previous next

NDI-IKPE 6

1 Umu Israel we me ihe ọjọ n'anya Jehova: Jehova we nye ha n'aka Midian arọ asa. 2 Aka Midian we di ike n'aru Israel: n'ihi Midian ka umu Israel mere onwe-ha ebe miri nērù nke di n'ugwu, na ọb͕à, na ebe ewusiri ike. 3 O rue, ọ buru na Israel agha nkpuru, na ndi Midian rigoro ya, na ndi Amalek, na umu Iru-anyanwu; ha we rigo imegide ha; 4 ha we ma ulo-ikwū-ha imegide ha, we bibie ihe-omume ala, rue ebe i gābà na Geza, ha arapughi kwa ihe nēdebe ndu n'Israel, ma ọ bu aturu, ma-ọbu ehi, ma-ọbu inyinya-ibu. 5 N'ihi na ha na anu-ulo-ha na ulo-ikwū nile ha rigoro, ha batara dika ojuju igurube n'iba-uba; ọnu-ọgugu adighi kwa ha, ọ dighi kwa camel-ha: ha we bata n'ala ibibi ya.

6 Ewe me ka Israel ghara inwe ike ma ọli n'ihi Midian; umu Israel we tikue Jehova.
7 O rue, mb͕e umu Israel tikuru Jehova n'ihi Midian, 8 na Jehova ziri otù nwoke, bú onye-amuma, jekuru umu Israel: ọ si ha, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Mu onwem mere ka unu si n'Ijipt rigota, eme-kwa-ram ka unu si n'ulo ndi-orù puta: 9 M'we naputa unu n'aka ndi Ijipt, na n'aka ndi nile nēmeb͕u unu, M'we chupu ha n'iru unu, nye unu ala-ha:

10 M'we si unu, Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu; unu atula egwu chi nile nke ndi-Amorait, ndi unu onwe-unu bi n'ala-ha: ma unu egeghi nti olum.
11 Mọ-ozi nke Jehova we bia, nọdu n'okpuru osisi terebinth ahu nke di n'Ọfra, nke Joash, bú onye Abieza, nwere: ma Gideon nwa-ya nēticha ọka wheat n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine, iwepu ya n'iru Midian. 12 Mọ-ozi nke Jehova we me ka ọ hu ya anya, si ya, Jehova nọyere gi, gi dike bu dìnkpà. 13 Gideon we si ya, Biko, onye-nwem, ọ buru na Jehova nọyere ayi, n'ìhi gini kwa ka ihe a nile dakwasiworo ayi? òle ebe kwa ka ihe-ebube-Ya nile di, nke nna-ayi-hà kọrọ ayi akukọ ha, si, Jehova, Ọ̀ meghi ka ayi si n'Ijipt rigota? ma ub͕u a Jehova arapuwo ayi, nye kwa ayi n'aka Midian. 14 Jehova we che ya iru, si, Je n'ike-gi a, zọputa Israel n'aka Midian: èzigaghm i? 15 Ọ si Ya, Biko, Onye-nwe-ayi, #M'gēji gini zọputa Israel? le, usu nnù ndikom abua na ọgu iri nkem bu nke nēnweghi ike nime Manase, mu onwem bu kwa onye pekasiri npe n'ulo nnam. 16 Jehova we si ya, N'ihi na Mu na gi gānọ, i gētib͕u kwa Midian dika otù nwoke. 17 Ọ si ya, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru Gi, Gi me-kwa-ram ihe-iriba-ama na Gi onwe-gi nākpayerem uka. 18 Biko, esila n'ebe a pua, rue mb͕e m'gābiakute Gi, weputa onyinyem inata iru-ọma, dọba ya n'iru Gi. Ọ si, Mu onwem gānọdu rue mb͕e i gābiaghachi. 19 Gideon we ba n'ulo, dozie nwa-ewu, na achicha ekoghi-eko nke ephah utu ọka: o tiyere anu ahu nime nkata, tiye kwa ofè n'ite, weputa ya nye ya n'okpuru osisi terebinth ahu, we weta ya nso. 20 Mọ-ozi nke Chineke we si ya, Were anu nka na achicha ekoghi-eko nka, dọba n'elu nkume a di elu, wusi kwa ofé. O me otú a. 21 Mọ-ozi nke Jehova we setipu nsọtu nkpa-n'aka nke di n'aka-ya, metu anu ahu na achicha ekoghi-eko ahu; ọku we si na nkume ahu di elu rigo, ripia anu ahu na achicha ekoghi-eko; mọ-ozi nke Jehova we pua n'anya-ya. 22 Gideon we hu na mọ-ozi nke Jehova ka ọ bu; Gideon we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! n'ihi na ahuwom mọ-ozi nke Jehova iru n'iru. 23 Jehova we si ya, Udo diri gi; atula egwu: i gaghi-anwu.

