NDI-IKPE 16
1 Samson we jerue Geza, hu otù nwayi nākwa iko n'ebe ahu, o we bakuru ya. 2 Ewe gwa ndi Geza, si, Samson abiawo ebe a. Ha we b͕a ya buruburu, che ya anwu abali ahu nile n'ọnu-uzọ-ama obodo, nọdu du abali ahu nile, si, Ka ọ di rue ìhè ututu, ayi we b͕ue ya.
3 Samson we dina rue etiti abali, bilie n'etiti abali, jide ibo ọnu-uzọ-ama obodo, jide kwa ide-ya abua, ropu ha, tiyere nkpọrọ, tukwasi ha n'ubu-ya abua, būru ha rigo n'elu ugwu nke di n'iru Hebron.
4 O rue, mb͕e nka gasiri, na ọ huru otù nwayi n'anya na ndagwurugwu Sorek, onye aha-ya bu Delaila. 5 Ndi-isi ndi Filistia we rigokuru ya, si ya, Rà ya ọnu, hu ihe ọ bu, bú nke ike uku ya di nime ya, na ihe ayi gēji pu imegide ya, ka ayi we ke ya ab͕u iweda ya n'ala: ayi onwe-ayi gēnye kwa gi, nwoke ọ bula nime ayi, nnù ọla-ọcha abua na ọgu iri-na-ise. 6 Delaila we si Samson, Biko, gosim ihe ọ bu, bú nke ike uku gi di nime ya, na ihe agēji ke gi ab͕u iweda gi n'ala. 7 Samson we si ya, Ọ buru na ha ewere akwara ọhu asa nke anāmikọghi amikọ kem ab͕u, m'gābu kwa onye nādighi ike, di kwa ka madu ọ bula si di. 8 Ndi-isi Filistia we chigoro Delaila akwara ọhu asa nke anāmikọghi amikọ, o we were ha ke ya ab͕u. 9 Ma o nwere ndi nēche anwu nānọdu n'ime-ulo. O we si ya, Ndi Filistia nādakwasi gi, Samson. O we dọbìe akwara asa ahu, dika anādọbì eriri-nzuzu mb͕e aṅara ya ọku. Amaghi kwa ike-ya. 10 Delaila we si Samson, Le, i kwawom emò, gwam okwu-ugha: biko, gosim ub͕u a ihe agēji ke gi ab͕u. 11 Ọ si ya, Ọ buru na ha achiri udọ̀ ọhu, nke akējighi je ozi ọ bula, kesim ab͕u ike, m'gābu kwa onye nādighi ike, di kwa ka madu ọ bula si di. 12 Delaila we chiri udọ̀ ọhu, were ha ke ya ab͕u, si ya, Ndi Filistia nādakwasi gi, Samson. Ma ndi nēche anwu nānọdu n'ime-ulo. O we dọbìpu ha n'ogwe - aka - ya abua dika ogho. 13 Delaila we si Samson, Rue ub͕u a i kwawom emò, gwam okwu-ugha: gosim ihe agēji ke gi ab͕u. Ọ si ya, Ọ buru na i kpà osusu asa nke isim n'ákwà akpara. 14 O we were ǹtú ya, si ya, Ndi Filistia nādakwasi gi, Samson. O we teta n'ura-ya, were ǹtú nke ihe eji akpà ákwà na ákwà ahu akpara, bulie ije-ya. 15 Delaila we si ya, Ì si aṅa si, Ahurum i n'anya, ma obi-gi adighi n'ebe m'nọ? ub͕ò atọ a ka i kwaworom emò, ma i gosighm ihe ọ bu, bú nke ike uku gi di nime ya. 16 O rue, mb͕e o were okwu-ya nile kpagide ya ubọchi nile, sob͕u kwa ya, na nkpuru-obi-ya enweghi ntachi-obi rue ọnwu. 17 O we gosi ya obi-ya nile, si ya, Ọ dighi mb͕e aguba gara n'elu isim; n'ihi na onye-Nazirait nke Chineke ka m'bu site n'afọ nnem: ọ buru na akọpum isi, ikem gēsi n'arum wezuga onwe-ya, m'gābu kwa onye nādighi ike, di kwa ka madu nile si di. 18 Delaila we hu na o gosiri ya obi-ya nile, o we ziga kpọ ndi-isi ndi Filistia, si, Rigotanu otù ub͕ò a, n'ihi na o gosiwom obi-ya nile. Ndi-isi ndi Filistia we rigokute ya, chigota ego ahu n'aka-ha. 19 O we me ka Samson raru ura n'ikperè-ukwu-ya abua; o we malite iweda ya n'ala, ike-ya we si n'aru ya wezuga onwe-ya. 20 O we si, Ndi Filistia nādakwasi gi, Samson. O we teta n'ura-ya, si, M'gāpu dika m'nēme ub͕ò ub͕ò, we meghari aru. Ma ya onwe-ya amaghi na Jehova esiwo n'ebe ọ nọ wezuga Onwe-ya. 21 Ndi Filistia we jide ya, rukpọ anya-ya abua; ha we me ka ọ ridarue Geza, were ihe ọla abua ke ya ab͕u; o we buru onye nēgwe ọka n'ulo ndi ekere ab͕u.
