previous next

LUK 20

1 O we rue, n'otù nime ubọchi ahu, mb͕e Ọ nēzí ndi-Ju ihe n'ulo uku Chineke, nēzì kwa ozi ọma, na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ, ha na ndi-okenye, we guzo Ya nso; 2 ha we kwue, si Ya, Gwa ayi: Ọ̀ bu n'aha ike gini ka I nēme ihe ndia? ma-ọbu ònye ka ọ bu, bú onye nyere Gi ike a? 3 Ma Ọ zara, si ha, Mu onwem gāju kwa unu otù ajuju unu zakwam: 4 Baptism nke Jọn, ò sitere n'elu-igwe, ma-ọbu na o sitere n'aka madu? 5 Ha we kwurita n'etiti onwe-ha, si, Ọ buru na ayi asi, O sitere n'elu-igwe; Ọ gāsi, N'ìhi gini ka unu nējighi kwe ya? 6 Ma ọ buru na ayi asi, O sitere n'aka madu; ndi-Ju nile gēji nkume tub͕u ayi: n'ihi na emewo ka ha kweye na Jọn bu onye-amuma. 7 Ha we za, si na ha amataghi ebe o sitere.

8 Jisus we si ha, Mu onwem agaghi-agwa kwa unu aha ike M'ji eme ihe ndia.
9 O we malite ituru ndi-Ju ilu a: Otù onye kuru ubi-vini, were kwa ya tiye n'aka ndi-ọlu-ubi, we je ala ọzọ nọdu oge di anya. 10 N'oge ighọ nkpuru o we zigara ndi-ọlu-ubi ahu otù orù, ka ha we nye ya nkpuru ufọdu nke ubi-vine ahu: ma ndi-ọlu-ubi ahu piara ya ihe, zilaga ya n'aka efu. 11 O we zikwasi orù ọzọ: ha we pia kwa ya ihe, me ya ihe-ihere, zilaga ya n'aka efu. 12 O we zikwasi orù nke-atọ: ha we meru kwa onye ahu aru, we tupu ya. 13 Onye-nwe ubi-vine ahu we si, Gini ka m'gēme? m'gēziga ọkparam m'huru n'anya: eleghi anya ha gāsọpuru nwam nka. 14 Ma mb͕e ndi-ọlu-ubi ahu huru ya, ha kwurita n'etiti onwe-ha, si, Nka bu onye-nketa: ka ayi b͕ue ya, ka ihe-nketa-ya we buru nke ayi. 15 Ha we tupu ya n'azu ubi-vine ahu, b͕ue ya. Gini kwa ka onye-nwe ubi-vine ahu gēme ha? 16 Ọ gābia, la ndi-ọlu-ubi ahu n'iyì, were kwa ubi-vine ahu nye ndi ọzọ. Ma mb͕e ha nuru ya, ha si, Chineke ekwela.

17 Ma O lere ha anya, si, Gini kwa bu ihe a nke edeworo n'akwukwọ nsọ,
Nkume nke ndi nēwu ulo juru,
Nke ahu ka emere isi nkuku ulo?

18 Agētiwasi onye ọ bula nke dakwasiri nkume ahu; ma onye ọ bula ọ gādakwasi ya, ọ gēfesa ya ka uzuzu.
19 Ndi-ode-akwukwọ na ndi-isi-nchu-àjà we chọ uzọ itukwasi Ya aka n'otù oge hour ahu; ma ha turu egwu ndi-Ju: n'ihi na ha mara na Ọ turu ilu a imegide ha. 20 Ha we che Ya nche, we zipu ndi-nledo, ndi mere onwe-ha dika ndi ezi omume, ka ha we jide Ya n'okwu-ọnu-Ya, irara Ya nye n'aka ọchichi na ike nke onye-isi. 21 Ha we jua Ya, si, Onye-ozizí, ayi amatawo na I nēkwu nēzi kwa ihe ziri ezi, na I dighi-ele kwa madu anya n'iru, kama I nēzí uzọ Chineke n'ezi-okwu: 22 Ò ziri ezi n'iwu ka ayi tu ùtú nye Sisa, ma-ọbu na ò zighi ezi? 23 Ma Ọ matara aghughọ-ha, we si ha, 24 Gosinum otù shilling. Ònyinyo na ihe-ndekwasi nke onye ka o nwere? Ha si, Nke Sisa. 25 O we si ha, Ya mere, nyeghachinu Sisa ihe nke Sisa, nyeghachi-kwa-nu Chineke ihe nke Chineke.