24 Gideon we wuere Jehova ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, kpọ ya Jehova-shalom: rue ta ọ digide n'Ọfra nke ndi Abieza.
25 O rue, n'abali ahu, na Jehova siri ya, Were oke-ehi nke nna-gi nwere, bú oke-ehi nke-abua, nke b͕ara arọ asa, kwadà kwa ebe-ichu-àjà Beal nke nna-gi nwere, b͕utu kwa Ashera nke di n'akuku ya: 26 wu-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, ebe-ichu-àjà n'elu ebe a siri ike, n'usoro, were kwa oke-ehi nke-abua ahu, were kwa nkù Ashera nke i gēb͕utu, sure àjà-nsure-ọku. 27 Gideon we chiri ndikom iri sitere na ndi-orù-ya, o me dika Jehova gwara ya okwu: o rue, n'ihi na ọ turu egwu ulo nna-ya na ndikom obodo-ya, ime ya n'ehihie, na o mere ya n'abali. 28 Ndikom obodo ahu we bilie n'isi-ututu, ma, le, akwaturu ebe-ichu-àjà Beal, b͕utu kwa Ashera nke di n'akuku ya, sure kwa oke-ehi nke-abua ahu n'elu ebe-ichu-àjà nke ewuru. 29 Ha we sirita onwe-ha, Ònye mere ihe a? Ha we jua ajuju, chọ kwa, si, Gideon nwa Joash emewo ihe a. 30 Ndikom obodo ahu we si Joash, Me ka nwa-gi puta, ka ọ nwua: n'ihi na ọ kwatuwo ebe-ichu-àjà Beal, na n'ihi na o b͕utuwo Ashera nke di n'akuku ya. 31 Joash we si ndi nile nke guzoro megide ya, Unu onwe-unu, ùnu gēkpere Beal ọnu-ya? ma-ọbu unu onwe-unu, ùnu gāzọputa ya? Onye nke gēkpere ya ọnu-ya, ka eme ka ọ nwua: rapu ya rue ututu; ọ buru na chi ka ọ bu, ya kpere onwe-ya ọnu-ya, n'ihi na akwatuwo ebe-ichu-àjà-ya.

32 Ọ we kpọ ya Jerubeal n'ubọchi ahu, si, Ka Beal kpegide ya, n'ihi na ọ kwatuwo ebe-ichu-àjà-ya.
33 Ndi Midian nile na ndi Amalek na umu Iru-anyanwu we chikọta onwe-ha, gabiga, ma ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Jezreel. 34 Mọ nke Jehova we were Gideon kpuchie Onwe-ya dika uwe; o we fùa opì-ike; Abieza we kpọkọta onwe-ha n'azu ya. 35 O we ziga ndi-ozi nime Manase nile; ha onwe-ha kpọkọta-kwa-ra onwe-ha n'azu ya: o we ziga ndi-ozi nime Asha, na nime Zebulun, na nime Naftali; ha we rigo izute ha. 36 Gideon we si Chineke, Ọ buru na I nēsi n'akam zọputa Israel, dika I kwuworo, 37 le, mu onwem nētiye aji-anu ebìri ebì n'ebe-nzọcha-ọka; ọ buru na igirigi adikwasi nání n'aji-anu ebìri ebì ahu, ma ọkpukpọ-nku adikwasi n'ala nile buruburu, m'gāmara kwa na I gēsi n'akam zọputa Israel, dika I kwuworo. 38 O we di otú a: o we bilie n'isi-ututu n'echi-ya, pikọta aji-anu ebìri ebì ahu, hichapu igirigi n'aji-anu ebìri ebì ahu, ojuju ọkwa miri. 39 Gideon we si Chineke, Ka iwe-Gi ghara idi ọku megidem, ka m'kwu kwa nání otù ub͕ò a: biko, ka m'were aji-anu ebìri ebì ahu nwa nání otù ub͕ò a; biko, ka ọkpukpọ-nku dikwasi nání n'aji-anu ebìri ebì ahu, ma ka igiriri dikwasi n'ala nile buruburu. 40 Chineke we me otú a n'abali ahu: ọkpukpọ-nku we dikwasi nání n'aji-anu ebìri ebì ahu, ma igirigi dikwasiri n'ala nile buruburu.

Judges 6

1 And the children of Israel did that which was evil in the sight of Jehovah: and Jehovah delivered them into the hand of Midian seven years.2 And the hand of Midian prevailed against Israel; and because of Midian the children of Israel made them the dens which are in the mountains, and the caves, and the strongholds.3 And so it was, when Israel had sown, that the Midianites came up, and the Amalekites, and the children of the east; they came up against them;4 and they encamped against them, and destroyed the increase of the earth, till thou come unto Gaza, and left no sustenance in Israel, neither sheep, nor ox, nor ass.5 For they came up with their cattle and their tents; they came in as locusts for multitude; both they and their camels were without number: and they came into the land to destroy it.6 And Israel was brought very low because of Midian; and the children of Israel cried unto Jehovah.

