LUK 10
1 Ma mb͕e ihe ndia gasiri Onye-nwe-ayi guputara ọgu ndikom atọ na iri di iche, we zipu ha abua abua ka ha ga n'iru Ya ba n'obodo na ebe ọ bula, ebe Ya onwe-ya gaje ibia. 2 O we si ha, Owuwe-ihe-ubi riri nne n'ezie, ma ndi-ọlu di ole-na-ole: ya mere, nāriọnu Onye-nwe owuwe-ihe-ubi ahu, ka O zipu ndi-ọlu ba n'owuwe-ihe-ubi-Ya. 3 Jenu: le, Mu onwem nēzipu unu dika umu-aturu n'etiti agu. 4 Unu ewela àkpà-ego, ma-ọbu àkpà-ije, ma-ọbu akpukpọ-ukwu: unu ekele-kwa-la onye ọ bula n'uzọ. 5 Ma ulo ọ bula unu gābà nime ya, burunu uzọ si, Udo diri ulo a. 6 Ọ buru kwa na onye-udo nọ n'ebe ahu, udo-unu gānọkwasi ya: ma ọ buru na onye-udo anọghi ya, udo-unu gālaghachiri unu ọzọ. 7 Nọgide-kwa-nu n'ulo ahu, nēri nāṅu kwa ihe ha nēnye umu: n'ihi na onye-ọlu kwesiri ugwọ-ọlu-ya. Unu esila n'otù ulo ba n'ulo ọzọ. 8 Nime obodo ọ bula unu gābà kwa, ha we nara unu nke-ọma, rienu ihe edebere n'iru unu: 9 mekwanu ndi aru-ha nādighi ike nọ n'ebe ahu ka aru-ha di ike, si-kwa-nu ha, Ala-eze Chineke di unu nso. 10 Ma nime obodo ọ bula unu gābà, ma ha anaraghi unu nke-ọma, puanu n'amá-ya, si, 11 Ọbuná ájá si n'obodo-unu, nke rakuru n'ukwu-ayi, ka ayi nēhichapu imegide unu: otú ọ di, maranu nka, na ala-eze Chineke di nso. 12 Asim unu, Ala Sọdọm gānagide okwu n'ubọchi ahu kari obodo ahu. 13 Ahuhu gādiri gi, Korazin; ahuhu gādiri gi, Betsaida; n'ihi na asi na alururi ọlu nile di ike na Taia na Saidon, nke aluru nime unu, ha gēchèghariwori n'oge di anya gara aga, nānọdu n'ákwà-nkpe na ntu. 14 Otú ọ di, Taia na Saidon gānagide okwu n'ikpé ahu kari unu. 15 Gi onwe-gi kwa, Kapanaum, àgēweli gi rue elu-igwe? agēweda gi rue Hedis.
16 Onye nānu okwu-unu nānu okwu Mu onwem; onye nāju kwa unu nāju Mu onwem; ma onye nāju Mu onwem nāju Onye ziterem.
17 Ọgu ndikom atọ na iri ahu were ọṅù lata, si, Onye-nwe-ayi, ọbuná ndi-mọ ọjọ ka anēdo n'okpuru ayi n'aha-Gi. 18 O we si ha, Ahurum Setan ka ọ darari dika àmùmà pua n'elu-igwe. 19 Le, enyewom unu ike izọkwasi agwọ na akpi ukwu, na imegide ike onye-iro-unu nile: ọ dighi kwa ihe ọ bula gēmeru unu aru ma-ọli.
20 Otú ọ di, unu aṅurila ọṅu na nka, na anēdo ndi ajọ mọ n'okpuru unu; ma ṅurianu ọṅu na edewo aha-unu n'akwukwọ n'elu-igwe.
21 N'oge hour ahu tọrọ Ya utọ nke-uku nime Mọ Nsọ, O we si, Ekelem Gi, Nna, Onye-nwe elu-igwe na uwa, na I zonariri ndi-amam-ihe na ndi nwere nghọta ihe ndia, I were kwa ha kpughere umu ọhu: e, Nna; ekelem Gi na ọ di ezi nma otú a n'iru Gi. 22 Nnam rara ihe nile nyem n'aka: ọ dighi kwa onye ọ bula mara Onye Ọkpara ahu bu, ma-ọbughi Nna-Ya; na Onye Nna ahu bu, ma-ọbughi Ọkpara-Ya, na onye ọ bula Ọkpara nēzube ikpughe Ya nye ya. 23 Mb͕e O chigharisiri n'ebe ndi nēso uzọ-Ya nọ, O we si n'iche, Ngọzi nādiri anya nāhu ihe unu nāhu:
24 n'ihi na asim unu, na ọtutu ndi-amuma na ndi-eze chọrọ ihu ihe unu onwe-unu nāhu, ma ha ahughi ha; na inu ihe unu nānu, ma ha anughi ha.
