previous next

NDI-IKPE 4

1 Umu Israel we me kwa ọzọ ihe ọjọ n'anya Jehova, mb͕e Ihud nwusiri. 2 Jehova we renye ha n'aka Jebin, bú eze Kenean, onye bu eze nime Hezoa; onye-isi usuu-ndi-agha-ya bu kwa Sisera, ma onye ahu bi nime Haroshet nke mba di iche iche ọzọ.

3 Umu Israel we tikue Jehova: n'ihi na o nwere nnù ub͕ọ-ala ígwè abua na ọgu ise; ya onwe-ya we meb͕usie umu Israel ike orú arọ.
4 Ma Debora, bú nwayi nke bu onye-amuma, bú nwunye Lapidot, ya onwe-ya nēkpe Israel ikpe na mb͕e ahu. 5 Nwayi ahu bi kwa n'okpuru nkwu Debora n'etiti Rema na Bet-el n'ugwu Efraim: umu Israel we rigokute ya ka o kpe ha ikpe. 6 O zìe kpọ Berak nwa Abinoam ka o si na Kedesh-naftali bia, ọ si ya, Ọ̀ nyeghi iwu, bú Jehova, Chineke nke Israel, si, Je, dọrọ rue n'ugwu Teboa, chiri kwa n'onwe-gi orú nnù ndikom na nnù ise sitere n'umu Naftali, site kwa n'umu Zebulun? 7 M'gadọ kwa Sisera, bú onye-isi usu-ndi-agha Jebin, rue gi aru, rue mìri-iyi Kaishon, ya na ub͕ọ-ala-ya na ìgwè ndi-ya; M'gēnye kwa ya n'aka-gi. 8 Berak we si ya, Ọ buru na i sorom je, m'gēje kwa: ma ọ buru na i soghm je, m'gaghi-eje. 9 Debora we si, Aghaghm isoro gi je: nání na ọjija-gi agaghi-adi n'ije nke gi onwe-gi nēje; n'ihi na ọ bu n'aka nwayi ka Jehova gērenye Sisera. Debora we bilie, soro Berak jerue Kedesh. 10 Berak we kpọkọta Zebulun na Naftali rue Kedesh; o we were ukwu-ya rigo, ya na orú nnù ndikom na nnù ise: Debora we soro ya rigo. 11 Ma Heba, bú onye-Kenait, siri na Ken kewapu onwe-ya, bú site n'umu Hobab nwa-nne nwunye Moses, we ma ulo-ikwū-ya rue osisi terebinth nime Zaananim, nke di n'akuku Kedesh. 12 Ha we gosi Sisera na Berak nwa Abinoam arigowo n'ugwu Teboa. 13 Sisera we kpọkọta ub͕ọ-ala-ya nile, bú nnù ub͕ọ-ala ígwè abua na ọgu ise, na ndi nile ndi soro ya, site na Haroshet nke mba di iche iche ọzọ, rue miri-iyi Kaishon. 14 Debora we si Berak, Bilie; n'ihi na nka bu ubọchi nke Jehova nyeworo Sisera n'aka-gi: Jehova, Ọ̀ pughi we je n'iru gi? Berak we si n'ugwu Teboa rida, ya na orú nnù ndikom na nnù ise ndi soro ya n'azu. 15 Jehova we were ọnu mma-agha chusa Sisera, na ub͕ọ-ala-ya nile, na ọmuma-ulo-ikwū-ya nile, n'iru Berak; Sisera we si n'ub͕ọ-ala-ya rida, b͕alaga n'ukwu-ya.

16 Ma Berak churu ub͕ọ-ala-ya nile n'azu, na n'azu ọmuma-ulo-ikwū-ya, rue Haroshet nke mba di iche iche ọzọ: ọmuma-ulo-ikwū nile nke Sisera we da n'ọnu mma-agha; ọ dighi otù nwoke fọduru.
17 Ma Sisera b͕alagara n'ukwu-ya rue ulo-ikwū Jael, bú nwunye Heba onye-Kenait: n'ihi na udo di n'etiti Jebin, bú eze Hezoa, na ulo Heba, bú onye-Kenait. 18 Jael we pua izute Sisera, si ya, Wezuga onwe-gi, onye-nwem, wezuga onwe-gi bakutem; atula egwu. O we wezuga onwe-ya bakuru ya n'ulo-ikwū, o were ákwà-ichu-oyi kpuchie ya. 19 Ọ si ya, Biko, me ka m'ṅua nwantī miri; n'ihi na akpiri kpọrọm nku. O we meghe karama-akpukpọ miri-ara-ehi, me ka ọ ṅua, o kpuchie ya. 20 Sisera we si ya, Guzo n'ọnu-uzọ ulo-ikwū, o gēru kwa, ọ buru na nwoke ọ bula abia, jua gi, si, Ọ̀ di nwoke ọ bula nọ n'ebe a? na i gāsi, É-è. 21 Jael, bú nwunye Heba, we were ǹtú ulo-ikwū, jide kwa otùtù n'aka-ya, bakuru ya nwayọ, kpọbà ǹtú ahu n'akuku egedege-iru-ya, ǹtú we kpọpue ba n'ala; n'ihi na nwoke ahu di n'oké ura, ike gwu-kwa-ra ya; o we nwua. 22 Ma, le, Berak nāchu Sisera, Jael we puta izute ya, si ya, Bia, m'gēme kwa ka i hu nwoke ahu nke gi onwe-gi nācho. O we bakuru ya; ma, le, Sisera adawo nwua, ǹtú ahu di kwa n'akuku egedege-iru-ya. 23 Chineke we me ka Jebin, bú eze Kenean, ruru ala ubọchi ahu n'iru umu Israel. 24 Aka umu Israel we nāga nēsi ike n'aru Jebin, bú eze Kenean, rue mb͕e ha bipuru Jebin, bú eze Kenean.

