NDI-IKPE 8
1 Ndikom Efraim we si ya, Gini bu ihe a i meworo ayi, na i kpọghi ayi, mb͕e i jere ibuso Midian agha? Ha we soro ya isesi okwu ike. 2 Ọ we si ha, Gini ka m'meworo ub͕u a dika nke unu mere? Ntutukọ nkpuru ubi-vine fọduru nke Efraim, ọ̀ dighi nma kara ọghughọ-nkpuru-vine nke Abieza? 3 N'aka-unu ka Chineke nyeworo ndi-isi Midian, bú Oreb na Zeeb: ma gini ka m'puru ime dika nke unu mere? Mb͕e ahu obi-ọku-ha juru n'aru ya, mb͕e o kwuru okwu ahu. 4 Gideon we biarue Jọdan igabiga, ya onwe-ya, na ọgu ndikom iri-na-ise ahu ndi soro ya, ha nāda #mbà, ma ha nāchu achu. 5 O we si ndikom Sukot, Biko, nyenu ndi nēsom n'ukwu n'ukwu ob͕e achicha; n'ihi na ha nāda #mbà, ma mu onwem nāchu Zeba na Zalmuna, bú ndi-eze Midian. 6 Ndi-isi Sukot we si, Ọbu-aka Zeba na Zalmuna, hà di n'aka-gi ub͕u a, na ayi gēnye usu-ndi-agha-gi nri? 7 Gideon we si, N'ihi nka mb͕e Jehova gēnye Zeba na Zalmuna n'akam, m'gēwere kwa ogwu nke ọzara were kwa ùgà ticha anu-aru-unu. 8 O si n'ebe ahu rigorue Penuel, gwa ha okwu dika nka: ndikom Penuel we za ya dika ndikom Sukot zara ya.
9 O we gwa kwa ndikom Penuel okwu, si, Mb͕e m'latara n'udo, m'gākwatu ulo-elu a.
10 Ma Zeba na Zalmuna nọ nime Kakoa, ha na ọmuma-ulo-ikwū nile ha, ihe ra ka orú nnù ndikom, na nnù iri-na-asa, na ọgu iri, ndi fọduru site n'ọmuma-ulo-ikwū nile nke umu Iru-anyanwu: ma ndi daworo di orú nnù ndikom uzọ iri-na-ise, ndi nāmiputa mma-agha. 11 Gideon we rigo n'uzọ ndi bi n'ulo-ikwū n'Iru-anyanwu Noba na Jọgbeha, o tib͕ue ọmuma-ulo-ikwū ahu; n'ihi na ọmuma-ulo-ikwū ahu nọ na ntukwasi-obi na ihe agaghi-eme ha. 12 Ma Zeba na Zalmuna b͕alagara; o we chua ha; o we nwude ndi-eze abua nke Midian, bú Zeba na Zalmuna, me ka ọmuma-ulo-ikwū ahu nile ma jijiji. 13 Gideon nwa Joash we si n'agha ahu site na nrigo Heres lata. 14 Ọ nwude otù nwa-okorọbia sitere na ndikom Sukot, o we jua ya ajuju: o we dere ya aha ndi-isi Sukot na ndi-okenye-ya n'akwukwọ, ọgu ndikom atọ na iri na asa. 15 O we biakute ndikom Sukot, si, Le Zeba na Zalmuna, ndi unu taram uta bayere ha, si, Ọbu-aka Zeba na Zalmuna, hà di n'aka-gi ub͕u a, na ayi gēnye ndikom-i ndi nāda #mbà nri. 16 O were ndi-okenye obodo ahu, na ogwu ọzara na ùgà, o were ha me ka ndikom Sukot mara ihe. 17 Ọ kwatu ulo-elu Penuel, b͕ue ndikom obodo ahu. 18 Ọ si Zeba na Zalmuna, Ndikom ahu nke unu b͕uru nime Teboa, hà di aṅa? Ha si, Dika i di, otú a ka ha di; onye ọ bula di ka umu eze n'aru. 19 Ọ si, Umu-nnem, bú umu-ndikom nnem muru, ka ha bu: Jehova nādi ndu! asi na unu emewo ka ha di ndu, agaghm-eb͕uwori unu. 20 O we si Jeta, bú ọkpara-ya, Bilie, b͕ue ha. Ma nwa-okoro ahu amiputaghi mma-agha-ya: n'ihi na ọ nātu egwu, n'ihi na nání nwa-okoro ka ọ bu rue mb͕e ahu.