25 Ma le, otù onye-iwu biliri, we nwa Ya, si, Onye-ozizí, ọ̀ bu gini ka m'gēme ka m'we keta ndu ebighi-ebi? 26 O we si ya, Gini ka edeworo n'akwukwọ iwu? ì si aṅa agu ya? 27 O we za, si, Hu Onye-nwe-ayi Chineke-gi n'anya site n'obi-gi dum, were kwa nkpuru-obi-gi dum, na ike-gi dum, na uche-gi dum; hu kwa onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi. 28 O we si ya, I zara nke-ọma: me nka, i gādi kwa ndu. 29 Ma ebe ọ nāchọ igu onwe-ya n'onye ezi omume, ọ si Jisus, Ònye bu kwa onye-ab͕ata-obim? 30 Jisus zara ya, si, Otù nwoke si na Jerusalem nārida iga Jeriko; o we dabà n'etiti ndi nāpunara madu ihe, ndi b͕ara ya ọtọ ti kwa ya ihe-otiti, we la, rapu ya ọtọgbọrọ. 31 Ma n'otù mb͕e ahu otù onye-nchu-àjà nārida n'uzọ ahu: mb͕e ọ huru ya, o we si n'akuku uzọ ọzọ gabiga. 32 Otú ahu onye Livai, mbe ọ biaruru ebe ahu, hu kwa ya, o we si kwa n'akuku uzọ ọzọ gabiga. 33 Ma otù onye Sameria, mb͕e ọ nọ n'ije, ọ bia rue n'ebe ọ nọ: mb͕e ọ huru ya, o we nwe ọmiko n'aru ya, 34 o we biakute ya, ke ọnyá nile ya, wukwasi ha manu na manya-vine; o we tukwasi ya n'anu-ulo nke aka ya, dubata ya n'ulo ndi-ọbìa, we le ya anya nke-ọma. 35 N'echi-ya o we tuputa shilling abua, nye onye-nwe ulo ndi-ọbìa ahu, si, Le ya anya nke-ọma; ihe ọ bula i n'akuku uzọ kari, mu onwem, mb͕e m'latara, m'gākwughachi gi. 36 Ọ̀ bu onye nime madu atọ a, ka i chère, gosiri onwe-ya ka onye-ab͕ata-obi nke onye ahu dabàra n'etiti ndi ahu nāpunara madu ihe?
37 Ọ si, Onye ahu nke mere ya ebere. Jisus we si ya, Ga, gi onwe-gi me kwa otú ahu.
38 Ma mb͕e ha nāga, Ya onwe-ya batara n'otù obodo ntà: otù nwanyi, aha-ya bu Mata, we kpọbata Ya n'ulo-ya. 39 O nwekwara nwa-nne-nwanyi anākpọ Meri, onye nānọdu kwa ala n'ukwu ala Onye-nwe-ayi, we nu okwu-Ya. 40 Ma uche Mata nābasasi n'ije-ozi nke-uku; o we biakute Ya ọsọsọ, si, Onye-nwe-ayi, ò metughi Gi n'obi na nwa-nnem nwanyi nārapum ka nání mu nēje ozi? ya mere, gwa ya ka o yerem aka. 41 Ma Onye-nwe-ayi zara, si ya, Mata, Mata, i nēcheb͕u onwe-gi nēsob͕u kwa onwe-gi n'ihi ọtutu ihe: 42 ma otu ihe bu ihe di nkpà: n'ihi na Meri rọputara ezi òkè ahu, nke anāgaghi-anapu ya.