26 Ha enweghi kwa ike ijide okwu-Ya n'iru ndi-Ju: ọziza-Ya we ju ha anya, ha we kpuchie ọnu-ha.
27 Ufọdu n'etiti ndi-Sadusi, ndi si na nbilite-n'ọnwu adighi, we biakute Ya; ha we jua Ya, 28 si, Onye-ozizí, Moses dere akwukwọ nye ayi, si, na ọ buru na nwa-nne-nwoke onye ọ bula anwua, mb͕e o nwere nwunye, ma onye ahu enweghi nwa, ka nwa-nne-ya nwoke kuru nwunye-ya, me ka nkpuru toputara nwa-nne-ya. 29 Ya mere, umu-nne-ndikom asa di: nke-mbu luru nwunye, we nwua nēnweghi nwa; 30 nke-abua kwa; 31 nke-atọ we kuru ya; otú ahu ha asa arapughi umu, we nwua. 32 Mb͕e ha nile nwusiri nwanyi ahu nwukwara. 33 Ya mere, na nbilite-n'ọnwu nwùnye onye n'etiti ha ka ọ gābu? n'ihi na ha asa nwere ya na nwunye. 34 Jisus we si ha, Umu nke oge a nālu nwunye, anēnye kwa ha n'ọlulu-di: 35 ma ndi aguru na ha kwesiri iru oge ahu, na iru nbilite-n'ọnwu ahu, bú isi na ndi nwuru anwu bilie, ha alughi nwunye, enyeghi kwa ha n'ọlulu-di: 36 n'ihi na ha apughi kwa inwu ọzọ: n'ihi na ha na ndi-mọ-ozi ra; ha bu kwa umu Chineke, ebe ha bu umu nbilite-n'ọnwu ahu. 37 Ma ọbuná Moses gosiri na anēme ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie, nēkwu nime ebe edere okwu bayere Osisi ntà, mb͕e ọ nākpọ Onye-nwe-ayi Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob. 38 Ma Ọ bughi Chineke nke ndi nwuru anwu, kama Ọ bu nke ndi di ndu: n'ihi na ọ bu n'ebe Ọ nọ ka madu nile di ndu. 39 Ufọdu n'etiti ndi-ode-akwukwọ we za, si, Onye-ozizí, I kwuru nke-ọma.

40 N'ihi na ha enweghi anya-ike ọzọ iju Ya ajuju ọ bula.
41 O we si ha, Hà si aṅa kwu na Kraist ahu bu nwa Devid?

42 N'ihi na Devid onwe-ya nēkwu n'akwukwọ Abù ọma, si,
Onye-nwe-ayi siri Onye-nwem,
Nọdu ala n'aka-nrim,

43 Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwu-Gi abua.

44 Ya mere, Devid nākpọ Ya Onye-nwe-ya, Ò si kwa aṅa buru Nwa-ya?
45 Ma mb͕e ndi-Ju nile nānu okwu-Ya Ọ si ndi nēso uzọ-Ya, 46 Nēzenu ndi-ode-akwukwọ, ndi nāchọ ijeghari n'uwe-nwuda, ndi nāhu kwa ekele n'ọma-ahia nile unu n'anya, na isi oche nile n'ulo-nzukọ nile unu, na isi ọnọdu n'oriri nile unu; 47 ndi nēripia ulo ndinyom di-ha nwuru, ndi nēkpe kwa ogologo ekpere ka madu we hu ha anya: ndia gēnwe ezi ọmuma-ikpé gabigara ókè kari ndi ọzọ.

