previous next

LUK 18

1 O we turu ha ilu izí ha na ha aghaghi ikpe ekpere mb͕e nile, na ighara ikwe ka ike gwu ha; 2 si, Otù onye-ikpé nọ n'otù obodo, onye nādighi-atu egwu Chineke, nke nādighi-asọpuru kwa madu: 3 otù nwanyi nke di-ya nwuru nọ kwa n'obodo ahu; nwanyi ahu we nābiakute ya, nāsi, Kpeputam n'aka onye-irom. 4 Ma na mbu ọ chọghi ime ya: ma emesia ọ siri n'onwe-ya, Ọ bu ezie na adighi m-atu egwu Chineke, adighm-asọpuru kwa madu; 5 ma n'ihi na nwanyi a di-ya nwuru nēsobum, m'gēkpeputa ya, ka ọ ghara ime ka ike gwusiam site n'ọbibia ọ nābia mb͕e nile. 6 Onye-nwe-ayi we si, Nurunu ihe onye-ikpé nke nēme ajọ omume kwuru. 7 Ma Chineke, Ọ̀ gaghi-ekpeputa ndi nke Ya arọputara, ndi nākpọku Ya ehihie na abali, O nwe-kwa-ra ogologo ntachi-obi n'ebe ha nọ?

8 Asim unu, na Ọ gēkpeputa ha ọsọsọ. Otú ọ di, mb͕e Nwa nke madu gābia, Ọ̀ gāhu okwukwe n'elu uwa?
9 O we tu kwa ilu a nye ufọdu ndi tukwasiri obi n'onwe-ha na ha bu ndi ezi omume, ndi kpọkwara ndi nile fọduru ihe-efu: 10 Ndikom abua rigoro n'ulo uku Chineke ikpe ekpere; otù nime ha bu onye-Farisi, ibe-ya bu onye-ọna-utu. 11 Onye-Farisi guzoro nēkpe ekpere nye onwe-ya otú a, si, Chineke, ekelem Gi, na adighi m ka ndi fọduru n'etiti madu, ndi nāpunara madu ihe, ndi ajọ omume, ndi nākwa iko, ma-ọbu dika ọbuná onye-ọna-utu a. 12 Anamebu ọnu ub͕ò abua n'ízù ubọchi asa; anamenye otù uzọ n'uzọ iri n'ihe nile, ka ha ra, bú nke m'natara. 13 Ma onye-ọna-utu ahu guzoro n'ebe di anya, ọ chọghi kwa iweli ọbuná anya-ya le elu-igwe, kama ọ nēti aka n'obi-ya, si, Chineke, ka obi-Gi juru n'ebe mu, bú onye-nmehie, nọ.

14 Asim unu, Nwoke a ridara n'ulo-ya buru onye aguworo n'onye ezi omume kari ibe-ya: n'ihi na onye ọ bula nke nēweli onwe-ya elu, agēweda ya; ma onye nēweda onwe-ya, agēweli ya elu.
15 Ha we kutakwara Ya umu ọhu ha, ka O we metu ha aka: ma mb͕e ndi nēso uzọ-Ya huru ya, ha bara ha nba. 16 Ma Jisus kpọrọ ha biakute Ya, si, Kwenu ka umu-ntakiri biakutem, unu eb͕ochi-kwa-la ha: n'ihi na ala-eze Chineke bu nke ndi di otú a.