22 Agiri-isi-ya we malite irute mb͕e akọpusiri ya.
23 Ndi-isi ndi Filistia we chikọta onwe-ha ichuru Degon, bú chi-ha, àjà uku, na iṅuri ọṅu: ha si, Chi-ayi enyewo Samson, bú onye-iro-ayi, n'aka-ayi. 24 Ndi ahu we hu ya, to chi-ha: n'ihi na ha siri, Chi-ayi enyewo onye-iro-ayi n'aka-ayi, bú onye nēme ka ala-ayi tọb͕ọrọ n'efu, onye me-kwa-ra ka ndi-ayi eb͕uru eb͕u ba uba. 25 O rue, mb͕e obi-ha di nma, na ha siri, Kpọnu Samson, ka ọ we mere ayi ihe-ọchì. Ha we si n'ulo ndi ekere ab͕u kpọputa Samson; o we me ihe-ọchì n'iru ha: ha we me ka o guzo n'etiti ogidi. 26 Samson we si nwa-okoro onye nēji ya n'aka, Ka m'nọduru onwem, ka m'we metu ogidi nke ulo nēguzosi ike n'elu ha aka, ka m'we dabere ha. 27 Ma ulo ahu juputara na ndikom na ndinyom; n'ebe ahu ka ndi-isi nile nke ndi Filistia nọ kwa; ihe ra ka nnù ndikom na ndinyom asa na ọgu iri nọ kwa n'elu ulo, ndi nēle ka Samson nēme ihe-ọchì. 28 Samson we kpọkue Jehova, si, Onye-nwe-ayi Jehova, biko, chetam, biko, Chineke, mekwam ka m'di ike nání otù ub͕ò a, ka m'bọ-kwa-ra onwem ọ́bọ̀ otù mb͕e n'aru ndi Filistia n'ihi anyam abua. 29 Samson we b͕akua ogidi abua nke di n'etiti, nke ulo nēguzosi ike n'elu ha, o we dabere ha, otù n'aka-nri-ya, na otù n'aka-ekpe-ya. 30 Samson we si, Ka mu onwem soro ndi Filistia nwua. O we were ike rulata onwe-ya; ulo ahu we dakwasi ndi-isi ahu, dakwasi kwa ndi nile nọ nime ya. Ndi nwuru anwu ndi o mere ka ha nwua n'ọnwu-ya we di ọtutu kari ndi o mere ka ha nwua na ndu-ya. 31 Umu-nne-ya na ulo nna-ya nile we rida, bulie ya, bugota ya, lìe ya n'etiti Zọra na Eshtaol n'ílì Manoa, bú nna-ya. O we kpe Israel ikpe orú arọ.
Judges 16
1 And Samson went to Gaza, and saw there a harlot, and went in unto her.2 And it was told the Gazites, saying, Samson is come hither. And they compassed him in, and laid wait for him all night in the gate of the city, and were quiet all the night, saying, Let be till morning light, then we will kill him.3 And Samson lay till midnight, and arose at midnight, and laid hold of the doors of the gate of the city, and the two posts, and plucked them up, bar and all, and put them upon his shoulders, and carried them up to the top of the mountain that is before Hebron.
