previous next

NDI-IKPE 9

1 Abimelek nwa Jerubeal we jerue Shekem, jekuru umu-nne nne-ya, gwa ha okwu, gwa kwa ab͕uru nile nke ulo nna nne-ya, si, 2 Biko, kwuenu na nti ndi nile nwe Shekem, si, Òle nke diri unu nma? na ọgu ndikom atọ na iri, bú umu-ndikom nile nke Jerubeal, nāchi unu, ma-ọbu na otù nwoke nāchi unu? cheta-kwa-unu na ọkpukpu-unu na anu-aru-unu ka m'bu. 3 Ume-nne nne-ya kwue okwu ndia nile bayere ya na nti ndi nile nwe Shekem: obi-ha we wezuga onwe-ha iso Abimelek; n'ihi na ha siri, Nwa-nne-ayi ka ọ bu. 4 Ha we nye ya ọgu ọla-ọcha atọ na iri sitere n'ulo Beal-berit, nke Abimelek ji go ndikom efu ndi obi-ha nādighi adi n'otù ebe, ha we jeso ya.

5 O we ba n'ulo nna-ya n'Ọfra, b͕ue umu-nne-ya, bú umu Jerubeal, ọgu madu atọ na iri, n'elu otù nkume: ma Jotam nwa Jerubeal nke-ntà fọduru; n'ihi na o zoro onwe-ya.
6 Ndi nile nwe Shekem we chikọta onwe-ha, ha na ulo nile nke Milo, ha we je me Abimelek ka ọ buru eze, n'akuku osisi terebinth nke ogidi ahu nke di na Shekem. 7 Ha we gosi ya Jotam, o we je guzo n'elu ugwu Geraizim, welie olu-ya, kpọ, si ha, Genum nti, unu ndi-nwe Shekem, ka Chineke we ge unu nti. 8 Osisi jere eje ite otù onye manu ka ọ buru eze-ha; ha we si osisi olive, Buru eze-ayi. 9 Osisi olive we si ha, M'gāgha manu nkem, bú nke ha ji sọpuru Chineke na madu nimem, je ifeghari n'elu osisi nile? 10 Osisi nile we si osisi fig, Gi onwe-gi bia, buru eze-ayi. 11 Osisi fig we si ha, M'gagha utọm na ezi ihe-ọmimim, je ifeghari n'elu osisi nile? 12 Osisi nile we si osisi vine, Gi onwe-gi bia, buru eze-ayi. 13 Osisi vine we si ha, M'gāgha manya ọhu nkem, bú nke nēme ka Chineke na madu ṅuria ọṅu, je ifeghari n'elu osisi nile? 14 Osisi nile we si ogwu, Gi onwe-gi bia, buru eze-ayi. 15 Ogwu we si osisi nile, Ọ buru na ọ bu n'ezi-okwu ka unu onwe-unu nētem manu iburu unu eze, bianu, b͕abànu n'okpuru ndo nkem: ma ọ buru na ọ bughi n'ezi-okwu, ka ọku si n'ogwu puta, ripia osisi cedar nile nke Lebanon. 16 Ma ub͕u a, ọ buru na ọ bu n'ezi-okwu na n'izu-okè ka unu meworo ihe a, na unu emewo Abimelek eze, ọ buru kwa na ọ bu ezi ihe ka unu meworo Jerubeal, me kwa ulo-ya, ọ buru kwa na ọ bu dika nmeso aka-ya abua si di ka unu meworo ya; 17 (n'ihi na nnam būru agha bayere unu, tufue ndu-ya n'iru ya, we naputa unu n'aka Midian: 18 ma unu onwe-unu ebiliwo imegide ulo nnam ta, b͕u kwa umu-ya ndikom, bú ọgu ndikom atọ na iri, n'elu otù nkume, me kwa Abimelek, bú nwa orù-ya nwayi, eze ndi-nwe Shekem, n'ihi na nwa-nne-unu ka ọ bu;) 19 ma ọ buru na ọ bu n'ezi-okwu na n'izu-okè ka unu meworo Jerubeal, me kwa ulo-ya, ta, ṅurianu ọṅu n'Abimelek, ka ọ ṅuria kwa nime unu, ọbuná ya onwe-ya: 20 ma ọ buru na ọ bughi otú a, ka ọku si n'Abimelek puta, ripia ndi-nwe Shekem, na ulo Milo; ka ọku si kwa na ndi-nwe Shekem puta, si kwa n'ulo Milo puta, ripia Abimelek.

