previous next

NDI-IKPE 5

1 Debora na Berak nwa Abinoam we bùa abù n'ubọchi ahu, si,

2 N'ihi na ndi-ndú nēdu edu n'Israel,
N'ihi na ndi Israel were afọ-ofufo nye onwe-ha,
Gọzienu Jehova.

3 Nurunu, ndi-eze; ṅanu nti, ndi-isi;
Mu onwem gābùku Jehova abù, ọbuná mu onwem;
M'gābùku Jehova, bú Chineke nke Israel, abù ọma.

4 Jehova, mb͕e I siri na Sia puta,
Mb͕e I siri n'ọhia Edom zọ ije,
Ala mara jijiji, elu-igwe bu-kwa-ra miri,
Igwe-oji nile nke b͕ara ọchichiri bu-kwa-ra miri.

5 Ugwu nile rudara dika miri n'iru Jehova,
Ọbuná Sainai ahu n'iru Jehova, bú Chineke nke Israel.

6 N'ubọchi Shamga nwa Anat,
N'ubọchi Jael, okporo-uzọ nile ghara idi,
Ndi nēje ije n'uzọ we je n'okporo-uzọ b͕agọrọ ab͕agọ.

7 Obodo ntà we ghara idi n'Israel, ha we ghara idi,
Rue mb͕e mu, bú Debora, biliri,
Rue mb͕e mu, bú nne n'Israel, biliri.

8 Ha rọputara chi ọhu di iche iche;
Mb͕e ahu agha di n'ọnu-uzọ-ama nile:
Àhuru ọta ma-ọbu ube
N'etiti orú nnù madu uzọ ise n'Israel?

9 Obim di n'ebe ndi-ònyé-ukpuru nke Israel nọ,
Ndi nēwere afọ-ofufo nye onwe-ha n'etiti ndi Israel:
Gọzienu Jehova.

10 Unu ndi inyinya-ibu ọcha nēbu,
Ndi nānọkwasi n'uwe-nwuda,
Unu na ndi nēje ije n'uzọ,
Tugharinu uche.

11 N'ebe dipuru anya n'olu ndi-uta, n'etiti ebe isere miri,
N'ebe aku ka ha gākọ akukọ ezi omume nile nke Jehova,
Bú ezi omume nile O mere obodo ntà Ya n'Israel.
Mb͕e ahu ndi Jehova ridara rue ọnu-uzọ-ama nile.

12 Teta, teta, Debora;
Teta, teta, kwue okwu abù:
Bilie, Berak, dọta usu ndi i dọtara n'agha n'agha, gi nwa Abinoam.

13 Mb͕e ahu ndi fọduru nime ndi di ike nke-uku, bú ndi Israel, ridara;
Jehova ridara n'ihim imegide ndi-dike.

14 Ndi nkpọrọgwu-ha di nime Amalek siri n'Efraim rida;
Nēso gi n'azu, Benjamin, n'etiti umu-nna-gi.
Ndi-ònyé-ukpuru siri na Makia rida,
Ndi ji nka-n'aka ode-akwukwọ ese ihe si-kwa-ra na Zebulun rida.

15 Ndi-isi n'Isaka nọye-kwa-ra Debora;
Dika Isaka si di, otú a ka Berak di;
Na ndagwurugwu ka ezigara ya n'ukwu-ya abua.
Na miri-iyi nile nke Reuben
Ka oké nzube obi di.

16 N'ìhi gini ka i nọduru n'etiti ogige-aturu-gi,
Inu ob͕ub͕u-ọ̀jà anēb͕uru ìgwè aturu?
Na miri-iyi nile nke Reuben
Ka oké nnyocha obi di.

17 Gilead biri n'ofè Jọdan:
Dan kwa, n'ìhi gini ka ọ nọ n'ub͕o?
Asha nọduru n'ọnu-miri oké osimiri,
Ọ bu kwa n'akuku ọwara-miri-ya nile ka o nēbi.

18 Zebulun bu ndi nyebigara ndu-ha rue ọnwu,
Naftali kwa, n'elu ebe nile di elu nke ọhia.

19 Ndi-eze biara, bū agha;
Mb͕e ahu ndi-eze Kenean būru agha,
Nime Teanak n'akuku miri Megido:
Ọ dighi urù ego ha nara.

20 N'elu-igwe ka ha si bū agha,
Kpakpando si n'uzọ nile ha atuliri atuli buso Sisera agha.

21 Miri-iyi Kaishon bupuru ha,
Miri-iyi ochie ahu, bú miri-iyi Kaishon.
Nkpuru-obim, i nāzọda ike.

22 Mb͕e ahu ka ukwu inyinya zọsiri ike
Site n'iwuli-elu ahu nile, bú iwuli-elu nke ihe nile ya di ike.

23 Buanu Miroz ọnu, ka mọ-ozi nke Jehova siri,
Buanu ndi bi nime ya ọnu nke-uku;
N'ihi na ha abiaghi iyere Jehova aka,
Iyere Jehova aka imegide ndi-dike.

24 Agāgọzi Jael kari ndinyom,
Bú nwunye Heba onye-Kenait,
Kari ndinyom n'ulo-ikwū ka agāgọzi ya.

25 Miri ka Sisera riọrọ, miri-ara-ehi ka ọ nyere ya;
O weta nso ya miri-ara-ehi nke raru araru n'ọkwa ndi di ebube.

26 Aka-ya ka ọ setiri na ǹtú,
Aka-nri-ya n'otùtù ndi nālu ọlu ike;
O were otùtù kpọ Sisera, ọ kpọrọ ya n'isi,
O we kpọpue ya, ǹtú ahu we bapue n'akuku egedege-iru-ya.

