previous next

LUK 2

1 Ma o rue na mb͕e ahu, iwu si n'ebe Sisa Ọgọstọs nọ puta na agēde aha madu nile bi n'elu-uwa dum madu bi n'akwukwo. 2 Nka bu odide-aha mbu edere mb͕e Kwiriniọs bu onye nāchi Siria. 3 Madu nile we ga ka ede aha-ha n'akwukwọ, onye ọ bula ọ ga obodo nke aka ya. 4 Josef we si kwa na Galili, site n'obodo Nazaret, rigo na Judia, ba n'obodo Devid nke anākpọ Betlehem, n'ihi na o si n'ulo na agburu Devid puta; 5 ka o we me ka ede aha ya na Meri n'akwukwọ, bú nwanyi ekwere na ọ gālu, onye di kwa ime. 6 O we rue, mb͕e ha nọ n'ebe ahu, ubọchi-ya zuru ka ọ gāmuta nwa.

7 O we muta Nwa-nwoke mbu ya; o we ke Ya n'ákwà ọkiké, nyibe Ya n'ihe anētiye nri anu-ulo, n'ihi na uzọ adighi nye ha n'ulo ndi-ije.
8 Ndi-ọzùzù-aturu di n'otù ala ahu nānọ n'ọhia, nēche kwa ìgwè aturu-ha n'abali. 9 Mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi we guzo ha nso, ebube nke Onye-nwe-ayi muba-kwa-ra ha gburugburu: ha we tua egwu nke-uku. 10 Mọ-ozi ahu we si ha, Unu atula egwu; n'ihi na le, anamezì unu ozi ọma nke oké ọṅù nke gādiri ndi Israel nile: 11 n'ihi na ta n'obodo Devid ka amuru nye unu Onye-nzọputa, Nke bu Kraist Onye-nwe-ayi. 12 Nka gābu-kwa-ra unu ihe-iriba-ama-Ya; Unu gāhu Nwa ọhu ekere n'ákwà ọkiké, nēdina kwa n'ihe anētiye nri anu-ulo.

13 Na mberede ìgwè usu ndi-mọ-ozi nke elu-igwe we nọyere mọ-ozi ahu, nēto Chineke, si,

14 Otuto diri Chineke n'ebe kachasi ihe nile elu,
Udo di kwa n'elu uwa n'etiti madu ndi ihe-ha di Ya ezi nma.
15 O we rue, mb͕e ndi-mọ-ozi puru n'ebe ha nọ la n'elu-igwe, ndi-ọzùzù-aturu we sirita onwe-ha, Ka ayi je rue Betlehem ub͕u a, hu ihe a ekwuru, nke Onye-nwe-ayi mere ka ayi mara. 16 Ha we were ọsọ bia, hu Meri na Josef, na Nwa ọhu ahu ka O dinara n'ihe ahu anētiye nri anu-ulo. 17 Ma mb͕e ha huru ya, ha me ka amara okwu agwara ha-ri bayere Nwatakiri ahu. 18 Okwu ndi-ọzùzù-aturu gwara ha we ju ndi nile nuru ha anya. 19 Ma Meri debere ihe ndia nile ekwuru, nātughari ha n'obi-ya.

20 Ndi-ọzùzù-aturu we laghachi, nēnye Chineke otuto, nēto kwa Ya n'ihi ihe nile ha nuru na nke ha huru, dika agwara ha.

21 Mb͕e ubọchi asatọ zuru ibì Ya úgwù, ewe kpọ aha-Ya Jisus, nke mọ-ozi kpọrọ ya mb͕e akātughi ime Ya.
22 Mb͕e ubọchi nile nke ime ha ka ha di ọcha dika iwu nke Moses si di zuru, ha we kuru Ya rigoro Jerusalem, iche Ya n'iru Onye-nwe-ayi 23 (dika edeworo ya n'iwu Onye-nwe-ayi, Nwa mbu ọ bula nke bu oke nke meghere àkpà-nwa, agākpọ ya ihe nsọ nye Onye-nwe-ayi), 24 na inye ihe-ichu-àjà dika okwu ekwuworo n'iwu Onye-nwe-ayi si di, Nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua. 25 Ma le, otù nwoke nọ na Jerusalem, onye aha-ya bu Simeon; nwoke a bu kwa onye ezi omume na onye nātu egwu Chineke, nēche nkasi-obi nke Israel: Mọ Nsọ di kwa n'aru ya. 26 Mọ Nsọ duru ya-ri ọdu, na ọ gaghi-ahu ọnwu, rue mb͕e ọ gāhu Kraist nke Onye-nwe-ayi. 27 O we bia na Mọ ahu nime ulo uku Chineke: mb͕e ndi muru Ya kubatara Nwatakiri ahu, bú Jisus, ka ha we mere Ya dika omume iwu Chineke si di,

