previous next

LUK 19

1 O we ba na Jeriko nāgabiga kwa n'etiti ya. 2 Ma le, otù nwoke anākpọ aha-ya Zakiọs; onye ahu bu kwa onye-isi-ọna-utu, onye ahu bu kwa ọgaranya. 3 O we chọ uzọ ihu Jisus imata onye Ọ bu; ma ọ pughi n'ihi ìgwè madu, n'ihi na o toghi ogologo. 4 O we b͕a ọsọ ga n'iru, we rigo n'osisi sycomore ka ọ hu Ya anya: n'ihi na Ọ gaje igabiga n'uzọ ahu. 5 Mb͕e Jisus biaruru ebe ahu, O we le anya n'elu, si ya, Zakiọs, me ngwa, ridata; n'ihi na aghaghi m inọdu n'ulo-gi ta. 6 O we me ngwa, ridata, were kwa ọṅù kpọbata Ya. 7 Mb͕e ha huru ya, ha nile we nātamu, si, Ọ bàra inọ ọnọdu-abali n'ulo nwoke bu onye-nmehie. 8 Zakiọs we guzọ, si Onye-nwe-ayi, Le, Onye-nwe-ayi, nkera ihe m'nwere ka m'gēnye ndi-ob͕eye; ọ buru kwa na anaram onye ọ bula ihe site n'ebubo ugha, m'gēnyeghachi anọ anọ. 9 Jisus we si ya, Ta ka nzọputa biaruru ulo a, ebe ya onwe-ya bu kwa nwa Abraham.

10 N'ihi na Nwa nke madu biara ichọ na izọputa ihe nke furu efu.
11 Ma mb͕e ha nānu ihe ndia, Ọ tukwasi tu ilu, n'ihi na Ọ nọ Jerusalem nso, na n'ihi na ha nēchè na ala-eze Chineke gaje iputa ìhè ngwa ngwa. 12 Ya mere Ọ siri, Otù nwoke amazuru aha-ya gara ala di anya, inara ala-eze nye onwe-ya, na ilaghachi. 13 O we kpọ madu iri nime ndi-orù-ya, nye ha ọgu pound abua na iri, si ha, Zuanu ahia rue mb͕e m'gābia. 14 Ma ndi-obodo-ya kpọrọ ya asì, ha we zìe ndi-ozi ga n'azu ya, si, Ayi achọghi ka nwoke a buru eze-ayi. 15 O we rue, mb͕e ọ laghachiri ọzọ, mb͕e ọ natasiri ala-eze-ya, na ọ siri ka akpọ ndi-orù ahu, ndi ọ nyereri ego ahu, ka ha biakute ya, ka o we mara ihe ha zutarari n'ahia. 16 Onye mbu we bia n'iru ya, si, Onye-nwe-ayi, pound ise nke gi abawo urù ọgu pound abua na iri. 17 Ọ we si ya, I mere nke-ọma, ezi orù: n'ihi na ahuru na i kwesiri ka atukwasi gi obi n'ihe dikarisiri ntà, gi buru onye nāchi obodo iri. 18 Nke-abua we bia, si, Onye-nwe-ayi, pound ise nke gi abawo urù orú pound na ise. 19 O we si kwa nwoke a, Gi onwe-gi buru kwa onye-isi nke obodo ise. 20 Orù nke di iche we bia, si, Onye-nwe-ayi, le pound ise nke gi, nke m'debere n'ákwà: 21 n'ihi na aturum gi egwu, n'ihi na i bu onye aka ike: i nēweli ihe i nātọb͕ọghi, i nēwe kwa ihe n'ebe ikọghi. 22 Ọ si ya, M'gēsite n'ọnu nke gi kpe gi ikpé, ajọ orù. I mara na mu onwem bu onye aka ike, nēweli ihe m'nātọb͕ọghri, nēwe kwa ihe m'nāghaghri; 23 n'ihi gini kwa ka i nējighi were egom nye ndi nāb͕anwe ego, mu onwem gānara kwa ya na uma mb͕e m'biara? 24 O we si ndi guzoro nso, Napunu ya pound ise ahu, were ha nye onye nwere ọgu pound abua na iri ahu. 25 Ha we si ya, Onye-nwe-ayi, o nwere ọgu pound abua na iri. 26 Asim unu, na onye ọ bula nke nwere ka agēnye; ma onye nēnweghi, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya.

