie, asi m unu, Unu nāchọm, ọ bughi n'ihi na unu huru ihe-iriba-ama kama ọ bu n'ihi na unu riri ufọdu nime ob͕e achicha ahu, afọ ju kwa unu. 27 Unu alula ọlu inata ihe-oriri nke nāla n'iyì, kama inata ihe-oriri nke nānọgide rue ndu ebighi-ebi, nke Nwa nke madu gēnye unu: n'ihi na Onye ahu ka Nna, bú Chineke, kara akàrà. 28 Ya mere ha siri Ya, Gini kwesiri ka ayi me, ka ayi we lua ọlu Chineke nile? 29 Jisus zara, si ha, Nka bu ọlu Chineke, ka unu kwere n'Onye ahu Ya onwe-ya zitere. 30 Ya mere ha siri Ya, Gini kwa ka Gi onwe-gi nēme ka ọ buru ihe-iriba-ama, ka ayi we hu, kwere kwa Gi? gini ka I nālu? 31 Nna-ayi-hà riri manna n'ọhia; dika edeworo n'akwukwọ nsọ, si, Nri nke sitere n'elu-igwe ka O nyere ha ka ha rie. 32 Ya mere Jisus siri ha, N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ bughi Moses nyere unu nri ahu nke sitere n'elu-igwe; kama ọ bu Nnam nēnye unu ezi nri ahu nke sitere n'elu-igwe. 33 N'ihi na nri nke Chineke bu nke ahu nke nēsi n'elu-igwe aridata, nke nēnye kwa uwa ndu. 34 Ya mere ha siri Ya, Onye-nwe-ayi, nye ayi nri a mb͕e nile. 35 Jisus siri ha, Mu onwem bu nri nēnye ndu: onye nābiakutem, agu agaghi-agu ya ma-ọli, onye nēkwere kwa na Mu akpiri agaghi-akpọ ya nku ma-ọli mb͕e ọ bula. 36 Ma asirim unu, na unu ahuwom, ma unu ekweghi. 37 Ihe nile nke Nnam nēnyem gābiakutem; onye nābiakutekwam M'gaghi-achupu ya ma-ọli. 38 N'ihi na esiwom n'elu-igwe ridata, ọ bughi ka M'nēme ihe Mu onwem nāchọ, kama ka M'nēme ihe Onye ziterem nāchọ. 39 Ma nka bu ihe Onye ziterem nāchọ, ka M'ghara itufu ihe ọ bula nime ihe nile O nyeworo m, kama ka M'me ka o si n'ọnwu bilie n'ubọchi ikpe-azu.

40 N'ihi na nka bu ihe Nnam nāchọ, ka onye ọ bula nke nēle Ọkpara-Ya anya, nke nēkwere kwa na Ya, we nwe ndu ebighi-ebi; Mu onwem gēme kwa ka o si n'ọnwu bilie n'ubọchi ikpe-azu.
41 Ya mere ndi-Ju nātamu ntamu megide Ya, n'ihi na Ọ siri, Mu onwem bu nri nke siri n'elu-igwe ridata. 42 Ha we si, Onye a, Ọ̀ bughi Jisus, Nwa Josef, Onye ayi onwe-ayi mara nna-Ya na nne-Ya? Ò si aṅa kwue ub͕u a, Esiwom n'elu-igwe ridata? 43 Jisus zara, si ha, Unu atamula n'etiti onwe-unu. 44 Ọ dighi onye ọ bula puru ibiakutem, ọ buru na Nna Nke ziterem adọghi ya: Mu onwem gēme kwa ka o si n'ọnwu bilie n'ubọchi ikpe-azu. 45 Edewo ya n'akwukwọ ndi-amuma, si, Ha nile gābu kwa ndi Chineke zíworo ihe. Onye ọ bula nke nuworo site n'ọnu Nnam, nke mutawo-kwa-ra ihe, ọ nābiakutem. 46 Ọ bughi na madu ọ bula ahuwo Nnam, ma-ọbughi Onye ahu Nke si n'ebe Chineke nọ puta, Onye ahu ahuwo Nnam. 47 N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye nēkwere nēnwe ndu ebighi-ebi. 48 Mu onwem bu nri nke nēnye ndu. 49 Nna-unu-hà riri manna ahu n'ọhia, ha we nwua. 50 Nka bu nri nke si n'elu-igwe ridata, ka madu we rie ufọdu nime ya, ghara kwa inwu anwu.