Luke 20

1 And it came to pass, on one of the days, as he was teaching the people in the temple, and preaching the gospel, there came upon him the chief priests and the scribes with the elders;2 and they spake, saying unto him, Tell us: By what authority doest thou these things? or who is he that gave thee this authority?3 And he answered and said unto them, I also will ask you a question; and tell me:4 The baptism of John, was it from heaven, or from men?5 And they reasoned with themselves, saying, If we shall say, From heaven; he will say, Why did ye not believe him?6 But if we shall say, From men; all the people will stone us: for they are persuaded that John was a prophet.7 And they answered, that they knew not whence it was.8 And Jesus said unto them, Neither tell I you by what authority I do these things.9 And he began to speak unto the people this parable: A man planted a vineyard, and let it out to husbandmen, and went into another country for a long time.10 And at the season he sent unto the husbandmen a servant, that they should give him of the fruit of the vineyard: but the husbandmen beat him, and sent him away empty.11 And he sent yet another servant: and him also they beat, and handled him shamefully, and sent him away empty.12 And he sent yet a third: and him also they wounded, and cast him forth.13 And the lord of the vineyard said, What shall I do? I will send my beloved son; it may be they will reverence him.14 But when the husbandmen saw him, they reasoned one with another, saying, This is the heir; let us kill him, that the inheritance may be ours.15 And they cast him forth out of the vineyard, and killed him. What therefore will the lord of the vineyard do unto them?16 He will come and destroy these husbandmen, and will give the vineyard unto others. And when they heard it, they said, God forbid.17 But he looked upon them, and said, What then is this that is written, The stone which the builders rejected, The same was made the head of the corner?

18 Every one that falleth on that stone shall be broken to pieces; but on whomsoever it shall fall, it will scatter him as dust.19 And the scribes and the chief priests sought to lay hands on him in that very hour; and they feared the people: for they perceived that he spake this parable against them.20 And they watched him, and sent forth spies, who feigned themselves to be righteous, that they might take hold of his speech, so as to deliver him up to the rule and to the authority of the governor.21 And they asked him, saying, Teacher, we know that thou sayest and teachest rightly, and acceptest not the person of any, but of a truth teachest the way of God:22 Is it lawful for us to give tribute unto Caesar, or not?23 But he perceived their craftiness, and said unto them,24 Show me a denarius. Whose image and superscription hath it? And they said, Caesar’s.25 And he said unto them, Then render unto Caesar the things that are Caesar’s, and unto God the things that are God’s.26 And they were not able to take hold of the saying before the people: and they marvelled at his answer, and held their peace.27 And there came to him certain of the Sadducees, they that say that there is no resurrection;28 and they asked him, saying, Teacher, Moses wrote unto us, that if a man’s brother die, having a wife, and he be childless, his brother should take the wife, and raise up seed unto his brother.29 There were therefore seven brethren: and the first took a wife, and died childless;30 and the second:31 and the third took her; and likewise the seven also left no children, and died.32 Afterward the woman also died.33 In the resurrection therefore whose wife of them shall she be? for the seven had her to wife.34 And Jesus said unto them, The sons of this world marry, and are given in marriage:35 but they that are accounted worthy to attain to that world, and the resurrection from the dead, neither marry, nor are given in marriage:36 for neither can they die any more: for they are equal unto the angels; and are sons of God, being sons of the resurrection.37 But that the dead are raised, even Moses showed, in the place concerning the Bush, when he calleth the Lord the God of Abraham, and the God of Isaac, and the God of Jacob.38 Now he is not the God of the dead, but of the living: for all live unto him.39 And certain of the scribes answering said, Teacher, thou hast well said.40 For they durst not any more ask him any question.41 And he said unto them, How say they that the Christ is David’s son?42 For David himself saith in the book of Psalms, The Lord said unto my Lord, Sit thou on my right hand,

43 Till I make thine enemies the footstool of thy feet.

44 David therefore calleth him Lord, and how is he his son?45 And in the hearing of all the people he said unto his disciples,46 Beware of the scribes, who desire to walk in long robes, and love salutations in the marketplaces, and chief seats in the synagogues, and chief places at feasts;47 who devour widows’ houses, and for a pretence make long prayers: these shall receive greater condemnation.