Luke 10
1 Now after these things the Lord appointed seventy others, and sent them two and two before his face into every city and place, whither he himself was about to come.2 And he said unto them, The harvest indeed is plenteous, but the laborers are few: pray ye therefore the Lord of the harvest, that he send forth laborers into his harvest.3 Go your ways; behold, I send you forth as lambs in the midst of wolves.4 Carry no purse, no wallet, no shoes; and salute no man on the way.5 And into whatsoever house ye shall enter, first say, Peace be to this house.6 And if a son of peace be there, your peace shall rest upon him: but if not, it shall turn to you again.7 And in that same house remain, eating and drinking such things as they give: for the laborer is worthy of his hire. Go not from house to house.8 And into whatsoever city ye enter, and they receive you, eat such things as are set before you:9 and heal the sick that are therein, and say unto them, The kingdom of God is come nigh unto you.10 But into whatsoever city ye shall enter, and they receive you not, go out into the streets thereof and say,11 Even the dust from your city, that cleaveth to our feet, we wipe off against you: nevertheless know this, that the kingdom of God is come nigh.12 I say unto you, it shall be more tolerable in that day for Sodom, than for that city.13 Woe unto thee, Chorazin! woe unto thee, Bethsaida! for if the mighty works had been done in Tyre and Sidon, which were done in you, they would have repented long ago, sitting in sackcloth and ashes.14 But it shall be more tolerable for Tyre and Sidon in the judgment, than for you.15 And thou, Capernaum, shalt thou be exalted unto heaven? thou shalt be brought down unto Hades.16 He that heareth you heareth me; and he that rejecteth you rejecteth me; and he that rejecteth me rejecteth him that sent me.17 And the seventy returned with joy, saying, Lord, even the demons are subject unto us in thy name.18 And he said unto them, I beheld Satan fallen as lightning from heaven.19 Behold, I have given you authority to tread upon serpents and scorpions, and over all the power of the enemy: and nothing shall in any wise hurt you.20 Nevertheless in this rejoice not, that the spirits are subject unto you; but rejoice that your names are written in heaven.21 In that same hour he rejoiced in the Holy Spirit, and said, I thank thee, O Father, Lord of heaven and earth, that thou didst hide these things from the wise and understanding, and didst reveal them unto babes: yea, Father; for so it was well-pleasing in thy sight.22 All things have been delivered unto me of my Father: and no one knoweth who the Son is, save the Father; and who the Father is, save the Son, and he to whomsoever the Son willeth to reveal him.23 And turning to the disciples, he said privately, Blessed are the eyes which see the things that ye see:24 for I say unto you, that many prophets and kings desired to see the things which ye see, and saw them not; and to hear the things which ye hear, and heard them not.25 And behold, a certain lawyer stood up and made trial of him, saying, Teacher, what shall I do to inherit eternal life?26 And he said unto him, What is written in the law? how readest thou?27 And he answering said, Thou shalt love the Lord thy God with all thy heart, and with all thy soul, and with all thy strength, and with all thy mind; and thy neighbor as thyself.28 And he said unto him, Thou hast answered right: this do, and thou shalt live.29 But he, desiring to justify himself, said unto Jesus, And who is my neighbor?30 Jesus made answer and said, A certain man was going down from Jerusalem to Jericho; and he fell among robbers, who both stripped him and beat him, and departed, leaving him half dead.31 And by chance a certain priest was going down that way: and when he saw him, he passed by on the other side.32 And in like manner a Levite also, when he came to the place, and saw him, passed by on the other side.33 But a certain Samaritan, as he journeyed, came where he was: and when he saw him, he was moved with compassion,34 and came to him, and bound up his wounds, pouring on them oil and wine; and he set him on his own beast, and brought him to an inn, and took care of him.35 And on the morrow he took out two shillings, and gave them to the host, and said, Take care of him; and whatsoever thou spendest more, I, when I come back again, will repay thee.36 Which of these three, thinkest thou, proved neighbor unto him that fell among the robbers?37 And he said, He that showed mercy on him. And Jesus said unto him, Go, and do thou likewise.38 Now as they went on their way, he entered into a certain village: and a certain woman named Martha received him into her house.39 And she had a sister called Mary, who also sat at the Lord’s feet, and heard his word.40 But Martha was cumbered about much serving; and she came up to him, and said, Lord, dost thou not care that my sister did leave me to serve alone? bid her therefore that she help me.41 But the Lord answered and said unto her, Martha, Martha, thou art anxious and troubled about many things:42 but one thing is needful: for Mary hath chosen the good part, which shall not be taken away from her.