27 Otú ọ di, ndi-irom ndia, ndi nāchọghi ka m'buru eze-ha, kuta ha n'ebe a, b͕ue ha n'irum.

28 Mb͕e O kwusiri okwu ndia, O we nāga n'iru, nārigoro Jerusalem.
29 O rue, mb͕e Ọ biaruru Betfagi na Betani nso, n'uzọ ugwu anākpọ ugwu Olive, na O zigara madu abua n'etiti ndi nēso uzọ-Ya, 30 si, Jenu n'obodo ntà nke di na ncherita-iru unu; mb͕e unu nābà, unu gāhu nime ya nwa-inyinya-ibu elibeworo, nke madu ọ bula akānọkwasigh: tọpunu ya, sekputa ya. 31 Ọ buru kwa na onye ọ bula ajua unu, si, N'ìhi gini ka unu nātọpu ya? unu gāsi otú a, Ọ di Onye-nwe-ayi nkpà. 32 Ndi ezigara we je, hu dika Ọ gwara ha. 33 Ma mb͕e ha nātọpu nwa-inyinya-ibu ahu, ndi-nwe-ya we si ha, Gini mere unu nātopu nwa-inyinya-ibu ahu? 34 Ha we si, Ọ di Onye-nwe-ayi nkpà. 35 Ha we sekputa ya nye Jisus: ha we wukwasi uwe-ha na nwa-inyinya-ibu ahu, we tukwasi Jisus na ya. 36 Mb͕e Ọ nāga, ha we tusa uwe-ha n'uzọ. 37 Ma mb͕e Ọ nābiaru Jerusalem nso ub͕u a, n'uzọ nrida nke ugwu Olive, ọra ndi nile nēso uzọ-Ya malitere iṅuri ọṅu na iwere oké olu to Chineke n'ihi ọlu nile di ike nke ha hururi; 38 si, Onye agọziri agọzi ka Eze Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi bu: udo di n'elu-igwe, otuto di kwa n'ebe kachasi ihe nile elu. 39 Ufọdu n'etiti ndi-Farisi we si n'ìgwè madu ahu si Ya, Onye-ozizí, bara ndi nēso uzọ-Gi nba.

40 O we za, si, Asim unu na, ọ buru na ndia ekpuchi ọnu-ha, nkume gēti nkpu.
41 Mb͕e Ọ biaruru Jerusalem nso, O we hu obodo ahu we kwara ya ákwá, 42 si, Ọ buru na i mara n'ubọchi a, ọbuná gi onwe-gi, ihe gēweta udo! ma ub͕u a ezonariri ha n'anya-gi. 43 N'ihi na ubọchi gābiakwasi gi, mb͕e ndi-iro-gi gēgwu ékpè na ìgá imegide gi, nọgide kwa gi gburugburu, jigide kwa gi n'akuku nile,

44 tuda kwa gi n'ala, na umu-gi bi nime gi; ha agaghi-arapu kwa nime gi otù nkume n'elu nkume-ibe-ya; n'ihi na i maghi oge nleta-gi.
45 O wee ba n'ulọ uku Chineke, malite ichupu ndi nēre,

46 nāsi ha, Edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ulom gābu kwa ulo ekpere: ma unu onwe-unu mere ya ọb͕à ndi nāpunara madu ihe.
47 O we nēzí ihe kwa-ubọchi n'ulo uku Chineke. Ma ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ na ndi-isi nke ndi-Ju nāchọ uzọ ila Ya n'iyì: 48 ha ahughi kwa ihe ha gēme; n'ihi na ndi-Ju nile nọ Ya nso gburugburu, nānu okwu-Ya.