21 Jotam we b͕alaga, b͕apu, jerue Bia, biri n'ebe ahu, n'ihi Abimelek, bú nwa-nne-ya.
22 Abimelek we buru onye-isi Israel arọ atọ. 23 Chinek we zite mọ ọjọ n'etiti Abimelek na ndi-nwe Shekem; ndi-nwe Shekem we ghọb͕ue Abimelek: 24 ka ihe-ike emere ọgu umu-ndikom Jerubeal atọ na iri we bia, ka ewe tukwasi kwa ọbara-ha n'isi Abimelek, bú nwa-nne-ha, onye b͕uru ha, na n'isi ndi-nwe Shekem, ndi mere ka aka-ya abua di ike ib͕u umu-nne-ya.

25 Ndi-nwe Shekem we do ndi nēruru ya nbì n'elu ugwu nile ha, ha we punara onye ọ bula nke nāgabiga n'uzọ ahu n'akuku ha ihe: ewe gosi Abimelek.
26 Geal nwa Ebed we bia, ya na umu-nne-ya, ha we gabiga ba Shekem: ndi-nwe Shekem we tukwasi ya obi. 27 Ha we pua ba n'ubi, ghọ nkpuru ubi-vine nile ha, zọcha nkpuru-vine, me ememe otuto, ba n'ulo chi-ha, rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, kọcha Abimelek. 28 Geal nwa Ebed we si, Ònye bu Abimelek, ònye bu kwa Shekem, na ayi gēfè ya òfùfè? ọ̀ bughi nwa Jerubeal? Zebul kwa, ọ̀ bughi onye-nlekọta ihe-ya? fènu ndikom Hemoa, bú nna Shekem, òfùfè: ma gini mere ayi onwe-ayi nēfè ya òfùfè? 29 Ma ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ndi nka nọ n'akam! m'gēwezuga kwa Abimelek. O we si Abimelek, Me ka usu-ndi-agha-gi ba uba, gi puta kwa. 30 Zebul, bú onye-isi obodo ahu, we nu okwu nile nke Geal nwa Ebed, iwe-ya we di ọku. 31 O we zigara Abimelek ndi-ozi n'aghughọ, si, Le, Geal nwa Ebed na umu-nne-ya nābà nime Shekem; ma, le, ha nākpab͕u obodo a imegide gi. 32 Ma ub͕u a, bilie n'abali, gi onwe-gi na ndi gi na ha nọ, ru kwa nbì n'ọhia:

33 ọ gēru kwa, n'ututu, mb͕e anyanwu nāwa, na i gēbili n'isi-ututu, made imegide obodo: ma, le, mb͕e ya onwe-ya na ndi ya na ha nọ nāpukute gi, i gēme kwa ha dika aka-gi gāchọta.
34 Abimelek we bilie n'abali, ya na ndi nile ndi soro ya, ha we rue nbì megide Shekem n'usu anọ. 35 Geal nwa Ebed we pua, guzo n'oghere ọnu-uzọ-ama obodo: Abimelek we si n'oruru-nbì ahu bilie, ya na ndi soro ya. 36 Geal we hu ndi ahu, we si Zebul, Le, ndi ufọdu si n'elu ugwu nārida. Zebul we si ya, Ọ bu onyinyo ugwu ka gi onwe-gi nāhu dika ndikom. 37 Geal we kwu ọzọ, si, Le, ndi ufọdu si n'elu-ala nke ala nārida, otù usu si kwa n'uzọ osisi terebinth nke Meonenim nābia. 38 Zebul we si ya, Òle ebe ọnu-gi ub͕u a, na i nāsi, Ònye bu Abimelek, na ayi gēfè ya òfùfè? Nkà abughi ndi nke i juworo? biko, pua ub͕u a, buso ha agha. 39 Geal we pua ga n'iru ndi-nwe Shekem, buso Abimelek agha. 40 Abimelek we chua ya, ọ we b͕alaga n'iru ya, ọtutu madu we da meru aru, rue oghere ọnu-uzọ-ama. 41 Abimelek we nọdu n'Aruma: Zebul we chupu Geal na umu-nne-ya, ka ha we ghara ibiri na Shekem. 42 O rue n'echi-ya, na ndi ahu puru ba n'ọhia; ha we gosi Abimelek. 43 O we chiri ndi-ya, kè ha usu atọ, rue nbì n'ọhia; ọ hu, ma, le, ndi ahu si n'obodo ahu nāputa; o we bilie imegide ha, tib͕ue ha. 44 Abimelek na usu ndi soro ya we made, guzo n'oghere ọnu-uzọ-ama obodo: usu abua ahu we made imegide ndi nile nọ n'ọhia, tib͕ue ha.

45 Abimelek we buso obodo ahu agha ubọchi ahu nile; o we were obodo ahu, b͕ue ndi nọ nime ya: ọ kwatue obodo ahu, ghasa ya nnú.
46 Ndi nile nwe ulo-elu Shekem we nu ya, ba n'ulo kachasi elu nke ulo El-berit. 47 Ewe gosi Abimelek na ndi nile nwe ulo-elu Shekem achikọtawo onwe-ha. 48 Abimelek we rigo n'ugwu Zalmon, ya onwe-ya na ndi nile soro ya; Abimelek we chiri anyu-ike-ha n'aka-ya, o we b͕utue alaka osisi, welie ya, tukwasi ya n'ubu-ya: ọ si ndi soro ya, Ihe unu huworom ka m'mere, menu ngwa, menu dika m'meworo.

49 Ndi ahu nile we b͕utu kwa, nwoke ọ bula alaka-ya, ha we jeso Abimelek, tukwasi ha n'ulo ahu kachasi elu, su ulo kachasi elu ahu ọku n'isi ha; ndikom nile nke ulo-elu Shekem we nwu kwa, bú ihe ra ka nnù ndikom na ndinyom abua na ọgu iri.
50 Abimelek we jerue Tibez, ma ulo-ikwū-ya megide Tibez, were ya. 51 Ma otù ulo-elu siri ike di n'etiti obodo ahu, ndikom nile na ndinyom nile na ndi nile nwe obodo ahu we b͕alaga n'ebe ahu, mechibido onwe-ha uzọ, rigo n'elu ulo-elu ahu. 52 Abimelek we biarue ulo-elu ahu, buso ya agha, jerue nso ọnu-uzọ ulo-elu ahu iwere ọku sure ya. 53 Otù nwayi we tua aka-nkume n'isi Abimelek, tuwa eju-isi-ya. 54 O we me ngwa kpọ nwa-okorọbia nēbu ihe-agha-ya, si ya, Miputa mma-agha-gi, me ka m'nwua, ka ha we ghara ikwu okwu bayerem, si, Nwayi b͕uru ya. Nwa-okorọbia-ya we mapue ya, ọ nwua. 55 Ndikom Israel we hu na Abimelek anwuruwo, ha we la, nwoke ọ bula n'ebe nke ya. 56 Chineke we nyeghachi ihe ọjọ Abimelek, nke o mere nna-ya, n'ib͕u ọgu umu-nne-ya atọ na iri: 57 ọ bu kwa ihe ọjọ nile nke ndikom Shekem ka Chineke nyeghachiri n'isi-ha: nkọcha Jotam nwa Jerubeal we biakwasi ha.

