NDI-IKPE 20
1 Umu Israel nile we puta, ewe kpọkọta nzukọ Israel dika otù nwoke, site na Dan we rue Bia-sheba, ha na ala Gilead, n'ebe Jehova nọ na Mizpa. 2 Ndi-isi ndi Israel nile, bú ebo nile nke Israel, we guzo onwe-ha nime nkpọkọta ndi Chineke, orú nnù ọgu uzọ abua na orú nnù uzọ iri, bú ndi ji ukwu eje, ndi nāmiputa mma-agha. 3 (Ma umu Benjamin nuru na umu Israel arigowo rue Mizpa.) Umu Israel we si, Kwuenu, ìhe ọjọ a si aṅa di? 4 Nwoke ahu, bú onye Livai, di nwayi ahu nke eb͕uru eb͕u, we za, si, Ọ bu Gibea nke diri Benjamin ka m'biara, mu onwem na ikom nwayi, inọ ọnọdu-abali. 5 Ndi-nwe Gibea we bilie megidem, b͕a ulo buruburu imegidem n'abali; mu ka ha chère ib͕u, ikom nwayi ka ha weda-kwa-ra n'ala, o we nwua. 6 M'we jide ikom nwayi, bọ̀ ya abọ̀, zisa ya n'ọhia nile nke ala-nketa Israel: n'ihi na ha emewo ihe-nzube ọjọ na ihe-nzuzu n'Israel. 7 Le, unu nile, bú umu Israel, weputanu okwu na ìzù n'onwe-unu n'ebe a. 8 Ndi Israel nile we bilie dika otù nwoke, si, Ayi agaghi-eje, onye ọ bula n'ulo-ikwū-ya, ayi agaghi-ewezuga kwa onwe-ayi, onye ọ bula ibà n'ulo-ya. 9 Ma ub͕u a nka bu ihe ayi gēme Gibea; ayi gārigo imegide ya n'ofufe-nzà; 10 ayi gēwere kwa ndikom iri nime ọgu ise nke ebo nile nke Israel, na ọgu ise nime nnù abua na ọgu iri, na nnù abua na ọgu iri nime orú nnù na nnù ise, iwetara ndi Israel ihe-oriri-uzọ, ka ha we me, mb͕e ha biaruru Geba Benjamin, dika ihe-nzuzu nile si di nke ha meworo n'Israel. 11 Ndikom nile nke Israel we chikọta onwe-ha imegide obodo ahu, dika otù nwoke ka ejikọtara ha n'otù. 12 Ebo Israel nile we zisa ndikom n'ebo Benjamin, si, Gini bu ihe ọjọ a nke emeworo ka ọ di n'etiti unu? 13 Ma ub͕u a nyenu ayi ndikom ahu, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, ndi nọ na Gibea, ka ayi we me ka ha nwua, ka ayi kpochapu kwa ihe ọjọ n'Israel. Ma umu Benjamin ekweghi ige nti olu umu-nne-ha, bú umu Israel. 14 Umu Benjamin we si n'obodo nile ha chikọta onwe-ha rue Gibea, ipu ibuso umu Israel agha. 15 Umu Benjamin we gukọta onwe-ha n'ubọchi ahu site n'obodo nile ha, orú nnù uzọ atọ na nnù ise, bú ndikom nāmiputa mma-agha, nāgughi ndi bi na Gibea, ndi gukọtara onwe-ha, nnù ndikom na ọgu iri-na-ise ndi arọputara arọputa.
16 N'etiti ndi nka nile nnù ndikom na ọgu iri-na-ise ndi arọputara arọputa di, ndi nēme aka-ekpe; onye ọ bula nime ha nāmata otù agiri-isi nkume, ghara imahie.
17 Ma ndikom Israel gukọtara onwe-ha, orú ọgu uzọ abua na orú nnù uzọ iri, bú ndikom nāmiputa mma-agha, nāgughi Benjamin: ndia nile bu ndikom agha. 18 Umu Israel we bilie, rigorue Bet-el, jua Chineke ase; ha we si, Ònye gēbu uzọ rigoro ayi ibuso umu Benjamin agha? Jehova we si, Juda gēbu uzọ. 19 Umu Israel we bilie n'ututu, ma ulo-ikwū-ha megide Gibea. 20 Ndikom Israel we pua ibuso Benjamin agha; ndikom Israel we do agha n'usoro megide ha na Gibea. 21 Umu Benjamin we si na Gibea puta, bibi rue ala n'etiti Israel n'ubọchi ahu orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri-na-ise. 22 Ndi ahu, bú ndikom Israel, we me onwe-ha ka ha di ike, ha we do kwa agha n'usoro ọzọ n'ebe ha doro onwe-ha n'usoro n'ubọchi mbu.