4 And it came to pass afterward, that he loved a woman in the valley of Sorek, whose name was Delilah.5 And the lords of the Philistines came up unto her, and said unto her, Entice him, and see wherein his great strength lieth, and by what means we may prevail against him, that we may bind him to afflict him: and we will give thee every one of us eleven hundred pieces of silver.6 And Delilah said to Samson, Tell me, I pray thee, wherein thy great strength lieth, and wherewith thou mightest be bound to afflict thee.7 And Samson said unto her, If they bind me with seven green withes that were never dried, then shall I become weak, and be as another man.8 Then the lords of the Philistines brought up to her seven green withes which had not been dried, and she bound him with them.9 Now she had liers-in-wait abiding in the inner chamber. And she said unto him, The Philistines are upon thee, Samson. And he brake the withes, as a string of tow is broken when it toucheth the fire. So his strength was not known.
10 And Delilah said unto Samson, Behold, thou hast mocked me, and told me lies: now tell me, I pray thee, wherewith thou mightest be bound.11 And he said unto her, If they only bind me with new ropes wherewith no work hath been done, then shall I become weak, and be as another man.12 So Delilah took new ropes, and bound him therewith, and said unto him, The Philistines are upon thee, Samson. And the liers-in-wait were abiding in the inner chamber. And he brake them off his arms like a thread.
13 And Delilah said unto Samson, Hitherto thou hast mocked me, and told me lies: tell me wherewith thou mightest be bound. And he said unto her, If thou weavest the seven locks of my head with the web.14 And she fastened it with the pin, and said unto him, The Philistines are upon thee, Samson. And he awaked out of his sleep, and plucked away the pin of the beam, and the web.
15 And she said unto him, How canst thou say, I love thee, when thy heart is not with me? thou hast mocked me these three times, and hast not told me wherein thy great strength lieth.16 And it came to pass, when she pressed him daily with her words, and urged him, that his soul was vexed unto death.17 And he told her all his heart, and said unto her, There hath not come a razor upon my head; for I have been a Nazirite unto God from my mother’s womb: if I be shaven, then my strength will go from me, and I shall become weak, and be like any other man.18 And when Delilah saw that he had told her all his heart, she sent and called for the lords of the Philistines, saying, Come up this once, for he hath told me all his heart. Then the lords of the Philistines came up unto her, and brought the money in their hand.19 And she made him sleep upon her knees; and she called for a man, and shaved off the seven locks of his head; and she began to afflict him, and his strength went from him.20 And she said, The Philistines are upon thee, Samson. And he awoke out of his sleep, and said, I will go out as at other times, and shake myself free. But he knew not that Jehovah was departed from him.21 And the Philistines laid hold on him, and put out his eyes; and they brought him down to Gaza, and bound him with fetters of brass; and he did grind in the prison-house.22 Howbeit the hair of his head began to grow again after he was shaven.
23 And the lords of the Philistines gathered them together to offer a great sacrifice unto Dagon their god, and to rejoice; for they said, Our god hath delivered Samson our enemy into our hand.24 And when the people saw him, they praised their god; for they said, Our god hath delivered into our hand our enemy, and the destroyer of our country, who hath slain many of us.25 And it came to pass, when their hearts were merry, that they said, Call for Samson, that he may make us sport. And they called for Samson out of the prison-house; and he made sport before them. And they set him between the pillars:26 and Samson said unto the lad that held him by the hand, Suffer me that I may feel the pillars whereupon the house resteth, that I may lean upon them.27 Now the house was full of men and women; and all the lords of the Philistines were there; and there were upon the roof about three thousand men and women, that beheld while Samson made sport.
28 And Samson called unto Jehovah, and said, O Lord Jehovah, remember me, I pray thee, and strengthen me, I pray thee, only this once, O God, that I may be at once avenged of the Philistines for my two eyes.29 And Samson took hold of the two middle pillars upon which the house rested, and leaned upon them, the one with his right hand, and the other with his left.30 And Samson said, Let me die with the Philistines. And he bowed himself with all his might; and the house fell upon the lords, and upon all the people that were therein. So the dead that he slew at his death were more than they that he slew in his life.31 Then his brethren and all the house of his father came down, and took him, and brought him up, and buried him between Zorah and Eshtaol in the burying-place of Manoah his father. And he judged Israel twenty years.