17 N'ezie asim unu, Onye ọ bula nke nāgaghi-anara ala-eze Chineke dika nwatakiri, ọ gaghi-abà nime ya ma-ọli.
18 Otù onye-isi we jua Ya, si, Ezi Onye-ozizí, gini ka m'gēme ka m'we keta ndu ebighi-ebi? 19 Ma Jisus siri ya, Gini mere i nākpọm ezi onye? ọ dighi onye ọ bula bu ezi onye, ma-ọbughi otù Onye, bú Chineke. 20 I matawo ihe nile enyere n'iwu, Akwala iko, Eb͕ula madu, Ezula ori, Ab͕ala àmà ugha, Sọpuru nna-gi na nne-gi. 21 Ma ọ siri, Ihe ndia nile ka m'ribara ama site n'okorọbia. 22 Ma mb͕e Jisus nuru ya, Ọ si ya, Otù ihe fọdu-kwa-ra gi ime: re ihe nile, ka ha ra, bú nke i nwere, kenye ndi-ob͕eye, i gēnwe kwa àkù n'elu-igwe: bia kwa, som. 23 Ma mb͕e ọ nuru ihe ndia, o wutara ya nke-uku; n'ihi na ọ bu oké ọgaranya. 24 Ma ebe Jisus huru ya, Ọ si, Le otú ọ diri ndi nwere àkù ike ibà n'ala-eze Chineke! 25 N'ihi na ọ dikariri kamel nfé isite n'anya àgìgá ba nime, kari ọgaranya ibà n'ala-eze Chineke. 26 Ma ndi nuru ya siri, Ònye kwa ka apuru izọputa? 27 Ma Ọ siri, Ihe anāpughi ime n'ebe madu nọ apuru ime n'ebe Chineke nọ. 28 Pita we si, Le, ayi onwe-ayi rapuru ihe nile nke aka ayi, we so Gi. 29 O we si ha, N'ezie asim unu, Ọ dighi onye ọ bula nke rapuru ulo, ma-ọbu nwunye, ma-ọbu umu-nne, ma-ọbu ndi muru ya, ma-ọbu umu, n'ihi ala-eze Chineke,

30 nke nāgaghi-anata kari ọtutu ihe n'oge a, nata kwa ndu ebighi-ebi n'oge nke nābia.
31 O we kuru ndi-ozi iri na abua ahu tiyere Onwe-ya, si ha, Le, ayi nārigoro Jerusalem, ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ site n'aka ndi-amuma gēmezu n'ebe Nwa nke madu nọ. 32 N'ihi na agārara Ya nye n'aka ndi mba ọzọ, me kwa Ya ihe-ọchì, me kwa Ya ihe-ihere, busa kwa Ya ọnu-miri: 33 ha gāpia kwa Ya ihe, b͕ue Ya: n'ubọchi nke-atọ Ọ gēsi kwa n'ọnwu bilie.

34 Ma ndi ahu aghọtaghi ihe ọ bula n'ihe ndia; ezonari-kwa-ra ha okwu a, ha amaghi kwa ihe anēkwu.
35 O rue, mb͕e Ọ nābiaru Jeriko nso, otù onye-ìsì nānọdu n'akuku uzọ nāriọ aririọ: 36 ma ebe ọ nuru ùzù ìgwè madu ka ha nāgabiga, ọ jua isi ihe a. 37 Ha we kọrọ ya, na Jisus Onye Na-zaret nāgabiga. 38 O we tie nkpu, si, Jisus, Nwa Devid, merem ebere. 39 Ndi bu uzọ ga we bara ya nba, ka o kpuchie ọnu-ya: ma onye ahu tikariri nkpu nke-uku, si, Nwa Devid, merem ebere. 40 Jisus we guzo, si ka eduru ya biakute Ya: ma mb͕e ọ biara nso, Ọ jua ya, si, 41 Gini ka i nāchọ ka M'mere gi? Ọ́ si, Onye-nwe-ayi, ka eme ka m'hu uzọ. 42 Jisus we si ya, Ka eme ka i hu uzọ: okwukwe-gi azọputawo gi. 43 Ngwa ngwa ewe me ka ọ hu uzọ, o we nēso Ya, nēnye Chineke otuto: ndi-Ju nile, mb͕e ha huru ya, ha we to Chineke.