7 And it came to pass, when the children of Israel cried unto Jehovah because of Midian,8 that Jehovah sent a prophet unto the children of Israel: and he said unto them, Thus saith Jehovah, the God of Israel, I brought you up from Egypt, and brought you forth out of the house of bondage;9 and I delivered you out of the hand of the Egyptians, and out of the hand of all that oppressed you, and drove them out from before you, and gave you their land;10 and I said unto you, I am Jehovah your God; ye shall not fear the gods of the Amorites, in whose land ye dwell. But ye have not hearkened unto my voice.

11 And the angel of Jehovah came, and sat under the oak which was in Ophrah, that pertained unto Joash the Abiezrite: and his son Gideon was beating out wheat in the winepress, to hide it from the Midianites.12 And the angel of Jehovah appeared unto him, and said unto him, Jehovah is with thee, thou mighty man of valor.13 And Gideon said unto him, Oh, my lord, if Jehovah is with us, why then is all this befallen us? and where are all his wondrous works which our fathers told us of, saying, Did not Jehovah bring us up from Egypt? but now Jehovah hath cast us off, and delivered us into the hand of Midian.14 And Jehovah looked upon him, and said, Go in this thy might, and save Israel from the hand of Midian: have not I sent thee?15 And he said unto him, Oh, Lord, wherewith shall I save Israel? behold, my family is the poorest in Manasseh, and I am the least in my father’s house.16 And Jehovah said unto him, Surely I will be with thee, and thou shalt smite the Midianites as one man.17 And he said unto him, If now I have found favor in thy sight, then show me a sign that it is thou that talkest with me.18 Depart not hence, I pray thee, until I come unto thee, and bring forth my present, and lay it before thee. And he said, I will tarry until thou come again.

19 And Gideon went in, and made ready a kid, and unleavened cakes of an ephah of meal: the flesh he put in a basket, and he put the broth in a pot, and brought it out unto him under the oak, and presented it.20 And the angel of God said unto him, Take the flesh and the unleavened cakes, and lay them upon this rock, and pour out the broth. And he did so.21 Then the angel of Jehovah put forth the end of the staff that was in his hand, and touched the flesh and the unleavened cakes; and there went up fire out of the rock, and consumed the flesh and the unleavened cakes; and the angel of Jehovah departed out of his sight.22 And Gideon saw that he was the angel of Jehovah; and Gideon said, Alas, O Lord Jehovah! forasmuch as I have seen the angel of Jehovah face to face.23 And Jehovah said unto him, Peace be unto thee; fear not: thou shalt not die.24 Then Gideon built an altar there unto Jehovah, and called it Jehovah-shalom: unto this day it is yet in Ophrah of the Abiezrites.

25 And it came to pass the same night, that Jehovah said unto him, Take thy father’s bullock, even the second bullock seven years old, and throw down the altar of Baal that thy father hath, and cut down the Asherah that is by it;26 and build an altar unto Jehovah thy God upon the top of this stronghold, in the orderly manner, and take the second bullock, and offer a burnt-offering with the wood of the Asherah which thou shalt cut down.27 Then Gideon took ten men of his servants, and did as Jehovah had spoken unto him: and it came to pass, because he feared his father’s household and the men of the city, so that he could not do it by day, that he did it by night.

28 And when the men of the city arose early in the morning, behold, the altar of Baal was broken down, and the Asherah was cut down that was by it, and the second bullock was offered upon the altar that was built.29 And they said one to another, Who hath done this thing? And when they inquired and asked, they said, Gideon the son of Joash hath done this thing.30 Then the men of the city said unto Joash, Bring out thy son, that he may die, because he hath broken down the altar of Baal, and because he hath cut down the Asherah that was by it.31 And Joash said unto all that stood against him, Will ye contend for Baal? Or will ye save him? he that will contend for him, let him be put to death whilst it is yet morning: if he be a god, let him contend for himself, because one hath broken down his altar.32 Therefore on that day he called him Jerubbaal, saying, Let Baal contend against him, because he hath broken down his altar.

33 Then all the Midianites and the Amalekites and the children of the east assembled themselves together; and they passed over, and encamped in the valley of Jezreel.34 But the Spirit of Jehovah came upon Gideon; and he blew a trumpet; and Abiezer was gathered together after him.35 And he sent messengers throughout all Manasseh; and they also were gathered together after him: and he sent messengers unto Asher, and unto Zebulun, and unto Naphtali; and they came up to meet them.

36 And Gideon said unto God, If thou wilt save Israel by my hand, as thou hast spoken,37 behold, I will put a fleece of wool on the threshing-floor; if there be dew on the fleece only, and it be dry upon all the ground, then shall I know that thou wilt save Israel by my hand, as thou hast spoken.38 And it was so; for he rose up early on the morrow, and pressed the fleece together, and wrung the dew out of the fleece, a bowlful of water.39 And Gideon said unto God, Let not thine anger be kindled against me, and I will speak but this once: let me make trial, I pray thee, but this once with the fleece; let it now be dry only upon the fleece, and upon all the ground let there be dew.40 And God did so that night: for it was dry upon the fleece only, and there was dew on all the ground.