NDI-IKPE 7
1 Jerubeal (onye ahu bu Gideon), na ndi nile soro ya, we bilie n'isi-ututu, ma ulo-ikwū-ha n'akuku isi-iyi Harod: ọmuma-ulo-ikwū Midian we di n'akuku Ugwu ha, site n'ugwu ntà More, nime ndagwurugwu.
2 Jehova we si Gideon, Ndi nke nēso gi baram uba inye Midian n'aka-ha, ka Israel we ghara inya isi megidem, si, Akam azọputawom.
3 Ma ub͕u a, biko, kpọ òkù na nti ndi nka, si, Ònye nātu egwu, nāma kwa jijiji? ya laghachi, si n'ugwu Gilead b͕alaga. Orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri-na-ise we si na ndi Israel laghachi; ma orú nnù ndikom na nnù ise fọduru.
4 Jehova we si Gideon, Ndi Israel bara uba rue ub͕u a; me ka ha ridarue miri ahu, M'gānwaputa-kwa-ra gi ha n'ebe ahu: ọ gēru kwa, na onye ọ bula M'gāsi gi, Onye a gēsoro gi je, ọ bu onye ahu gēsoro gi je; ma onye ọ bula M'gāsi gi, Onye a agaghi-eso gi je, ọ bu onye ahu nāgaghi-eje. 5 O we me ka ndi Israel ridarue miri ahu: Jehova we si Gideon, Onye ọ bula nke ji ire-ya ra miri, dika nkita nāra, onye ahu ka i gēdo n'onwe-ya iche; onye ọ bula kwa nke nēruru n'ikperè-ya abua iṅu miri. 6 Ọnu-ọgugu ndi nāra miri, n'itiye aka-ha n'ọnu-ha, di ọgu ndikom iri-na-ise: ma ndi nile fọduru nime ndi Israel ruru n'ikperè-ha iṅu miri. 7 Jehova we si Gideon, Ọ bu ọgu ndikom iri-na-ise ahu ndi nāra miri ka M'gēji zọputa unu, nye kwa Midian n'aka-gi; ma ka ndi Israel nile la, onye ọ bula n'ebe nke ya.
8 Ndi ahu we were ihe-oriri-uzọ n'aka-ha, na opì-ike-ha: ma o zilagara ndikom nile nke Israel, onye ọ bula n'ulo-ikwū-ya, ma ọgu ndikom iri-na-ise ahu ka o jidere: ma ọmuma-ulo-ikwū Midian di n'okpuru ya nime ndagwurugwu ahu.
9 O rue, n'abali ahu, na Jehova siri ya, Bilie, rida imegide ọmuma-ulo-ikwū ahu; n'ihi na enyewom ya n'aka-gi. 10 Ma ọ buru na gi onwe-gi atua egwu irida, gi na Pura, bú nwa-okorọbia-gi, ridarue ọmuma-ulo-ikwū ahu: 11 i gānu kwa ihe ha nēkwu: emesia agēme kwa ka aka-gi abua di ike ka i we rida imegide ọmuma-ulo-ikwū ahu. O we rida, ya onwe-ya na Pura, bú nwa-okorọbia-ya, rue nsọtu ndi chiri ihe-ekike-agha, ndi nọ n'ọmuma-ulo-ikwū ahu. 12 Ma ndi Midian na ndi Amalek na umu Iru-anyanwu nile nāmade nime ndagwurugwu ahu dika igurube n'uba; iguta-ọgugu adighi kwa camel-ha, dika ájá nke di n'usọ oké osimiri n'uba. 13 Gideon we bia, ma, le, otù nwoke nēzere ibe-ya nrọ, si, Le, arọrọm nrọ, ma, le, buruburu achicha ọka barley nākpọre ba n'ọmuma-ulo-ikwū Midian, ọ biarue ulo-ikwū, tie ya, o we da, achicha ahu we me ka o kpue iru, ulo-ikwū ahu we tọb͕ọ n'ala.