Judges 4

1 And the children of Israel again did that which was evil in the sight of Jehovah, when Ehud was dead.2 And Jehovah sold them into the hand of Jabin king of Canaan, that reigned in Hazor; the captain of whose host was Sisera, who dwelt in Harosheth of the Gentiles.3 And the children of Israel cried unto Jehovah: for he had nine hundred chariots of iron; and twenty years he mightily oppressed the children of Israel.

4 Now Deborah, a prophetess, the wife of Lappidoth, she judged Israel at that time.5 And she dwelt under the palm-tree of Deborah between Ramah and Beth-el in the hill-country of Ephraim: and the children of Israel came up to her for judgment.6 And she sent and called Barak the son of Abinoam out of Kedesh-naphtali, and said unto him, Hath not Jehovah, the God of Israel, commanded, saying, Go and draw unto mount Tabor, and take with thee ten thousand men of the children of Naphtali and of the children of Zebulun?7 And I will draw unto thee, to the river Kishon, Sisera, the captain of Jabin’s army, with his chariots and his multitude; and I will deliver him into thy hand.8 And Barak said unto her, If thou wilt go with me, then I will go; but if thou wilt not go with me, I will not go.9 And she said, I will surely go with thee: notwithstanding, the journey that thou takest shall not be for thine honor; for Jehovah will sell Sisera into the hand of a woman. And Deborah arose, and went with Barak to Kedesh.10 And Barak called Zebulun and Naphtali together to Kedesh; and there went up ten thousand men at his feet: and Deborah went up with him.

11 Now Heber the Kenite had separated himself from the Kenites, even from the children of Hobab the brother-in-law of Moses, and had pitched his tent as far as the oak in Zaanannim, which is by Kedesh.

12 And they told Sisera that Barak the son of Abinoam was gone up to mount Tabor.13 And Sisera gathered together all his chariots, even nine hundred chariots of iron, and all the people that were with him, from Harosheth of the Gentiles, unto the river Kishon.14 And Deborah said unto Barak, Up; for this is the day in which Jehovah hath delivered Sisera into thy hand; is not Jehovah gone out before thee? So Barak went down from mount Tabor, and ten thousand men after him.15 And Jehovah discomfited Sisera, and all his chariots, and all his host, with the edge of the sword before Barak; and Sisera alighted from his chariot, and fled away on his feet.16 But Barak pursued after the chariots, and after the host, unto Harosheth of the Gentiles: and all the host of Sisera fell by the edge of the sword; there was not a man left.

17 Howbeit Sisera fled away on his feet to the tent of Jael the wife of Heber the Kenite; for there was peace between Jabin the king of Hazor and the house of Heber the Kenite.18 And Jael went out to meet Sisera, and said unto him, Turn in, my lord, turn in to me; fear not. And he turned in unto her into the tent, and she covered him with a rug.19 And he said unto her, Give me, I pray thee, a little water to drink; for I am thirsty. And she opened a bottle of milk, and gave him drink, and covered him.20 And he said unto her, Stand in the door of the tent, and it shall be, when any man doth come and inquire of thee, and say, Is there any man here? that thou shalt say, No.21 Then Jael Heber’s wife took a tent-pin, and took a hammer in her hand, and went softly unto him, and smote the pin into his temples, and it pierced through into the ground; for he was in a deep sleep; so he swooned and died.22 And, behold, as Barak pursued Sisera, Jael came out to meet him, and said unto him, Come, and I will show thee the man whom thou seekest. And he came unto her; and, behold, Sisera lay dead, and the tent-pin was in his temples.

23 So God subdued on that day Jabin the king of Canaan before the children of Israel.24 And the hand of the children of Israel prevailed more and more against Jabin the king of Canaan, until they had destroyed Jabin king of Canaan.