Judges 9

1 And Abimelech the son of Jerubbaal went to Shechem unto his mother’s brethren, and spake with them, and with all the family of the house of his mother’s father, saying,2 Speak, I pray you, in the ears of all the men of Shechem, Whether is better for you, that all the sons of Jerubbaal, who are threescore and ten persons, rule over you, or that one rule over you? remember also that I am your bone and your flesh.3 And his mother’s brethren spake of him in the ears of all the men of Shechem all these words: and their hearts inclined to follow Abimelech; for they said, He is our brother.4 And they gave him threescore and ten pieces of silver out of the house of Baal-berith, wherewith Abimelech hired vain and light fellows, who followed him.5 And he went unto his father’s house at Ophrah, and slew his brethren the sons of Jerubbaal, being threescore and ten persons, upon one stone: but Jotham the youngest son of Jerubbaal was left; for he hid himself.6 And all the men of Shechem assembled themselves together, and all the house of Millo, and went and made Abimelech king, by the oak of the pillar that was in Shechem.

7 And when they told it to Jotham, he went and stood on the top of mount Gerizim, and lifted up his voice, and cried, and said unto them, Hearken unto me, ye men of Shechem, that God may hearken unto you.8 The trees went forth on a time to anoint a king over them; and they said unto the olive-tree, Reign thou over us.9 But the olive-tree said unto them, Should I leave my fatness, wherewith by me they honor God and man, and go to wave to and fro over the trees?10 And the trees said to the fig-tree, Come thou, and reign over us.11 But the fig-tree said unto them, Should I leave my sweetness, and my good fruit, and go to wave to and fro over the trees?12 And the trees said unto the vine, Come thou, and reign over us.13 And the vine said unto them, Should I leave my new wine, which cheereth God and man, and go to wave to and fro over the trees?14 Then said all the trees unto the bramble, Come thou, and reign over us.15 And the bramble said unto the trees, If in truth ye anoint me king over you, then come and take refuge in my shade; and if not, let fire come out of the bramble, and devour the cedars of Lebanon.16 Now therefore, if ye have dealt truly and uprightly, in that ye have made Abimelech king, and if ye have dealt well with Jerubbaal and his house, and have done unto him according to the deserving of his hands17 (for my father fought for you, and adventured his life, and delivered you out of the hand of Midian:18 and ye are risen up against my father’s house this day, and have slain his sons, threescore and ten persons, upon one stone, and have made Abimelech, the son of his maid-servant, king over the men of Shechem, because he is your brother);19 if ye then have dealt truly and uprightly with Jerubbaal and with his house this day, then rejoice ye in Abimelech, and let him also rejoice in you:20 but if not, let fire come out from Abimelech, and devour the men of Shechem, and the house of Millo; and let fire come out from the men of Shechem, and from the house of Millo, and devour Abimelech.21 And Jotham ran away, and fled, and went to Beer, and dwelt there, for fear of Abimelech his brother.

22 And Abimelech was prince over Israel three years.23 And God sent an evil spirit between Abimelech and the men of Shechem; and the men of Shechem dealt treacherously with Abimelech:24 that the violence done to the threescore and ten sons of Jerubbaal might come, and that their blood might be laid upon Abimelech their brother, who slew them, and upon the men of Shechem, who strengthened his hands to slay his brethren.25 And the men of Shechem set liers-in-wait for him on the tops of the mountains, and they robbed all that came along that way by them: and it was told Abimelech.

26 And Gaal the son of Ebed came with his brethren, and went over to Shechem; and the men of Shechem put their trust in him.27 And they went out into the field, and gathered their vineyards, and trod the grapes, and held festival, and went into the house of their god, and did eat and drink, and cursed Abimelech.28 And Gaal the son of Ebed said, Who is Abimelech, and who is Shechem, that we should serve him? is not he the son of Jerubbaal? and Zebul his officer? serve ye the men of Hamor the father of Shechem: but why should we serve him?29 And would that this people were under my hand! then would I remove Abimelech. And he said to Abimelech, Increase thine army, and come out.