14 Ibe-ya we za, si, Nka abughi ihe ọzọ ma-ọbughi mma-agha Gideon nwa Joash, bú nwoke Israel: Chineke enyewo Midian na ọmuma-ulo-ikwū-ya nile n'aka-ya.
15 O rue, mb͕e Gideon nuru ọzize nrọ ahu na akukọ-isi-ya, na ọ kpọrọ isi ala; o we laghachi n'ọmuma-ulo-ikwū Israel, si, Bilienu; n'ihi na Jehova enyewo ọmuma-ulo-ikwū Midian n'aka unu. 16 O we kewa ọgu ndikom iri-na-ise ahu n'usu atọ, o tiye n'aka-ha nile opì-ike, na ite nke ihe nādighi nime ha, na ọwa n'etiti ite ahu. 17 Ọ si ha, Lenum anya, me-kwa-unu otú a: ma, le, mb͕e mu onwem nābà na nsọtu ọmuma-ulo-ikwū-ha, ọ gēru kwa na, dika m'nēme, otú a ka unu gēme.
18 Mb͕e m'fùru opì-ike, mu onwem na ndi nile nke sorom, unu gāfù kwa opì-ike, ọbuná unu onwe-unu, buruburu ọmuma-ulo-ikwū ahu nile, si, Ayi diri Jehova, di-kwa-ra Gideon.
19 Gideon, na ọgu ndikom ise ndi soro ya, we ba na nsọtu ọmuma-ulo-ikwū na nmalite nche etiti abali, (ọ bu nání mb͕e ahu ka ha guzoro ndi-nche): ha we fùa opì-ike-ha, tupia kwa ite nke di n'aka-ha. 20 Usu atọ ahu we fùa opì-ike-ha, tiwa kwa ite-ha, jide kwa ọwa-ha n'aka-ekpe-ha, na opì-ike-ha n'aka-nri-ha, ifù afù: ha we tie nkpu, si, Mma-agha diri Jehova di-kwa-ra Gideon. 21 Ha we guzo, nwoke ọ bula n'ọnọdu-ya, buruburu ọmuma-ulo-ikwū ahu: ọmuma-ulo-ikwū ahu nile we b͕a ọsọ; ha we tie nkpu, b͕alaga. 22 Ha we fùa ọgu opì-ike iri-na-ise ahu, Jehova we me ka mma-agha nwoke ọ bula di n'aru ibe-ya, na n'aru ọmuma-ulo-ikwū ahu nile: ọmuma-ulo-ikwū ahu we b͕alaga rue Bet-shita n'uzọ Zerera, rue uzọ Ebel-mehola, n'akuku Tabat. 23 Ndikom Israel we si Naftali, na n'Asha, na nime Manase nile, kpọkọta onwe-ha, chua Midian n'azu. 24 Gideon we ziga ndi-ozi n'ugwu Efraim nile, si, Ridatanu izute Midian, burunu ha uzọ were miri, rue Bet-bara, bú Jọdan. Ndikom nile nke Efraim we kpọkọta onwe-ha, were miri ahu rue Bet-bara, bú Jọdan. 25 Ha we nwude ndi-isi abua nke Midian, bú Oreb na Zeeb; ha we b͕ue Oreb n'oke nkume Oreb, b͕u kwa Zeeb n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine nke Zeeb, we chua Midian: ha we wetara Gideon isi Oreb na Zeeb n'ofè Jọdan.
Judges 7
1 Then Jerubbaal, who is Gideon, and all the people that were with him, rose up early, and encamped beside the spring of Harod: and the camp of Midian was on the north side of them, by the hill of Moreh, in the valley.
2 And Jehovah said unto Gideon, The people that are with thee are too many for me to give the Midianites into their hand, lest Israel vaunt themselves against me, saying, Mine own hand hath saved me.3 Now therefore proclaim in the ears of the people, saying, Whosoever is fearful and trembling, let him return and depart from mount Gilead. And there returned of the people twenty and two thousand; and there remained ten thousand.