27 N'ab͕ata ukwu-ya abua ka o ruru ala, da, tọb͕ọ:
N'ab͕ata ukwu-ya abua ka o ruru ala, da:
Ebe o ruru ala, n'ebe ahu ka ọ dara, la n'iyì.

28 Na window-ya ka ọ lepuru anya, tie nkpu,
Bú nne Sisera, site n'oghere inara ifufe,
Gini mere ub͕o-ala-ya nānọ ọdù ibia?
Gini mere wheel nke ub͕ọ-ala-ya nile ji la azu?

29 Ndi-isi-ya ndinyom ndi mara ihe nāza ya,
E, ya onwe-ya nēkwughachiri onwe-ya okwu-ọnu-ya nile,

30 Hà achọtaghi? hà ekèghi ihe-nkwata?
Otù nwa-ab͕ọghọ, umu-ab͕ọghọ abua, gādiri nwoke ọ bula, n'isi n'isi;
Ihe-nkwata, bú uwe esijiri esiji, diri Sisera,
Ihe-nkwata, bú uwe esijiri esiji nke akpara nke-ọma,
Bú uwe esijiri esiji nke akpara nke-ọma n'akuku abua, nke diri olu ndi akwatara?

31 Otú a ka ndi-iro-Gi nile gāla n'iyi, Jehova:
Ma ndi nāhu Ya n'anya gādi ka anyanwu mb͕e ọ nāputa n'ike-ya.
Ala we di jū ọgu arọ abua.

Judges 5

1 Then sang Deborah and Barak the son of Abinoam on that day, saying,

2 For that the leaders took the lead in Israel, For that the people offered themselves willingly, Bless ye Jehovah.

3 Hear, O ye kings; give ear, O ye princes; I, even I, will sing unto Jehovah; I will sing praise to Jehovah, the God of Israel.

4 Jehovah, when thou wentest forth out of Seir, When thou marchedst out of the field of Edom, The earth trembled, the heavens also dropped, Yea, the clouds dropped water.

5 The mountains quaked at the presence of Jehovah, Even yon Sinai at the presence of Jehovah, the God of Israel.

6 In the days of Shamgar the son of Anath, In the days of Jael, the highways were unoccupied, And the travellers walked through byways.

7 The rulers ceased in Israel, they ceased, Until that I Deborah arose, That I arose a mother in Israel.

8 They chose new gods; Then was war in the gates: Was there a shield or spear seen Among forty thousand in Israel?

9 My heart is toward the governors of Israel, That offered themselves willingly among the people: Bless ye Jehovah.

10 Tell of it, ye that ride on white asses, Ye that sit on rich carpets, And ye that walk by the way.

11 Far from the noise of archers, in the places of drawing water, There shall they rehearse the righteous acts of Jehovah, Even the righteous acts of his rule in Israel. Then the people of Jehovah went down to the gates.

12 Awake, awake, Deborah; Awake, awake, utter a song: Arise, Barak, and lead away thy captives, thou son of Abinoam.

13 Then came down a remnant of the nobles and the people; Jehovah came down for me against the mighty.

14 Out of Ephraim came down they whose root is in Amalek; After thee, Benjamin, among thy peoples; Out of Machir came down governors, And out of Zebulun they that handle the marshal’s staff.

15 And the princes of Issachar were with Deborah; As was Issachar, so was Barak; Into the valley they rushed forth at his feet. By the watercourses of Reuben There were great resolves of heart.

16 Why sattest thou among the sheepfolds, To hear the pipings for the flocks? At the watercourses of Reuben There were great searchings of heart.

17 Gilead abode beyond the Jordan: And Dan, why did he remain in ships? Asher sat still at the haven of the sea, And abode by his creeks.

18 Zebulun was a people that jeoparded their lives unto the death, And Naphtali, upon the high places of the field.

19 The kings came and fought; Then fought the kings of Canaan. In Taanach by the waters of Megiddo: They took no gain of money.

20 From heaven fought the stars, From their courses they fought against Sisera.

21 The river Kishon swept them away, That ancient river, the river Kishon. O my soul, march on with strength.

22 Then did the horsehoofs stamp By reason of the prancings, the prancings of their strong ones.

23 Curse ye Meroz, said the angel of Jehovah. Curse ye bitterly the inhabitants thereof, Because they came not to the help of Jehovah, To the help of Jehovah against the mighty.

24 Blessed above women shall Jael be, The wife of Heber the Kenite; Blessed shall she be above women in the tent.

25 He asked water, and she gave him milk; She brought him butter in a lordly dish.

26 She put her hand to the tent-pin, And her right hand to the workmen’s hammer; And with the hammer she smote Sisera, she smote through his head; Yea, she pierced and struck through his temples.

27 At her feet he bowed, he fell, he lay; At her feet he bowed, he fell; Where he bowed, there he fell down dead.

28 Through the window she looked forth, and cried, The mother of Sisera cried through the lattice, Why is his chariot so long in coming? Why tarry the wheels of his chariots?

29 Her wise ladies answered her, Yea, she returned answer to herself,

30 Have they not found, have they not divided the spoil? A damsel, two damsels to every man; To Sisera a spoil of dyed garments, A spoil of dyed garments embroidered, Of dyed garments embroidered on both sides, on the necks of the spoil?

31 So let all thine enemies perish, O Jehovah: But let them that love him be as the sun when he goeth forth in his might. And the land had rest forty years.