23 (Umu Israel we rigo, kwa ákwá n'iru Jehova rue anyasi; ha we jua Jehova ase, si, M'gābiaru kwa nso ọzọ ibuso umu Benjamin, bú nwa-nnem, agha? Jehova we si, Rigonu megide ya.)
24 Umu Israel we biarue nso imegide umu Benjamin n'ubọchi nke-abua. 25 Benjamin we si na Gibea puta izute ha n'ubọchi nke-abua ahu, ha we bibie ọzọ rue ala n'etiti umu Israel orú nnù ndikom uzọ abua na nnù ise; ndia nile nāmiputa mma-agha. 26 Umu Israel nile, na ndi ahu nile, we rigo, biarue Bet-el, kwa ákwá, nọdu n'ebe ahu n'iru Jehova, bue ọnu n'ubọchi ahu rue anyasi; ha we sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo n'iru Jehova. 27 Umu Israel we jua Jehova ase, (n'ihi na n'ebe ahu ka ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Chineke di na mb͕e ahu, 28 Finehas, nwa Eleeza, nwa Eron, nēguzo kwa n'iru ya na mb͕e ahu,) si, M'gapu kwa ọzọ ibuso umu Benjamin, bú nwa-nnem, agha, ma-ọbu #m'gāgha? Jehova we si, Rigonu; n'ihi na echi ka M'gēnye ya n'aka-gi.
29 Israel we do ndi nēru nbì megide Gibea buruburu.
30 Umu Israel we rigo megide umu Benjamin n'ubọchi nke-atọ, do onwe-ha n'usoro megide Gibea, dika ha mere ub͕ò abua gara aga. 31 Umu Benjamin we pua izute ndi Israel, ewe dọpu ha n'obodo; ha we malite itib͕u ufọdu n'etiti ndi Israel na ib͕u ha, dika ha mere ub͕ò abua gara aga, n'uzo abua atuliri atuli, nke otù nime ha nārigo Bet-el, otù nārigo kwa Gibea, n'ọhia, ihe ra ka orú ndikom na iri nime Israel. 32 Umu Benjamin we si, Anētib͕u ha n'iru ayi, dika na mbu. Ma umu Israel siri, Ka ayi b͕alaga, si n'obodo dọputa ha n'uzọ atuliri atuli. 33 Ndikom nile nke Israel we si n'ọnọdu-ha bilie, do onwe-ha n'usoro na Beal-tema: ndi Israel ndi nēru nbì nāwaputa kwa n'ọnọdu-ha, na Maare-geba. 34 Orú nnù ndikom na nnù ise ndi arọputara arọputa n'Israel nile we bia na ncherita-iru Gibea, agha ahu we di arọ́: ma ndi Benjamin amaghi na ihe ọjọ nēmetu ha aru.
35 Jehova we tib͕ue Benjamin n'iru Israel: umu Israel we bibie orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri-na-ise nime Benjamin ubọchi ahu: ndia nile nāmiputa mma-agha.