30 And when Zebul the ruler of the city heard the words of Gaal the son of Ebed, his anger was kindled.31 And he sent messengers unto Abimelech craftily, saying, Behold, Gaal the son of Ebed and his brethren are come to Shechem; and, behold, they constrain the city to take part against thee.32 Now therefore, up by night, thou and the people that are with thee, and lie in wait in the field:33 and it shall be, that in the morning, as soon as the sun is up, thou shalt rise early, and rush upon the city; and, behold, when he and the people that are with him come out against thee, then mayest thou do to them as thou shalt find occasion.

34 And Abimelech rose up, and all the people that were with him, by night, and they laid wait against Shechem in four companies.35 And Gaal the son of Ebed went out, and stood in the entrance of the gate of the city: and Abimelech rose up, and the people that were with him, from the ambushment.36 And when Gaal saw the people, he said to Zebul, Behold, there come people down from the tops of the mountains. And Zebul said unto him, Thou seest the shadow of the mountains as if they were men.37 And Gaal spake again and said, See, there come people down by the middle of the land, and one company cometh by the way of the oak of Meonenim.38 Then said Zebul unto him, Where is now thy mouth, that thou saidst, Who is Abimelech, that we should serve him? is not this the people that thou hast despised? go out now, I pray, and fight with them.39 And Gaal went out before the men of Shechem, and fought with Abimelech.40 And Abimelech chased him, and he fled before him, and there fell many wounded, even unto the entrance of the gate.

41 And Abimelech dwelt at Arumah: and Zebul drove out Gaal and his brethren, that they should not dwell in Shechem.42 And it came to pass on the morrow, that the people went out into the field; and they told Abimelech.43 And he took the people, and divided them into three companies, and laid wait in the field; and he looked, and, behold, the people came forth out of the city; And he rose up against them, and smote them.44 And Abimelech, and the companies that were with him, rushed forward, and stood in the entrance of the gate of the city: and the two companies rushed upon all that were in the field, and smote them.45 And Abimelech fought against the city all that day; and he took the city, and slew the people that were therein: and he beat down the city, and sowed it with salt.

46 And when all the men of the tower of Shechem heard thereof, they entered into the stronghold of the house of Elberith.47 And it was told Abimelech that all the men of the tower of Shechem were gathered together.48 And Abimelech gat him up to mount Zalmon, he and all the people that were with him; and Abimelech took an axe in his hand, and cut down a bough from the trees, and took it up, and laid it on his shoulder: and he said unto the people that were with him, What ye have seen me do, make haste, and do as I have done.49 And all the people likewise cut down every man his bough, and followed Abimelech, and put them to the stronghold, and set the stronghold on fire upon them; so that all the men of the tower of Shechem died also, about a thousand men and women.

50 Then went Abimelech to Thebez, and encamped against Thebez, and took it.51 But there was a strong tower within the city, and thither fled all the men and women, and all they of the city, and shut themselves in, and gat them up to the roof of the tower.52 And Abimelech came unto the tower, and fought against it, and drew near unto the door of the tower to burn it with fire.53 And a certain woman cast an upper millstone upon Abimelech’s head, and brake his skull.54 Then he called hastily unto the young man his armorbearer, and said unto him, Draw thy sword, and kill me, that men say not of me, A woman slew him. And his young man thrust him through, and he died.55 And when the men of Israel saw that Abimelech was dead, they departed every man unto his place.56 Thus God requited the wickedness of Abimelech, which he did unto his father, in slaying his seventy brethren;57 and all the wickedness of the men of Shechem did God requite upon their heads: and upon them came the curse of Jotham the son of Jerubbaal.