Luke 19

1 And he entered and was passing through Jericho.2 And behold, a man called by name Zacchaeus; and he was a chief publican, and he was rich.3 And he sought to see Jesus who he was; and could not for the crowd, because he was little of stature.4 And he ran on before, and climbed up into a sycomore tree to see him: for he was to pass that way.5 And when Jesus came to the place, he looked up, and said unto him, Zacchaeus, make haste, and come down; for to-day I must abide at thy house.6 And he made haste, and came down, and received him joyfully.7 And when they saw it, they all murmured, saying, He is gone in to lodge with a man that is a sinner.8 And Zacchaeus stood, and said unto the Lord, Behold, Lord, the half of my goods I give to the poor; and if I have wrongfully exacted aught of any man, I restore fourfold.9 And Jesus said unto him, To-day is salvation come to this house, forasmuch as he also is a son of Abraham.10 For the Son of man came to seek and to save that which was lost.11 And as they heard these things, he added and spake a parable, because he was nigh to Jerusalem, and because they supposed that the kingdom of God was immediately to appear.12 He said therefore, A certain nobleman went into a far country, to receive for himself a kingdom, and to return.13 And he called ten servants of his, and gave them ten pounds, and said unto them, Trade ye herewith till I come.14 But his citizens hated him, and sent an ambassage after him, saying, We will not that this man reign over us.15 And it came to pass, when he was come back again, having received the kingdom, that he commanded these servants, unto whom he had given the money, to be called to him, that he might know what they had gained by trading.16 And the first came before him, saying, Lord, thy pound hath made ten pounds more.17 And he said unto him, Well done, thou good servant: because thou wast found faithful in a very little, have thou authority over ten cities.18 And the second came, saying, Thy pound, Lord, hath made five pounds.19 And he said unto him also, Be thou also over five cities.20 And another came, saying, Lord, behold, here is thy pound, which I kept laid up in a napkin:21 for I feared thee, because thou art an austere man: thou takest up that which thou layedst not down, and reapest that which thou didst not sow.22 He saith unto him, Out of thine own mouth will I judge thee, thou wicked servant. Thou knewest that I am an austere man, taking up that which I laid not down, and reaping that which I did not sow;23 then wherefore gavest thou not my money into the bank, and I at my coming should have required it with interest?24 And he said unto them that stood by, Take away from him the pound, and give it unto him that hath the ten pounds.25 And they said unto him, Lord, he hath ten pounds.26 I say unto you, that unto every one that hath shall be given; but from him that hath not, even that which he hath shall be taken away from him.27 But these mine enemies, that would not that I should reign over them, bring hither, and slay them before me.28 And when he had thus spoken, he went on before, going up to Jerusalem.29 And it came to pass, when he drew nigh unto Bethphage and Bethany, at the mount that is called Olivet, he sent two of the disciples,30 saying, Go your way into the village over against you; in which as ye enter ye shall find a colt tied, whereon no man ever yet sat: loose him, and bring him.31 And if any one ask you, Why do ye loose him? thus shall ye say, The Lord hath need of him.32 And they that were sent went away, and found even as he had said unto them.33 And as they were loosing the colt, the owners thereof said unto them, Why loose ye the colt?34 And they said, The Lord hath need of him.35 And they brought him to Jesus: and they threw their garments upon the colt, and set Jesus thereon.36 And as he went, they spread their garments in the way.37 And as he was now drawing nigh, even at the descent of the mount of Olives, the whole multitude of the disciples began to rejoice and praise God with a loud voice for all the mighty works which they had seen;38 saying, Blessed is the King that cometh in the name of the Lord: peace in heaven, and glory in the highest.39 And some of the Pharisees from the multitude said unto him, Teacher, rebuke thy disciples.40 And he answered and said, I tell you that, if these shall hold their peace, the stones will cry out.41 And when he drew nigh, he saw the city and wept over it,42 saying, If thou hadst known in this day, even thou, the things which belong unto peace! but now they are hid from thine eyes.43 For the days shall come upon thee, when thine enemies shall cast up a bank about thee, and compass thee round, and keep thee in on every side,44 and shall dash thee to the ground, and thy children within thee; and they shall not leave in thee one stone upon another; because thou knewest not the time of thy visitation.45 And he entered into the temple, and began to cast out them that sold,46 saying unto them, It is written, And my house shall be a house of prayer: but ye have made it a den of robbers.47 And he was teaching daily in the temple. But the chief priests and the scribes and the principal men of the people sought to destroy him:48 and they could not find what they might do; for the people all hung upon him, listening.