36 Umu Benjamin we hu na etib͕uru ha: n'ihi na ndikom Israel nyere Benjamin uzọ, n'ihi na ha tukwasiri obi na ndi nēru nbì ndi ha doro imegide Gibea. 37 Ndi nēru nbì we je ọsọsọ, made imegide Gibea; ndi nēru nbì we dọrọ onwe-ha rue obodo, were ọnu mma-agha tib͕ue obodo ahu nile. 38 Ma ihe-iriba-ama akara àkà nke diri ndikom Israel na ndi nēru nbì bu nka, na ha gēme ka oké nkwuli anwuru-ọku si n'obodo ahu rigo. 39 Ndikom Israel we chigharia n'agha ahu, Benjamin we malite itib͕u ufọdu n'etiti ndikom Israel na ib͕u ha, ihe ra ka orú ndikom na iri: n'ihi na ha siri, N'ezie ndi etib͕uworo nọ̄ n'iru ayi ka ha bu, dika n'agha mbu. 40 Nkwuli anwuru ahu we malite isi n'obodo ahu rigo, buru ogidi anwuru-ọku, Benjamin we gha anya n'azu ha, ma, le, obodo ahu dum rigoro n'anwuru-ọku rue elu-igwe. 41 Ndikom Israel we chigharia, ndikom Benjamin we ma jijiji: n'ihi na ha huru na ihe ọjọ emetuwo ha aru. 42 Ha we chigharia n'iru ndikom Israel rue uzọ ọzara; ma agha ahu sogidesiri ha ike; ndi siri n'obodo nile puta nēbibi ha n'etiti ha. 43 Ha we b͕a Benjamin buruburu, chua ha, zọkwasi ha ukwu n'ebe-izu-ike-ha, rue na ncherita-iru Gibea n'akuku ọwuwa-anyanwu. 44 Orú nnù ndikom uzò abua na nnù ise nke Benjamin we da; ndia nile bu ndi-dìnkpà. 45 Ha we chigharia b͕alaga n'uzọ ọzara rue nkume di elu, bú Rimon: ha we ghọrọ ha, bú nnù ndikom iri-na-abua na ọgu iri, n'uzọ atuliri atuli, we sogidesi ha ike rue Gidom, tib͕ue nime ha nnù ndikom ise. 46 Ndi nile ndi si na Benjamin da n'ubọchi ahu di orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri ndi nāmiputa mma-agha; ndia nile bu ndi-dìnkpà. 47 Ma nnù ndikom na ọgu iri chighariri b͕alaga n'uzọ ọzara rue nkume di elu, bú Rimon, nọdu na nkume di elu, bú Rimon, ọnwa anọ. 48 Ndikom Israel we laghachikuru umu Benjamin, were ọnu mma-agha tib͕ue ha, site n'obodo ndikom rue anu-ulo na ihe ọ bula nke achọtara achọta; ọzọ kwa, obodo nile nke ha chọtara, ha suru ha ọku.
Judges 20
1 Then all the children of Israel went out, and the congregation was assembled as one man, from Dan even to Beer-sheba, with the land of Gilead, unto Jehovah at Mizpah.2 And the chiefs of all the people, even of all the tribes of Israel, presented themselves in the assembly of the people of God, four hundred thousand footmen that drew sword.3 (Now the children of Benjamin heard that the children of Israel were gone up to Mizpah.) And the children of Israel said, Tell us, how was this wickedness brought to pass?4 And the Levite, the husband of the woman that was murdered, answered and said, I came into Gibeah that belongeth to Benjamin, I and my concubine, to lodge.5 And the men of Gibeah rose against me, and beset the house round about me by night; me they thought to have slain, and my concubine they forced, and she is dead.6 And I took my concubine, and cut her in pieces, and sent her throughout all the country of the inheritance of Israel; for they have committed lewdness and folly in Israel.7 Behold, ye children of Israel, all of you, give here your advice and counsel.
8 And all the people arose as one man, saying, We will not any of us go to his tent, neither will we any of us turn unto his house.9 But now this is the thing which we will do to Gibeah: we will go up against it by lot;10 and we will take ten men of a hundred throughout all the tribes of Israel, and a hundred of a thousand, and a thousand out of ten thousand, to fetch victuals for the people, that they may do, when they come to Gibeah of Benjamin, according to all the folly that they have wrought in Israel.11 So all the men of Israel were gathered against the city, knit together as one man.
12 And the tribes of Israel sent men through all the tribe of Benjamin, saying, What wickedness is this that is come to pass among you?13 Now therefore deliver up the men, the base fellows, that are in Gibeah, that we may put them to death, and put away evil from Israel. But Benjamin would not hearken to the voice of their brethren the children of Israel.14 And the children of Benjamin gathered themselves together out of the cities unto Gibeah, to go out to battle against the children of Israel.15 And the children of Benjamin were numbered on that day out of the cities twenty and six thousand men that drew sword, besides the inhabitants of Gibeah, who were numbered seven hundred chosen men.16 Among all this people there were seven hundred chosen men lefthanded; every one could sling stones at a hair-breadth, and not miss.