51 Mu onwem bu nri di ndu nke siri n'elu-igwe ridata: ọ buru na madu erie ufọdu nime nri a, ọ gādi ndu rue mb͕e ebighi-ebi: ma nri nke Mu onwem gēnye kwa bu anu-arum, n'ihi ndu nke uwa.
52 Ya mere ndi-Ju nālurita uka n'etiti onwe-ha, si, Onye a, Ò si aṅa pu inye ayi anu-aru-Ya ka ayi rie? 53 Ya mere Jisus siri ha, N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ buru na unu erighi anu-aru nke Nwa nke madu, ọ buru kwa na unu aṅughi ọbara-Ya, unu enweghi ndu nime onwe-unu. 54 Onye nēri anu-arum, nke nāṅu kwa ọbaram, o nwere ndu ebighi-ebi; Mu onwem gēme kwa ka o si n'ọnwu bilie n'ubọchi ikpe-azu. 55 N'ihi na anu-arum bu ihe-oriri n'ezie, ọbaram bu kwa ihe-ọṅuṅu n'ezie. 56 Onye nēri anu-arum, nke nāṅu kwa ọbaram, ọ nānọgide nimem, Mu onwem kwa nime ya. 57 Dika Nna Nke di ndu ziterem, dika Mu onwem di kwa ndu n'ihi Nnam; otú a onye nērim, onye ahu gādi kwa ndu n'ihim. 58 Nka bu nri ahu nke siri n'elu-igwe ridata: ọ bughi dika nna-unu-hà riri, we nwua: onye nēri nri a gādi ndu rue mb͕e ebighi-ebi.

59 Ihe ndia ka O kwuru n'ulo-nzukọ, mb͕e O nēzí ihe na Kapanaum.
60 Ya mere ọtutu nime ndi nēso uzọ-Ya, mb͕e ha nuru okwu ahu, ha siri, Okwu a di ike; ònye puru inu ya? 61 Ma ebe Jisus mara n'Onwe-ya na ndi nēso uzọ-Ya nātamu ntamu n'ihi nka, Ọ siri ha, Ọ̀ bu nka nēme ka unu ma n'ọnyà? 62 Ùnu agaghi-amakari kwa n'ọnyà ma ọ buru na unu ahu Nwa nke madu ka Ọ nārigo n'ebe Ọ nọri na mbu? 63 Ọ bu Mọ nēme ka madu di ndu; anu-aru abaghi urù ọ bula: okwu nke Mu onwem gwaworo unu, ha bu mọ, buru kwa ndu. 64 Ma ufọdu ndi nēkweghi di n'etiti unu. N'ihi na Jisus mara site na mbu ndi ha bu ndi nēkweghi, na onye ọ bu nke gārara Ya nye.

65 O we si, Ọ bu n'ihi nka ka M'siworo unu, na ọ dighi onye ọ bula puru ibiakutem, ọ buru na enyeghi ya site n'aka Nnam.
66 Site na nka ọtutu nime ndi nēso uzọ-Ya we laghachi azu, ha esoghi kwa Ya ejeghari ọzọ. 67 Ya mere Jisus siri ndi-ozi iri na abua ahu, Ùnu onwe-unu nāchọ kwa ila? 68 Saimon Pita zara Ya, si, Onye-nwe-ayi, Ònye ka ayi gējekuru? I nwere okwu nke ndu ebighi-ebi. 69 Ọzọ, ayi onwe-ayi ekwerewo mara kwa na Gi onwe-gi bu Onye Nsọ ahu nke Chineke. 70 Jisus zara ha, si, Ọ̀ bughi Mu onwem rọputara unu, bú ndi-ozi iri na abua, ma otù onye nime unu bu nwa ekwensu? 71 Ma Ọ nēkwu ihe bayere Judas nwa Saimon Iskariot, n'ihi na onye ahu gaje irara Ya nye, buri otù onye nime ndi-ozi iri na abua ahu.