21 Zeba na Zalmuna we si, Gi onwe-gi bilie, dakwasi ayi: n'ihi na dika nwoke si di, otú a ka idi-ike-ya di. Gideon we bilie, b͕ue Zeba na Zalmuna, were ihe nile yiri ọnwa nke di n'olu camel-ha.
22 Ndikom Israel we si Gideon, Nāchi ayi, ma gi onwe-gi, ma nwa-gi nwoke, ma nwa nwa-gi: n'ihi na i zọputawo ayi n'aka Midian. 23 Gideon we si ha, Mu onwem agaghi-achi unu, nwam agaghi-achi kwa unu: Jehova gāchi unu. 24 Gideon we si ha, Ka m'riọ unu aririọ, nye-kwa-num, nwoke ọ bula nb͕a-aka nke ihe-nkwata-ya. (N'ihi ma ha nwere nb͕a-aka ọla-edo, n'ihi na ndi Ishmael ka ha bu.) 25 Ha si, Ayi gēnye ha nọ̄. Ha we b͕asa uwe, tubà n'ebe ahu, nwoke ọ bula nb͕a-aka nke ihe-nkwata-ya. 26 Ọtùtù nb͕a-aka ọla-edo nile nke ọ riọrọ we di nnù shekel ọla-edo anọ na ọgu ise; nāgughi ihe nile yiri ọnwa, na ihe nile anākwuba na nti, na uwe ododo nile nke di n'aru ndi-eze Midian, nāgughi kwa ihe-inya-n'olu nile nke di n'olu camel-ha. 27 Gideon we me ya ka ọ buru ephod, guzo ya ọtọ n'obodọ-ya, bú Ọfra: Israel nile we soro ya nākwa iko n'ebe ahu: o we ghọrọ Gideon, ghọ-kwa-ra ulo-ya, ọnyà.
28 Ewe me ka Midian ruru ala n'iru umu Israel, ha ewelighi kwa isi-ha ọzọ. Ala we di jū ọgu arọ abua n'ub͕ochi Gideon.
29 Jerubeal nwa Joash we je biri n'ulo-ya. 30 Gideon nwe-kwa-ra ọgu umu-ndikom atọ na iri ndi siri n'úkwù onwe-ya puta: n'ihi na ọ nwere ọtutu ndinyom. 31 Iko-ya nwayi nke nọ na Shekem, ya onwe-ya mu-kwa-ra ya nwa-nwoke, ọ gua ya aha Abimelek.
32 Gideon nwa Joash we nwua n'ezi isi-awọ, elìe ya n'ílì Joash, bú nna-ya, n'Ọfra nke ndi Abieza.
33 O rue, mb͕e Gideon nwuru, na umu Israel laghachiri, soro Bealim nākwa iko, doro onwe-ha Beal-berit ka ọ buru chi. 34 Ma umu Israel echetaghi Jehova, bú Chineke-ha, Onye nānaputa ha n'aka ndi-iro-ha nile buruburu: 35 ha emeghi kwa ulo Jerubeal, bú Gideon, ebere, dika ezi ihe nile si di nke o mere Israel.
Judges 8
1 And the men of Ephraim said unto him, Why hast thou served us thus, that thou calledst us not, when thou wentest to fight with Midian? And they did chide with him sharply.2 And he said unto them, What have I now done in comparison with you? Is not the gleaning of the grapes of Ephraim better than the vintage of Abiezer?3 God hath delivered into your hand the princes of Midian, Oreb and Zeeb: and what was I able to do in comparison with you? Then their anger was abated toward him, when he had said that.