4 And Jehovah said unto Gideon, The people are yet too many; bring them down unto the water, and I will try them for thee there: and it shall be, that of whom I say unto thee, This shall go with thee, the same shall go with thee; and of whomsoever I say unto thee, This shall not go with thee, the same shall not go.5 So he brought down the people unto the water: and Jehovah said unto Gideon, Every one that lappeth of the water with his tongue, as a dog lappeth, him shalt thou set by himself; likewise every one that boweth down upon his knees to drink.6 And the number of them that lapped, putting their hand to their mouth, was three hundred men: but all the rest of the people bowed down upon their knees to drink water.7 And Jehovah said unto Gideon, By the three hundred men that lapped will I save you, and deliver the Midianites into thy hand; and let all the people go every man unto his place.8 So the people took victuals in their hand, and their trumpets; and he sent all the men of Israel every man unto his tent, but retained the three hundred men: and the camp of Midian was beneath him in the valley.
9 And it came to pass the same night, that Jehovah said unto him, Arise, get thee down into the camp; for I have delivered it into thy hand.10 But if thou fear to go down, go thou with Purah thy servant down to the camp:11 and thou shalt hear what they say; and afterward shall thy hands be strengthened to go down into the camp. Then went he down with Purah his servant unto the outermost part of the armed men that were in the camp.12 And the Midianites and the Amalekites and all the children of the east lay along in the valley like locusts for multitude; and their camels were without number, as the sand which is upon the sea-shore for multitude.13 And when Gideon was come, behold, there was a man telling a dream unto his fellow; and he said, Behold, I dreamed a dream; and, lo, a cake of barley bread tumbled into the camp of Midian, and came unto the tent, and smote it so that it fell, and turned it upside down, so that the tent lay flat.14 And his fellow answered and said, This is nothing else save the sword of Gideon the son of Joash, a man of Israel: into his hand God hath delivered Midian, and all the host.
15 And it was so, when Gideon heard the telling of the dream, and the interpretation thereof, that he worshipped; and he returned into the camp of Israel, and said, Arise; for Jehovah hath delivered into your hand the host of Midian.16 And he divided the three hundred men into three companies, and he put into the hands of all of them trumpets, and empty pitchers, with torches within the pitchers.17 And he said unto them, Look on me, and do likewise: and, behold, when I come to the outermost part of the camp, it shall be that, as I do, so shall ye do.18 When I blow the trumpet, I and all that are with me, then blow ye the trumpets also on every side of all the camp, and say, For Jehovah and for Gideon.
19 So Gideon, and the hundred men that were with him, came unto the outermost part of the camp in the beginning of the middle watch, when they had but newly set the watch: and they blew the trumpets, and brake in pieces the pitchers that were in their hands.20 And the three companies blew the trumpets, and brake the pitchers, and held the torches in their left hands, and the trumpets in their right hands wherewith to blow; and they cried, The sword of Jehovah and of Gideon.21 And they stood every man in his place round about the camp; and all the host ran; and they shouted, and put them to flight.22 And they blew the three hundred trumpets, and Jehovah set every man’s sword against his fellow, and against all the host; and the host fled as far as Beth-shittah toward Zererah, as far as the border of Abel-meholah, by Tabbath.23 And the men of Israel were gathered together out of Naphtali, and out of Asher, and out of all Manasseh, and pursued after Midian.
24 And Gideon sent messengers throughout all the hill-country of Ephraim, saying, Come down against Midian, and take before them the waters, as far as Beth-barah, even the Jordan. So all the men of Ephraim were gathered together, and took the waters as far as Beth-barah, even the Jordan.25 And they took the two princes of Midian, Oreb and Zeeb; and they slew Oreb at the rock of Oreb, and Zeeb they slew at the winepress of Zeeb, and pursued Midian: and they brought the heads of Oreb and Zeeb to Gideon beyond the Jordan.