28 ya onwe-ya we nara Ya nke-ọma, kuru Ya n'aka-ya, gọzi kwa Chineke, si,

29 Onye-nwem, ub͕u a ka I gārapu orù-Gi ka ọ la
N'udo, dika okwu-Gi si di;

30 N'ihi na anyam ahuwo nzọputa-Gi,

31 Nke I doziri n'iru ndi nile;

32 Ìhè agēkpughere mba nile ọzọ,
Na ebube ndi-Gi, bú Israel.
33 Ihe ekwuru bayere Ya we nēju kwa nna-Ya na nne-Ya anya; 34 Simeon we gọzie ha, si kwa Meri nne-Ya, Le, edowo Nwa nka ka Ọ buru ọdida na nbili nke ọtutu madu n'Israel; ka Ọ buru kwa ihe-iriba-ama anēkwu okwu megide; 35 ma mma-agha gāduwa kwa nkpuru-obi gi onwe-gi; ka ewe kpughe èchìchè nke si n'ọtutu obi puta. 36 Otù onye anākpọ Ana di kwa, bú onye-amuma-nwanyi, nwa-nwanyi Fanuel, nke si n'ebo Asha puta (nwanyi a aghọwo ezi agadi, ebe ya na di-ya biri arọ asa site na nwa-ab͕ọghọ-ya, 37 o we nọdu n'ọnọdu nwanyi di-ya nwuru rue ọgu arọ anọ na anọ), onye nāpughi n'ulo Chineke, ma o were obubu-ọnu na aririọ nēkpere Chineke abali na ehihie. 38 O we bia rue ebe ahu n'otù oge hour ahu, we kele Chineke, gwa kwa ndi nile nēche nb͕aputa nke Jerusalem okwu bayere Ya.

39 Mb͕e ha mezuru ihe nile nke di ka iwu Onye-nwe-ayi si di, ha we laghachi na Galili, rue obodo nke aka ha, bú Nazaret.

40 Nwatakiri ahu we nētó, nēsi kwa ike, nējuputa n'amam-ihe: amara Chineke di kwa n'aru Ya.
41 Ndi muru Ya nēje Jerusalem kwa-arọ n'ememe ngabiga. 42 Mb͕e Ọ b͕ara arọ iri na abua, ha we rigo dika omume nke ememe ahu si di; 43 mb͕e ha nọzuru ubọchi nile, mb͕e ha nālaghachi, Nwa-okoro ahu, bú Jisus, we nọdu n'azu na Jerusalem; ndi muru Ya amaghi kwa ya; 44 ma ebe ha chère na Ọ di n'usu-ha, ha jere ije otù ubọchi; ha nachọ kwa Ya n'etiti ndi-ikwu-ha na ndi ha mara: 45 mb͕e ha nāchọtaghi Ya, ha we laghachi na Jerusalem, nāchọ Ya. 46 Ọ we rue, mb͕e ubọchi atọ gasiri, ha hu Ya n'ulo Chineke, ka Ọ nọduru n'etiti ndi-ozizí, nānu okwu-ha, nāju kwa ha ajuju: 47 ibobo nghọta-Ya na ọziza nile Ya we nwua ndi nile nuru okwu-Ya n'aru. 48 Mb͕e ha huru Ya, egwu wee tua ha n'aru: nne-Ya we si Ya, Nwam, Gini mere I meso ayi otú a? le, nna-Gi na mu onwem nāchọ Gi n'obi ufu. 49 O we si ha, Gini mere unu nāchọm? ùnu amataghi na aghaghm idi n'ihe nke Nnam? 50 Ma ha onwe-ha aghọtaghi okwu Ọ gwara ha.

51 O we so ha rida, bia rue Nazaret; Ọ we nọdu n'okpuru ha: nne-Ya we nēdebe ihe nile ekwuru n'obi-ya.
52 Jisus we nāga n'iru n'amam-ihe na ogologo, nāga kwa n'amara n'ebe Chineke na madu nọ.