4 And Gideon came to the Jordan, and passed over, he, and the three hundred men that were with him, faint, yet pursuing.5 And he said unto the men of Succoth, Give, I pray you, loaves of bread unto the people that follow me; for they are faint, and I am pursuing after Zebah and Zalmunna, the kings of Midian.6 And the princes of Succoth said, Are the hands of Zebah and Zalmunna now in thy hand, that we should give bread unto thine army?7 And Gideon said, Therefore when Jehovah hath delivered Zebah and Zalmunna into my hand, then I will tear your flesh with the thorns of the wilderness and with briers.8 And he went up thence to Penuel, and spake unto them in like manner; and the men of Penuel answered him as the men of Succoth had answered.9 And he spake also unto the men of Penuel, saying, When I come again in peace, I will break down this tower.
10 Now Zebah and Zalmunna were in Karkor, and their hosts with them, about fifteen thousand men, all that were left of all the host of the children of the east; for there fell a hundred and twenty thousand men that drew sword.11 And Gideon went up by the way of them that dwelt in tents on the east of Nobah and Jogbehah, and smote the host; for the host was secure.12 And Zebah and Zalmunna fled; and he pursued after them; and he took the two kings of Midian, Zebah and Zalmunna, and discomfited all the host.
13 And Gideon the son of Joash returned from the battle from the ascent of Heres.14 And he caught a young man of the men of Succoth, and inquired of him: and he described for him the princes of Succoth, and the elders thereof, seventy and seven men.15 And he came unto the men of Succoth, and said, Behold Zebah and Zalmunna, concerning whom ye did taunt me, saying, Are the hands of Zebah and Zalmunna now in thy hand, that we should give bread unto thy men that are weary?16 And he took the elders of the city, and thorns of the wilderness and briers, and with them he taught the men of Succoth.17 And he brake down the tower of Penuel, and slew the men of the city.
18 Then said he unto Zebah and Zalmunna, What manner of men were they whom ye slew at Tabor? And they answered, As thou art, so were they; each one resembled the children of a king.19 And he said, They were my brethren, the sons of my mother: as Jehovah liveth, if ye had saved them alive, I would not slay you.20 And he said unto Jether his first-born, Up, and slay them. But the youth drew not his sword; for he feared, because he was yet a youth.21 Then Zebah and Zalmunna said, Rise thou, and fall upon us; for as the man is, so is his strength. And Gideon arose, and slew Zebah and Zalmunna, and took the crescents that were on their camels’ necks.
22 Then the men of Israel said unto Gideon, Rule thou over us, both thou, and thy son, and thy son’s son also; for thou hast saved us out of the hand of Midian.23 And Gideon said unto them, I will not rule over you, neither shall my son rule over you: Jehovah shall rule over you.24 And Gideon said unto them, I would make a request of you, that ye would give me every man the ear-rings of his spoil. (For they had golden ear-rings, because they were Ishmaelites.)25 And they answered, We will willingly give them. And they spread a garment, and did cast therein every man the ear-rings of his spoil.26 And the weight of the golden ear-rings that he requested was a thousand and seven hundred shekels of gold, besides the crescents, and the pendants, and the purple raiment that was on the kings of Midian, and besides the chains that were about their camels’ necks.27 And Gideon made an ephod thereof, and put it in his city, even in Ophrah: and all Israel played the harlot after it there; and it became a snare unto Gideon, and to his house.28 So Midian was subdued before the children of Israel, and they lifted up their heads no more. And the land had rest forty years in the days of Gideon.
29 And Jerubbaal the son of Joash went and dwelt in his own house.30 And Gideon had threescore and ten sons of his body begotten; for he had many wives.31 And his concubine that was in Shechem, she also bare him a son, and he called his name Abimelech.32 And Gideon the son of Joash died in a good old age, and was buried in the sepulchre of Joash his father, in Ophrah of the Abiezrites.
33 And it came to pass, as soon as Gideon was dead, that the children of Israel turned again, and played the harlot after the Baalim, and made Baal-berith their god.34 And the children of Israel remembered not Jehovah their God, who had delivered them out of the hand of all their enemies on every side;35 neither showed they kindness to the house of Jerubbaal, who is Gideon, according to all the goodness which he had showed unto Israel.