John 6

1 After these things Jesus went away to the other side of the sea of Galilee, which is the sea of Tiberias.2 And a great multitude followed him, because they beheld the signs which he did on them that were sick.3 And Jesus went up into the mountain, and there he sat with his disciples.4 Now the passover, the feast of the Jews, was at hand.5 Jesus therefore lifting up his eyes, and seeing that a great multitude cometh unto him, saith unto Philip, Whence are we to buy bread, that these may eat?6 And this he said to prove him: for he himself knew what he would do.7 Philip answered him, Two hundred shillings’ worth of bread is not sufficient for them, that every one may take a little.8 One of his disciples, Andrew, Simon Peter’s brother, saith unto him,9 There is a lad here, who hath five barley loaves, and two fishes: but what are these among so many?10 Jesus said, Make the people sit down. Now there was much grass in the place. So the men sat down, in number about five thousand.11 Jesus therefore took the loaves; and having given thanks, he distributed to them that were set down; likewise also of the fishes as much as they would.12 And when they were filled, he saith unto his disciples, Gather up the broken pieces which remain over, that nothing be lost.13 So they gathered them up, and filled twelve baskets with broken pieces from the five barley loaves, which remained over unto them that had eaten.14 When therefore the people saw the sign which he did, they said, This is of a truth the prophet that cometh into the world.15 Jesus therefore perceiving that they were about to come and take him by force, to make him king, withdrew again into the mountain himself alone.16 And when evening came, his disciples went down unto the sea;17 and they entered into a boat, and were going over the sea unto Capernaum. And it was now dark, and Jesus had not yet come to them.18 And the sea was rising by reason of a great wind that blew.19 When therefore they had rowed about five and twenty or thirty furlongs, they behold Jesus walking on the sea, and drawing nigh unto the boat: and they were afraid.20 But he saith unto them, It is I; be not afraid.21 They were willing therefore to receive him into the boat: and straightway the boat was at the land whither they were going.22 On the morrow the multitude that stood on the other side of the sea saw that there was no other boat there, save one, and that Jesus entered not with his disciples into the boat, but that his disciples went away alone23 (howbeit there came boats from Tiberias nigh unto the place where they ate the bread after the Lord had given thanks):24 when the multitude therefore saw that Jesus was not there, neither his disciples, they themselves got into the boats, and came to Capernaum, seeking Jesus.25 And when they found him on the other side of the sea, they said unto him, Rabbi, when camest thou hither?26 Jesus answered them and said, Verily, verily, I say unto you, Ye seek me, not because ye saw signs, but because ye ate of the loaves, and were filled.27 Work not for the food which perisheth, but for the food which abideth unto eternal life, which the Son of man shall give unto you: for him the Father, even God, hath sealed.28 They said therefore unto him, What must we do, that we may work the works of God?29 Jesus answered and said unto them, This is the work of God, that ye believe on him whom he hath sent.30 They said therefore unto him, What then doest thou for a sign, that we may see, and believe thee? what workest thou?31 Our fathers ate the manna in the wilderness; as it is written, He gave them bread out of heaven to eat.32 Jesus therefore said unto them, Verily, verily, I say unto you, It was not Moses that gave you the bread out of heaven; but my Father giveth you the true bread out of heaven.33 For the bread of God is that which cometh down out of heaven, and giveth life unto the world.34 They said therefore unto him, Lord, evermore give us this bread.35 Jesus said unto them. I am the bread of life: he that cometh to me shall not hunger, and he that believeth on me shall never thirst.36 But I said unto you, that ye have seen me, and yet believe not.37 All that which the Father giveth me shall come unto me; and him that cometh to me I will in no wise cast out.38 For I am come down from heaven, not to do mine own will, but the will of him that sent me.39 And this is the will of him that sent me, that of all that which he hath given me I should lose nothing, but should raise it up at the last day.40 For this is the will of my Father, that every one that beholdeth the Son, and believeth on him, should have eternal life; and I will raise him up at the last day.41 The Jews therefore murmured concerning him, because he said, I am the bread which came down out of heaven.42 And they said, Is not this Jesus, the son of Joseph, whose father and mother we know? how doth he now say, I am come down out of heaven?43 Jesus answered and said unto them, Murmur not among yourselves.44 No man can come to me, except the Father that sent me draw him: and I will raise him up in the last day.45 It is written in the prophets, And they shall all be taught of God. Every one that hath heard from the Father, and hath learned, cometh unto me.46 Not that any man hath seen the Father, save he that is from God, he hath seen the Father.47 Verily, verily, I say unto you, He that believeth hath eternal life.48 I am the bread of life.49 Your fathers ate the manna in the wilderness, and they died.50 This is the bread which cometh down out of heaven, that a man may eat thereof, and not die.51 I am the living bread which came down out of heaven: if any man eat of this bread, he shall live for ever: yea and the bread which I will give is my flesh, for the life of the world.52 The Jews therefore strove one with another, saying, How can this man give us his flesh to eat?53 Jesus therefore said unto them, Verily, verily, I say unto you, Except ye eat the flesh of the Son of man and drink his blood, ye have not life in yourselves.54 He that eateth my flesh and drinketh my blood hath eternal life: and I will raise him up at the last day.55 For my flesh is meat indeed, and my blood is drink indeed.56 He that eateth my flesh and drinketh my blood abideth in me, and I in him.57 As the living Father sent me, and I live because of the Father; so he that eateth me, he also shall live because of me.58 This is the bread which came down out of heaven: not as the fathers ate, and died; he that eateth this bread shall live for ever.59 These things said he in the synagogue, as he taught in Capernaum.60 Many therefore of his disciples, when they heard this, said, This is a hard saying; who can hear it?61 But Jesus knowing in himself that his disciples murmured at this, said unto them, Doth this cause you to stumble?62 What then if ye should behold the Son of man ascending where he was before?63 It is the spirit that giveth life; the flesh profiteth nothing: the words that I have spoken unto you are spirit, and are life.64 But there are some of you that believe not. For Jesus knew from the beginning who they were that believed not, and who it was that should betray him.65 And he said, For this cause have I said unto you, that no man can come unto me, except it be given unto him of the Father.66 Upon this many of his disciples went back, and walked no more with him.67 Jesus said therefore unto the twelve, Would ye also go away?68 Simon Peter answered him, Lord, to whom shall we go? thou hast the words of eternal life.69 And we have believed and know that thou art the Holy One of God.70 Jesus answered them, Did not I choose you the twelve, and one of you is a devil?71 Now he spake of Judas the son of Simon Iscariot, for he it was that should betray him, being one of the twelve.