Luke 2

1 Now it came to pass in those days, there went out a decree from Caesar Augustus, that all the world should be enrolled.2 This was the first enrolment made when Quirinius was governor of Syria.3 And all went to enrol themselves, every one to his own city.4 And Joseph also went up from Galilee, out of the city of Nazareth, into Judaea, to the city of David, which is called Bethlehem, because he was of the house and family of David;5 to enrol himself with Mary, who was betrothed to him, being great with child.6 And it came to pass, while they were there, the days were fulfilled that she should be delivered.7 And she brought forth her firstborn son; and she wrapped him in swaddling clothes, and laid him in a manger, because there was no room for them in the inn.8 And there were shepherds in the same country abiding in the field, and keeping watch by night over their flock.9 And an angel of the Lord stood by them, and the glory of the Lord shone round about them: and they were sore afraid.10 And the angel said unto them, Be not afraid; for behold, I bring you good tidings of great joy which shall be to all the people:11 for there is born to you this day in the city of David a Saviour, who is Christ the Lord.12 And this is the sign unto you: Ye shall find a babe wrapped in swaddling clothes, and lying in a manger.13 And suddenly there was with the angel a multitude of the heavenly host praising God, and saying,

14 Glory to God in the highest, And on earth peace among men in whom he is well pleased.

15 And it came to pass, when the angels went away from them into heaven, the shepherds said one to another, Let us now go even unto Bethlehem, and see this thing that is come to pass, which the Lord hath made known unto us.16 And they came with haste, and found both Mary and Joseph, and the babe lying in the manger.17 And when they saw it, they made known concerning the saying which was spoken to them about this child.18 And all that heard it wondered at the things which were spoken unto them by the shepherds.19 But Mary kept all these sayings, pondering them in her heart.20 And the shepherds returned, glorifying and praising God for all the things that they had heard and seen, even as it was spoken unto them.21 And when eight days were fulfilled for circumcising him, his name was called JESUS, which was so called by the angel before he was conceived in the womb.22 And when the days of their purification according to the law of Moses were fulfilled, they brought him up to Jerusalem, to present him to the Lord23 (as it is written in the law of the Lord, Every male that openeth the womb shall be called holy to the Lord),24 and to offer a sacrifice according to that which is said in the law of the Lord, A pair of turtledoves, or two young pigeons.25 And behold, there was a man in Jerusalem whose name was Simeon; and this man was righteous and devout, looking for the consolation of Israel: and the Holy Spirit was upon him.26 And it had been revealed unto him by the Holy Spirit, that he should not see death, before he had seen the Lord’s Christ.27 And he came in the Spirit into the temple: and when the parents brought in the child Jesus, that they might do concerning him after the custom of the law,28 then he received him into his arms, and blessed God, and said,

29 Now lettest thou thy servant depart, Lord, According to thy word, in peace;

30 For mine eyes have seen thy salvation,

31 Which thou hast prepared before the face of all peoples;

32 A light for revelation to the Gentiles, And the glory of thy people Israel.

33 And his father and his mother were marvelling at the things which were spoken concerning him;34 and Simeon blessed them, and said unto Mary his mother, Behold, this child is set for the falling and the rising of many in Israel; and for a sign which is spoken against;35 yea and a sword shall pierce through thine own soul; that thoughts out of many hearts may be revealed.36 And there was one Anna, a prophetess, the daughter of Phanuel, of the tribe of Asher (she was of a great age, having lived with a husband seven years from her virginity,37 and she had been a widow even unto fourscore and four years), who departed not from the temple, worshipping with fastings and supplications night and day.38 And coming up at that very hour she gave thanks unto God, and spake of him to all them that were looking for the redemption of Jerusalem.39 And when they had accomplished all things that were according to the law of the Lord, they returned into Galilee, to their own city Nazareth.40 And the child grew, and waxed strong, filled with wisdom: and the grace of God was upon him.41 And his parents went every year to Jerusalem at the feast of the passover.42 And when he was twelve years old, they went up after the custom of the feast;43 and when they had fulfilled the days, as they were returning, the boy Jesus tarried behind in Jerusalem; and his parents knew it not;44 but supposing him to be in the company, they went a day’s journey; and they sought for him among their kinsfolk and acquaintance:45 and when they found him not, they returned to Jerusalem, seeking for him.46 And it came to pass, after three days they found him in the temple, sitting in the midst of the teachers, both hearing them, and asking them questions:47 and all that heard him were amazed at his understanding and his answers.48 And when they saw him, they were astonished; and his mother said unto him, Son, why hast thou thus dealt with us? behold, thy father and I sought thee sorrowing.49 And he said unto them, How is it that ye sought me? knew ye not that I must be in my Father’s house?50 And they understood not the saying which he spake unto them.51 And he went down with them, and came to Nazareth; and he was subject unto them: and his mother kept all these sayings in her heart.52 And Jesus advanced in wisdom and stature, and in favor with God and men.