17 And the men of Israel, besides Benjamin, were numbered four hundred thousand men that drew sword: all these were men of war.18 And the children of Israel arose, and went up to Beth-el, and asked counsel of God; and they said, Who shall go up for us first to battle against the children of Benjamin? And Jehovah said, Judah shall go up first.
19 And the children of Israel rose up in the morning, and encamped against Gibeah.20 And the men of Israel went out to battle against Benjamin; and the men of Israel set the battle in array against them at Gibeah.21 And the children of Benjamin came forth out of Gibeah, and destroyed down to the ground of the Israelites on that day twenty and two thousand men.22 And the people, the men of Israel, encouraged themselves, and set the battle again in array in the place where they set themselves in array the first day.23 And the children of Israel went up and wept before Jehovah until even; and they asked of Jehovah, saying, Shall I again draw nigh to battle against the children of Benjamin my brother? And Jehovah said, Go up against him.
24 And the children of Israel came near against the children of Benjamin the second day.25 And Benjamin went forth against them out of Gibeah the second day, and destroyed down to the ground of the children of Israel again eighteen thousand men; all these drew the sword.26 Then all the children of Israel, and all the people, went up, and came unto Beth-el, and wept, and sat there before Jehovah, and fasted that day until even; and they offered burnt-offerings and peace-offerings before Jehovah.27 And the children of Israel asked of Jehovah (for the ark of the covenant of God was there in those days,28 and Phinehas, the son of Eleazar, the son of Aaron, stood before it in those days), saying, Shall I yet again go out to battle against the children of Benjamin my brother, or shall I cease? And Jehovah said, Go up; for to-morrow I will deliver him into thy hand.
29 And Israel set liers-in-wait against Gibeah round about.30 And the children of Israel went up against the children of Benjamin on the third day, and set themselves in array against Gibeah, as at other times.31 And the children of Benjamin went out against the people, and were drawn away from the city; and they began to smite and kill of the people, as at other times, in the highways, of which one goeth up to Beth-el, and the other to Gibeah, in the field, about thirty men of Israel.32 And the children of Benjamin said, They are smitten down before us, as at the first. But the children of Israel said, Let us flee, and draw them away from the city unto the highways.33 And all the men of Israel rose up out of their place, and set themselves in array at Baal-tamar: and the liers-in-wait of Israel brake forth out of their place, even out of Maareh-geba.34 And there came over against Gibeah ten thousand chosen men out of all Israel, and the battle was sore; but they knew not that evil was close upon them.35 And Jehovah smote Benjamin before Israel; and the children of Israel destroyed of Benjamin that day twenty and five thousand and a hundred men: all these drew the sword.
36 So the children of Benjamin saw that they were smitten; for the men of Israel gave place to Benjamin, because they trusted unto the liers-in-wait whom they had set against Gibeah.37 And the liers-in-wait hasted, and rushed upon Gibeah; and the liers-in-wait drew themselves along, and smote all the city with the edge of the sword.38 Now the appointed sign between the men of Israel and the liers-in-wait was, that they should make a great cloud of smoke rise up out of the city.39 And the men of Israel turned in the battle, and Benjamin began to smite and kill of the men of Israel about thirty persons; for they said, Surely they are smitten down before us, as in the first battle.40 But when the cloud began to arise up out of the city in a pillar of smoke, the Benjamites looked behind them; and, behold, the whole of the city went up in smoke to heaven.41 And the men of Israel turned, and the men of Benjamin were dismayed; for they saw that evil was come upon them.42 Therefore they turned their backs before the men of Israel unto the way of the wilderness; but the battle followed hard after them; and they that came out of the cities destroyed them in the midst thereof.43 They inclosed the Benjamites round about, and chased them, and trod them down at their resting-place, as far as over against Gibeah toward the sunrising.44 And there fell of Benjamin eighteen thousand men; all these were men of valor.45 And they turned and fled toward the wilderness unto the rock of Rimmon: and they gleaned of them in the highways five thousand men, and followed hard after them unto Gidom, and smote of them two thousand men.46 So that all who fell that day of Benjamin were twenty and five thousand men that drew the sword; all these were men of valor.47 But six hundred men turned and fled toward the wilderness unto the rock of Rimmon, and abode in the rock of Rimmon four months.48 And the men of Israel turned again upon the children of Benjamin, and smote them with the edge of the sword, both the entire city, and the cattle, and all that they found: moreover all the cities which they found they set on fire.