Luke 18

1 And he spake a parable unto them to the end that they ought always to pray, and not to faint;2 saying, There was in a city a judge, who feared not God, and regarded not man:3 and there was a widow in that city; and she came oft unto him, saying, Avenge me of mine adversary.4 And he would not for a while: but afterward he said within himself, Though I fear not God, nor regard man;5 yet because this widow troubleth me, I will avenge her, lest she wear me out by her continual coming.6 And the Lord said, Hear what the unrighteous judge saith.7 And shall not God avenge his elect, that cry to him day and night, and yet he is longsuffering over them?8 I say unto you, that he will avenge them speedily. Nevertheless, when the Son of man cometh, shall he find faith on the earth?9 And he spake also this parable unto certain who trusted in themselves that they were righteous, and set all others at nought:10 Two men went up into the temple to pray; the one a Pharisee, and the other a publican.11 The Pharisee stood and prayed thus with himself, God, I thank thee, that I am not as the rest of men, extortioners, unjust, adulterers, or even as this publican.12 I fast twice in the week; I give tithes of all that I get.13 But the publican, standing afar off, would not lift up so much as his eyes unto heaven, but smote his breast, saying, God, be thou merciful to me a sinner.14 I say unto you, This man went down to his house justified rather than the other: for every one that exalteth himself shall be humbled; but he that humbleth himself shall be exalted.15 And they were bringing unto him also their babes, that he should touch them: but when the disciples saw it, they rebuked them.16 But Jesus called them unto him, saying, Suffer the little children to come unto me, and forbid them not: for to such belongeth the kingdom of God.17 Verily I say unto you, Whosoever shall not receive the kingdom of God as a little child, he shall in no wise enter therein.18 And a certain ruler asked him, saying, Good Teacher, what shall I do to inherit eternal life?19 And Jesus said unto him, Why callest thou me good? none is good, save one, even God.20 Thou knowest the commandments, Do not commit adultery, Do not kill, Do not steal, Do not bear false witness, Honor thy father and mother.21 And he said, All these things have I observed from my youth up.22 And when Jesus heard it, he said unto him, One thing thou lackest yet: sell all that thou hast, and distribute unto the poor, and thou shalt have treasure in heaven: and come, follow me.23 But when he heard these things, he became exceeding sorrowful; for he was very rich.24 And Jesus seeing him said, How hardly shall they that have riches enter into the kingdom of God!25 For it is easier for a camel to enter in through a needle’s eye, than for a rich man to enter into the kingdom of God.26 And they that heard it said, Then who can be saved?27 But he said, The things which are impossible with men are possible with God.28 And Peter said, Lo, we have left our own, and followed thee.29 And he said unto them, Verily I say unto you, There is no man that hath left house, or wife, or brethren, or parents, or children, for the kingdom of God’s sake,30 who shall not receive manifold more in this time, and in the world to come eternal life.31 And he took unto him the twelve, and said unto them, Behold, we go up to Jerusalem, and all the things that are written through the prophets shall be accomplished unto the Son of man.32 For he shall be delivered up unto the Gentiles, and shall be mocked, and shamefully treated, and spit upon:33 and they shall scourge and kill him: and the third day he shall rise again.34 And they understood none of these things; and this saying was hid from them, and they perceived not the things that were said.35 And it came to pass, as he drew nigh unto Jericho, a certain blind man sat by the way side begging:36 and hearing a multitude going by, he inquired what this meant.37 And they told him that Jesus of Nazareth passeth by.38 And he cried, saying, Jesus, thou son of David, have mercy on me.39 And they that went before rebuked him, that he should hold his peace: but he cried out the more a great deal, Thou son of David, have mercy on me.40 And Jesus stood, and commanded him to be brought unto him: and when he was come near, he asked him,41 What wilt thou that I should do unto thee? And he said, Lord, that I may receive my sight.42 And Jesus said unto him, Receive thy sight; thy faith hath made thee whole.43 And immediately he received his sight, and followed him, glorifying God: and all the people, when they saw it, gave praise unto God.